Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 75 p. 176-p. 177 para. 1
  • Jizọs Ekwuo Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ekwuo Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Iyi nke Obi Ụtọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Onye Na-akpatakarị Ihe Ise Okwu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Abaara Ndị Farisii Mba
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 75 p. 176-p. 177 para. 1
Jizọs gbaziri otu nwaanyị nyere nne ya otuto pụrụ iche olu

ISI NKE 75

Jizọs Ekwuo Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ

LUK 11:14-36

  • JIZỌS NA-EJI “MKPỊSỊ AKA CHINEKE” ACHỤPỤ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ

  • IHE GA-EME KA MMADỤ NWEE EZIGBO OBI ỤTỌ

Ọ dịbeghị anya Jizọs kụzighachiri otú e si ekpe ekpere. Ma, ọ bụghị naanị otú e si ekpe ekpere ka Jizọs kụziri ihe karịrị otu ugboro mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa. Mgbe Jizọs na-arụ ọrụ ebube na Galili, e boro ya ebubo na ọ bụ ike ndị mmụọ ọjọọ ka o ji eme otú ahụ. Ugbu a ọ nọ na Judia, e bokwara ya ebubo ahụ ọzọ.

Mgbe Jizọs chụpụchara mmụọ ọjọọ ji otu nwoke, bụ́ nke mere ka ọ ghara ịna-ekwu okwu, ọ tụrụ ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ n’anya. Ma, ọ tụghị ndị na-akatọ ya n’anya. Ha boro ya ụdị ebubo ahụ e boburu ya. Ha kwuru, sị: “Ọ bụ ike Bielzebọb bụ́ onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ ka o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.” (Luk 11:15) Ndị ọzọ, bụ́ ndị chọrọ ịhụkwu ihe ndị gosiri onye Jizọs bụ, gwara ya ka o meere ha ihe ịrịba ama si n’eluigwe.

Mgbe Jizọs matara na ha chọrọ ile ya ule, ọ gwara ha ụdị ihe ahụ ọ gwara ndị ahụ na-emegide ya na Galili. Ọ gwara ha na alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada. Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ bụrụ na Setan ekewaa wee na-emegide onwe ya, olee otú alaeze ya ga-esi guzo?” Jizọs gwaziri ha hoo haa, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ mkpịsị aka Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, alaeze Chineke akwaala unu n’ezie.”—Luk 11:18-20.

Mgbe Jizọs kwuru gbasara “mkpịsị aka Chineke,” ndị ọ na-agwa okwu nwere ike icheta ihe mere n’oge ụmụ Izrel. Ndị nọ n’obí Fero, bụ́ ndị hụrụ ọrụ ebube Mozis rụrụ, tiri mkpu, sị: “Ọ bụ mkpịsị aka Chineke!” Ọ bụkwa “mkpịsị aka Chineke” dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ. (Ọpụpụ 8:19; 31:18) Ọ bụ otu “mkpịsị aka Chineke” a, ya bụ, mmụọ nsọ ya, mere ka Jizọs nwee ike ịna-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma na-agwọ ndị ọrịa. N’ihi ya, Alaeze Chineke akwaala ndị a na-emegide Jizọs n’ihi na yanwa, bụ́ onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke, nọ n’ihu ha na-arụ ọrụ ebube ndị ahụ.

Jizọs ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ gosiri na ọ ka Setan ike, otú ahụ onye ka mmadụ ike nwere ike ịbịakwute ya ebe o ji ngwá agha na-eche obí ya nche ma merie ya. Jizọs mere ihe atụ o mere na mbụ gbasara mmụọ na-adịghị ọcha nke si n’ime mmadụ pụta. Ọ bụrụ na onye ahụ ejighị ihe ndị dị mma dochie ebe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ si pụta, mmụọ ahụ ga-akpọrọ mmụọ asaa ọzọ laghachi ma mee ka ọnọdụ ikpeazụ ya dị́ njọ karịa nke mbụ. (Matiu 12:22, 25-29, 43-45) Ọ bụkwa otú ọ na-aga ịdị mba Izrel.

Ihe a Jizọs na-akụzi mere ka otu nwaanyị na-ege ya ntị jiri oké olu kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị afọ buru gị na ara ị ṅụrụ!” Ọ na-agụ ụmụ nwaanyị ndị Juu agụụ ka ha mụta onye amụma, karịchaa, Mesaya. N’ihi ya, nwaanyị a nwere ike iche na obi na-atọgbu Meri atọgbu na ọ mụtara onye a bụ ọkà n’ịkụzi ihe. Ma, Jizọs gbaziri nwaanyị ahụ olu, mee ka ọ ghọta ihe ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Ọ sịrị ya: “Ee e, kama nke ahụ, obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!” (Luk 11:27, 28) O nwetụbeghị mgbe Jizọs kwuru na e kwesịrị ịkwanyere Meri ùgwù pụrụ iche. Ihe ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ bụ mmadụ ịna-efe Chineke, ọ bụghị mmadụ na onye na-efe Chineke isi n’otu ezinụlọ ma ọ bụkwanụ ihe mmadụ merela n’ozi Chineke.

Jizọs katọrọ ndị ahụ maka na ha chọrọ ka o nye ha ihe ịrịba ama si n’eluigwe, dịkwa ka ọ katọrọ ndị Galili chọrọ ka o mee otú ahụ. Ọ gwara ha na o nweghị ihe ịrịba ama a ga-enye ha ma ọ́ bụghị “ihe ịrịba ama Jona.” Otú Jona si bụrụ ihe ịrịba ama bụ na ọ nọrọ n’afọ azụ̀ abalị atọ, jirikwa obi ike kwusaa ozi ọma nke mere ka ndị Ninive chegharịa. Jizọs kwuru, sị: “Ma, lee! onye ka Jona nọ n’ebe a.” (Luk 11:29-32) Jizọs karịkwara Sọlọmọn, bụ́ onye eze nwaanyị Shiba bịara ịnụrụ amamihe ya.

Jizọs kwuru, sị: “Mgbe mmadụ mụnyere oriọna, ọ na-adọba ya, ọ bụghị n’ebe zoro ezo ma ọ bụ n’okpuru nkata, kama n’elu ihe ndọba oriọna.” (Luk 11:33) Ọ ga-abụ na ihe Jizọs na-ekwu bụ na ịkụzi ihe na ịrụ ọrụ ebube n’ihu ndị a dị nnọọ ka mmadụ iji ihe kpuchie oriọna a mụnyere amụnye. Ebe ọ bụ na anya ha adịghị otu ebe, ha ekweghị ka ọrụ ọ na-arụ baara ha uru.

O tebeghị aka Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ji otu nwoke ma mee ka nwoke ahụ kwuwe okwu. Ihe a o mere kwesịrị ime ka ndị mmadụ nye Chineke otuto ma mee ka ha na-agwa ndị mmadụ ihe Jehova na-eme. N’ihi ya, Jizọs dọrọ ndị na-akatọ ya aka ná ntị, sị: “Ya mere, mụrụ anya. Ikekwe, ìhè nke dị n’ime gị bụ ọchịchịrị. N’ihi ya, ọ bụrụ na ahụ́ gị dum nwere ìhè, n’enweghị ebe ọ bụla gbara ọchịchịrị, ahụ́ gị dum ga na-enwu gbaa dị ka mgbe ọkụ oriọna na-enye gị ìhè.”—Luk 11:35, 36.

  • Olee ihe ndị Judia ụfọdụ kwuru mgbe Jizọs gwọchara otu nwoke?

  • Gịnị bụ “mkpịsị aka Chineke”? Olee otú Alaeze Chineke si kwaa ndị na-emegide Jizọs?

  • Olee ihe ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya