Mara Jehova Site n’Okwu Ya
“Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—JỌN 17:3.
1, 2. (a) Gịnị ka “ịmara” na “ihe ọmụma” dị ka e ji ha mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ pụtara? (b) Ihe atụ ndị dị aṅaa na-eme ka ihe nke a pụtara doo anya?
ỊMARA mmadụ dị ka nanị onye a maara ma ọ bụ inwe ihe ọmụma na-abaghị ime banyere otu ihe, erughị eru ịbụ nkọwa nke okwu ahụ bụ́ “ịmara” ma ọ bụ “ihe ọmụma” dị ka e si jiri ha mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ. Na Bible, nke a gụnyere “omume nke ịmara ihe site n’ahụmahụ,” ihe ọmụma nke na-ekwupụta “mmekọrịta nke ntụkwasị obi n’etiti mmadụ abụọ.” (The New International Dictionary of New Testament Theology) Nke ahụ gụnyere ịmara Jehova site n’ọrụ aka ya kpọmkwem, dị ka ọtụtụ ihe omume ahụ dị n’akwụkwọ Ezikiel ebe Chineke mezuru ihe e kpere n’ikpe megide ndị na-eme ihe ọjọọ, na-ekwupụta: ‘I wee mara na mụ onwe m bụ Jehova.’—Ezikiel 38:23.
2 A pụrụ iji ihe atụ ole na ole mee ka ọtụtụ ụzọ dị iche iche a pụrụ isi jiri “ịmara” na “ihe ọmụma” mee ihe doo anya. Jisọs kwuru, sị “Ọ dịghị mgbe ọ bụla m maara unu”; o bu n’uche na o nweghị ihe ọ bụla jikọtara ya na ha. (Matiu 7:23) Ndị Kọrịnt nke Abụọ 5:21 na-asị na Kraịst “amaghị mmehie.” Nke ahụ apụtaghị na ọ maghị ihe ọ bụla banyere mmehie, kama na o tinyeghị onwe ya n’ime ya. N’otu aka ahụ, mgbe Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst,” ọ gụnyere ihe dị ukwu karịa nanị ịmara ihe ụfọdụ banyere Chineke na Kraịst.—Tụlee Matiu 7:21.
3. Gịnị na-anwapụta na Jehova na-egosipụta akara e ji amata ezi Chineke ahụ?
3 A pụrụ ịmara ọtụtụ àgwà Jehova site n’Okwu ya, bụ́ Bible. Otu n’ime ha bụ ikike nke ibu amụma n’ụzọ ziri ezi. Nke a bụ ihe e ji mara ezi Chineke ahụ: “Ka ha bute ha nso, gosi anyị ihe ahụ nke ga-eme: gosinụ ihe nile e mere na mgbe mbụ, ihe ha bụ, ka anyị wee tụkwasị ha obi anyị, wee mara ikpeazụ ha; ma ọ bụ meenụ ka anyị nụrụ ihe ahụ nile nke na-abịa. Gosinụ ihe ahụ nile nke ga-abịa n’ọdịnihu, ka anyị wee mara na chi ka unu bụ.” (Aịsaịa 41:22, 23) N’Okwu ya, Jehova kwuru ihe ndị mbụ banyere okike nke elu ala na ndụ dị n’elu ya. Ọ gwara anyị ogologo oge tupu ha emee ihe ndị ga-eme ma emesịa na ndị mezukwaranụ. Ọbụnakwa ugbu a ọ ‘na-eme ka anyị nụrụ ihe ahụ nile nke na-abịa,’ karịsịa ihe ndị ga-eme “na mgbe ikpeazụ” ndị a.—2 Timoti 3:1-5, 13; Jenesis 1:1-30; Aịsaịa 53:1-12; Daniel 8:3-12, 20-25; Matiu 24:3-21; Mkpughe 6:1-8; 11:18.
4. Olee otú Jehova siworo jiri àgwà ya nke ike mee ihe, oleekwa otú ọ ka ga-esi jiri ya mee ihe?
4 Àgwà ọzọ Jehova nwere bụ ike. Ọ pụtara ìhè n’eluigwe ebe kpakpando ndị na-arụ ọrụ dị ka ọkụ na-agbaze ike atọm na-awụpụ ìhè na okpomọkụ. Mgbe ndị mmadụ na ndị mmụọ ozi na-enupụ isi mara ọkaaka Jehova aka, ọ na-eji ike ya eme ihe dị ka “onye agha,” na-echebe aha ọma na ụkpụrụ ezi omume ya. N’oge ndị dị otú ahụ ọ naghị egbu oge ịwụpụ ikike n’ụzọ na-ebibi ebibi, dị ka n’oge Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, ná mbibi nke Sọdọm na Gọmọra, nakwa ná mgbapụta nke Israel gabiga Osimiri Uhie. (Ọpụpụ 15:3-7; Jenesis 7:11, 12, 24; 19:24, 25) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eji ike ya mee ihe iji ‛zọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu.’—Ndị Rom 16:20.
5. Tinyere ike ya, àgwà ọzọ dị aṅaa ka Jehova nwekwara?
5 Ma, ọbụna n’agbanyeghị ike ndị a nile a na-akparaghị ókè, e nwere umeala n’obi. Abụ Ọma 18:35, 36 kwuru, sị: “Umeala n’obi nke gị na-emekwa m ka m baa ụba. I na-eme ka nzọụkwụ m saa mbara n’okpuru m.” Umeala n’obi nke Chineke na-enye ya ohere ịbụ onye “na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu.”—Abụ Ọma 113:6, 7.
6. Àgwà dị aṅaa nke Jehova na-azọpụta ndụ?
6 Obi ebere Jehova n’imeso mmadụ ihe na-azọpụta ndụ. Lee aha obi ebere e gosiri Manase mgbe a gbaghaara ya, ọ bụ ezie na o mewo oké ihe ọjọọ! Jehova sịrị: “Mgbe m na-asị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ; o wee si ná mmehie ya chigharịa, mee ihe e kpere n’ikpe na ezi omume; mmehie ya nile nke o mehieworo a gaghị echeta ha megide ya: ihe e kpere n’ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghị ịdị ndụ.” (Ezikiel 33:14, 16; 2 Ihe Emere 33:1-6, 10-13) Jisọs na-eṅomi Jehova mgbe ọ gbara ume ka a na-agbaghara ruo 77 ugboro, ọbụna ugbo 7 n’otu ụbọchị!—Abụ Ọma 103:8-14; Matiu 18:21, 22; Luk 17:4.
Chineke nke Na-enwe Mmetụta
7. Olee otú Jehova si dị iche n’ebe chi nile nke ndị Grik nọ, ihe ùgwù dịkwa aṅaa meghepụrụ nye anyị?
7 Ndị ọkà ihe ọmụma Grik, dị ka ndị Epicurean, kwenyere n’ọtụtụ chi ma na-ele ha anya dị ka ndị nọpụrụ anya n’ebe ụwa nọ nke na ha enweghị mmasị n’ahụ mmadụ ma ọ bụ bụrụ ndị mmetụta ya na-emetụ n’ahụ. Lee ka mmekọrịta dị n’etiti Jehova na Ndịàmà ya kwesịrị ntụkwasị obi si dị iche! “Ihe ndị ya na-atọ Jehova ụtọ.” (Abụ Ọma 149:4) Ndị ọjọọ bi tupu Iju Mmiri ahụ mere ya ka ọ kwaa ụta o wee “wute ya n’obi ya.” Ndị Israel site n’ekwesịghị ntụkwasị obi ha, wetaara Jehova ihe mgbu na mwute. Ndị Kraịst site n’erubeghị isi ha, pụrụ iwetara mmụọ Jehova iru uju; otú ọ dị, site n’ikwesị ntụkwasị obi ha, ha pụrụ iwetara ya ọṅụ. Lee ihe ijuanya ọ bụ iche na mmadụ efu nọ n’elu ala pụrụ ime ka Onye Okike nke eluigwe na ala nwee mwute ma ọ bụ ọṅụ! N’ihi ihe nile ọ na-emere anyị, lee aha ihe ịtụnanya ọ bụ na anyị nwere ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ime ya obi ụtọ!—Jenesis 6:6; Abụ Ọma 78:40, 41; Ilu 27:11; Aịsaịa 63:10; Ndị Efesọs 4:30.
8. Olee otú Abraham si jiri nkwuwa okwu o nwere n’ebe Jehova nọ mee ihe?
8 Okwu Chineke na-egosi na ịhụnanya Jehova na-enye anyị ohere nke “nkwuwa okwu” dị ukwuu. (1 Jọn 4:17) Rịba ama ọnọdụ Abraham mgbe Jehova bịara ibibi Sọdọm. Abraham gwara Jehova, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na ị ga-ekpochapụ ndị ezi omume tinyere ndị na-emebi iwu? Eleghị anya [iri ndị ezi omume ise] dị n’obodo ahụ: ọ̀ ga-abụ ezie na ị ga-ekpochapụ ebe ahụ ghara ịgbaghara ya n’ihi [iri mmadụ ise ndị ezi omume] nọ n’ime ya? . . . ya bụrụ gị ihe arụ: onye ikpe ụwa nile, ọ́ gaghi eme ihe e kpere n’ikpe?” Leenụ ụdị okwu ndị a gwara Chineke! N’agbanyeghị nke ahụ Jehova kwere ịzọpụta Sọdọm ma ọ bụrụ na 50 ndị ezi omume nọ n’ebe ahụ. Abraham nọgidere, wee welata ọnụ ọgụgụ ahụ, site na 50 ruo 20. Ụjọ tụrụ ya na ọ pụrụ ịbụ na ọ na-arịọbiga arịriọ oké. O kwuru, sị: “Biko, ka Onyenwe anyị ghara iwe iwe dị ọkụ, ka m kwukwa okwu nanị otu ugbo a: eleghị anya a ga-achọta n’ebe ahụ iri.” Ọzọ Jehova kwetara: “M gaghị ebibi ya n’ihi iri ahụ.”—Jenesis 18:23-33.
9. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka Abraham kwuo okwu dị ka o si kwuo, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
9 N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka Abraham nwee ụdị nkwuwa okwu dị otú ahụ iji kwuo okwu n’ụzọ dị otú a? Otu ihe bụ na Jehova maara mmetụta nkụda mmụọ nke Abraham na-enwe. Ọ maara na nwa nwoke nwanne Abraham bụ́ Lọt bi na Sọdọm, Abraham nwekwara nchegbu banyere ịnọ ná nchebe ya. Ọzọkwa, Abraham bụ enyi Chineke. (Jemes 2:23) Mgbe mmadụ gwara anyị okwu n’olu ike, ànyị na-agbalị ịmata mmetụta kpaliri okwu ya ma chebara ọnọdụ ndị na-ebelata ihe mgbu echiche, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ enyi nke nọ n’okpuru ụdị nrụgide ụfọdụ nke mmetụta uche? Ọ́ bụghị ihe nkasị obi ịhụ na Jehova ga-aghọta ojiji anyị ji nkwuwa okwu eme ihe, dị ka o mere n’ebe Abraham nọ?
10. Olee otú nkwuwa okwu na-esi enyere anyị aka n’ekpere?
10 Karịsịa mgbe anyị chọrọ ya dị ka “Onye na-anụ ekpere” ka anyị na-achọsị ike nkwuwa okwu nke a iji gwa ya ihe nile na-esogbu anyị, mgbe anyị nwere obi ịda mba na nchekasị dị ukwuu nke uche. (Abụ Ọma 51:17; 65:2, 3) Ọbụna n’oge ndị ahụ mgbe anyị na-apụghị ikwuli ihe ọ bụla, “mmụọ nsọ onwe ya weere ịsụ ude a na-apụghị ikwu na-arịọrọ anyị arịrịọ,” Jehova na-anụkwa. Ọ pụrụ ịmara echiche anyị: “Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya. N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, lee, Jehova, ị machasịwo ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ịnọ na-arịọ, na-achọ, na-akụ aka.—Ndị Rom 8:26; Abụ Ọma 139:2, 4; Matiu 7:7, 8.
11. Olee otú e si gosi na Jehova na-eche banyere anyị?
11 Jehova na-eche banyere anyị. Ọ na-enye ndụ o kere eke ihe ndị dị mkpa. “Anya ihe nile na-ele anya gị; gị onwe gị na-enyekwa ha ihe oriri ha na mgbe ya. Ị na-asaghe aka gị, ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” (Abụ Ọma 145:15, 16) A na-akpọ anyị òkù ịhụ otú ọ na-esi enye nnụnụ nọ n’ime ọhịa nri. Lee urodi nọ n’ime ubi, otú o si yikwasị ha uwe mara mma. Jisọs gbakwụnyere na Chineke ga-emere anyị otú ahụ, ọbụna karịa ka o na-emere ha. Ya mere n’ihi gịnị ka anyị ji echegbu onwe anyị? (Deuterọnọmi 32:10; Matiu 6:26-32; 10:29-31) Pita nke Mbụ 5:7 na-akpọ unu òkù ka unu “na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.”
“Onyinyo nke Ụdị Ya”
12, 13. Tinyere ịhụ Jehova site n’ihe ndị o kere eke na ọrụ ya ndị e dekọrọ n’ime Bible, olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi hụ ma nụ okwu ya?
12 Anyị pụrụ ịhụ Jehova Chineke site n’ihe o kere eke; anyị pụrụ ịhụ ya site n’ịgụ banyere ọrụ ya nile n’ime Bible; anyị pụkwara ịhụ ya site n’okwu na ọrụ ndị e dekọrọ banyere Jisọs Kraịst. Jisọs n’onwe ya kwuru otú ahụ na Jọn 12:45, sị: “Onye na-ahụ m na-ahụkwa onye zitere m.” Ọzọkwa, na Jọn 14:9: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” Ndị Kọlọsị 1:15 kwuru, sị: “[Jisọs] bụ onyinyo nke Chineke ahụ nke a na-apụghị ịhụ anya.” Ndị Hibru 1:3 kwupụtara, sị: “[Jisọs] bụ nnwupụ nke ebube [Chineke] na onyinyo nke ụdị ya.”
13 Jehova zitere Ọkpara ya ọ bụghị nanị iweta ihe mgbapụta kamakwa isetipụ ihe nlereanya a ga-eṅomi, ma n’okwu ọnụ ma n’omume. Jisọs kwuru okwu Chineke. O kwuru na Jọn 12:50, sị: “Ihe mụ onwe m na-ekwu, dị ka Nna m gwaworo m okwu, otú a ka m na-ekwu.” Na Jọn 5:30 o kwuru, sị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m.”—Jọn 6:38.
14. (a) Gịnị ka Jisọs hụrụ nke kpaliri ọmịiko ya? (b) N’ihi gịnị ka ụzọ Jisọs si ekwu okwu ji na-eme ka ndị mmadụ na-enuga ịnụ okwu ya?
14 Jisọs hụrụ ndị na-arịa ekpenta, ndị nwere nkwarụ, ndị ntị chiri, ndị ogbi, na ndị mmụọ ọjọọ ji nakwa ndị na-eruru ndị ha nwụrụ anwụ újú. N’ịbụ onye ọmịiko kpaliri, ọ gwọrọ ndị ọrịa ma kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ hụrụ ìgwè mmadụ a gbara akpụkpọ ma na-akwagharị n’ụzọ ime mmụọ, o wee malite izi ha ọtụtụ ihe. Ọ bụghị nanị na o ji okwu ndị kwesịrị ekwesị zie ihe, kamakwa okwu ndị sitere n’obi ya nke gara kpọmkwem n’obi nke ndị ọzọ, nke dọtara ha n’ebe ọ nọ, nke na-eweta ha n’ụlọ nsọ n’ezi oge ịnụ okwu ya, nke mere ka ha rapagidesie ike n’ebe ọ nọ, iji obi ụtọ na-ege ya ntị. Ha bịara n’ìgwè ịnụ okwu ya, na-ekwu na ‘ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.’ Ibobo ozizi ya nwụkwara ha n’ahụ. (Jọn 7:46; Matiu 7:28, 29; Mak 11:18; 12:37; Luk 4:22; 19:48; 21:38) Mgbe ndị iro ya chọkwara iji ajụjụ mata ya n’ọnyà, ọ gbanwere ọnọdụ ahụ, na-emechi ha ọnụ—Matiu 22:41-46; Mak 12:34; Luk 20:40.
15. Gịnị bụ isiokwu bụ isi nke nkwusa Jisọs, ruokwa ókè ha aṅaa ka o mere ka ndị ọzọ soro na-agbasa ya?
15 O kwupụtara na “alaeze eluigwe dị nso,” ma gbaa ndị na-ege ntị ume ịnọgide ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ya.’ O zipụrụ ndị ọzọ ikwusa na “alaeze eluigwe dị nso,” iji “mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,” ịbụ ndịàmà nke Kraịst “n’ebe ụwa sọtụrụ.” Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde Ndịàmà anọ na ọkara nke Jehova na-eje ije na nzọụkwụ ya, na-eme ihe ndị ahụ.—Matiu 4:17; 6:33; 10:7; 28:19; Ọrụ 1:8.
16. Olee otú e si tinye àgwà Jehova nke ịhụnanya n’ule siri ike, ma gịnị ka o mezuru nye ihe a kpọrọ mmadụ?
16 “Chineke bụ ịhụnanya,” ka a gwara anyị na 1 Jọn 4:8. E tinyere àgwà ya nke a pụrụ iche n’ụle sịkarisịrị oké ike a pụrụ iche n’echice mgbe o zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’elu ala ịbịa nwụọ. Ihe mgbu nke Ọkpara a a hụrụ n’anya nwetara na arịrịọ ọ rịọrọ Nna ya nke eluigwe aghaghị ịkpataworo Jehova ọtụtu ihe mgbu na mwute, ọ bụ ezie na Jisọs nwapụtara dị ka ụgha ịma aka Setan na Jehova apụghị inwe ndị mmadụ n’elu ala ndị pụrụ ijigide ikwesị ntụkwasị obi ha nye Ya n’okpuru ule siri oké ike. Anyị kwesịkwara igosi ekele maka ịdị ukwuu nke àjà Jisọs, n’ihi na Chineke zitere ya n’ebe a ịnwụ n’ihi anyị (Jọn 3:16) Nke a abụghị ọnwụ dị mfe dịkwa ngwa. Iji ghọta ihe o furu ma Chineke ma Jisọs ma si n’ụzọ dị otú ahụ ghọta ịdị ukwuu nke àjà ha chụrụ n’ihi anyị, ka anyị nyochaa ihe ndekọ Bible nke otú ihe ndị ahụ si mee.
17-19. Olee otú Jisọs si kọwaa ihe mgbu na-eche ya ihu?
17 Ọ dịkarịa ala ugbo anọ, Jisọs kọwaara ndị ozi ya ihe na-aga ime n’ọdịnihu. Nanị ụbọchi ole na ole tupu ya e were ọnọdụ, o kwuru, sị: “Lee, anyị na-arịgoro Jerusalem; a ga-ararakwa Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị isi nchụaja na ndị odeakwụkwọ; ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ, rara ya nye n’aka ndị mba ọzọ: ha ga-emekwa ya ihe ọchị, bụsa ya ọnụ mmiri, pịa ya ihe, gbuo ya.”—Mak 10:33, 34.
18 Jisọs nwetara mmetụta nrụgide nke ihe na-eche ya ihu, na-aghọta ịdị egwu nke ịpịa ihe ndị Rom. Ọnụ ọnụ nke ụtarị ahụ e ji akpụkpọ anụ mee a na-eji eme ihe maka ịpịa ihe nwere mkpụrụ ígwè na ọkpụkpụ atụrụ e tinyere n’ime ha; ya mere ka ịpịa ihe ahụ na-aga n’ihu, azụ na ụkwụ na-aghọ iberibe anụ ahụ ndị na-agba ọbara. Ọtụtụ ọnwa tupu nke a, Jisọs gosiri oké nrụgide mmetụta uche nke ihe mgbu dị n’ihu na-ewetara ya, na-ekwu, dị ka anyị na-agụ na Luk 12:50, sị: “Ma e nwere m baptism a ga-eji mee m baptism; o na-egbuwa m mgbu n’obi nke ukwuu ruo mgbe a ga-emezu ya.”
19 Nrugide ahụ rịrị elu ka oge ahụ na-eru nso. Ọ gwara Nna ya nke eluigwe banyere ya: “Ugbu a ka mkpụrụ obi m na-alọ m mmiri; gịnị ka m ga-ekwukwa? Nna, zọpụta m n’oge hour nke a.” (Jọn 12:27) Lee ka Jehova na-aghaghị isi nwee mmetụta site n’arịrịọ nke a sitere n’ọnụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya! Na Getsemane, nanị hour ole na ole tupu ọnwụ ya, obi lọrọ Jisọs mmiri nke ukwuu, o wee gwa Pita, Jemes, na Jọn, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ruo ọnwụ.” Minit ole na ole mgbe nke a gasịrị, o kpere ekpere ikpeazụ ya n’isiokwu ahụ nye Jehova: “Nna, ọ bụrụ na ọ dị gị mma, nara m iko a: otú ọ dị, ka e mee ihe gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe mụ onwe m na-achọ. Ma ebe ọ na-egbu ya mgbu n’obi ri nne o kpee ekpere si ike karịa: ọsụsọ ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.” (Matiu 26:38; Luk 22:42, 44) Nke a pụrụ ịbụ ihe a maara ná mmụta ahụ ike dị ka hematidrosis (nke pụtara isi n’akpụkpọ ahụ agbapụta ọbara ma ọ bụ ihe ndị mejupụtara ọbara) Ọ bụ ihe a na-adịghị ahụkebe ma ọ pụrụ ime n’ọnọdụ mmetụta uche dị elu.
20. Gịnị nyeere Jisọs aka ịgafe ihe mgbu ya?
20 Banyere oge a na Getsemane, Ndị Hibru 5:7 kwuru, sị: “N’ụbọchi nke anụ ahụ ya, mgbe ọ weresịrị ịkwa ákwá siri ike na anya miri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.” Ebe ọ bụ na “Onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya n’ọnwụ” azọpụtaghị ya, n’echiche dị aṅaa ka a nụrụ olu ya? Luk 22:43 na-aza, sị: “E wee mee ka ọ hụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe bịa, na-enye ya ike.” A zara ekpere ahụ n’ụdị na mmụọ ozi ahụ Chineke zitere nyere Jisọs ike n’ezie iji nagide ihe mgbu ahụ.
21. (a) Gịnị gosiri na Jisọs gafere ihe mgbu ahụ ná mmeri? (b) Mgbe ule anyị siri oké ike, olee otú anyị ga-esi achọ ikwu okwu?
21 Nke a pụtara ìhè site n’ihe si na nke a pụta. Mgbe ịgba mgba ime ya gasịrị, Jisọs biliri, laghachikwuru Pita, Jemes, na Jọn, wee sị: “Bilienụ, ka anyị jee.” (Mak 14:42) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ ọ na-asị, ‘Ka m gaa ka e jiri isusu ọnụ rara m nye, ka ìgwè mmadụ jide m, ka e kpee m ikpe n’ụzọ iwu na-akwadoghị, ka a maa m ikpe ọnwụ n’ụzọ na-ezighị ezi. Ka m gaa iji bụrụ onye a ga-akwa emo, bụọ ọnụ mmiri, pịa ihe, ma kpọgide n’elu osisi ịta ahụhụ.’ Ruo hour isii ọ nọ n’elu ebe ahụ ahụ, n’oké ihe mgbu, na-atachi obi ruo ọgwụgwụ. Ka ọ na-anwụ, o tiri mkpu ná mmeri, sị: “Ọ gwụwo.” (Jọn 19:30) Ọ nọgidewo na-anọgidesi ike ma gosipụta iguzosi ike n’ezi ihe ya n’ikwado ọkaaka Jehova. O mezuwo ihe nile Jehova zitere ya n’elu ala ime. Mgbe anyị nwụrụ ma ọ bụ mgbe Amagedọn bịara, ànyị ga-enwe ike ịsị banyere ọrụ anyị natara site n’aka Jehova, sị: “Ọ gwụwo”?
22. Gịnị na-egosi ọ̀tụ̀tụ̀ nke mgbasa nke ihe ọmụma Jehova?
22 Otú ọbụna o si dị, anyị pụrụ ijide n’aka na n’oge Jehova nke na-abịa ngwa ngwa, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị ka ịmara na inwe ihe ọmụma pụtara?
◻ Olee otú e siworo gosi anyị ebere na mgbaghara Jehova n’Okwu ya?
◻ Olee otú Abraham si jiri nkwuwa okwu o nwere n’ebe Jehova nọ mee ihe?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji ele Jisọs anya ma hụ àgwà dị iche iche nke Jehova n’ime ya?