Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 6/1 p. 27
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amụma E Buru Megide Taya Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike na Okwu Jehova Na-emezu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Jehova Emerụọ Mpako nke Taịa
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Mba Ndị Gbara Jeruselem Gburugburu
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Mba Dị Iche Iche ‘Ga-amara na M Bụ Jehova’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 6/1 p. 27

Ị̀ Maara?

Gịnị mere egwu ji tụọ Pọntịọs Paịlet mgbe a gwara ya na Jizọs “mere onwe ya ọkpara Chineke”?—Jọn 19:7.

Mgbe Julius Caesar nwụrụ, Ụlọ Nzukọ Ome Iwu ndị Rom kwuru na ọ bụ chi. E mechara kpọwa onye o ji mere nwa nke nọchiri ya n’ọchịchị, bụ́ Octavian, divi filius, nke pụtara, “Ọkpara Onye Bụ́ Chi,” ma ọ bụ “Ọkpara Chineke.” Utu aha a ghọrọ aha dị nsọ a na-etu ndị eze Rom. Ihe ndị e dere n’elu ebe ịchụàjà ndị Rom, n’ụlọ nsọ ha, n’ihe oyiyi ha, nakwa n’ego kịrịkịrị ha, gosiri na nke a bụ eziokwu. Mgbe ndị Juu boro Jizọs ebubo na o mere onwe ya “ọkpara Chineke,” ihe ha boro ya bụ na ọ chọrọ iweghara aha a na-etu ndị eze Rom, nke bụ́ ịgba ọchịchị Rom mgba okpuru.

N’oge a na-ekpe Jizọs ikpe, a na-etu Taịbiriọs utu aha ahụ bụ́ divi filius. Ihe e ji mara eze a bụ na ọ na-egbu onye ọ bụla o chere bụ́ onye iro ya. Ọ bụ ya mere na mgbe ndị Juu kwuru na ọ bụrụ na Paịlet amaghị Jizọs ikpe, na ọ na-enupụrụ Siza isi, Paịlet “tụkwuru egwu.” Mgbe ha nyegidere ya nsogbu, o mechara kweta wee nye iwu ka e gbuo Jizọs.—Jọn 19:8, 12-16.

Gịnị mere Zekaraya ji buo amụma na a ga-ebibi Taya ọ bụ ezie na ọ dịla anya ndị Babịlọn bibiri ya?

N’ezie, obodo Taya oge ochie, nke dị n’Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian, dị mpaghara abụọ. Otu dị n’elu ala, mmiri agbaa nke ọzọ gburugburu.

O nwere mgbe ndị Taya na ndị Izrel dị ná mma. Ma, ka oge na-aga, Taya bara ọgaranya wee malite inupụrụ Jehova bụ́ Chineke isi, na-enupụrụ ya isi ruo n’ókè na ha na-ezuru ọlaọcha na ọlaedo nke ndị ya, na-erekwa ụfọdụ n’ime ha ka ha ghọọ ndị ohu. (Joel 3:4-6) Nke a mere ka Jehova maa Taya ikpe. Jehova si n’ọnụ ndị amụma ya buo amụma na Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ga-ebibi Taya. Eze a chịịrị ndị agha ya gaa Taya mgbe o bibichara Jeruselem na 607 B.C.E.—Aịzaya 23:13, 14; Jeremaya 27:2-7; Ezikiel 28:1-19.

Mgbe e meriri ndị Taya, ha buuru ngwongwo ha gbaga ná mpaghara obodo ha nke mmiri gbara gburugburu. Ndị Babịlọn bibiri mpaghara obodo Taya nke dị n’elu ala. Mgbe ọ fọrọ nke nta ka otu narị afọ gafee, Jehova si n’ike mmụọ nsọ mee ka Zekaraya kwuo ikpe ọ mara Taya, sị: “Lee! Jehova ga-anapụ ya ihe niile o nwere, gbuo ndị agha ya n’oké osimiri; ọkụ ga-erepịakwa ya.”—Zekaraya 9:3, 4.

N’afọ 332 T.O.A., amụma a Zekaraya buru mezuru mgbe Alexander Onye Ukwu bibiri mpaghara obodo ahụ nke mmiri gbara gburugburu. Iji bibie ya, Alexander ji osisi na nkume si na Taya nke mbụ ahụ e bibiri ebibi rụọ ụzọ dị narị mita asatọ, wee si na ya banye ná mpaghara obodo ahụ mmiri gbara gburugburu. Ezikiel bukwara nke a n’amụma.—Ezikiel 26:4, 12.

[Foto dị na peeji nke 27]

“Nnọchibido a nọchibidoro Taya”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Onye sere ya bụ Andre Castaigne (1898-1899)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya