-
“Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”Ụlọ Nche—2002 | Septemba 1
-
-
14. N’ilu banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi, n’ihi gịnị ka o ji dị ịrịba ama na Jizọs ji ụzọ ‘si Jeruselem gbadaa Jeriko’ mee ka isi ihe ọ na-ekwu pụta ìhè?
14 Nke abụọ, cheta ilu nke onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi. Jizọs malitere site n’ịsị: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma.” (Luk 10:30) N’ụzọ dị ịrịba ama, Jizọs ji ụzọ ‘si Jeruselem gaa Jeriko’ mee ka isi ihe ọ na-ekwu pụta ìhè. Mgbe ọ na-atụ ilu a, ọ nọ na Judia, bụ́ ebe na-adịghị anya site na Jeruselem; n’ihi ya, o yiri ka ndị na-ege ya ntị ha maara ụzọ ọ na-ekwu banyere ya. A ma ụzọ ahụ ama dị ka ụzọ dị ize ndụ, karịsịa nye onye na-aga ya nanị ya. Ọ gbagọrọ agbagọ nke ukwuu ma dịrị n’ịkpa, na-eme ka ndị na-apụnara mmadụ ihe nwee ọtụtụ ebe ha pụrụ izo.
15. Gịnị mere na ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ịgọpụrụ enweghị mmasị nke onye nchụàjà na onye Livaị ahụ a kọrọ n’ihe atụ metụtara onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi?
15 Ọ dị ihe ọzọ kwesịrị ka a rịba ya ama banyere aka Jizọs zoro n’ụzọ ahụ si ‘Jeruselem gbadaa Jeriko.’ Dị ka e kwuru n’akụkọ ahụ, onye nchụàjà bu ụzọ gafere, e mesịakwa onye Livaị esikwa n’ụzọ ahụ gafee—ọ bụ ezie na ọ dịghị onye n’ime ha kwụsịrị iji nyere onye ahụ e merụrụ ahụ́ aka. (Luk 10:31, 32) Ndị nchụàjà jere ozi n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ndị Livaị nyekwaara ha aka. Ọtụtụ ndị nchụàjà na ndị Livaị na-ebi na Jeriko mgbe ha na-adịghị arụ ọrụ n’ụlọ nsọ, n’ihi na Jeriko dị nanị kilomita 23 site na Jeruselem. N’ihi ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere mgbe ha na-esi n’ụzọ ahụ agafe. Rịbakwa ama na onye nchụàjà ahụ na onye Livaị ahụ “si Jeruselem” na-aga n’ụzọ ahụ, si otú ahụ na-apụ n’ụlọ nsọ ahụ.b N’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ịgọpụrụ enweghị mmasị a ndị ikom ahụ gosipụtara site n’ịsị, ‘Ha zeere nwoke ahụ e merụrụ ahụ́ n’ihi na o yiri onye nwụrụ anwụ, imetụ ozu aka gaara emewo ka ha ghara ikwesị ekwesị ije ozi n’ụlọ nsọ ruo nwa oge.’ (Levitikọs 21:1; Ọnụ Ọgụgụ 19:11, 16) Ọ̀ bụ na o doghị anya na ilu Jizọs gosipụtara ihe ndị na-ege ya ntị maara nke ọma?
-
-
“Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”Ụlọ Nche—2002 | Septemba 1
-
-
b Ebe Jeruselem dị dị elu karịa ebe Jeriko dị. N’ihi ya, onye njem ‘na-esi Jeruselem agbada Jeriko,’ dị ka e kwuru n’ilu ahụ.
-