Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 7/1 p. 15
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Igwe Ihe Ndị Na-emepụta Nri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ị̀ Na-ata Ikekere Ezé?
    Teta!—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 7/1 p. 15

Ị̀ MAARA?

Olee otú e si eji nkume igwe nri egwe ihe n’oge ochie?

N’oge ochie, a na-eji nkume igwe nri egweri ọka ka ọ bụrụ ntụ ọka e ji eme achịcha. N’ọtụtụ ezinụlọ, ụmụ nwaanyị ma ọ bụ ndị ohu na-eji nkume igwe nri egwe ihe n’ụbọchị ọ bụla. A na-anụkarị ụda ebe a na-egwe ihe n’ụlọ ndị mmadụ n’ụbọchị ọ bụla n’oge ochie.—Ọpụpụ 11:5; Jeremaya 25:10.

Ebe ndị Ijipt oge ochie kpụrụ onye ji nkume igwe nri egwe ihe

E nwere ihe ndị e sere ese na ihe ndị a kpụrụ akpụ gosiri otú e si eji nkume igwe nri egwe ihe n’oge ochie. E si n’Ijipt oge ochie nweta ha. Nkume igwe nri na-enwe ebe gbalitetụrụ elu, elu ya na-adịkwa larịị. A na-etinyezi ọka na ya na-egweri ya. Onye na-egwe nri na-esekpuru n’ihu nkume igwe nri, jiri aka nkume na-egwe ihe n’elu ya, ya gwere gaa ihu, ya egwere gaa azụ. Otu akwụkwọ kwuru na aka nkume e ji egwe ihe na-adịkarị n’agbata kilogram abụọ na kilogram anọ n’ịdị arọ. E jiri ya tụọ mmadụ, o nwere ike igbu onye ahụ.—Ndị Ikpe 9:50-54.

N’oge ochie, igwe nri dị ezinụlọ ọ bụla oké mkpa iji dị ndụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji nye iwu ka mmadụ ghara iburu nkume igwe nri dị ka ihe ibé. Na Diuterọnọmi 24:6, Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ga-eburu nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume igwe nri dị ka ihe ibé, n’ihi na ọ bụ mkpụrụ obi ka ọ na-eburu dị ka ihe ibé.”

Gịnị ka ‘ịnọ n’obi mmadụ’ pụtara?

Ebe Jọn onyeozi nọ n’obi Jizọs ka ha na-eme Ememme Ngabiga ikpeazụ ha mere

Baịbụl kwuru na Jizọs “nọ n’obi Nna ya.” (Jọn 1:​18) Ihe ọ pụtara bụ na Jizọs na Chineke dị n’ezigbo mma nakwa na ihe Jizọs dị Chineke mma. Ọ bụ otú ndị Juu si anọ n’oge ha na-eri nri ka e lekwasịrị anya kwuo na Jizọs “nọ n’obi Nna ya.”

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-abụ ndị Juu chọọ iri nri, ha anọrọ n’obere ihe ndina ndị dị gburugburu tebụl ha ga-anọ eri nri. Onye ọ bụla n’ime ha na-anọ ka ò dina edina, chee ihu ya ebe tebụl dị, gbatịa ụkwụ ya n’elu ihe ndina ahụ ma tụkwasị aka ekpe ya n’elu pilo. Otú a ha si anọ na-eme ka ha nwee ike iji aka nri ha na-eri nri. Otu akwụkwọ kwuru na ebe ọ bụ na ndị niile na-eri nri na tebụl na-eji aka ekpe ha atụkwasị n’elu pilo, otu onye nọrọ, ibe ya anọrọ ya n’ihu, “isi onye nọ n’ihu na-anọ nso n’obi onye nọ ya n’azụ. Ọ bụ ya mere e ji ekwu na onye ahụ ‘nọ n’obi’ onye nke ọzọ.”

A na-ewere na a kwanyeere mmadụ ùgwù pụrụ iche ma ọ bụrụ na onye ahụ nọ n’obi onye isi ezinụlọ ma ọ bụkwanụ n’obi onye kpọrọ oriri n’oge a na-eri nri. Ọ bụ ya mere na mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eme Ememme Ngabiga ikpeazụ ha mere, ọ bụ Jọn onyeozi, onye ‘Jizọs hụrụ n’anya,’ nọ nso n’obi Jizọs na-eri nri. Ọ bụkwa ya mere o ji dịrị Jọn mfe ‘ịdala azụ dabere n’obi Jizọs’ ma jụọ ya ajụjụ.​—⁠Jọn 13:​23-​25; 21:20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya