-
‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’Ṅomie Okwukwe Ha
-
-
5. Mgbe Jizọs kwuru na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa,” gịnị ka o bu n’obi? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala.)
5 Ebel so ná ndị mbụ dịrị ndụ n’ụwa n’ihi na a mụrụ ya obere oge Chineke kechara mmadụ. Jizọs mechara kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Gụọ Luk 11:50, 51.) O doro anya na ụwa Jizọs kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ ụmụ mmadụ ndị nwere olileanya na a ga-agbapụta ha ná mmehie. Ọ bụ eziokwu na Ebel bụ onye nke anọ dịrị ndụ n’ụwa, ma ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ onye mbụ Chineke weere na e nwere ike ịgbapụta ná mmehie.a O doro anya na nne na nna Ebel na nwanne ya Ken ejighị Chineke kpọrọ ihe, n’ihi ya, o nweghị ezigbo ihe Ebel nwere ike ịmụta n’aka ha.
-
-
‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’Ṅomie Okwukwe Ha
-
-
a Ihe okwu Hibru a sụgharịrị ‘ịtọ ntọala ụwa’ pụtara bụ ịgha mkpụrụ, ya bụ, ịmụ nwa. N’ihi ya, ihe a na-ekwu okwu ya bụ mmadụ mbụ a mụrụ n’ụwa. Ma, ebe ọ bụ Ken bụ nwa mbụ Adam na Iv mụrụ, olee ihe mere Jizọs ji hapụ Ken kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa”? Ihe ndị Ken kpebiri ime na ihe ndị o mechara mee gosiri na ọ ma ụma nupụrụ Jehova Chineke isi. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na a gaghị azọpụta Ken ma ọ bụ kpọlite ya n’ọnwụ otú ahụ a na-agaghị akpọlite nne na nna ya, bụ́ Adam na Iv.
-