Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/1 p. 8-9
  • Oké Ihe Mgbu n’ime Ogige ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ihe Mgbu n’ime Ogige ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Ihe Mgbu n’Ime Ogige ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya nke Ukwuu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ụbọchị Ikpeazụ nke Ndụ Jisọs Dị Ka Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/1 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Oké Ihe Mgbu n’ime Ogige ahụ

MGBE Jisọs kpesịrị ekpere, ya na 11 ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi bụkuru Jehova abụ otuto. Mgbe ahụ, ha sitere n’ime ụlo ahụ dị n’elu rịdata, banye n’ọchịchịrị ahụ jụrụ oyị nke anyasị, wee chee ihu ịlaghachi gabiga Ndagwurugwu Kidrọn nke dị n’ụzọ Betani. Ma mgbe ha nọ n’ụzọ, ha kwụsịrị n’otu ebe na-amasịkarị ha, bụ́ ogige Getsemane. Nke a dị n’elu Ugwu Olive ma ọ bụ n’ebe dị ya nso. Jisọs esorowo ndị ozi ya nwee nzukọ n’ebe a ọtụtụ ugbo n’etiti osisi olive ndị ahụ.

Ọ hapụrụ asatọ n’ime ndị ozi ahụ—ma eleghị anya n’ebe dị nso n’ụzọ e si abanye n’ogige ahụ—wee nye ha ndụmọdụ, sị: “Nọdụnụ n’ebe a, ruo mgbe m ga-eje n’ebe ahụ kpee ekpere.” O wee kpọrọ mmadụ atọ ndị nke ọzọ ahụ—Pita, Jemes, na Jọn—wee bamikwuo n’ime ogige ahụ. Jisọs malitere inwe mwute, obi malitekwara ịlọ ya mmiri. Ọ gwara ha, sị, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ruo onwụ: nọgidenụ n’ebe a, soo m na-eche nche.”

N’ịgatụkwu n’ihu, Jisọs dara kpuchie ihu ya n’ala wee malite ikpesi ekpere ike, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka iko a gabiga m: ma o bụghị dị ka mụ onwe m na-achọ, kama dị ka gị onwe gị na-achọ.” Gịnị ka okwu ya pụtara? Gịnị mere ‘o ji na-ewute ya nke ukwuu ruo ọnwụ’? Ọ̀ na-ala azụ ná mkpebi ya nke ịnwụ ọnwụ na iweta ihe mgbapụta ahụ?

Ọ dịghị ma ọlị! Jisọs anaghị arịọ arịrịọ ka e gbochie ya ịnwụ ọnwụ. Ọbụna echiche nke izere ọnwụ ọchụchụ àjà, nke Pita tụrụ aro ya n’otu oge gara aga, bụ ihe arụ nye ya. Kama nke ahụ, ọ nọ n’oké ihe mgbu n’ihi na ọ na-atụ egwu na n’ihi ụzọ ọ gaje isi nwụọ—dị ka ajọ onye omempụ—gaje iwetara aha Nna ya nkọcha. Ọ na-echeta ugbu a na n’ime hour ole na ole, a gaje ịkpọgide ya n’osisi dị ka ụdị mmadụ kasị dịrị njọ—onye na-ekwulu Chineke! Ọ bụ nke a na-enye ya oké nsogbu.

Mgbe o kpesịrị ogologo ekpere, Jisọs lọghachiri wee hụ na ndị ozi atọ ahụ na-arahụ ụra. N’ịgwa Pita okwu, ọ sịrị: “Ùnu dị otú a enweghị ike iso m chee nche otu oge hour? Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka unu wee ghara ịba n’ọnwụnwa.” Otụ́ ọ dị, n’ịghọta ọnọdụ nrụgide ha nọworo n’ime ya na otụ́ o si bụrụ na oge agawo nke ukwuu, ọ sịrị: “Mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.”

Jisọs jekwara nke ugbo abụọ ma rịọ ka Chineke wepụrụ ya “iko a,” ya bụ, òkè Jehova kenyeworo ya, ma o bụ nzube o nwere maka ya. Mgbe o lọghachiri, ọ hụkwara ka mmadụ atọ ahụ na-arahụ ụra mgbe ha kwesịrị ịnọworịị na-ekpe ekpere ka ha ghara ịbanye n’ọnwụnwa. Mgbe Jisọs gwara ha okwu, ha amaghị ihe ha ga-azaghachi ya.

N’ikpeazụ, na nke ugbo atọ, Jisọs gapụtụrụ nke nta, wee gbunye ikpere n’ala, jirikwa oké iti mkpu na anya mmiri kpee ekpere, sị: “Nna, ọ bụrụ na ọ dị gị mma, nara m iko a.” Jisọs na-enwe oké ihe mgbu n’ihi nkatọ nke ọnwụ ya dị ka onye omempụ ga-ewetara aha Nna ya. Ee, ịbụ onye e boro ebubo dị ka onye nkwulu—onye na-akọcha Chineke—fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ pụghị ibuli ya!

N’agbanyeghị nke ahụ, Jisọs gara n’ihu ikpe ekpere, sị: “Ọ bụghị ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe gị onwe gị na-achọ.” Jisọs ji nrubeisi doo ọchịchọ nke ya n’okpuru ọchịchọ nke Chineke. Mgbe nke a mere, otu mmụọ ozi si n’eluigwe pụtara wee jiri okwu nkasi obi ụfọdụ mesie ya obi ike. Ma eleghị anya mmụọ ozi ahụ gwara Jisọs na Nna ya na-ele ya anya ọma.

N’agbanyeghị nke ahụ, lee nnọọ ụdị ibu arọ dịkwasịrị n’ubu Jisọs! Ndụ ebighị ebi nke ya onwe ya na nke agbụrụ mmadụ dum bụ ihe a na-ejidebeghị n’aka. Mmetụta o nwere n’uche ya dị ukwuu. Ya mere, Jisos gara n’ihu na-ekpesikwu ekpere ike, ọsụsọ ya ghọkwara ọkpụrụkpụ ọbara mgbe ọ na-atasị n’ala. Akwụkwọ bụ The Journal of the American Medical Association kwuru, sị, “Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe a na-adịghị ahụkebe, a pụrụ inwe ọsụsọ nke bụ ọbara . . . n’oge e nwere ọnọdụ mkpali dị elu nke ukwuu.”

Mgbe e mesịrị, Jisọs lọghachikwutere ndị ozi ya nke ugbo atọ, wee hụkwa ka ha na-ehi ụra ọzọ. Mwute efu emewo ka ike gwụsịa ha. O tiri mkpu, sị, “Na-arahụnụ ụra site n’ugbu a, na-ezukwanụ ike: o zuwo: oge hour nke m eruwo; lee, a na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. Bilienụ, ka anyị jee: lee, onye na-arara m nye nọ nso.”

Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas Iskarịọt bịara nso, oké ìgwè mmadụ ndị ji ihe e ji amụ ọkụ na oriọna na ihe agha dị iche iche sokwa ya. Matiu 26:30, 36-47; 16:21-23; Mak 14:26, 32-43; Luk 22:39-47; Jọn 18:1-3; Ndị Hibru 5:7.

◆ Mgbe ha hapụsịrị ime ụlọ ahụ dị n’elu, olee ebe Jisọs duuru ndị ozi ahụ jee, gịnịkwa ka o mere n’ebe ahụ?

◆ Mgbe Jịsọs na-ekpe ekpere, gịnị ka ndị ozi ahụ na-eme?

◆ Gịnị mere Jisọs ji nọrọ n’oké ihe mgbu, gịnịkwa ka ọ rịọrọ ka Chineke mee?

◆ Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ nke bụ na ọsụsọ Jisọs ghọrọ ọkpụrụkpụ ọbara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya