Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 2/15 p. 10-15
  • Ihe Mgbapụta Ruru Eru n’Ihi Mmadụ Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mgbapụta Ruru Eru n’Ihi Mmadụ Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Iseokwu Ndị A Gaje Idozi
  • Ihe Mgbapụta: Ihe Mkpuchi
  • Ihe Mgbapụta Ruru Eru
  • Ònye Wetara Ihe Mgbapụta ahụ?
  • “E Mezuwo Ya!”
  • Jehova Enye “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 2/15 p. 10-15

Ihe Mgbapụta Ruru Eru n’Ihi Mmadụ Nile

“Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—MATIU 20:28.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye kasị ukwuu Chineke nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Abamuru dị aṅaa na-abịa site n’inyocha ihe mgbapụta ahụ?

IHE mgbapụta ahụ bụ onyinye kasị ukwuu Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ. Site ‘n’ihe mgbapụta ahụ,’ anyị pụrụ inwe “mgbaghara nke ndahie nile anyị.” (Ndị Efesọs 1:7) Ọ bụ ntọala nke olileanya maka ndụ ebighị ebi, ma ọ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala nke bụ paradaịs. (Luk 23:43; Jọn 3:16) N’ihi ya, ndị Kraịst pụkwara inwe ọnọdụ dị ọcha n’ihu Chineke ọbụna ugbu a.—Mkpughe 7:14, 15.

2 Ya mere, ihe mgbapụta ahụ abụghị ihe na-edoghị anya ma ọ bụ ihe na-adịghị adị n’ezie. Ebe o nwere ntọala iwu kwadoro nke gbanyere mkpọrọgwụ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke, ihe mgbapụta ahụ pụrụ iweta ezi abamuru ndị a pụrụ ịhụ anya. Akụkụ ụfọdụ nke ozizi nke a pụrụ ibụ “nke dị ike ịghọta.” (2 Pita 3:16) Ma ị ga-achọpụta na mgbalị e tinyere inyocha ihe mgbapụta ahụ nke ọma kwesịrị nnọọ ekwesị, n’ihi na ọ na-egosipụta ịhụnanya karịsịrị ihe nile nke Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Ịghọta isi ihe dị n’ihe mgbapụta ahụ bụ ịghọta otu akụkụ bụ isi nke “akụ nke amamihe na nke ihe ọmụma” dị omimi nke Chineke.—Ndị Rom 5:8; 11:33.

Ihe Iseokwu Ndị A Gaje Idozi

3. Olee ụzọ o si dị mkpa inwe ihe mgbapụta, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Chineke na-apụghị ilefuru nnọọ mmehie ihe a kpọrọ mmadụ anya?

3 Ihe mgbapụta ahụ dịrị mkpa n’ihi mmehie nke mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, onye nyefere ụmụ ya ihe nketa ahụ na-abaghị uru nke ọrịa, nrịrịa, iru újú, na ihe mgbu. (Ndị Rom 8:20) N’ihi ezughị okè e bu pụta ụwa, ndị nile sitere n’usoro Adam bụ “ụmụ nke iwe,” ndị kwesịrị ọnwụ. (Ndị Efesọs 2:3; Deuterọnọmi 32:5) Chineke apụghị iji mmetụta na-enweghị ụkpụrụ mee ihe wee gbaghara nnọọ ihe a kpọrọ mmadụ n’echeghị echiche. Okwu nke ya onwe ya na-egosi na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Iji wee lefuru mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ anya, Chineke ga-elefuruworị ụkpụrụ ezi omume ya anya, wee na-eme ka ụkpụrụ ikpe ziri ezi nke ya onwe ya ghara ịdị irè! (Job 40:8) Ma, “ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ọnọdụ guzosiri ike nke ocheeze [Chineke].” (Abụ Ọma 89:14) Nchigharị ọ bụla o mere pụọ n’ebe ezi omume dị ga-abụ ịgba mmebi iwu ume, mebiekwa ọnọdụ ya dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala.—Tụlee Eklisiastis 8:11.

