-
Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”Ụlọ Nche—2006 | Disemba 15
-
-
4 Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, nke ga-agakwurukwa ya n’etiti abalị ma sị ya, ‘Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ, n’ihi na otu enyi m ka si nnọọ na njem bịa na nke m, enweghịkwa m ihe m ga-eche ya n’ihu’? Onye ahụ esikwa n’ime ụlọ kwuo ná nzaghachi, sị, ‘Kwụsị inye m nsogbu. A kpọchielarị m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinawokwa n’ihe ndina; apụghị m ibili nye gị ihe ọ bụla.’ Asị m unu, Ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla n’ihi na ọ bụ enyi ya, n’ezie n’ihi ịnọgidesi ike ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ndị ọ chọrọ.” Jizọs kọwaziri otú ihe atụ a si metụta ekpere, sị: “N’ihi ya asị m unu, Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. N’ihi na onye ọ bụla na-arịọ na-anata, onye ọ bụla na-achọkwa na-achọta, a ga-emeghekwara onye ọ bụla nke na-akụ.”—Luk 11:5-10.
-
-
Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”Ụlọ Nche—2006 | Disemba 15
-
-
6. Olee otú e si were omenala nke ile ọbịa n’oge Jizọs?
6 Ihe Jizọs gosiri anyị abụghị nanị otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere—ịdị na-anọgidesi ike—kama, o gosikwara anyị ihe mere anyị kwesịrị iji na-eme otú ahụ. Iji ghọta ihe ihe atụ ahụ na-akụziri anyị nke ọma, anyị kwesịrị ịtụle otú ndị gere ntị n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa bụ́ onye nọgidesiri ike n’arịrịọ ya si were omenala nke ile ọbịa. Ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na n’oge Bible, ilekọta ndị ọbịa anya nke ọma bụ omenala ndị mmadụ ji kpọrọ ihe, karịsịa ndị ohu Chineke. (Jenesis 18:2-5; Ndị Hibru 13:2) Ịghara ile ọbịa bụ ihe ihere. (Luk 7:36-38, 44-46) Ka anyị buru nke ahụ n’uche tụleghachi akụkọ ahụ Jizọs kọrọ.
7. N’ihi gịnị ka nwoke ahụ nwere onye ọbịa n’ihe atụ Jizọs ji ghara ime ihere ịkpọte enyi ya?
7 Nwoke ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe atụ ahụ nwere onye ọbịa n’etiti abalị. Nwoke ahụ lere ya anya na ya kwesịrị inye onye ọbịa ya nri, ma, o nweghị ‘ihe ọ ga-eche ya n’ihu.’ O lere nke ahụ anya dị ka ihe dị oké mkpa! Ọ ghaghị inwetara ya achịcha, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya. N’ihi ya, ọ gara na nke enyi ya ma kpọtee ya n’emeghị ihere. Ọ kpọrọ enyi ya ma sị ya: “Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ.” Ọ nọgidere na-arịọ ya ruo mgbe o nwetara ihe ọ chọrọ. Ọ bụ nanị mgbe o nwetara achịcha ahụ ka o nwere ike ịza onye na-ele ọbịa.
Ka Ọ Dịruru Gị ná Mkpa—Otú ahụ Ka Ị Ga Na-arịọ Maka Ya
8. Gịnị ga-akpali anyị ikpe ekpere n’esepụghị aka maka mmụọ nsọ?
8 Gịnị ka ihe atụ a na-egosi banyere ihe mere anyị ji ekpe ekpere n’esepụghị aka? Nwoke ahụ nọgidere na-arịọ maka achịcha n’ihi na o lere ya anya na inweta achịcha ndị ahụ dị nnọọ mkpa iji rụọ ọrụ ya dị ka onye na-ele ọbịa. (Aịsaịa 58:5-7) Ma ó nweghị achịcha, ọ gaghị abụ onye na-ele ọbịa. N’iji ya tụnyere anyị, n’ihi na anyị ghọtara na inweta mmụọ nsọ Chineke dị anyị nnọọ mkpa iji jee ozi anyị dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị na-anọgide na-ekpegara Chineke ekpere, na-arịọ ya maka mmụọ nsọ ya. (Zekaraịa 4:6) Ma anyị enweghị ya, anyị agaghị abụ ezi Ndị Kraịst. (Matiu 26:41) Ị̀ hụrụ ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ a? Ọ bụrụ na anyị ewere mmụọ nsọ Chineke dị ka ihe dị anyị nnọọ mkpa, o yiri ka ànyị ga-anọgidesi ike na-arịọ maka ya.
9, 10. (a) Nye ihe atụ na-egosi mkpa ọ dị anyị ịnọgide na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya. (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?
9 Ka anyị jiri ihe nwere ike ime n’oge a kọwaa ihe anyị na-amụta n’ihe atụ a, ka e were ya na otu onye ezinụlọ gị malitere ịrịa ọrịa n’etiti abalị. Ị̀ ga-akpọte dọkịta iji rịọ ya maka enyemaka? Ị gaghị akpọte ya ma ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ na-arịa obere ọrịa. Ma, ọ bụrụ na obi kuchiri ya, ị gaghị eme ihere ịkpọ dọkịta. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ. Ị maara na enyemaka onye ọkachamara dị ya nnọọ mkpa. Achọghị enyemaka nke onye ọkachamara nwere ike ime ka onye ahụ nwụọ. N’otu aka ahụ, a pụrụ ikwu na ezi Ndị Kraịst na-anọ n’ọnụ ọnwụ mgbe nile. A sị ka e kwuwe, Setan na-ejegharị dị ka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” na-achọ iripịa anyị. (1 Pita 5:8) Ka anyị wee nọgide ná mmekọrịta anyị na Chineke, enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke dị anyị ezigbo mkpa. Arịọghị Chineke maka enyemaka nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ. N’ihi ya, anyị ga-anọgide na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya. (Ndị Efesọs 3:14-16) Ọ bụ nanị ime otú ahụ ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ume dị anyị mkpa iji ‘tachie obi ruo ọgwụgwụ.’—Matiu 10:22; 24:13.
-