Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/1 p. 20-23
  • Mgbe Mmesapụ Aka Bara Uba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Mmesapụ Aka Bara Uba
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbịakwute Onye Na-enye Amamihe
  • Inye Onye Kasị Enye Ihe, Ihe
  • Olee Mkpa Ndị E nwere Ugbu A?
  • “Ngọzi Jehova, nke ahụ Na-eme Mmadụ Ọgaranya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Imesapụ Aka N’ụba Na-eweta Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Iji Obi Ụtọ Na-enye Onyinye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Zụlite Mmụọ Inye Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/1 p. 20-23

Mgbe Mmesapụ Aka Bara Uba

Ọ BỤRỤ na i nwere ohere nke inye eze onyinye, gịnị ka ị ga-enye ya? Gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụ onye kasị baa ọgaranya na onye kasị nwee amamihe n’ụwa? Ị̀ pụrụ icheta onyinye ọ bụla nke pụrụ ịmasị ya? Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, eze nwanyị Sheba aghaghị ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị ahụ ka ọ na-akwadebe ileta kpọmkwem onye ọchịchị dị otú ahụ—Eze Solomọn nke Israel.

Bible na-agwa anyị na onyinye ya gụnyere ọlaedo dị talent 120 “na ụda dị iche iche bara ụba nke ukwuu, na nkume dị oké ọnụ ahịa.” N’ọnụ ahịa nke oge a, ọnụ ahịa ọlaedo ahụ nanị ruru ihe dị ka $40,000,000. E debere ụda, bụ́ mmanụ na-esi isi ụtọ nke e jikwa agwọ ọrịa na ọlaedo n’otu ọkwá dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụ ezie na Bible ekwughị otú mmanụ eze nwanyị ahụ nyere Solomọn hà, ọ gwara anyị na onyinye ya enweghị atụ.—1 Ndị Eze 10:10.

N’ụzọ doro anya, eze nwanyị Sheba bụ nwanyị bara ọgaranya ma na-emesapụ aka. Ọzọkwa, e mesapụkwaara ya aka. “Eze bụ́ Solomọn,” ka Bible na-ekwu, “nyekwara eze nwanyị Sheba ihe nile na-atọ ya ụtọ, ihe ọ bụla ọ rịọrọ, n’agụghị ihe o buteere eze.” (2 Ihe E Mere 9:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ezie, ọ pụrụ ịbụwo omenala bụ́ ndị ọchịchị inyerịta onwe ha onyinye; ma, Bible kpọtụrụ “[mmesapụ] aka” Solomọn aha kpọmkwem. (1 Ndị Eze 10:13) Solomọn n’onwe ya dere, sị: “Mkpụrụ obi nke na-agọzi agọzi ka a ga-eme ka ọ maa abụba: ọzọ, onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”—Ilu 11:25.

N’ezie, eze nwanyị Sheba chụkwara ọtụtụ ihe n’àjà n’ihe banyere oge na mgbalị iji leta Solomọn. O yiri ka Sheba ọ dị n’ógbè Republic of Yemen nke oge a; ya mere eze nwanyị ahụ na usuu kamel ya mere njem karịrị nnọọ kilomita 1,600 gaa Jerusalem. Dị ka Jisọs si kwuo, “o siri n’ebe ụwa sọtụrụ bịa.” N’ihi gịnị ka eze nwanyị Sheba ji mee mgbalị siri ike otú ahụ? Isi ihe mere o ji bịa bụ “ịnụ amamihe Solomọn.”—Luk 11:31.

Ndị Eze nke Mbụ 10:1, 2 na-ekwu na eze nwanyị Sheba “[bịara] iwere ilu dị iche iche nwaa [Solomọn]. . . . [O wee] gwa ya okwu nile nke dị ya n’obi.” Olee otú Solomọn si meghachi omume? “Solomọn wee gosi ya okwu ya nile: ọ dịghị okwu ọ bụla e zonahụrụ eze nke ọ na-egosighị ya.”—1 Ndị Eze 10:3.

N’ịbụ onye ihe ọ nụrụ ma hụ tụrụ n’anya, eze nwanyị ahụ ji obi umeala zaghachi, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ohu gị ndị a bụ, ndị na-eguzo n’ihu gị mgbe nile, ndị na-anụ amamihe gị.” (1 Ndị Eze 10:4-8) Ọ sịghị na ihe na-agara ndị ohu Solomọn nke ọma n’ihi na ha bụ ndị akụ̀ na ụba gbara gburugburu—ọ bụ ezie na ha bụ. Kama nke ahụ, ndị ohu Solomọn bụ ndị a gọziri agọzi n’ihi na ha pụrụ mgbe nile ige ntị n’amamihe Chineke nyere Solomọn. Lee ezi ihe nlereanya eze nwanyị Sheba bụụrụ ndị Jehova taa, bụ́ ndị na-erite uru n’amamihe nke Onye Okike n’onwe ya nakwa nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst!

Ihe ọzọ kwesịkwara ịrịba ama bụ okwu ọzọ eze nwanyị ahụ gwara Solomọn: “Ka Jehova, bụ́ Chineke gị, bụrụ onye a gọziri agọzi.” (1 Ndị Eze 10:9) Ihe àmà na-egosi na ọ hụrụ na aka Jehova dị n’amamihe na ọganihu Solomọn. Nke a kwekọrọ n’ihe Jehova kwere ụmụ Israel ná nkwa tupu mgbe ahụ. ‘Idebe ụkpụrụ m dị iche iche,’ ka ọ sịrị, “bụ amamihe unu na nghọta unu n’anya ndị nile, ndị ga-anụ ụkpụrụ ndị a nile, wee sị, Otú ọ dị, ndị maara ihe na ndị nwere nghọta ka mba ukwu a bụ.”—Deuterọnọmi 4:5-7.

Ịbịakwute Onye Na-enye Amamihe

N’oge a, a dọtawokwa ọtụtụ nde mmadụ n’ebe nzukọ Jehova dị n’ihi na ha aghọtawo na “Israel nke Chineke” bụ “ndị maara ihe na ndị nwere nghọta,” ọ bụghị site n’ọmụmụ, kama n’ihi na iwu na ụkpụrụ zuru okè nke Chineke na-eduzi ha. (Ndị Galetia 6:16) Ọnụ ọgụgụ ndị a na-eme baptism na-egosi na kwa afọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ụfọdụ narị puku ndị ọhụrụ na-eso ụzọ agwala Israel ime mmụọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Lee ihe ijuanya ndị ọhụrụ a na-enwe mgbe ha hụrụ oké oriri nke nri ime mmụọ nke Jehova mewooro ndị ohu ya! Ha ahụtụbeghị ụdị ya n’okpukpe mbụ ha.—Aịsaịa 25:6.

Inye Onye Kasị Enye Ihe, Ihe

N’ịbụ ndị nataworo ihe dị ukwuu, ndị na-enwe ekele na-echekarị ihe ha onwe ha pụrụ inye Eze kasị ukwuu na Onye kasị enye ihe, bụ́ Jehova Chineke. Bible na-ekpughe na onyinye kasị mma anyị pụrụ inye Jehova bụ “àjà, bụ́ otuto.” (Ndị Hibru 13:15) N’ihi gịnị? N’ihi na àjà a metụtara nzọpụta ndụ kpọmkwem, bụ́ isi ihe Jehova nwere mmasị na ya na mgbe ọgwụgwụ a. (Ezikiel 18:23) Ọzọkwa, mmadụ inye ume na oge ya iji nyere ndị ọrịa, ndị dara mbà n’obi, na ndị ọzọ aka bụ àjà a na-anara nke ọma.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14; Ndị Hibru 13:16; Jemes 1:27.

Onyinye ego na-ekere òkè bụ́ isi. Ọ na-eme ka e nwee ike ibipụta Bible, akwụkwọ ndị dabeere na Bible, na inweta ebe ndị Kraịst pụrụ ịgbakọta. (Ndị Hibru 10:24, 25) Onyinye na-emekwa ka e nwee ihe enyemaka iji nyere ndị agha na ọdachi ndị na-emere onwe ha kpara aka ọjọọ aka.

Iji duzie anyị n’ihe metụtara inye ihe, Okwu Chineke na-enye ụkpụrụ ụfọdụ dị mma. Dị ka ihe atụ, ọ na-akụziri ndị Kraịst inye, ọ bụghị ihe ụfọdụ e kwuru otú ha ga-aha, kama ihe aka ha ruru inye, na-eji ọchịchọ obi ha na obi ụtọ eme otú ahụ. (2 Ndị Kọrint 9:7) Ụfọdụ pụrụ inye ihe dị ukwuu; ndị ọzọ pụrụ inye nanị ihe dị nta, dị ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke nọ ná mkpa n’oge Jisọs. (Luk 21:2-4) Ọ́ bụghị ihe dị ịrịba ama na Jehova—Onye Nwe eluigwe na ụwa dum—na-eji onyinye na àjà ọ bụla si n’ezi obi bụ́ nke e nyere ma ọ bụ chụọ n’aha ya akpọrọ ihe?—Ndị Hibru 6:10.

Ka ha wee nwee ike iji obi ụtọ na-enye, a na-akọrọ ndị Jehova mkpa dị iche iche e nwere na ụzọ ndị dị irè a pụrụ isi gboo mkpa ndị ahụ. N’aka nke ya, mmụọ nsọ Jehova na-akwali obi nke ndị nwere ọchịchọ, ime ihe. N’Israel oge ochie, a gbasoro ụkpụrụ a n’iwu ụlọikwuu nakwa, mgbe e mesịrị, ụlọ nsọ ahụ. (Ọpụpụ 25:2; 35:5, 21, 29; 36:5-7; 39:32; 1 Ihe E Mere 29:1-19) Na narị afọ mbụ O.A., otu ụkpụrụ ahụ nyeere ndị Kraịst aka inweta ihe ndị dị ha mkpa iji wegara ndị mba ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ na iji kwado ụmụnna nọ n’Israel n’oge ụnwụ nri.—1 Ndị Kọrint 16:2-4; 2 Ndị Kọrint 8:4, 15; Ndị Kọlọsi 1:23.

N’otu aka ahụ taa, Jehova agọziwo ndị ya, ọ ga-anọgidekwa na-agọzi ha, site n’inye ha ihe ndị dị ha mkpa iji rụzuo ọrụ nkwusa na izi ihe kasị ukwuu ụwa hụtụrụla.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Olee Mkpa Ndị E nwere Ugbu A?

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e debanyewo aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ n’ọtụtụ mba bụ́ ebe a machibidoburu ọrụ ha iwu. N’ihi ya, e nweela mmụba dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa n’ọtụtụ n’ime mba ndị a. N’ụzọ kwere nghọta, a na-achọsi Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible ike.

Otú ahụ ka ọ dị banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze. A chọrọ ugbu a, ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze 9,000 gburugburu ụwa. Ọ bụrụ na a ga na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa ụbọchị, ọ ga-ewe ihe karịrị afọ 24 iji gboo mkpa e nwere ugbu a! Ka ọ dị ugbu a, a na-eguzobe ihe dị ka ọgbakọ ọhụrụ asaa kwa ụbọchị, ọtụtụ n’ime ha bụ n’akụkụ ụwa ebe ndị e nwere ego dị nta. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ n’ime ebe ndị a achọghị ụlọ ndị dị oké ọnụ. N’ebe ụfọdụ, a pụrụ iji obere ego dị ka $6,000 wuchaa Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ga-egbo mkpa ahụ ma gbaa ezi àmà nye ndị bi n’ógbè ahụ.

Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị Kraịst nwere ego karịa ndị ọzọ, ya mere Pọl onyeozi dere, sị: “N’ụzọ nhata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọdụụrụ ha inwe n’oge dị ugbu a, ka ihe ndị ahụ nwebigara ókè wee mejuokwa ihe fọdụụrụ unu inwe; ka nhata wee dị.” (2 Ndị Kọrint 8:14) Taa, “nhata” yiri nke ahụ na-eme ka e nwee ego a chọrọ iji na-enwe Bible, akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, Ụlọ Nzukọ Alaeze, ihe enyemaka maka ọdachi, na ihe ndị ọzọ n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Lee ngọzi ụdị inye ihe ahụ bụ—nye ma onye na-enye enye ma onye na-anara anara!—Ọrụ 20:35.

Dị ka akwụkwọ ozi ndị Society na-anata site n’aka ndị nwere obi mmesapụ aka na-egosi, ọtụtụ ndị na-agụ magazin a na-achọ inye aka ma ha ejighị n’aka ụzọ dịgasị iche a pụrụ isi nye onyinye. Obi abụọ adịghị ya na igbe so isiokwu a ga-enye aka ịza ajụjụ ha.

N’oge ọchịchị dị ebube nke Solomọn, ndị “eze nile nke ụwa” bụ́ ndị nụrụ banyere ya bịara ileta ya. Ma, ọ bụ nanị otu onye ọchịchị ka Bible kpọtụrụ aha—eze nwanyị Sheba. (2 Ihe E Mere 9:23) Lee nnọọ àjà ọ chụrụ! Ma a kwụghachiri ya ụgwọ n’ụba—nke na n’ọgwụgwụ nke nleta ya, ‘ume gwụrụ ya, o jukwara ya anya.’—2 Ihe E Mere 9:4, Today’s English Version.

N’ọdịnihu, Jehova, bụ́ Eze kasị ukwuu na Onye kasị enye ihe, ga-emere ndị na-achụrụ ya àjà ihe karịrị ihe Solomọn pụrụ ime mgbe ọ bụla. Ná nzaghachi, ‘ume ga-agwụ ndị a, ọ ga-ejukwa ha anya,’ n’ihi na ọ bụghị nanị na Jehova ga-echebe ha gabiga ụbọchị ikpe ya dị egwu kama mgbe nke ahụ gasịrị, ọ ‘ga-asaghe aka ya, werekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16.

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

ỌTỤTỤ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́ “Onyinye A Na-enye Society.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha.

A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-⁠2483, ma ọ bụ gaa n’ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI

A pụrụ inye Watch Tower Society ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye ego kpọmkwem na ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze zuru ụwa ọnụ uru. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ́ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ịkpọtụrụ Society tupu o denyere Society ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Ihe Ntụkwasị Obi: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ ime ka Society rite uru site n’ụdị ụfọdụ nke atụmatụ ọrụ ebere aka, Society akwadebewo otu broshuọ Bekee a kpọrọ Planned Giving to Benefit Kingdom Service Worldwide. E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị Society nataworo metụtara onyinye, ike ekpe, na ihe ntụkwasị obi. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi. A hazikwara ya iji nyere ndị bi na United States aka bụ́ ndị na-eme atụmatụ inye Society onyinye pụrụ iche ugbu a ma ọ bụ ịhapụ ekpe mgbe ha nwụrụ ịhọrọ ụzọ ndị kasị baa uru na ndị kasị dị irè, na-eburu ọnọdụ onwe onye na nke ezinụlọ ha n’uche. A pụrụ inweta broshuọ a site n’ịrịọ kpọmkwem Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere ka ha nye ya mmadụ.

Mgbe ha gụsịrị broshuọ ahụ ma soro ndị na-arụ ọrụ n’Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Society ma n’otu mgbe ahụ, mụbaa ihe a na-esepụrụ ha n’ụtụ isi site n’ime otú ahụ. E kwesịrị ime ka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere mara banyere ma nata otu n’ime akwụkwọ ndị bara uru metụtara nke ọ bụla ná ndokwa ndị a. Ọ bụrụ na i nwere mmasị na nke ọ bụla n’ime ndokwa atụmatụ ọrụ ebere ndị a, i kwesịrị ịkpọtụrụ Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu.

CHARITABLE PLANNING OFFICE

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive,

Patterson, New York 12563-⁠9204

Telifon: (914) 306-⁠1000

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

A na-akwado ọrụ Ndịàmà Jehova site n’onyinye afọ ofufo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya