-
Ònye Ka Ị Na-erubere Isi—Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?Ụlọ Nche—2005 | Disemba 15
-
-
7. Gịnị mere ọrụ nkwusa ahụ ji kpasuo ndị isi nchụàjà iwe?
7 Mkpebi siri ike ndịozi ahụ mere ịnọgide na-ekwusa ozi ọma kpasuru ndị isi nchụàjà iwe. Ụfọdụ ndị nchụàjà, gụnyere Keifas n’onwe ya, bụ ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. (Ọrụ 4:1, 2; 5:17) N’agbanyeghị nke ahụ, ndịozi ahụ nọgidere na-ekwu na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Tụkwasị na nke ahụ, ụfọdụ n’ime ndị isi nchụàjà agbalịsiela ike inweta ihu ọma ndị ọchịchị Rom. N’oge a na-ekpe Jizọs ikpe, mgbe e nyere ndị isi nchụàjà ohere ịnabata Jizọs dị ka eze ha, ha tiri mkpu, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.” (Jọn 19:15)a Ọ bụghị nanị na ndịozi ahụ na-ekwu na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, kama ha na-akụzi na e wezụga aha Jizọs, “aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyeworo n’etiti ụmụ mmadụ bụ́ nke a na-aghaghị isi na ya zọpụta anyị.” (Ọrụ 2:36; 4:12) Ndị nchụàjà ahụ na-atụ egwu na ọ bụrụ na ndị mmadụ amalite ile Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ anya dị ka Onye Ndú ha, ndị Rom nwere ike ịbịa ma nara ndị ndú ndị Juu ahụ ‘ma ebe ha ma mba ha.’—Jọn 11:48.
-
-
Ònye Ka Ị Na-erubere Isi—Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?Ụlọ Nche—2005 | Disemba 15
-
-
a “Siza” ahụ ndị isi nchụàjà ahụ nakweere n’ihu ọha n’oge ahụ bụ Eze Ukwu Taịbiriọs nke Rom bụ́ onye e ledara anya, onye ihu abụọ na ogbu ọchụ. Ihe ọzọ e ji mara Taịbiriọs bụ omume ọjọọ ya nke ịkwa iko.—Daniel 11:15, 21.
-