4. Ihe iseokwu dịgasị aṅaa ka nnupụisi Setan kpaliri?

4 Ọ dịkwa mkpa ka Chineke dozie ihe iseokwu ndị ọzọ nnupụisi Setan welitere, bụ́ ihe iseokwu ndị ịdị mkpa ha dị ukwuu karịa ọnọdụ ọjọọ ụmụ mmadụ nọ na ya. Setan tinyere ihe ịrụ ụka n’aha ọma Chineke nwere site n’ibo Jehova ebubo ịbụ onye ụgha na onye ọchịchị aka ike obi tara mmiri, onye na-anapụ ndị o kere eke ihe ọmụma na nnwere onwe. (Jenesis 3:1-5) N’ịga n’ihu, site n’ime ihe yiri ka ò mebiri nzube Chineke nke iji ụmụ mmadụ ndị ezi omume mejupụta ụwa, Setan mere ka Chineke yie onye dara ada ná mgbalị ya. (Jenesis 1:28; Aịsaịa 55:10, 11) Setan jikwa anya ike kwugide ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe, na-ebo ebubo ahụ nke bụ na ha na-ejere Ya ozi nanị n’ihi ọdịmma nke onwe ha. Setan nyara isi na ọ bụrụ na e tinye ha n’ọnọdụ ihe isi ike, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ga-anọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke!—Job 1:9-11.

5. N’ihi gịnị ka Chineke na-apụghị ilefuru ihe ịma aka nile Setan welitere anya?

5 A pụghị ilefuru ihe ịma aka ndị a anya. Ọ bụrụ na a hapụ ha n’azaghị ha aza, a ga-emesịa kpochapụ obi ike na nkwado e nwere n’ebe ọchịchị Chineke dị. (Ilu 14:28) Ọ bụrụ na iwu na ụkpụrụ adakpọọ, ọgba aghara ọ́ gaghị ejupụta n’eluigwe na ala? O si otú a bụrụ na Chineke ji ya onwe ya na ụzọ ezi omume ya nile dị ka ụgwọ iwepụ ịbụ ọkaaka ya n’ụta. O ji ya ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi dị ka ụgwọ ikwe ka ha gosipụta nguzosi ike ha n’ebe ọ nọ. Nke a pụtara imeso ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie ihe n’ụzọ nke ga-edebe ihe iseokwu ndị dị mkpa n’ọnọdụ mbụ. O mesịrị gwa Israel, sị: “Mụ onwe m, ọbụna mụ onwe m, bụ onye ahụ nke na-echichapụ njehie gị nile n’ihi mụ onwe m.”—Aịsaịa 43:25.

Ihe Mgbapụta: Ihe Mkpuchi

6. Olee okwu ụfọdụ e ji mee ihe n’ime Bible iji kọwaa ụzọ Chineke nke ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ?

6 N’Abụ Ọma 92:5 anyị na-agụ, sị: “Lee ka ọrụ gị nile si dị ukwuu, Jehova! Echiche gị miri emi nke ukwuu.” Ya mere, ọ chọrọ mgbalị ka anyị wee ghọtazuo ihe Chineke meere ihe a kpọrọ mmadụ. (Tụlee Abụ Ọma 36:5, 6.) Ọ bụ ihe obi ụtọ na Bible na-enyere anyị aka ịghọta ihe site n’iji okwu ndị dị iche iche mee ihe, bụ́ ndị na-akọwa oké ọrụ nile nke Chineke ma ọ bụ ndị na-eme ihe atụ ha, site n’ụzọ dị iche iche e si ele ihe anya. Bible na-ekwu okwu banyere ihe mgbapụta ahụ dị ka ihe nzụta, ihe ime ka a dịghachi n’otu, ihe ịjụrụ obi, ihe nnapụta, na ihe mkpuchi mmehie. (Abụ Ọma 49:8; Daniel 9:24; Ndị Galetia 3:13; Ndị Kọlọsi 1:20; Ndị Hibru 2:17) Ma eleghị anya, okwu nke kọwara ihe nke ọma karịsịa bụ nke ahụ Jisọs n’onwe ya ji mee ihe na Matiu 20:28: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta [Grik, lyʹtron] n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”

7, 8. (a) Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu Grik na Hibru ndị dịịrị ihe mgbapụta? (b) Mee ihe atụ ụzọ ihe mgbapụta si chọọ ka e nwee nkwekọrịta.

7 Gịnị bụ ihe mgbapụta? Okwu Grik ahụ bụ lyʹtron bụ nke e nwetara site na ngwaa nke pụtara “ịtọhapụ ihe.” E jiri ya mee ihe ịkọwa ụgwọ a na-akwụ iji nweta ntọhapụ nke ndị a dọọrọ n’agha. Otú ọ dị, n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, okwu ahụ dịịrị ihe mgbapụta, bụ́ koʹpher, sitere na ngwaa nke pụtara ‘ikpuchi’ ma ọ bụ ‘iji ihe kpuchie.’ Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Noa ka o jiri bitumen techie (ka·pharʹ) ụgbọ ahụ. (Jenesis 6:14) Ya mere, site n’ile ihe anya n’ụzọ dị otú a, ịgbapụta, ma ọ bụ ikpuchi mmehie pụtara iji ihe techie mmehie.—Abụ Ọma 65:3.

8 Akwụkwọ bụ Theological Dictionary of the New Testament kwuru na koʹpher “na-egosikarị ihe ya na ihe hà,” ma ọ bụ nkwekọrịta. Otú a, ihe mkpuchi (kap·poʹreth) nke igbe ọgbụgba ndụ ahụ kwekọrọ n’ọdịdị nke igbe ahụ n’onwe ya. N’otu aka ahụkwa, n’ikpuchi mmehie, ma ọ bụ n’inye ihe mgbapụta, ikpe ziri ezi nke Chineke na-achọ ‘mkpụrụ obi n’ọnoḍụ mkpụrụ obi, anya n’ọnọdụ anya, ézé n’ọnọdụ ézé, aka n’ọnọdụ aka, ụkwụ n’ọnọdụ ụkwụ.’ (Deuterọnọmi 19:21) Ma mgbe ụfọdụ, a pụrụ imezu ihe ikpe ziri ezi chọrọ site n’iji ihe ya na ihe hà nye n’ọnọdụ ịta ahụhụ siri ike. Iji mee ihe atụ: Ọpụpụ 21:28-32 na-ekwu okwu banyere oké ehi nke sọgburu mmadụ na mpì. Ọ bụrụ na onye nwe ya maara ọnọdụ ehi ahụ ma ghara ime ihe ọ bụla iji gbochie ya imerụ mmadụ ahụ, a pụrụ ime ka o jiri ndụ nke ya onwe ya kpuchie, ma ọ bụ kwụọ ụgwọ maka ndụ nke onye ahụ e gburu egbu! Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ụta nile adịrịghị onye nwe ehi ahụ? Ọ ga-adị mkpa ka o weta koʹpher, bụ́ ihe ọ ga-eji kpuchie njehie ya. Ndị ikpe a họpụtara ahọpụta pụrụ ikwu ka o nye ihe mgbapụta, ma ọ bụ kwụọ nhá, dị ka ihe iji napụta onwe ya.

9. Olee ụzọ ọnọdụ metụtara ụmụ e buru ụzọ mụọ n’Israel si mee ihe atụ ịha nhata a chọrọ n’ọnụ ahịa nnapụta?

9 Okwu Hibru ọzọ dịịrị “ịgbapụta” bụ pa·dhahʹ, bụ́ ngwaa nke isi ihe ọ pụtara bụ ‘ịnapụta.’ Ọnụ Ọgụgụ 3:39-51 mere ihe atụ nke otú ọnụ ahịa ihe nnapụta ga-esi bụrụ ihe zuru ezu kpọmkwem. Ebe ọ napụtaworo ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ndị Israel site n’ogbugbu n’oge Ememe Ngabiga nke afọ 1513 T.O.A, ọ bụ Chineke nwe ha. Otú a, ọ pụrụ ikwuworị ka nwa mbụ nile e buru ụzọ mụọ n’Israel na-ejere ya ozi n’ụlọ nsọ ya. Kama nke ahụ, Chineke nakweere “ọnụ ahịa nnapụta” (pidh·yohmʹ, bụ́ okwu mkpọaha e nwetara site na pa·dhahʹ), na-enye iwu, sị: “Ị ga-ewekwara m ndị Livaị . . . n’ọnọdụ ụmụ nile e buru ụzọ mụọ n’etiti ụmụ Israel.” Ma ihe ndochi anya ahụ aghaghị ịbụ nke zuru ezu kpọmkwem. A gụrụ ndị nile nọ n’agbụrụ Livaị ọnụ: 22,000 ndị ikom. Ihe ọzọ e mere bụ ịgụ ụmụ Israel nile e buru ụzọ mụọ ọnụ: 22,273 ndị ikom. Ọ bụ nanị site n’ịkwụ ‘ihe mgbapụta’ nke shekel ise maka otu onye ọ bụla ka a pụrụ ịnapụta ụma 273 ụmụ ahụ e buru ụzọ mụọ, ha wee bụrụ ndị a tọhapụrụ site n’ije ozi ụlọ nsọ.

Ihe Mgbapụta Ruru Eru

10. N’ihi gịnị ka àjà ụmụ na-apụghị ikpuchi mmehie nile nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu?

10 Nkọwa ndị e nyeworo na-egosi na ihe mgbapụta aghaghị ịbụ ihe ya na ihe ọ na-anọchi anya ya, ma ọ bụ ihe ọ na-ekpuchi, hà nhata. Àjà ụmụ anụmanụ nke ndị nwere okwukwe site n’Ebel gaa n’ihu chụrụ apụghị ikpuchi mmehie mmadụ n’ezie, ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ dị elu karịa ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị uche. (Abụ Ọma 8:4-8) Otú a, Pọl pụrụ ide na “ọbara nke oké ehi na nke ewu apụghị iwepụ mmehie.” Àjà ndị dị otú ahụ pụrụ ịnọ nanị dị ka mkpuchi ihe onyinyo, ma ọ bụ nke ihe atụ, n’ichere ihe mgbapụta ahụ nke gaje ịbịa.—Ndị Hibru 10:1-4.

11, 12. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị mkpa ka ọtụtụ puku nde mmadụ nwụọ ọnwụ ọchụchụ àjà iji kpuchie mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Ọ̀ bụ nanị ònye pụrụ ije ozi dị ka “ihe mgbapụta ruru eru,” nzube dị aṅaa ka ọnwụ ya na-emezukwa?

11 Ihe mgbapụta nke a e sere onyinyo ya aghaghị ịbụ nke ya na Adam hà nhata, ebe ọ bụ na amamikpe ọnwụ ahụ nke Chineke mara Adam n’ụzọ ikpe ziri ezi rụpụtara amamikpe nye agbụrụ mmadụ dum. Ndị Kọrint nke Mbụ 15:22 na-asị, “Ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam.” Ya mere, ọ dịghị mkpa ka ọtụtụ puku nde ụmụ mmadụ n’otu n’otu nwụọ ọnwụ ọchụchụ àjà iji wee mee ihe kwekọrọ na nke ọ bụla n’ụmụ Adam. “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa.” (Ndị Rom 5:12) ‘Ebe ọnwụ sitekwara n’aka mmadụ,’ ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ pụkwara ịbịa ‘site n’aka mmadụ.’—1 Ndị Kọrint 15:21.

12 Mmadụ nke pụrụ ịbụ ihe mgbapụta ahụ aghaghị ịbụ onye zuru okè nke nwere anụ ahụ na ọbara—ihe ya na Adam hà nhata kpọmkwem. (Ndị Rom 5:14) Onye bụ mmụọ ma ọ bụ “onye bụ Chineke, bụrụkwa mmadụ” agaghị eme ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe ziri ezi guzozie. Ọ bụ nanị mmadụ zuru okè, onye na-anọghị n’okpuru amamikpe ọnwụ ahụ Adam wetara, pụrụ inye “ihe mgbapụta ruru eru” bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ zuru okè n’ebe Adam nọ. (1 Timoti 2:6, NW)a Site n’iwepụta onwe ya iji ndụ ya chụọ àjà, “Adam ikpeazụ” nke a pụrụ ịkwụ ụgwọ nke mmehie ‘mmadụ mbụ ahụ bụ Adam.’—1 Ndị Kọrint 15:45; Ndị Rom 6:23.

13, 14. (a) Adam na Iv hà na-erite uru site n’ihe mgbapụta ahụ? Kọwaa. (b) Olee ụzọ ihe mgbapụta ahụ si abara ndị si n’usoro ọmụmụ Adam uru? Mee ihe atụ.

13 Otú ọ dị, ma Adam ma Iv adịghị nke ritere uru site n’ihe mgbapụta ahụ. Iwu Mosis ahụ nwere ụkpụrụ nke a: “Unu anarakwala ihe mgbapụta n’ọnọdụ ndụ ogbu mmadụ, nke ikpe ịnwụ ọnwụ maworo.” (Ọnụ Ọgụgụ 35:31) E duhieghị Adam, ya mere, mmehie ya bụ nke a ma ụma, lezie anya mee. (1 Timoti 2:14) Ọ pụtara igbu ụmụ ya, n’ihi na ha ketara ezughị okè ya ugbu a, wee si otú a na-abịa n’okpuru amamikpe nke ọnwụ. N’ụzọ doro anya, Adam kwesịrị ịnwụ ọnwụ, n’ihi na dị ka mmadụ zuru okè, o leziwo anya họrọ inupụ isi n’iwu Chineke. Ọ gaara abụworị ihe megidere ụkpụrụ ezi omume nke Jehova ka o jiri ihe mgbapụta ahụ mee ihe ga-abara Adam uru. Otú ọ dị, ịkwụ ụgwọ mmehie Adam wetara ihe mere ka amamikpe ọnwụ nke dịkwasịrị ụmụ Adam ghara ịdịkwa irè. (Ndị Rom 5:16) N’okwu iwu, e gbubipụwo ike mbibi ihe nke mmehie site n’isi mmalite ya. Onye wetara ihe mgbapụta ahụ ‘detụrụ ọnwụ ire n’ihi mmadụ nile ọ bụla,’ na-eburu ihe sitere ná mmehie nke ụmụ Adam nile.—Ndị Hibru 2:9; 2 Ndị Kọrint 5:21; 1 Pita 2:24.

14 Iji mee ihe atụ: Jiri anya nke uche gị lee otu nnukwute ụlọ ọrụ nke nwere ọtụtụ narị ndị ọrụ. Otu onye nlekọta ụlọ ọrụ nke na-adịghị eme ihe n’eziokwu mere ka ụlọ ọrụ ahụ dakpọọ; ụlọ ọrụ ahụ mechiri. Ọtụtụ narị mmadụ enweghịkwa ọrụ ugbu a, ha enweghịkwa ike ịkwụ ụgwọ ndị ha ji. Di ma ọ bụ nwunye ha, ụmụ ha, na, n’ezie, ndị nile ha ji ụgwọ, na-ata ahụhụ n’ihi àgwà ọjọọ nke otu onye ahụ! Mgbe ahụ otu onye ọgaranya nke bụ omepụrụ onye ọ dịịrị bịara wee kwụọ ụgwọ nile ụlọ ọrụ ahụ ji ma mepeghachi ya. Ịkagbu otu ụgwọ ahụ wetakwaara ọtụtụ ndị ahụ e were n’ọrụ, ezinụlọ ha, na ndị ha ji ụgwọ nnapụta zuru ezu. Ma, onye nlekọta ọrụ mbụ ahụ ọ̀ ga-eketa okè site n’ihe ịga nke ọma ọhụrụ nke a? Ee e, ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, wee sikwa otú a bụrụ onye a chụrụ n’ọrụ kpam kpam! N’otu aka ahụ, nkagbu nke otu ụgwọ ahụ Adam ji na-ewetara ọtụtụ nde ndị sitere n’usoro ọmụmụ ya uru—ma o wetaraghị Adam.

Ònye Wetara Ihe Mgbapụta ahụ?

15. Ònye pụrụ iweta ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

15 Onye ọbụ abụ ahụ kwara àrị̀rị̀ kwuo, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla ga-agbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: (n’ihi na mgbapụta mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ ahịa, ọ ga-ahakwa ya aka ruo mgbe ebighị ebi).” Nsụgharị The New English Bible na-ekwu na ọnụ ahịa ihe mgbapụta ahụ bụ “ihe karịrị ike ya ịkwụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 49:7, 8) Ya mere, ònye ga-eweta ihe mgbapụta ahụ? Ọ bụ nanị Jehova pụrụ iweta ‘Nwa Atụrụ ahụ zuru okè nke na-ebupụ mmehie nke ụwa.’ (Jọn 1:29) Chineke eziteghị mmụọ ozi ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ chụrụ àjà ahụ kasị elu nke izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ “ihe na-atọ ya ụtọ kwa ụbọchị.”—Ilu 8:30; Jọn 3:16.

16. (a) Olee ụzọ Ọkpara Chineke si wee bụrụ onye a mụrụ dị ka mmadụ zuru okè? (b) Gịnị ka a pụrụ ịkpọ Jisọs n’echiche metụtara iwu?

16 Site n’iji afọ ofufo kere òkè ná ndokwa nke a Chineke mere, Ọkpara Chineke ‘napụrụ onwe ya’ ọdịdị ya nke eluigwe. (Ndị Filipaị 2:7) Jehova bufere ike ndụ na ọdịdị mmadụ nke Ọkpara o buru ụzọ mụọ n’eluigwe gaa n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke onye Juu aha ya bụ Meri. Mgbe ahụ, mmụọ nsọ ‘kpuchiri ya,’ na-eme ka e jide n’aka na nwa ahụ nke na-etolite n’ime akpa nwa ya ga-adị nsọ, n’enweghị mmehie ma ọlị. (Luk 1:35; 1 Pita 2:22) Dị ka mmadụ, aha ya ga-abụ Jisọs. Ma n’ụzọ metụtara iwu, a pụrụ ịkpọ ya ‘Adam nke abụọ,’ n’ihi na o kwekọrọ n’ụzọ zuru okè n’ebe Adam nọ. (1 Ndị Kọrint 15:45, 47) Otú a, Jisọs pụrụ ịchụ onwe ya n’àjà dị ka “nwa atụrụ nke ọrụ ma ọ bụ ntụpọ na-adịghị ya n’ahụ,” ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ ndị na-emehie emehie.—1 Pita 1:18, 19.

17. (a) Ònye ka a kwụrụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Ebe ọ bụ Chineke nyere, natakwa ihe mgbapụta ahụ, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji mee mgbanwerịta ahụ ma ọlị?

17 Ma, ọ̀ bụ onye ka a ga-akwụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ? Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ọkà mmụta okpukpe Krisendọm rụrụ ụka na ọ bụ Setan bụ Ekwensu ka a kwụrụ ya. Nke bụ eziokwu bụ na ihe a kpọrọ mmadụ abụwo ‘ndị e rere ịnọ n’okpuru’ mmehie, wee si otú a banye n’okpuru nduzi nke Setan. (Ndị Rom 7:14; 1 Jọn 5:19) Ma ọ bụ Jehova, ọ bụghị Setan, “na-abọ ọ́bọ̀ maka mmehie.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:6) Ya mere, dị ka Abụ Ọma 49:7 kwuru hoo haa, ihe mgbapụta ahụ bụ nke a ‘ga-enye Chineke.’ Jehova wetara ihe mgbapụta ahụ, ma mgbe a chụsịrị Nwa Atụrụ nke Chineke n’àjà, a ghaghị ịkwụghachi Chineke ọnụ ahịa nke ihe mgbapụta ya. (Tụlee Jenesis 22:7, 8, 11-13; Ndị Hibru 11:17.) Nke a emeghị ka ihe mgbapụta ahụ bụrụ ihe dị ala ruo n’ókè nke ịbụ mgbanwerịta efu nke mmetụta dị omimi na-adịghị na ya dị ka à ga-asị na e si n’otu akpa wepụta ego ma tinye ya n’akpa ọzọ. Ihe mgbapụta ahụ abụkebeghị mgbanwerịta ihe efu, kama o metụtakarịrị ihe banyere ụkpụrụ iwu. Site n’ịnọgidesi ike n’ịchọ ka a kwụọ ihe mgbapụta—ọbụna nke ga-efu ya ihe dị ukwuu—Jehova mesiri ike nnọgidesi ike ya n’ụkpụrụ ezi omume.—Jemes 1:17.

“E Mezuwo Ya!”

18, 19. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Jisọs taa ahụhụ?

18 N’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.A., oge ruru maka ịkwụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ. E jidere Jisọs Kraịst n’ebubo ụgha dị iche iche, maa ya ikpe, wee kpọgide ya n’elu osisi e ji egbu mmadụ. O jiri “ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri” kpekuo Chineke ekpere n’ihi oké ihe mgbu na mweda n’ala nke a wetara. (Ndị Hibru 5:7) Ọ̀ dị mkpa ka Jisọs taa ahụhụ n’ụzọ dị otú a? Ee, n’ihi na site n’ịnọgide bụrụ “onye dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie,” ruokwa ọgwụgwụ, Jisọs doziri ihe iseokwu ahụ metụtara ịnọgide n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè.—Ndị Hibru 7:26.

19 Ịta ahụhụ Kraịst mekwara ihe iji mee ka o zuo okè maka ọrụ ya dị ka Onye Isi Nchụaja nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ gaghị abụ onye ọchịchị aka ike nke na-adịghị enwe obi ebere. “N’ihi na ebe ya onwe ya hụworo ahụhụ site n’ọnwụnwa a nwara ya, ọ pụrụ inyere ndị a na-anwa aka.” (Ndị Hibru 2:10, 18; 4:15) Jisọs nwere ike iji ume ikpeazụ ya tie mkpu mmeri ahụ, bụ́ “E mezuwo ya!” (Jọn 19:30, NW) Ọ bụghị nanị na o gosipụtawo nguzosi ike n’ezi ihe nke ya onwe ya, kama o nwewo ihe ịga nke ọma n’ịtọ ntọala maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ—nke dịkwa mkpa karị, maka iwepụ ịbụ ọkaaka nke Jehova n’ụta!

20, 21. (a) Gịnị mere e ji kpọlite Kraịst site n’ọnwụ? (b) N’ihi gịnị ka e ji mee ka Jisọs Kraịst ‘dịrị ndụ ná mmụọ ya’?

20 Ma, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi jiri ihe mgbapụta ahụ mee ihe ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie uru? Ọ̀ bụ òle mgbe? Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? A hapụghị okwu ndị a ka ha nọrọ n’elebaraghị ha anya. N’ụbọchị atọ mgbe ọnwụ Kraịst gasịrị, Jehova kpọlitere ya site ná ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ 3:15; 10:40) Site n’oké ihe omume nke a, nke bụ ihe ọtụtụ narị ndị hụrụ ya n’onwe ha gbaworo akaebe banyere ya, ọ bụghị nanị na Jehova kwụghachiri Ọkpara ya ụgwọ maka ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, kama o nyekwara ya ohere ịrụzu ọrụ nnapụta ya.—Ndị Rom 1:4; 1 Ndị Kọrint 15:3-8.

21 Jisọs bụ onye “e mere ka ọ dị ndụ ná mmụọ ya,” o nweghịkwa onye maara ihe mere anụ ahụ ya. (1 Pita 3:18; Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:27) Dị ka onye bụ mmụọ e kere eke, Jisọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilite pụrụ ịlaghachi n’eluigwe ugbu a ná mmeri. Lee nnọọ ọṅụ a na-akparaghị ókè a na-aghaghị inweworị n’eluigwe n’oge ahụ! (Tụlee Job 38:7.) Ọ bụghị nanị ka e wee nabata ya ka Jisọs ji laghachi. Ọ bịara ịrụ ọrụ ndị ọzọ, gụnyere ime ka o kwe agbụrụ mmadụ dum omume irite uru site n’ihe mgbapụta ya. (Tụlee Jọn 5:17, 20, 21.) Ụzọ o si mee nke a na ihe ọ pụtara nye ihe a kpọrọ mmadụ ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a, bụ́ an·tiʹly·tron, apụtaghị ebe ọ bụla ọzọ n’ime Bible. E nwere njikọ dị n’etiti ya na okwu ahụ Jisọs jiri mee ihe maka ihe mgbapụta (lyʹtron) na Mak 10:45. Otú ọ dị, Akwụkwọ The New International Dictionary of New Testament Theology na-eme ka ọ pụta ìhè na an·tiʹly·tron ‘mesiri ike echiche nke ime mgbanwerịta.’ N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, nsụgharị New World Translation dere ya “ihe mgbapụta ruru eru.”

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ Ihe iseokwu dịgasị aṅaa dị mkpa nke ukwuu ọbụna karịa nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ?

◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ịgbapụta’ ndị mmehie?

◻ N’ebe ònye nọ ka Jisọs na-aghaghị ikwekọ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

◻ Ònye nyere ihe mgbapụta ahụ, ọ̀ bụkwa ònye ka a kwụrụ ụgwọ ahụ?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na a ga-akpọlite Kraịst n’ọnwụ dị ka onye bụ mmụọ?

[Foto dị na peeji nke 13]

Àjà ụmụ anụmanụ ezughị ezu ikpuchi mmehie ụmụ mmadụ; ha sere onyinyo àjà ahụ ka ukwuu nke gaje ịbịa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya