Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/15 p. 5-7
  • Krismas—Ọ̀ Bụ Ụzọ E Si Anabata Jisọs?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Krismas—Ọ̀ Bụ Ụzọ E Si Anabata Jisọs?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “A Sịkwa na Opi Na-ada nke A Na-amaghị Isi Ya”
  • ‘Iji Rite Ụmụ Mmadụ n’Uru’
  • E Weghachighị “Ndị Kraịst Nzuzo”
  • Ndị E Weghachiri n’Ezi Iso Ụzọ Kraịst
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Agba Krismas?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/15 p. 5-7

Krismas—Ọ̀ Bụ Ụzọ E Si Anabata Jisọs?

ỌMỤMỤ nke Onye Nzọpụta ahụ, bụ́ Mesaịa ahụ a nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge, bụ n’ezie oge ịṅụrị ọṅụ. Otu mmụọ ozi mara ọkwa gwa ndị na-azụ atụrụ nọ nso na Betlehem, sị, “Lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile: n’ihi na taa n’obodo Devid ka a mụrụ nye unu Onye Nzọpụta, nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.” Ìgwè ndị mmụọ ozi sonyere, na-eto Chineke, sị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.” (Luk 2:10-14) Ụfọdụ ndị pụrụ ikwubi na ndị Kraịst kwesịrị iṅomi ndị mmụọ ozi ahụ n’igosipụta ọṅụ ha n’ọbịbịa Kraịst bịara n’elu ala laa azụ n’oge ahụ.

Nke a abụghị nke mbụ Bible mere ihe ndekọ banyere ndị mmụọ ozi ịbụ abụ otuto. Mgbe a tọrọ ntọala ụwa, “kpakpando ụtụtụ na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:4-7) E deghị kpọmkwem ụbọchị ihe omume nke a weere ọnọdụ n’ime Bible. (Jenesis 1:1, 14-18) N’agbanyeghị otú ihe omume ahụ siworo bụrụ nke kpatara ọṅụ, ndị Kraịst arụbeghị ụka na n’ihi na ndị mmụọ ozi tiri mkpu ọṅụ, na ha kwesịrị ime ememe okike ụwa kwa afọ, ma eleghị anya nabata otu ememe ndị ọgọ mmụọ iji cheta ihe omume ahụ.

Ma nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ndị na-eme ememe Krismas na-eme banyere ọmụmụ Jisọs Kraịst. Ileba anya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ọ bụla n’akwụkwọ ihe ọmụma ndị e deziri nke ọma n’okpuru isiokwu bụ “Krismas” na-akwado na a maghị ụbọchị ọmụmụ Jisọs. Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere ụbọchị ahụ.

“A Sịkwa na Opi Na-ada nke A Na-amaghị Isi Ya”

“Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo,” ka Pọl onyeozi dere, n’idozi ọgba aghara ahụ dị n’ọgbakọ dị na Kọrint oge ochie. N’otu ọnọdụ okwu ahụ, ọ jụrụ, sị: “A sịkwa na opi na-ada nke a na-amaghị isi ya, ònye ga-akwadebe onwe ya ije agha?” (1 Ndị Kọrint 14:8, 33) Ugbu a, ọ bụru na Chineke nke udo chọrọ ka ndị Kraịst na-eme ememe ọmụmụ nke Ọkpara ya n’elu ala, Ọ̀ ga-ahapụrụ ya ụmụ mmadụ na-ezughị okè iji uche nke aka ha họrọ otu ụbọchị site n’ememe ndị ọgọ mmụọ, ka ha nabatakwa ihe omume ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke?

Ịtụle ihe nlereanya ole na ole dị na Bible na-eme ka o doo anya na Jehova Chineke adịghị esi otú ahụ emeso ndị ya. Mgbe ọ chọrọ ka ụmụ Israel mee ememe dị iche iche a na-eme kwa afọ n’okpuru Iwu Mosis, Chineke họpụtara kpọmkwem ụbọchị ndị a ga na-eme ha, gwakwa ha ụzọ ha ga-esi mee ememe ndị ahụ. (Ọpụpụ 23:14-17; Levitikọs 23:34-43) Jisọs Kraịst, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe o nyere iwu ka e mee ememe ncheta ọmụmụ ya, nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu idebe otu ụbọchị a kara aka. “N’abalị ahụ nke a raara ya nye n’aka mmadụ,” bụ́ Nisan 14, 33, O.A., Jisọs guzobere ememe nke Nri Anyasị Onyenwe Anyị, na-eji achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-eme ihe. O nyere iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (1 Ndị Kọrint 11:23, 24) Ụda opi n’ihe banyere oge na ụzọ a ga-esi na-eme ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị pụtara ìhè, dookwa anya. Ya mere, gịnịkwanụ banyere Krismas? Ọ dịghị ebe ọ bụla n’ime Bible anyị hụrụ iwu ọ bụla e nyere ime ememe ncheta ọmụmụ Kraịst, ọ gwaghịkwa anyị oge na ụzọ a ga-esi mee ya.

‘Iji Rite Ụmụ Mmadụ n’Uru’

“Oo, n’ezie amaara m na Krismas malitere n’etiti ndị ọgọ mmụọ,” ka otu onye ndú okpukpe nọ n’otu Zion Church dị na Tokyo kwuru, “ma ya bụrụhaala na ndị nkịtị na-enwe mmasị n’Iso Ụzọ Kraịst na December 25, na-abịakwa ịmụta ozizi nke Jisọs Onye Kwesịrị Nsọpụrụ, Krismas nwere ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’Iso Ụzọ Kraịst.” Ọtụtụ ndị kwenyere n’echiche ya. Ì kwenyere na mmebi ụkpụrụ dị otú ahụ kwesịrị ekwesị?

Ụfọdụ ndị na-arụ ụka na ọbụna Pọl mebiri ụkpụrụ ụfọdụ iji nwetakwuo ndị kwere ekwe. “Ana m eme onwe m ka m bụrụ ohu onye ọ bụla,” ka o dere, “iji wee rite ọtụtụ mmadụ n’uru ruo ókè o kwere mee . . . Mgbe mụ na ndị Jentaịl na-arụkọ ọrụ, ana m adị ndụ dị ka onye Jentaịl, n’agbasoghị Iwu ndị Juu, ka m wee rite ndị Jentaịl n’uru. . . . Ana m eme ihe ndị a nile n’ihi ozi ọma ahụ, ka m wee kere òkè ná ngọzi ya nile.” (1 Ndị Kọrint 9:19-23, Today’s English Version) Okwu ndị a hà mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi ịnabata ememe ndị ọgọ mmụọ iji dọta mmasị ndị Jentaịl bịa n’Iso Ụzọ Kraịst?

Jiri nlezianya tụlee ọnọdụ okwu Pọl dị na ya. N’amaokwu 21, ọ sịrị: “Nke a apụtaghị na adịghị m erubere iwu Chineke isi; n’ezie anọ m n’okpuru iwu Kraịst.” (TEV) Ya mere, o mebighị ụkpụrụ site n’ịnara ihe ndị megidere iwu Kraịst, kama ọ ‘dịrị ndụ dị ka onye Jentaịl’ site n’ịkwanyere omenala na omume ndị ebe dị iche iche ùgwù ruo n’ókè ihe ndị a na-emegideghị iwu ndị Kraịst.a

N’iburu nke a n’uche, chee echiche otú ịnabata ememe ndị ọgọ mmụọ n’ime “Iso Ụzọ Kraịst” n’okpuru aha nke Krismas ga-adị ma e lee ya anya, na-eburu iwu Bible na-esonụ n’uche: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, n’ihi na unu na ha dị iche: n’ihi na olee nkekọ ezi omume na imebi iwu na-ekekọ? . . . Ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe na-ekerịta? . . . N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzookwanụ iche, ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.” (2 Ndị Kọrint 6:14-17) N’agbanyeghị ihe a pụrụ ikwu na ọ bụ ha kpatara ya, iji ememe ndị ọgọ mmụọ gwagbuo Iso Ụzọ Kraịst abụghị ụzọ e si anabata Jisọs dị ka Onye Nzọpụta. Ọ ga-abụworị ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ime narị afọ mbụ mgbe Jisọs bịara n’anụ ahụ, ọ bụkwa ihe na-ekwesịghị ekwesị taa, ọ ga-adịkwa otú ahụ n’ọdịnihu, mgbe Kraịst ga-abịa dị ka Eze imezu ihe Chineke kpere n’ikpe. (Mkpughe 19:11-16) N’eziokwu, ndị ahụ na-ahọrọ ime ememe dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ n’okpuru ihe mkpuchi ụgha nke ịbụ nke “ndị Kristian,” pụkwara ịdị na-agọnarị Jisọs Kraịst.

E Weghachighị “Ndị Kraịst Nzuzo”

Mụta ihe site n’ihe mere ndị Katọlik nọ na Japan n’oge ọchịchị ndị shogun. Mgbe nzọda nke okpukpe Katọlik malitere na 1614, ihe dị ka 300,000 ndị Japan bụ ndị Katọlik nwere ihe atọ ha ga-ahọrọ site na ha: ịghọ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha, ịgọnarị okwukwe ha, ma ọ bụ ịnọgide n’okwukwe ha na nzuzo. Ndị ahụ nọgidere n’okwukwe ha na nzuzo ka a kpọrọ ndị Kraịst nzuzo. Iji wee kpuchite okwukwe ha, ha kwekọrọ n’omenala dị iche iche nke ndị okpukpe Buddha na nke ndị Shinto. N’ụkpụrụ okwukwe ha, ha jiri aha bụ Maria Kannon mee ihe, nke bụ Meri nke e mere ka o yie bodhisattva nke ndị okpukpe Buddha n’ụdị nke nne ku nwa n’aka. Ememe ha nile gwakọtara okpukpe ndị Buddha, okpukpe Katọlik, na okpukpe ọdịnala ndị Shinto. Otú ọ dị, mgbe a manyere ha ije ememe olili ozu ndị okpukpe Buddha, ha na-agụghachi ekpere ndị Kristian, na-emekwa modoshi, bụ ihe nke ga-eme ka ihe omume okpukpe Buddha ahụ ghara ịdị irè. Gịnị meworo “ndị Kraịst” ahụ?

“Ruo n’ókè o metụtara ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Kirishitan [ndị Kraịst] ahụ,” ka akwụkwọ ahụ bụ The Hidden Christians kwuru, “oké mmasị maka okpukpe tolitere n’ime ha, na-eme ka o siere ha ike ịhapụ ofufe nke Shinto na nke chi dị iche iche nke ndị Buddha.” Mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, ndị ozi ala ọzọ nke okpukpe Katọlik wee bịaghachi na Japan, ihe ka ọtụtụ ná “ndị Kraịst nzuzo” ahụ rapagidere n’ụdị ngwakọta okpukpe ha ahụ.

Otú ọ dị, Chọọchị Katọlik ọ̀ pụrụ ịkatọ “ndị Kraịst nzuzo” ahụ n’ụzọ ezi uche dị na ya, bụ́ ndị jụrụ ikwe ka e weghachi ha n’okpukpe Roman Katọlik? Chọọchị Katọlik anabatawokwa ọtụtụ ozizi na ememe ndị ọgọ mmụọ, gụnyere Krismas. Ọ bụrụ na ndị Katọlik na ndị Protestant, ọ bụ ezie na ha na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst, ejiriwo ememe ndị na-ekweghị ekwe mee ka “Iso Ụzọ Kraịst” nke ha bụrụ nke ndị ọgọ mmụọ, ọ̀ bụ na ha onwe ha adịghị ajụkwa Jisọs Kraịst?

Ndị E Weghachiri n’Ezi Iso Ụzọ Kraịst

Setsuko, bụ́ onye ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe dị mkpa ruo 36 afọ, mesịrị ghọta nke ahụ. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ọ gbalịrị imeju agụụ ime mmụọ ya site n’isonyere òtù chọọchị Katọlik. ‘Lee ka nke a si bụrụ ihe na-eju afọ!’ ka o chere mgbe o jere Mas Krismas, hụkwa ọmarịcha osisi Krismas ndị dị n’ime na n’èzí chọọchị ya. “Enwere m nnọọ obi ụtọ n’ihi ọmarịcha ihe ịchọ mma ndị ahụ anyị mere, bụ́ nke ka nke chọọchị ndị dị nso mma,” ka o kwuru. Otú o sina dị, Setsuko enweghị ezi nghọta ọ bụla nke ozizi ndị Katọlik, ọbụna na ọ bụ ezie na ọ kụziri ihe na Sunday school ha ruo nwa oge. Ya mere, mgbe ọ chọrọ imikpukwu onwe ya n’ọrụ chọọchị, ọ jụrụ onye ụkọchukwu ya ajụjụ ole na ole. Kama ịza ajụjụ ya, onye ụkọchukwu ahụ wedara ya n’ala. N’ịbụ onye na-enwetaghị ihe ọ tụrụ anya ya, o kpebiri ịmụ Bible n’onwe ya. Mgbe izu abụọ gasịrị, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya, o wee nakwere ọmụmụ Bible ebe obibi.

Ọ kọwara, sị: “Ọ bụ ihe na-egbu mgbu iche eziokwu dị iche iche nke Bible ihu, bụ́ ndị kagbusịrị ihe ndị m kwenyeburu na ha. Ọbụna ọrịa alopecia neurotica, bụ́ ndasị nke agịrị isi, bịara m n’ihi mkpasu iwe. Otú ọ dị, nwayọọ nwayọọ, ìhè nke eziokwu nwubara n’ime obi m. Ọ nwụrụ m ibubo n’ahụ ịmụta na a pụghị ịmụworị Jisọs na December, bụ́ oge oyi mgbe mmiri na-ezokwa, mgbe ndị na-azụ atụrụ na-agaghị anọworị na-elekọta atụrụ ha n’èzí n’anyasị. (Luk 2:8-12) O tisasịrị echiche m nwere banyere ọmụmụ nwa ahụ, n’ihi na anyị na-ejibu ogho eme ihe dị ka snow n’iji chọọ ihe osise dị iche iche nke atụrụ na ndị na-azụ atụrụ mma.”

Mgbe o dosịrị ya anya ihe Bible na-akụzi n’ezie, Setsuko kpebiri ịkwụsị ime ememe Krismas. Ọ kwụsịrị inwe “mmụọ Krismas” ahụ otu ugbo n’afọ, ma na-egosipụta mmụọ ndị Kraịst nke iji obi ụtọ na-enye onyinye kwa ụbọchị.

Ọ bụrụ na i ji obi eziokwu kwere na Kraịst, ya ewela gị iwe mgbe ị hụrụ ka ndị ọgọ mmụọ na-emetọ Krismas. Ihe ha na-eme bụ nanị imeghachi ihe ọ bụ na mbụ—ememe ndị ọgọ mmụọ. Krismas adịghị eduje onye ọ bụla n’ịnabata Jisọs Kraịst, onye bịaghachiworo n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya dị ka Eze nke eluigwe. (Matiu, isi 24 na 25; Mak, isi 13; Luk, isi 21) Kama nke ahụ, ezi ndị Kraịst na-egosipụta mmụọ yiri nke Kraịst gburugburu afọ dum, ha na-ekwusakwa ozi ọma nke Alaeze ahụ, nke Jisọs ghọworo Eze na ya. Ọ bụ otú ahụ ka Chineke chọrọ ka anyị si nabata Jisọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta anyị na Eze nke Alaeze ahụ.—Abụ Ọma 2:6-12.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Tụlee ụzọ abụọ Pọl si mee omume n’okwu metụtara obibi úgwù. Ọ bụ ezie na ọ maara na “obibi úgwù abụghị ihe,” o biri onye ahụ ya na ya so ejegharị, bụ́ Timoti, úgwù, onye bụ onye Juu site ná nne ya. (1 Ndị Kọrint 7:19; Ọrụ 16:3) N’okwu banyere Taịtọs, Pọl zeere ime ka e bie ya úgwù dị ka okwu metụtara ụkpụrụ ná nrụrịta ụka ya na ndị okpukpe ndị Juu. (Ndị Galetia 2:3) Taịtọs bụ onye Grik, n’ihi nke a kwa, n’adịghị ka Timoti, o nweghị ezi ihe ọ bụla mere ọ ga-eji bie úgwù. Ọ bụrụ na a ga-ebi ya, bụ́ onye Jentaịl, úgwù, ‘Kraịst agaghị abara ya uru ọ bụla.’—Ndị Galetia 5:2-4.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ezi ndị Kraịst na-asọpụrụ Jisọs gburugburu afọ dum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya