Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 95 p. 222-p. 223 para. 9
  • Jizọs Akụzie Gbasara Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Akụzie Gbasara Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mmụta Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Ihe Chineke Kekọtara . . .”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 95 p. 222-p. 223 para. 9
Ebe ndị mmadụ na-akpọtara Jizọs ụmụ ha

ISI NKE 95

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya

MATIU 19:1-15 MAK 10:1-16 LUK 18:15-17

  • JIZỌS EMEE KA A MATA IHE CHINEKE KWURU GBASARA ỊGBA ALỤKWAGHỊM

  • ONYINYE ỊNỌ N’ALỤGHỊ DI MA Ọ BỤ NWUNYE

  • IHE MERE O JI DỊ MKPA KA ANYỊ DỊ KA ỤMỤNTAKỊRỊ

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya esila na Galili pụọ. Ha gafeziri Osimiri Jọdan ma si na Peria na-agafe. Mgbe ikpeazụ Jizọs bịara Peria, ọ gwara ndị Farisii ihe Chineke kwuru gbasara mmadụ ịgba nwunye ya alụkwaghịm. (Luk 16:18) Ugbu a ha hụrụ Jizọs ọzọ, ha jụwakwara ya gbasara ịgba alụkwaghịm iji lee ya ule.

Mozis dere na nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na e nwere “ihe na-ekwesịghị ekwesị” nwaanyị ahụ mere. (Diuterọnọmi 24:1) Ma, e nwere ihe dị iche iche ndị mmadụ chere kwesịrị ime ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm. Ụfọdụ ndị chere na ọ bụrụgodị obere ihe ka nwaanyị mere, di ya nwere ike ịgba ya alụkwaghịm. Ọ bụ ya mere ndị Farisii ahụ ji jụọ Jizọs, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?”—Matiu 19:3.

Kama ikwuwe ihe ndị mmadụ chere, Jizọs kwuru otú Chineke chọrọ ka alụmdi na nwunye dịrị. Ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:4-6) Mgbe Chineke mere ka Adam na Iv bụrụ di na nwunye, o kwughị na ha nwere ike ịnọkata gbasaa.

Ndị Farisii ekwetaghị ihe a Jizọs kwuru. Ha sịrị ya: “Gịnịzi mere Mozis ji nye iwu ka e nye nwaanyị akwụkwọ nchụpụ, gbaakwa ya alụkwaghịm?” (Matiu 19:7) Jizọs zara ha, sị: “Mozis kwetara ka unu na-agba nwunye unu alụkwaghịm n’ihi na obi kpọrọ unu nkụ, ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị site ná mmalite.” (Matiu 19:8) Mgbe Jizọs kwuru “site ná mmalite,” oge o bu n’obi abụghị oge Mozis, kama ọ bụ mgbe Chineke jikọtara Adam na Iv n’Iden.

Jizọs gwaziri ha otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị ha: “Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko [ya bụ, por·neiʹa n’asụsụ Grik], wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Matiu 19:9) Nke a gosiri na naanị mgbe Akwụkwọ Nsọ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụ ka nwaanyị gbaa di ya alụkwaghịm bụ ma otu n’ime ha kwaa iko.

Ihe a Jizọs kwuru mere ka ndị na-eso ụzọ ya kwuo, sị: “Ọ bụrụ otú a ka ọ dị n’etiti nwoke na nwunye ya, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ịlụ nwunye.” (Matiu 19:10) Ihe anyị na-amụta n’ihe a bụ na onye ọ bụla nke na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị iburu n’obi na alụmdi na nwunye abụghị a lụọ taa, e tisaa echi.

Jizọs kwuziri gbasara mmadụ ịnọ n’alụghị nwaanyị. O kwuru na ihe mere ụfọdụ ndị alụghị nwaanyị bụ na a mụrụ ha, ha abụrụ ndị ọnaozi, ya bụ, na ha na nwaanyị agaghị enweli mmekọahụ. Ma, ndị ọzọ bụ ndị e mere ọnaozi ka ha ghara inwe ike inwe mmekọahụ. E nwekwara ndị bụ́ ndị ọnaozi maka na ha ma ụma kpebie na ha agaghị enwe mmekọahụ ka ha nwee ike lekwasịkwuo anya n’ọrụ gbasara Alaeze eluigwe. Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Onye ọ bụla nke ga-emeli ya [ya bụ, ịnọ n’alụghị di ma ọ bụkwanụ nwunye], ya mee ya.”—Matiu 19:12.

Ndị mmadụ kpọziiri ụmụaka ha na-akpọtara Jizọs. Ma ndị na-eso ụzọ Jizọs baara ha mba. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji mee otú ahụ bụ na ha achọghị ka onye ọ bụla nyee Jizọs nsogbu. Ma mgbe Jizọs hụrụ ihe na-emenụ, iwe were ya, ya asị ndị na-eso ụzọ ya: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m; unu anwala igbochi ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ. N’ezie, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-anabataghị alaeze Chineke dị ka nwatakịrị agaghị aba n’ime ya ma ọlị.”—Mak 10:14, 15; Luk 18:15.

Jizọs ji ihe a o kwuru kụziere anyị ezigbo ihe. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịba n’Alaeze Chineke, anyị ga-adị umeala n’obi ka ụmụntakịrị ma nwee mmasị ka a kụziere anyị ihe otú ahụ ụmụaka si enwe mmasị ka a kụziere ha ihe. Jizọs gosiziri na ya hụrụ ụmụaka n’anya. Otú o si gosi ya bụ na o kuuru ha ma gọzie ha. Otú ahụ Jizọs si hụ ụmụaka n’anya ka o sikwa hụ ndị niile nabatara “alaeze Chineke dị ka nwatakịrị” n’anya.—Luk 18:17.

  • Olee otú ndị Farisii si jiri okwu gbasara ịgba alụkwaghịm lee Jizọs ule?

  • Olee ihe Jizọs kwuru Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị ya ga-eme ka mmadụ gbaa alụkwaghịm?

  • Gịnị mere ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Kraịst nwere ike iji kpebie na ha achọghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye?

  • Gịnị ka otú Jizọs si mesoo ụmụntakịrị na-akụziri anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya