-
“O Bu Ụzọ Hụ Anyị n’Anya”Bịaruo Jehova Nso
-
-
Omume Ịhụnanya Kasịnụ
4. Olee otú otu onye agha Rom si bịa ghọta na Jizọs abụghị mmadụ nkịtị, gịnịkwa ka onye agha ahụ kwubiri?
4 Ma ọchịchịrị nke gbara tupu Jizọs anwụọ ma oké ala ọma jijiji nke mere mgbe ọ nwụsịrị juru ọchịagha ndị Rom nke e nyere ọrụ ịhụ maka ogbugbu e gburu Jizọs, anya. Ọ sịrị: “N’ezie onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Matiu 27:54) O doro anya na Jizọs abụghị mmadụ nkịtị. Onye agha ahụ nyere aka gbuo Ọkpara Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu mụrụ nanị ya! Olee nnọọ otú Ọkpara a dịruru oké ọnụ ahịa nye Nna ya?
5. Olee otú a pụrụ isi maa atụ nnukwute oge Jehova na Ọkpara ya nọkọworo n’eluigwe?
5 Bible kpọrọ Jizọs, “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Cheedị echiche—Ọkpara Jehova dị adị tupu eluigwe na ala nkịtị amalite ịdị. Ya bụrụ otú ahụ, ogologo oge ha aṅaa ka Nna ahụ na Ọkpara ahụ nọkọworo? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na eluigwe na ala dị ijeri afọ 13. Ị̀ pụrụ ọbụna iji uche gị chee otú afọ ahụ ha n’ogologo? Iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta afọ ole eluigwe na ala dịworo dị ka ndị ọkà mmụta sayensị na-eche, otu ụlọ ebe a na-egosi ụwa mbara ígwé dị iche iche na otú ha si agagharị nwere otu eriri e ji agụ oge, nke dị mita 110 n’ogologo. Ka ndị bịara ilegharị anya na-aga ije n’akụkụ eriri ahụ, ụkwụ ọ bụla ha zọrọ na-anọchite anya ihe dị ka nde afọ 75 eluigwe na ala dịruworo. N’isi njedebe nke eriri ahụ, e ji otu kpọm nke ha ibu ka otu agịrị isi mmadụ nọchite anya oge nile mmadụ dịworo ndụ! Ma, ọ bụrụgodị na afọ ole a ha na-eme atụmatụ na eluigwe na ala dị ziri ezi, ogologo eriri ahụ dum agaghị ezu iji gosi afọ ole Ọkpara Jehova dịworo ndụ! Gịnị ka ọ nọ na-arụ oge ahụ nile?
6. (a) Gịnị ka Ọkpara Jehova nọ na-arụ tupu ya aghọọ mmadụ? (b) Ụdị nkekọ dị aṅaa dị n’etiti Jehova na Ọkpara ya?
6 Ọkpara ahụ ji obi ụtọ jee ozi dị ka “onye ọkà” nke Nna ya. (Ilu 8:30) Bible na-ekwu, sị: “Ma ọ́ bụghịkwa site n’aka [Ọkpara ahụ] ọ dịghị ọbụna otu ihe e mere ka ọ dịrị.” (Jọn 1:3) Ya mere, Jehova na Ọkpara ya rụkọrọ ọrụ ọnụ iji kee ihe ndị ọzọ nile. Lee oge na-akpali akpali, nke na-enye obi ụtọ ọ bụụrụ ha! Ọtụtụ ndị ga-ekweta na ịhụnanya nke na-adị n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa ya na-esi ike nke ukwuu. Ịhụnanya ‘bụkwa ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.’ (Ndị Kọlọsi 3:14) Mgbe ahụ, ònye n’ime anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ zuru ezu otú nkekọ nke dịworo n’ime ogologo oge dị otú ahụ siruru ike? N’ụzọ doro anya, nkekọ ịhụnanya kasị ike e nwetụrụla jikọtara Jehova Chineke na Ọkpara ya.
7. Mgbe e mere Jizọs baptizim, olee otú Jehova si gosipụta mmetụta ya banyere Ọkpara ya?
7 Ka o sina dị, Nna ahụ zitere Ọkpara ya n’ụwa ka a mụọ ya dị ka nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ. Ya ime otú ahụ pụtara na ruo iri afọ ole na ole, Jehova ga-akwụsị iso Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-enwe mmekọrịta chiri anya n’eluigwe. O ji oké mmasị na-ekiri site n’eluigwe ka Jizọs tolitere ma ghọọ nwoke zuru okè. Mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ 30, e mere ya baptizim. Ọ baghịrị anyị uru ịkọwa nkọ otú obi dị Jehova n’ebe ọ nọ. Nna ya si n’eluigwe kwuo okwu n’onwe ya, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Nna Jizọs aghaghị inweworịị obi ụtọ dị ukwuu ịhụ na o ji ikwesị ntụkwasị obi mezuo ihe nile e buru n’amụma, ihe nile a chọrọ ka o mee!—Jọn 5:36; 17:4.
8, 9. (a) Gịnị ka Jizọs gabigara na Naịsan 14, 33 O.A., oleekwa otú ọ dị Nna ya nke eluigwe? (b) Gịnị mere Jehova ji kwe ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ?
8 Otú ọ dị, olee otú obi dị Jehova na Naịsan 14, 33 O.A.? Olee otú obi dị ya mgbe a raara Jizọs nye, mgbe ìgwè na-eme ihe ike jidekwara ya n’abalị ahụ? Mgbe ndị enyi Jizọs gbahapụrụ ya na mgbe e kpere ya ikpe n’ụzọ iwu na-akwadoghị? Mgbe a na-akwa ya emo, na-abụ ya asọ mmiri, ma na-esu ya ọkpọ? Mgbe a na-apịa ya ihe, pịarisie ya azụ? Mgbe a kpọrọ ya ntú n’ụkwụ na n’aka, kpọgide ya n’otu ogologo ogwe osisi ma hapụ ya n’elu ebe ahụ ebe ndị mmadụ nọ na-akwa ya emo? Olee otú ọ dị Nna ya mgbe Ọkpara ọ hụrụ n’anya tikuru ya n’ihi oké ihe mgbu? Olee otú obi dị Jehova mgbe Jizọs kubiri ume nakwa nke mbụ ya kemgbe a malitere ike ihe, mgbe Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-adịkwaghị?—Matiu 26:14-16, 46, 47, 56, 59, 67; 27:38-44, 46; Jọn 19:1.
“Chineke . . nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya”
9 Anyị agaghị akọli ya. Ebe ọ bụ na Jehova nwere mmetụta, anyị agaghị akọwali mwute o nwere n’ihi ọnwụ nke Ọkpara ya. Ihe a ga-akọwali bụ nzube Jehova mere o ji kwe ka o mee. Gịnị mere Nna ya ji tinye onwe ya n’ọnọdụ ga-eme ka o nwee mmetụta dị otú ahụ? Jehova na-ekpughere anyị otu ihe magburu onwe ya na Jọn 3:16—amaokwu Bible nke dị oké mkpa nke na a kpọwo ya Oziọma n’ụdị dị ntakịrị. Ọ na-ekwu, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ya mere, nzube Jehova ji kwe ka o mee bụ nke a: ịhụnanya. Onyinye Jehova—nzite o zitere Ọkpara ya ịbịa taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị—bụ omume ịhụnanya kasịnụ e metụworo.
-
-
“O Bu Ụzọ Hụ Anyị n’Anya”Bịaruo Jehova Nso
-
-
12 A·gaʹpe na-ezo aka n’ịhụnanya nke ụkpụrụ na-achịkwa. Ya mere, ọ bụghị nanị imeghachi omume n’ihe mmadụ kwuru ma ọ bụ mee n’ihi mmetụta uche. Ọ na-agụnye ọtụtụ ihe karị, ọ na-esite n’ichemi echiche na ịkpachapụ anya mee ihe. Karịsịa, a·gaʹpe adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị ma ọlị. Dị ka ihe atụ, lee anya ọzọ na Jọn 3:16. Olee “ụwa” Chineke hụrụ n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya? Ọ bụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta. Nke ahụ na-agụnye ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-agbaso ụzọ mmehie ná ndụ ha. Jehova ọ̀ hụrụ onye nke ọ bụla n’anya dị ka enyi ya, otú o si hụ Ebreham kwesịrị ntụkwasị obi n’anya? (Jems 2:23) Ee e, ma Jehova ji ịhụnanya mee ka ịdị mma ya ruo mmadụ nile, ọbụna n’agbanyeghị oké ihe o furu ya. Ọ chọrọ ka mmadụ nile chegharịa ma gbanwee ụzọ ha. (2 Pita 3:9) Ọtụtụ ndị na-eme otú ahụ. Ọ na-eji obi ụtọ anabata ndị a dị ka ndị enyi ya.
-