Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 6/1 p. 23
  • Chineke nke Nwere Mmasị Ịgbaghara Mmehie

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke nke Nwere Mmasị Ịgbaghara Mmehie
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Nọsie Ike n’Ozi Chineke Otú Pita Mere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 6/1 p. 23

Bịaruo Chineke Nso

Chineke nke Nwere Mmasị Ịgbaghara Mmehie

Jọn 21:15-17

“GỊ onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ihe a e kwuru na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova bụ́ Chineke na-agbaghara mmehie n’ụba. Otu ihe mere ná ndụ Pita onyeozi gosiri nke ọma na Jehova na-agbaghara mmehie “n’ụzọ dị ukwuu.”—Aịzaya 55:7.

Pita bụ otu n’ime ndị ha na Jizọs kacha kpachie anya. Ma, n’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, ụjọ jidere Pita, o wee mee mmehie dị oké njọ. Pita nọ na mbara èzí nke ebe a nọ kpee Jizọs ikpe na-ezighị ezi gọọ agọ n’ihu ọha, ọ bụghị naanị otu ugboro, kama ugboro atọ, na ya amaghị onye Jizọs bụ. Ozugbo Pita gọrọ agọ nke ugboro atọ, Jizọs ‘tụgharịrị legide Pita anya.’ (Luk 22:55-61) Chegodị echiche otú obi dị Pita mgbe Jizọs lere ya anya! Pita ghọtara na ya emeela oké mmehie, “o jitelighị onwe ya, o wee malite ibe ákwá.” (Mak 14:72) Ọ ga-abụ na onyeozi ahụ nke nwere nchegharị nọ na-eche n’ime obi ya ma Chineke ọ̀ ga-agbagharakwa ya ngọnahụ ahụ ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ.

Mgbe Jizọs bilitere n’ọnwụ, ya na Pita kparịtara ụka. Obi abụọ adịghị ya na ụka ha kparịtara mere ka o doo ya anya na a gbagharawo ya. Jizọs agwaghị ya okwu n’olu ike ma ọ bụ maa ya ikpe. Kama nke ahụ, ọ jụrụ Pita, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya?” Pita zara ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.” Jizọs asị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Jizọs jụrụ Pita ajụjụ ahụ nke ugboro abụọ, Pita azaakwa ya otu ihe ahụ, ma eleghị anya, zasitụkwuo ya ike. Jizọs asị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Mgbe ahụ, Jizọs jụkwara ya otu ajụjụ ahụ nke ugboro atọ, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya nke ukwuu? O wee wute Pita,” o wee, sị: “Onyenwe anyị, ị maara ihe niile; ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Jizọs wee sị ya: ‘Na-azụ ụmụ atụrụ m.’”—Jọn 21:15-17.

Gịnị mere Jizọs ji jụọ ya ajụjụ ndị ahụ, ọ bụ ezie na ọ maara azịza ha? Jizọs nwere ikike ịmata ihe dị mmadụ n’obi, ya mere, ọ maara na Pita hụrụ ya n’anya. (Mak 2:8) Ajụjụ ndị ahụ Jizọs jụrụ Pita nyere Pita ohere ikwu ugboro atọ na ya ka hụrụ Jizọs n’anya. Mgbe Jizọs gwara ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m. . . . Na-azụ ụmụ atụrụ m. . . . Na-azụ ụmụ atụrụ m,” o mere ka obi sie onyeozi ahụ nwere nchegharị ike na a ka tụkwasịrị ya obi. Ya mere, ihe Jizọs mere bụ inye Pita ọrụ ka o lekọtawa ihe dị oké ọnụ ahịa Jizọs nwere, ya bụ, ndị ọ hụrụ n’anya na-eso ụzọ ya. (Jọn 10:14, 15) Ọ ga-abụrịrị na obi ruru Pita ala mgbe ọ matara na Jizọs ka tụkwasịrị ya obi!

O doro anya na Jizọs gbaghaara onyeozi ya a nwere nchegharị. Ebe ọ bụ na Jizọs ṅomiri àgwà na ụzọ Nna ya n’ụzọ zuru okè, o doro anyị anya na Jehova gbaghakwaara Pita. (Jọn 5:19) Jehova anaghị ala azụ ịgbaghara mmehie, kama nke ahụ, ọ bụ Chineke ebere, onye dị “njikere ịgbaghara” onye mmehie nke nwere nchegharị. Nke a ọ́ naghị eme ka obi sie anyị ike?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya