-
Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”Ụlọ Nche—2006 | Disemba 15
-
-
5. Gịnị ka ihe atụ banyere nwoke ahụ nọgidere na-arịọ enyi ya ihe na-akụziri anyị banyere ihe anyị ga-eme mgbe anyị na-ekpe ekpere?
5 Ihe atụ a doro anya nke nwoke ahụ nọgidere na-arịọ enyi ya ihe na-egosi ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-ekpe ekpere. Rịba ama na Jizọs kwuru na nwoke ahụ nwetara ihe ọ chọrọ “n’ihi ịnọgidesi ike ya.” (Luk 11:8) Okwu Bekee a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ịnọgidesi ike” pụtara nanị otu ugboro na Bible. E si n’okwu Grik pụtara n’ụzọ nkịtị “emeghị ihere” sụgharịa ya. Ọtụtụ mgbe, emeghị ihere na-abụ àgwà ọjọọ. Otú ọ dị, mgbe mmadụ na-emeghị ihere ma ọ bụ mgbe ọ nọgidesiri ike n’ezi ihe, o nwere ike ịbụ ezi àgwà. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ebe ihe atụ banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa dị. O meghị ihere ọ bụla n’ịnọgide na-arịọ enyi ya ka o nye ya ihe ọ chọrọ. Ebe ọ bụ na Jizọs ji nwoke a nwere onye ọbịa meere anyị ihe atụ, anyị kwesịkwara ịnọgidesi ike n’ekpere. Jehova chọrọ ka anyị ‘nọgide na-arịọ, nọgide na-achọ, nọgide na-akụ.’ Ná nzaghachi, ọ ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’
-
-
Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”Ụlọ Nche—2006 | Disemba 15
-
-
9, 10. (a) Nye ihe atụ na-egosi mkpa ọ dị anyị ịnọgide na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya. (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?
9 Ka anyị jiri ihe nwere ike ime n’oge a kọwaa ihe anyị na-amụta n’ihe atụ a, ka e were ya na otu onye ezinụlọ gị malitere ịrịa ọrịa n’etiti abalị. Ị̀ ga-akpọte dọkịta iji rịọ ya maka enyemaka? Ị gaghị akpọte ya ma ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ na-arịa obere ọrịa. Ma, ọ bụrụ na obi kuchiri ya, ị gaghị eme ihere ịkpọ dọkịta. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ. Ị maara na enyemaka onye ọkachamara dị ya nnọọ mkpa. Achọghị enyemaka nke onye ọkachamara nwere ike ime ka onye ahụ nwụọ. N’otu aka ahụ, a pụrụ ikwu na ezi Ndị Kraịst na-anọ n’ọnụ ọnwụ mgbe nile. A sị ka e kwuwe, Setan na-ejegharị dị ka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” na-achọ iripịa anyị. (1 Pita 5:8) Ka anyị wee nọgide ná mmekọrịta anyị na Chineke, enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke dị anyị ezigbo mkpa. Arịọghị Chineke maka enyemaka nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ. N’ihi ya, anyị ga-anọgide na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya. (Ndị Efesọs 3:14-16) Ọ bụ nanị ime otú ahụ ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ume dị anyị mkpa iji ‘tachie obi ruo ọgwụgwụ.’—Matiu 10:22; 24:13.
-