Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 11 p. 108-117
  • “Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Ziri Ihe n’Ụzọ Dị Mfe Nghọta
  • Ọ Jụrụ Ajụjụ Ndị Kwesịrị Ekwesị
  • Ọ Rụrụ Ụka Bụ́ Ịgbà
  • “Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ṅomie Onye Ozizi Ahụ Bụ́ Ọkà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jiri Nghọta Na Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-ezi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 11 p. 108-117

ISI NKE IRI NA OTU

“Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”

1, 2. (a) Gịnị mere ndị ọrụ nche ahụ e zipụrụ ka ha gaa jide Jizọs ji gbara aka lọta? (b) Gịnị mere Jizọs ji bụrụ onye ozizi pụrụ iche?

IWE juru ndị Farisii obi. Jizọs nọ n’ụlọ nsọ, na-akụzi banyere Nna ya. Ndị na-ege okwu ya kewara abụọ; ọtụtụ n’ime ha nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ, ma ndị ọzọ chọrọ ka e jide ya. Mgbe ọ na-ekwekwaghị ndị ndú okpukpe ahụ odidi, ha zipụrụ ndị ọrụ nche ka ha gaa jide Jizọs. Otú ọ dị, ndị ọrụ nche ahụ gba aka lọta. Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụrụ ha, sị: “Gịnị mere unu akpọtaghị ya?” Ndị ọrụ nche ahụ zara, sị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” Otú Jizọs si zie ihe tọrọ ha ụtọ nke na ha ahụghị ihe mere ha ga-eji jide ya.a—Jọn 7:45, 46.

2 Ọ bụghị naanị ndị ọrụ nche ahụ ka otú Jizọs si zie ihe tọrọ ụtọ. Ndị mmadụ zukọtara n’ìgwè ka ha gere ihe ọ na-akụzi. (Mak 3:7, 9; 4:1; Luk 5:1-3) Gịnị mere Jizọs ji bụrụ onye ozizi pụrụ iche otú ahụ? Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Asatọ, ọ hụrụ eziokwu ndị ahụ ọ kụziri n’anya, hụkwa ndị ọ kụziiri ihe n’anya. Ọ bụkwa aka ochie n’otú o si zie ihe. Ka anyị tụlee ụzọ atọ dị irè o si zie ihe, na otú anyị pụrụ isi ṅomie ụzọ ndị ahụ.

O Ziri Ihe n’Ụzọ Dị Mfe Nghọta

3, 4. (a) Gịnị mere Jizọs ji kwuo okwu dị mfe nghọta mgbe ọ na-ezi ihe? (b) Olee otú Ozizi Elu Ugwu ahụ si gosi na ihe Jizọs ziri dị mfe nghọta?

3 Cheedị echiche banyere ọtụtụ okwu Jizọs maara, ndị ọ pụrụ iji kụzie ihe! Ma, mgbe ọ na-ezi ihe, ọ naghị ekwu okwu na-agaghị ekwe ndị na-ege okwu ya nghọta. Ọtụtụ n’ime ndị na-ege okwu ya bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Ọ ghọtara ebe ha maruru ihe. Ọ dịghị mgbe ọ kụziiri ha ihe niile otu mgbe. (Jọn 16:12) Okwu ya dị mfe nghọta. Ma, eziokwu ndị o ji ya kụzie dị oké mkpa.

4 Dị ka ihe atụ, tụlee Ozizi Elu Ugwu ahụ e dere na Matiu 5:3-7:27. Ndụmọdụ Jizọs nyere n’ozizi a na-akpali ndị mmadụ iche echiche. Ọ na-ekwu kpọmkwem ihe bụ́ eziokwu dị n’ihe a na-ekwu. Ọ dịghị ihe o kwuru nke dị mgbagwoju anya. N’ezie, o siri ike ịhụ otu okwu nke nwatakịrị na-apụghị ịghọta ozugbo! Ka a sịkwa ihe mere na mgbe Jizọs kwuchara okwu ahụ, “otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.” Ma eleghị anya, ọtụtụ ndị ọrụ ubi, ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị na-akụ azụ̀ so n’ìgwè mmadụ ahụ.—Matiu 7:28.

5. Nye ihe atụ ndị na-egosi okwu Jizọs kwuru ndị dị mfe nghọta ma baa uru nke ukwuu.

5 Okwu Jizọs kwuru mgbe ọ na-ezi ihe na-adịkarị mfe nghọta, dịkwa mkpirikpi. Ma, ihe ọ na-ekwu bara uru nke ukwuu. N’oge dị anya nke ukwuu tupu a malite ibipụta akwụkwọ, o si otú ahụ kụnye ozi ya n’uche ndị na-ege okwu ya nakwa n’obi ha, nke na ha apụghị ichefu ya. Tụlee ihe atụ ụfọdụ: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.” “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.” “Mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”b (Matiu 7:1; 9:12; 26:41; Mak 12:17; Ọrụ 20:35) Ugbu a ọ fọrọ ntakịrị ka o ruo puku afọ abụọ kemgbe e kwuru okwu ndị a, a ka na-echeta ha nke ọma.

6, 7. (a) Ọ bụrụ na anyị ga-ezi ihe dị mfe nghọta, gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-ekwu okwu dị mfe nghọta? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịkụziri onye anyị na-amụrụ Baịbụl ihe niile otu mgbe?

6 Olee otú anyị pụrụ isi na-ezi ihe dị mfe nghọta? Otu n’ime ihe dị mkpa anyị ga-eme bụ ikwu okwu dị mfe nghọta nke ọtụtụ mmadụ pụrụ ịghọta ngwa ngwa. Eziokwu ndị bụ́ isi n’Okwu Chineke adịghị mgbagwoju anya. Jehova ekpugheworo ndị nwere obi eziokwu, bụ́ ndị dị obi umeala, nzube ya. (1 Ndị Kọrịnt 1:26-28) Okwu ndị dị mfe nghọta, ndị e leziri anya họrọ, pụrụ ịkọwa eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke n’ụzọ dị irè.

Ihe Osise dị na peeji nke 110

Mgbe ị na-ezi ihe, mee ka ọ dị mfe nghọta

7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ izi ihe n’ụzọ dị mfe nghọta, anyị ga-elezi anya zere ịkụziri onye anyị na-amụrụ Baịbụl ihe niile otu mgbe. N’ihi ya, mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Baịbụl, anyị ekwesịghị ịkọwacha ihe niile; anyị ekwesịghịkwa ịmụ ya ọkụ ọkụ dị ka à ga-asị na ihe kasị mkpa bụ ịmụcha ebe anyị bu n’obi ịmụcha. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikwe ka ihe ga-ekpebi ebe a ga-amụru bụrụ ihe dị onye a na-amụrụ Baịbụl mkpa, na otú ike ya hà. Ihe anyị chọrọ ime bụ inyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst, na onye na-efe Jehova. Iji mee nke a, anyị kwesịrị iwepụta oge ọ bụla ga-ezu ime ka onye anyị na-amụrụ ihe ghọta ihe ọ na-amụ nke ọma. Ọ bụ naanị mgbe anyị mere nke a ka eziokwu Baịbụl ga-eru ya n’obi, kpaliekwa ya ime ihe ọ mụtara.—Ndị Rom 12:2.

Ọ Jụrụ Ajụjụ Ndị Kwesịrị Ekwesị

8, 9. (a) Gịnị mere Jizọs ji jụọ ajụjụ? (b) Olee otú Jizọs si jiri ajụjụ nyere Pita aka iji aka ya ghọta ihe o kwesịrị ịza n’ihe banyere ịtụ ụtụ isi a na-atụ maka ụlọ nsọ?

8 Jizọs ji ajụjụ kụzie ihe n’ụzọ pụrụ iche, ọbụna mgbe ọ na-agaghị egbu ya oge ịgwa onye na-ege okwu ya ihe ọ chọrọ ịgwa ya. Gịnịzi mere ọ na-eji ajụ ajụjụ? Mgbe ụfọdụ, o ji ajụjụ ndị na-eru n’obi mee ka a mata ihe ndị na-emegide ya bu n’obi, si otú ahụ mechie ha ọnụ. (Matiu 21:23-27; 22:41-46) Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, o ji ajụjụ mee ka ndị na-eso ụzọ ya kwuo ihe ha bu n’obi, kpalie ha iche echiche, zụọkwa ha ime otú ahụ. Ya mere, ọ jụrụ ajụjụ ndị dị ka, “Gịnị ka unu chere?” na “Ì kwere nke a?” (Matiu 18:12; Jọn 11:26) Jizọs ji ajụjụ ndị ahụ ruo n’obi ndị na-eso ụzọ ya, meekwa ka okwu ya metụ ha n’obi. Tụlee otu ihe atụ.

9 N’otu oge, ndị ọnaụtụ jụrụ Pita ma Jizọs ọ̀ na-atụ ụtụ isi a na-atụ maka ụlọ nsọ.c Pita zara ozugbo, sị, “Ee.” Mgbe e mesịrị, Jizọs mere ka ọ tụgharịa uche site n’ịsị ya: “Saịmọn, gịnị ka i chere? Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? Ọ̀ bụ n’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” Pita zara, sị: “Ọ bụ n’aka ndị bịara abịa. Jizọs wee sị ya: “Ya mere, n’ezie, ụmụ ha anaghị atụ ụtụ.” (Matiu 17:24-27) O doro anya na Pita ghọtara ihe mere Jizọs ji jụọ ajụjụ ndị ahụ, n’ihi na ndị mmadụ maara na ndị ezinụlọ eze anaghị atụ ụtụ isi. Ya mere, ebe Jizọs bụ Ọkpara nke Eze eluigwe ahụ a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ mụrụ naanị ya, ọ bụghị iwu na ọ ga-atụ ụtụ isi. Rịba ama na kama naanị ịgwa Pita ihe o kwesịrị ịza, Jizọs ji akọ jụọ Pita ajụjụ ndị ga-enyere ya aka iji aka ya ghọta ihe o kwesịrị ịza, ma eleghị anya, ghọta na o kwesịrị iche echiche nke ọma tupu ya azaa ajụjụ ọ bụla n’ọdịnihu.

Ihe Osise dị na peeji nke 112

Jụọ ajụjụ ndị ga-adaba n’ihe na-amasị onye nwe ụlọ

10. Olee otú anyị pụrụ isi jụọ ajụjụ n’ụzọ dị irè mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

10 Olee otú anyị pụrụ isi jụọ ajụjụ n’ụzọ dị irè mgbe anyị nọ n’ozi? Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị pụrụ iji ajụjụ kpalie mmasị ndị mmadụ, nke ga-eme ka anyị nwee ike izi ha ozi ọma, ma eleghị anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ahụ onye katara ahụ́, anyị pụrụ iji nkwanye ùgwù jụọ ya, sị, “Olee ihe ndị gbanwerela n’ụwa kemgbe ndụ gị?” Mgbe anyị nyesịrị ya ohere ka ọ zaa, anyị nwere ike ịjụ ya, sị, “Gịnị ka i chere ga-eme ka ụwa a bụrụ ebe ka mma obibi?” (Matiu 6:9, 10) Ọ bụrụ na anyị ahụ nwaanyị nke ụmụ ya ka dị obere, anyị pụrụ ịjụ ya, sị, “Ì chetụla echiche otú ụwa a ga-adị mgbe ụmụ gị ga-eto?” (Abụ Ọma 37:10, 11) Site n’ileru anya ala mgbe anyị bịarutere n’ụlọ ndị mmadụ, anyị pụrụ ịhọrọ ajụjụ ga-adaba n’ihe na-amasị onye nwe ụlọ.

11. Olee otú anyị pụrụ isi jụọ ajụjụ n’ụzọ dị irè mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Baịbụl?

11 Olee otú anyị pụrụ isi jụọ ajụjụ n’ụzọ dị irè mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Baịbụl? Ajụjụ ndị e leziri anya họrọ pụrụ inyere anyị aka ịchọpụta ihe dị n’obi onye anyị na-amụrụ ihe. (Ilu 20:5) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na anyị na-amụ isiokwu bụ́ “Ibi Ndụ n’Ụzọ Na-amasị Chineke” n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? d Isiokwu ahụ tụlere otú Chineke si ele ihe ndị dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, ịṅụbiga mmanya ókè, na ịgha ụgha, anya. Ihe onye a na-amụrụ ihe zara pụrụ igosi na ọ ghọtara ihe Baịbụl na-akụzi, ma ò kwetara ihe ahụ ọ na-amụ? Anyị pụrụ ịjụ ya, sị, “Ì chere na ezi uche dị n’otú Chineke si ele ihe ndị a anya?” Anyị pụkwara ịjụ ya, sị, “Olee otú ị pụrụ isi jiri ihe a ị mụtara na-ebi ndụ?” Ma, cheta na i kwesịrị iji akọ jụọ ya ajụjụ ndị a, wee kwanyere onye ahụ a na-amụrụ ihe ùgwù. Anyị ekwesịghị ịjụ ya ajụjụ ndị ga-emenye ya ihere.—Ilu 12:18.

Ọ Rụrụ Ụka Bụ́ Ịgbà

12-14. (a) Olee ụzọ ụfọdụ Jizọs si jiri nkà o nwere rụọ ụka bụ́ ịgbà? (b) Olee otú Jizọs si rụọ ụka bụ́ ịgbà mgbe ndị Farisii sịrị na ọ bụ Setan nyere ya ike?

12 Ebe ọ bụ na uche Jizọs zuru okè, ọ bụ aka ochie n’ime ka ndị ọzọ tụgharịa uche. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji arụmụka bụ́ ịgbà akụghasị ebubo ụgha ndị na-emegide ya boro ya. Ọtụtụ mgbe, o ji arụmụka nke na-eru n’obi kụziere ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe bara uru. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

13 Mgbe Jizọs gwọsịrị otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, bụ́ onye kpuru ìsì ma daa ogbi, ndị Farisii boro ya ebubo, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị ike Bielzebọb [ya bụ, Setan], onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” Ha kwetara na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ chọrọ ike karịrị ike mmadụ. Otú ọ dị, ha sịrị na ọ bụ Setan nyere Jizọs ike ahụ. Ọ bụghị naanị na ebubo ahụ bụ ebubo ụgha, kamakwa, ezi uche adịghị na ya. Jizọs mere ka a mata na echiche ha ezighị ezi mgbe ọ zara ha, sị: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya na-atọgbọrọ n’efu, obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị eguzo. N’otu ụzọ ahụ, ọ bụrụ na Setan achụpụ Setan, o kewawo wee na-emegide onwe ya; oleezi otú alaeze ya ga-esi guzo?” (Matiu 12:22-26) Ihe Jizọs na-ekwu n’ezie bụ: “Ọ bụrụ na m bụ onye ozi Setan, na-emebisị ọrụ Setan rụrụ, ihe ọ pụtara bụ na Setan na-agba onwe ya mgba okpuru, ọ ga-adakwa n’oge na-adịghị anya.” Olee otú ha pụrụ isi kụghasịa arụmụka dị otú ahụ nke doro anya?

14 Ihe Jizọs chọrọ ịgwa ha agwụbeghị. Ebe ọ maara na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ jụrụ ha ajụjụ dị mfe nghọta, nke dị mkpa, sị: “Ọ bụrụkwa na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu [ma ọ bụ, ndị na-eso ụzọ unu] ji na-achụpụ ha?” (Matiu 12:27) Isi ihe Jizọs rụrụ ụka ya bụ: “Ọ bụrụ na ọ bụ ike Setan ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ ghaghị ịbụ na ọ bụ otu ike ahụ ka ndị na-eso ụzọ unu ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.” Gịnị ka ndị Farisii pụrụ ikwu? Ọ dịghị mgbe ha ga-ekweta na ọ bụ Setan nyere ndị na-eso ụzọ ha ike ha ji na-arụ ọrụ. Jizọs si otú ahụ jiri echiche na-ezighị ezi ha nwere mee ka ha kweta ihe na-adịtụdịghị ha mma. Ọ́ bụghị ihe na-atọ ụtọ ịgụ banyere otú Jizọs si mee ka ha tụgharịa uche? Ma, cheedị banyere ìgwè mmadụ ahụ ndị ji ntị ha gee okwu Jizọs, n’ihi na o doro anya na ọnụnọ ọ nọ ebe ahụ na otú olu ya na-ada mere ka okwu ya kpaa ike dị ukwuu.

15-17. Nye ihe atụ nke na-egosi otú Jizọs si jiri ụdị arụmụka bụ́ ‘lee ka ọ ga-esi mee ya karị’ kụzie eziokwu ndị na-enye obi ụtọ banyere Nna ya.

15 Jizọs jikwa arụmụka bụ́ ịgbà, nke na-eru n’obi, kụzie eziokwu ndị na-agba ume, ndị na-enyekwa obi ụtọ, banyere Nna ya. O mere otú ahụ mgbe mgbe site n’iji ụdị arụmụka a pụrụ ịkpọ ‘lee ka ọ ga-esi mee ya karị’ kụzie ihe. O nyeere ndị na-ege okwu ya aka isi n’otu eziokwu ha maara wee kwenyesie ike n’ihe ọzọ. N’ụdị arụmụka a, a na-eji otu ihe atụnyere ihe ọzọ dị iche. Ọ pụkwara iru ndị mmadụ n’obi. Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ.

16 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ ya ka ọ kụziere ha otú e si ekpe ekpere, ọ kọwara otú ndị mụrụ ụmụ, bụ́ ndị mmadụ na-ezughị okè, si adị njikere ‘inye ụmụ ha ezi onyinye.’ O wee kwuo, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:1-13) N’ihe Jizọs kwuru, o ji otu ihe tụnyere ihe ọzọ dị iche. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ bụ́ ndị mụrụ ụmụ na-egbo mkpa ụmụ ha, lee ka Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye zuru okè na onye ezi omume n’ụzọ niile, ga-esi nye ndị nọgidesiri ike na-efe ya mmụọ nsọ karị, ya bụ, ndị na-eji obi umeala abịakwute ya n’ekpere!

17 Jizọs ji ụdị arụmụka ahụ nye ndụmọdụ amamihe dị na ya banyere otú e si akwụsị nchegbu. Ọ sịrị: “Ugoloọma adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe, ma Chineke na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ? Rịbanụ ama nke ọma otú okooko lili si eto, ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa atụ ogho . . . Ọ bụrụkwa na Chineke si otú a na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, nke na-adị taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, lee ka ọ ga-esi yiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta!” (Luk 12:24, 27, 28) Ọ bụrụ na Jehova na-elekọta nnụnụ na okooko osisi, lee ka ọ ga-esi na-elekọta ụmụ mmadụ karị, ya bụ, ndị hụrụ ya n’anya, na-efekwa ya ofufe! O doro anya na Jizọs ji arụmụka dị otú ahụ ruo n’obi ndị na-ege okwu ya.

18, 19. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka onye sịrị na ya ekweghị na Chineke, bụ́ onye ọ na-apụghị ịhụ anya, tụgharịa uche?

18 Mgbe anyị nọ n’ozi, anyị kwesịrị iji arụmụka doro anya na-akụghasị ozizi ụgha. Anyị kwesịkwara iji arụmụka nke na-eru n’obi na-akụzi eziokwu ndị na-agba ume banyere Jehova. (Ọrụ 19:8; 28:23, 24) Ọ̀ bụ iwu na anyị ga-amụta otú e si arụ ụka dị mgbagwoju anya? Ọ dịghị ma ọlị. Ihe anyị na-amụta n’aka Jizọs bụ na arụmụka bụ́ ịgbà, nke a rụrụ n’ụzọ dị mfe nghọta, na-akasị adị irè.

19 Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-agwa onye sịrị na ya ekweghị na Chineke, bụ́ onye ọ na-apụghị ịhụ anya? Anyị pụrụ ime ka onye ahụ chee echiche banyere ihe na-eme eme, ya bụ, na ihe ọ bụla a rụrụ nwere onye rụrụ ya. Ọ bụrụ na anyị ahụ ihe a rụrụ, anyị na-aghọta na ọ ghaghị ịbụ na e nwere onye rụrụ ya. Anyị pụrụ ịsị onye ahụ: “Ọ bụrụ na ị banyere n’ime ọhịa, hụ ụlọ a rụrụ nke ọma, tinyejuo ya nri, ọ̀ bụ na ị gaghị ekweta na ọ dị onye rụrụ ya? Ya mere, ọ bụrụ na anyị ahụ otú e si hazie ihe e kere eke, hụkwa nri e tinyejuru n’ụwa, ọ̀ bụ na amamihe adịghị n’ikweta na ọ dị Onye rụrụ ihe a niile? Otú Baịbụl si lee ya anya bụ: ‘Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.’” (Ndị Hibru 3:4) N’ezie, n’agbanyeghị otú ụka anyị rụrụ si doo anya, ọ bụghị mmadụ niile ga-ekweta.—2 Ndị Tesalonaịka 3:2.

