Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
È mere ka ntị chie Zakaraịas, nna Jọn Onye Na-eme Baptism, meekwa ka ọ daa ogbi, dị ka Luk 1:62 yiri ka ọ na-egosi?
Ụfọdụ ekwubiwo na Zakaraịas chikwara ntị. Anyị na-agụ n’ihe ndekọ Bible, sị: “Ha wee kpọba [nwa ahụ] Zakaraịas, n’aha nna ya. Nne ya wee zaa, sị, Ee e; kama a ga-akpọ ya Jọn. Ha wee sị ya, Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti ndị ikwu gị nke a na-akpọ aha nke a. Ha wee feere nna ya aka, ihe ọ chọrọ ka a kpọọ ya. O wee rịọ ha ka ha nye ya ihe e ji ede akwụkwọ, o wee dee, sị, Aha ya bụ Jọn.”—Luk 1:59-63.
Otú ọ dị, ọ dịghị ihe dị n’ihe ndekọ nke a na-ekwu kpọmkwem na Zakaraịas enweghị ike ịnụ ihe ruo ogologo oge ụfọdụ.
Tupu mgbe ahụ mmụọ ozi Gebriel amaworo Zakaraịas ọkwa ọmụmụ na-abịa n’ihu nke nwa nwoke a ga-akpọ aha ya Jọn. Nke ahụ siiri Zakaraịas meworo agadi ike ikwere. Mmụọ ozi ahụ zaghachiri, sị: “Leekwa, ị ga-ekpuchi ọnụ, ị gaghị apụkwa ikwu okwu, ruo ụbọchị ahụ mgbe ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị okwu m ndị a, nke ga-emezu n’oge ha.” (Luk 1:13, 18-20) Mmụọ ozi ahụ kwuru na ọ ga-emetụta ikwu okwu Zakaraịas, ọ bụghị ịnụ ihe ya.
Ihe ndekọ ahụ gakwara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe ọ pụtara [n’ụlọ nsọ ahụ], ọ pụghị ịgwa [ndị na-echerenụ] okwu: ha wee mazuo na ọ hụrụrịị ọhụụ n’ụlọ nsọ: ya onwe ya wee na-efere ha aka, na-anọgidekwa n’ogbi.” (Luk 1:22) Okwu Grik a sụgharịrị ebe a ịbụ “ogbi” na-enye echiche nke mgbochi, n’okwu, n’ịnụ ihe, ma ọ bụ na ha abụọ. (Luke 7:22) Gịnị banyere Zakaraịas? Ọ dị mma, tụlee ihe mere mgbe a gwọrọ ya. “Ngwa ngwa ọnụ ya wee saghee, ire ya tọpụkwa, o wee na-ekwu okwu, na-agọzi Chineke.” (Luk 1:64) Nke ahụ na-eduje n’echiche ahụ ezi uche dị na ya nke na nanị ikike Zakaraịas nwere ikwu okwu ka e gbochiri.
Mgbe ahụ, gịnị mere ndị ọzọ ji jụọ Zakaraịas ‘ihe ọ chọrọ ka a kpọọ nwa ahụ site n’ifere ya aka’? Ndị nsụgharị ụfọdụ ọbụna na-ede nke a ịbụ “n’asụsụ nke ifegharị aka” ma ọ bụ “na-eji asụsụ mmegharị ahụ eme ihe.”
Ọtụtụ mgbe, a na-amanye Zakaraịas, onye daburu ogbi eri ịma ọkwa nke onye mmụọ ozi ahụ, iji mmegharị ahụ, ụdị nke asụsụ mmegharị ahụ, na-ekwu okwu. Dị ka ihe atụ, ọ “na-efere ha aka” bụ́ ndị nọ n’ụlọ nsọ ahụ. (Luk 1:21, 22) Mgbe o mesịrị rịọ ka e nye ya mbadamba nkume, ọ ghaghị ifeworo ha aka ma ọ bụ jiri mmegharị ahụ mee ihe. (Luk 1:63) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na ndị nọ ya nso n’oge ịda ogbi ya aghaghị ịdị na-eji mmegharị ahụ eme ihe.
Otú ọ dị, e nwere nkọwa yikarịrị eziokwu maka ife aka ndị ahụ a kpọtụrụ uche na Luk 1:62. Elizabet ka kwupụtasịrị echiche ya maka aha nwa ahụ. Ya mere, n’ekwugideghị ya, ha pụrụ nanị imewo ihe na-esonụ na nke kwesịrị ekwesị nke inweta mkpebi di ya. Ha pụrụ ime nke ahụ site nanị n’ikwe n’isi ma ọ bụ imegharị ahụ. Eziokwu bụ na ha edereghị Zakaraịas ajụjụ ha ka ọ gụọ pụrụ ọbụna ịbụ ihe àmà na ọ nụrụ ihe ndị nwunye ya kwuru. Otú a, nanị ikwe n’isi ma ọ bụ mmegharị ahụ yiri ya n’ebe ọ nọ nwere ike, ‘Ee em, anyị nile (gụnyere gị, Zakaraịas) nụrụ aro ya, ma gịnị bụ mkpebi ikpeazụ gị maka aha nwa ahụ?’
Ngwa ngwa nke ahụ mesịkwara ọrụ ebube ọzọ mere, na-agbanwegharị ọnọdụ ahụ. “Ngwa ngwa ọnụ ya wee saghee, ire ya tọpụkwa, o wee na-ekwu okwu.” (Luk 1:64) Ọ dịghị mkpa ikwu banyere ọnụnụ ihe ya ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe mere nke ahụ.