Ihe Osise dị na peeji nke 116

Rụọ ụka nke ga-eru onye ị na-agwa okwu n’obi

20, 21. (a) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ụdị arụmụka bụ́ ‘lee ka ọ ga-esi mee ya karị’ mee ka a mata àgwà Jehova na ụzọ ya? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Abụọ?

20 Mgbe anyị na-ezi ihe, ma ọ̀ bụ n’ozi ubi ma ọ bụ n’ọgbakọ, anyị pụrụ iji ụdị arụmụka a mee ka a mata àgwà Jehova na ụzọ ya. Dị ka ihe atụ, iji gosi na ozizi ịta ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ na-akparị Jehova, anyị pụrụ ịsị: “Ọ̀ dị nna nwere ịhụnanya nke ga-enye nwa ya ntaramahụhụ site n’itinye aka nwa ya n’ọkụ? Lee ka ozizi ọkụ ala mmụọ na-aghaghị isi bụrụ ihe arụ karị n’ebe Nna anyị nke eluigwe, nke nwere ịhụnanya, nọ!” (Jeremaya 7:31) Anyị pụrụ ime ka obi sie onye kwere ekwe ibe anyị nke dara mbà n’obi ike na Jehova hụrụ ya n’anya site n’ịsị ya: “Ọ bụrụ na Jehova weere ntakịrị nza dị ka ihe bara uru, lee ka ọ na-aghaghị isi bụrụ na ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime ndị na-efe ya ofufe n’ụwa n’anya, ma gị onwe gị!” (Matiu 10:29-31) Arụmụka dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka iru ndị ọzọ n’obi.

21 Ugbu a anyị tụlesịrị naanị ụzọ atọ n’ime ụzọ dị iche iche Jizọs si kụzie ihe, ọ pụrụ ịdịrị anyị mfe ịhụ na ndị ọrụ nche ahụ na-ejideghị Jizọs ekwubigaghị okwu ókè mgbe ha sịrị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” N’Isi nke Iri na Abụọ, anyị ga-atụle ụzọ ọzọ Jizọs si zie ihe, nke bụ́ ụzọ a kasị mara amara ma eleghị anya, ya bụ, iji ihe atụ ezi ihe.

a O yiri ka ndị ọrụ nche ahụ na-arụrụ ụlọikpe Sanhedrin ọrụ, nọrọkwa n’okpuru ndị isi nchụàjà.

b Nke ikpeazụ a dị n’Ọrụ 20:35. Ọ bụ naanị Pọl onyeozi kwuru ihe a Jizọs kwuru. Ọ pụrụ ịbụ na ọ nụrụ ya n’okwu ọnụ (ma ọ́ bụghị n’ọnụ onye nụrụ mgbe Jizọs kwuru ya, ya abụrụ n’ọnụ Jizọs mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ) ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na ọ bụ Chineke kpugheere ya okwu ahụ.

c E nyere ndị Juu iwu ịtụ ụtụ isi a na-atụ maka ụlọ nsọ kwa afọ, ya bụ, mkpụrụ ego drakma abụọ, bụ́ ego ole a na-akwụ mmadụ n’ihe dị ka ọrụ abalị abụọ. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Ihe bụ́ isi e ji ụtụ isi a eme bụ ịkwụ ụgwọ ihe niile e mefuru n’àjà nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, tinyere àjà ndị ọzọ niile a na-achụ n’ihi ndị mmadụ.”

d Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee otú okwu Jizọs pụrụ isi nyere gị aka ịhọrọ ụdị okwu ị ga na-ekwu mgbe ị na-eme ihe omume n’ọgbakọ?—Matiu 11:25.

  • Olee ụzọ dị iche iche ndị ọkà okwu na-ekwu okwu n’ihu ọha pụrụ isi ṅomie ụdị ajụjụ a Jizọs ji zie ihe?—Matiu 11:7-9.

  • Olee otú ị pụrụ isi jiri nkà okwu bụ́ ikwu ihe karịa otú ọ dị kụzie ihe?—Matiu 7:3; 19:24.

  • Dị ka Jizọs, olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe nlereanya kụziere ndị ọzọ ihe?—Jọn 13:5, 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya