Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/15 p. 15-20
  • Ezi Ịhụnanya Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Ịhụnanya Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nlereanya Kasị Mma Anyị Nwere
  • Ezi Ihe Nlereanya nke Jisọs
  • Ihe Nlereanya nke Pọl
  • Ezi Ịhụnanya Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ n’Oge Anyị A
  • Ezi Ịhụnanya na Ije Ozi Anyị
  • Ọ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ n’Ụzọ Ndị Ọzọ
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
  • Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/15 p. 15-20

Ezi Ịhụnanya Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ

“Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha ya dị.”—NDỊ HIBRU 6:10.

1, 2. N’ihi gịnị ka ezi ịhụnanya ji bụrụ ihe na-enyeghachi anyị ụgwọ ọrụ n’onwe anyị?

ỊHỤNANYA nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị bụ àgwà kasị elu, kasị mma, kasị dịrị oké ọnụ ahịa anyị pụrụ igosipụta. Ịhụnanya nke a (Grik, aga’pe) na-achọ ihe dị ukwuu n’aka anyị mgbe nile. Ma n’ihi na ọ bụ Chineke nke ikpe ziri ezi na ịhụnanya kere anyị, anyị na-achọpụta na ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị bụ n’ezie ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. N’ihi gịnị ka o ji dịrị otú a?

2 Otu ihe mere ezi ịhụnanya ji na-enyeghachi ụgwọ ọrụ metụtara ụkpụrụ nke njikọ dị n’etiti uche na ahụ, nke bụ mmetụta echiche na uche na-enwe n’ahụ anyị. Otu onye ọkà n’ihe banyere nchekasị ekwuwo, sị: “‘Hụ onye agbata obi gị n’anya’ bụ otu n’ime aro ndị amamihe kasị dịrị na ha e nyetụworo n’ihe banyere ahụ ike.” Ee, “Onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ.” (Ilu 11:17) Okwu ndị a na-esonụ dịkwa mkpa otú ahụ: “Mkpụrụ obi nke na-agọzi agọzi [“nke na-emesapụ aka,” NW] ka a ga-eme ka ọ maa abụba: ọzọ, onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”—Ilu 11:25; tụlee Luk 6:38.

3. Olee ụzọ Chineke na-esi eme ihe iji mee ka ezi ịhụnanya bụrụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ?

3 Ịhụnanya bụkwa ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ihi na Chineke na-enyeghachi achọghị ọdịmma onwe onye nanị ụgwọ ọrụ. Anyị na-agụ, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka [Chineke] ga-akwụghachi ya.” (Ilu 19:17) Ndịàmà Jehova na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị a mgbe ha na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha maara na ‘Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ ha na ịhụnanya ha gosiri n’ebe aha ya dị.’—Ndị Hibru 6:10.

Ihe Nlereanya Kasị Mma Anyị Nwere

4. Ònye na-enye anyị ihe nlereanya kachasị mma nke na-egosi na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ, oleekwa ụzọ o siworo mee nke ahụ?

4 Ònye na-enye ihe nlereanya kachasị mma nke na-egosi na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ? Ee, ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ mere nke a ma ọ bụghị Chineke n’onwe ya! Ọ “hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya.” (Jọn 3:16) Onyinye o nyere Ọkpara ya ka ndị nile na-anakwere àjà mgbapụta ahụ ugbu a wee nwee ike inwe ndụ ebighị ebi furu Jehova ihe dị nnọọ ukwuu, o gosikwara n’ụzọ pụtara ìhè na o nwere ma ịhụnanya ma ọmịiko. A gara n’ihu igosikwa nke a site n’eziokwu ahụ nke bụ na ‘ná mkpagbu nile nke Israel n’Ijipt, ya ka a na-akpagbu.’ (Aịsaịa 63:9) Lee nnọọ ka ọ ga-esiworị bụrụ ihe mkpagbu nye Jehova ọbụna karị ịhụ ka Ọkpara ya na-ata ahụhụ n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ, ịnụkwa ka o tiri mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka ị hapụrụ nanị m?”—Matiu 27:46.

5. Gịnị meworo n’ihi na Chineke hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya nke ukwuu na o nyere Ọkpara ya dị ka ihe ịchụ àjà?

5 Jehova ọ̀ hụrụ ngosipụta nke ya onwe ya gosipụtara ezi ịhụnanya dị ka ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ? O mere nnọọ otú ahụ. N’ụzọ pụtara ìhè, lee nnọọ azịza Chineke nwere ike ịtụghachi n’ihu Ekwensu n’ihi na Jisọs gosiri onwe ya onye kwesịrị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe nile Setan mesoro ya! (Ilu 27:11) N’eziokwu, ihe nile Alaeze Chineke ga-emezu n’iwepụ aha Jehova n’ụta, iweghachi Paradaịs n’elu ala nke a, na inye ọtụtụ nde mmadụ ndụ ebighị ebi, ga-ewere ọnọdụ n’ihi na Chineke hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o nyere ihe kachasị oké ọnụ ahịa n’obi ya dị ka ihe ịchụ àjà.

Ezi Ihe Nlereanya nke Jisọs

6. Ịhụnanya kpaliri Jisọs ime gịnị?

6 Ezi ihe nlereanya ọzọ nke na-egosi na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ bụ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya, ịhụnanya ahụ kpalikwara Jisọs ime uche Jehova n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe ya. (Jọn 14:31; Ndị Filipaị 2:5-8) Jisọs nọgidere na-egosi ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, nke ahụ pụtara na ọ ghaghị ịrịọ Nna ya arịrịọ ‘site n’ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri.’—Ndị Hibru 5:7.

7. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jisọs siworo hụ na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ?

7 E nyeghachiri Jisọs ụgwọ ọrụ maka ịhụnanya dị otú ahụ nke ịchụ onwe onye n’àjà? N’ezie e mere otú ahụ! Chee echiche banyere ọṅụ o nwetara site n’ihe ọma nile o mere n’oge ije ozi ya nke were afọ atọ na ọkara. Lee ka o si nyere ụmụ mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ! Karịsịa ihe nile, site n’igosipụta na onye zuru okè pụrụ ịnọgidesi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè nye Chineke n’agbanyeghị ihe nile Setan pụrụ iweta megide ya, Jisọs nwere afọ ojuju nke igosipụta Ekwensu dị ka onye ụgha. Ọzọkwa, dị ka ohu Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, Jisọs natara nkwụghachi ụgwọ ahụ dị ukwuu nke anwụghị anwụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ gaa ná ndụ n’eluigwe. (Ndị Rom 6:9; Ndị Filipaị 2:9-11; 1 Timoti 6:15,16; Ndị Hibru 1:3, 4) Leekwa nnọọ ihe ùgwù dị ebube ndị na-echere ya n’ihu n’Amagedọn nakwa n’oge Ọchịchị Puku Afọ ya, mgbe a ga-eweghachite Paradaịs n’elu ala, kpọghachitekwa ọtụtụ puku nde ụmụ mmadụ site n’ọnwụ! (Luk 23:43) E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na Jisọs achọpụtawo na ezi ịhụnanya bụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ.

Ihe Nlereanya nke Pọl

8. Gịnị bụ ahụmahụ Pọl n’ihi ezi ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke na mmadụ ibe ya nọ?

8 N’otu mgbe, Pita onyeozi jụrụ Jisọs, sị: “Lee, anyị onwe anyị hapụrụ ihe nile, wee soo gị; gịnịkwa ka anyị ga-enwe?” N’otu akụkụ, Jisọs zara, sị: “Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-anata ya ọtụtụ okpukpu karị, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” (Matiu 19:27-29, NW) Anyị nwere ihe nlereanya pụtara ìhè banyere nke a n ‘onyeozi ahụ bụ Pọl, bụ́ onye nwetara ọtụtụ ngọzi, dị ka e dekọrọ ya karịsịa site n’aka Luk n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi. Ezi ịhụnanya maka Chineke na mmadụ ibe ya kpaliri Pọl ịhapụ ọrụ ya dị ka onye Farisii a na-enye nsọpụrụ. Cheekwa echiche banyere ihe Pọl nagidere n’ụdị nke ihe otiti, ịnọ ọnwụ nso, ịnọ n’ihe ize ndụ, na ịnọ n’ụkọ—ihe nile n’ihi ezi ịhụnanya o nwere maka Chineke na ozi Ya dị nsọ.—2 Ndị Kọrint 11:23-27.

9. Olee ụzọ e si nyeghachi Pọl ụgwọ ọrụ maka igosipụta ezi ịhụnanya?

9 Jehova ò nyeghachiri Pọl ụgwọ ọrụ n’ihi ịbụ ezi ihe nlereanya dị otú ahụ n’igosipụta ezi ịhụnanya? Ọ dị mma, cheedị echiche banyere otú ije ozi Pọl si mịpụta mkpụrụ. O nwere ike iguzobe ọtụtụ ọgbakọ ndị Kraịst. Leekwa nnọọ ọtụtụ ọrụ ebube Chineke nyere ya ike ịrụ! (Ọrụ 19:11, 12) Pọl nwekwara ihe ùgwù nke ịnata ọhụụ ndị karịrị ike mmadụ, nakwa nke ide akwụkwọ ozi 14 dị iche iche ndị bụ akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst ugbu a. Iji mee ka ihe ndị a nile zuo ezu, e nyere ya ihe mgbata n’ọsọ ahụ nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:53, 54; 2 Ndị Kọrint 12:1-7; 2 Timoti 4:7, 8) N’ezie, Pọl chọpụtara na Chineke na-enyeghachi ezi ịhụnanya ụgwọ ọrụ.

Ezi Ịhụnanya Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ n’Oge Anyị A

10. Gịnị ka ọ pụrụ iwe iji ghọọ onye na-eso ụzọ Jisọs nakwa iji gosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ?

10 Ndịàmà Jehova n’oge a achọpụtawokwa na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. Igosipụta ịhụnanya anyị nwere maka Jehova site n’iwere ọnọdụ anyị n’akụkụ ya, nakwa n’ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs pụrụ ọbụna ịnapụ anyị ndụ anyị dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Tụlee Mkpughe 2:10.) Ọ bụ ya mere Jisọs ji kwuo na anyị kwesịrị ịgụzi ihe ọ ga-ewe. Ma anyị anaghị eme nke ahụ ka anyị wee kpebie ma ịbụ onye na-eso ụzọ ọ̀ bụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ma ọ bụ na ọ bụghị. Kama, anyị na-eme nke ahụ iji kwadebe onwe anyị ịkwụ ihe ọ bụla ọ ga-ewe iji bụrụ onye na-eso ụzọ.—Luk 14:28.

11. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-eji ala azụ n’ịrara onwe ha nye Chineke?

11 Taa, ọtụtụ ndị—nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o ruru ọtụtụ nde mmadụ—na-ekwere n’ozi ahụ Ndịàmà Jehova na-ewetara ha site n’Okwu Chineke. Ma ha na-ala azụ site n’ịrara onwe ha nye Chineke na ịbụ ndị e mere baptism. Nke a ọ̀ pụrụ ịdị otu a n’ihi na ha enweghị ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, bụ́ nke ndị ọzọ nwere? Ọtụtụ ndị na-ala azụ n’ime nraranye na baptism n’ihi na ha chọrọ ịnọgide na-enweta ihu ọma nke di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe. Ndị ọzọ adịghị abịa Chineke nso n’ihi na ha nwere àgwà nke otu onye oji ego achụ ego, onye gwara otu Onyeàmà, sị: “Mmehie na-amasị m,” N’eziokwu, ndị dị otú ahụ enweghị ekele n’ihe nile Chineke na Kraịst mewooro ha.

12. Gịnị ka magazin nke a kwuworo nke na-egosi ụgwọ ọrụ nke ihe ọmụma nke na-adọrọ anyị bịa Chineke nso n’ezi ịhụnanya?

12 Ọ bụrụ na anyị nwere ezi ekele maka ihe nile Jehova Chineke na Jisọs Kraịst mewooro anyị, anyị ga-egosi nke a site n’ịdị njikere ịkwụ ihe ọ bụla ọ ga-ewe iji jeere Nna anyị nke eluigwe ozi nakwa iji bụrụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs. N’ihi ezi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ, ndị ikom na ndị inyom ndị nọ n’ọnọdụ dị iche iche ná ndụ—ndị oji ego achụ ego ihe na-agara nke ọma, ndị a maara nke ọma n’egwuregwu dị iche iche, na ọtụtụ ndị ọzọ—ejiwo nchụso ndị na-achọ ọdịmma onwe ha gbanwere ije ozi ndị Kraịst, dị ka Pọl onyeozi mere. Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ ha ga-anara n’ọnọdụ ụgwọ ọrụ nile ha na-enweta site n’ịmara na ijere Chineke ozi. N’ihe banyere nke a, ỤIọ Nche kwuru n’otu mgbe gara aga, sị: “Mgbe ụfọdụ, anyị ajụwo, sị, Òle n’ime unu, ụmụnna anyị, ga-adị njikere ịnara otu puku dollar maka ihe ọ maara banyere Eziokwu ahụ? Anyị adịghị ahụ onye ọ bụla weliri aka ya elu! Ònye ga-anara puku dollar iri? Ọ dịghị onye ọ bụla! Ònye ga-anara otu nde dollar? Ònye ga-anara ụwa dum n’ọnọdụ ihe ọ maara banyere Ọdịdị Chineke na Atụmatụ Chineke ahụ? Ọ dịghị onye anyị na-ahụ! Mgbe ahụ, anyị sịrị, Unu abụghị ìgwè mmadụ ndị na-enweghị afọ ojuju, ezi ndị enyi anyị. Ya bụrụ na unu nwere mmetụta nke ndị bụ ọgaranya ruo n’ókè nke na unu agaghị anara ihe ọ bụla iji gbanwere ihe ọmụma Chineke unu nwere, mgbe ahụ, unu nwere mmetụta nke ndị bara ọgaranya dị ka anyị nwekwara.” (December 15, 1914, peji 377 [Bekee]) Ee, ezi ihe ọmụma nke Chineke na nzube ya nile na-adọta anyị nso ebe ọ nọ n’ezi ịhụnanya nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ezie.

13. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee ọmụmụ ihe onwe onye anya?

13 Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-agbalịsi ike ịmara ya na ime uche ya. (1 Jọn 5:3) Anyị ga-ele ọmụmụ ihe onwe onye, ikpe ekpere, na ijezu nzukọ ndị Kraịst nile anya dị ka ihe dị oké mkpa. Ihe ndị a nile chọrọ iji onwe onye chụọ àjà, n’ihi na ihe omume ndị a metụtara imefu oge, ike, na ihe onwunwe ndị ọzọ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee nhọrọ n’etiti ikiri ihe omume telivishọn na ikere òkè n’ọmụmụ Bible onwe onye. Ma lee nnọọ ka anyị na-esi bụrụ ndị siwanyere ike n’ime mmụọ, ka anyị na-esi nwee ike ịgbara ndị ọzọ àmà nke ọma karị, na-enwetakwa ihe dị ukwuu karị site ná nzukọ ndị Kraịst dị iche iche mgbe anyị ji ọmụmụ ihe dị otú a kpọrọ ihe, wepụtakwa oge zuru ezu maka ya! —Abụ Ọma 1:1-3.

14. Ruo ókè ha aṅaa ka ekpere na ezi mmekọrịta nke anyị na Jehova Chineke dị mkpa?

14 Ànyị na-enweta ọṅụ n’ịgwa Nna anyị nke eluigwe okwu mgbe mgbe site ‘n’ịnọgidesi ike n’ikpe ekpere’? (Ndị Rom 12:12) Ka ànyị na-abụkarị ndị ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na anyị adịghị eji ohere nke a dị oké ọnụ ahịa na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị? ‘Ikpe ekpere n’esepụghị aka’ bụ ụzọ dị oké mkpa iji wusie mmekọrịta anyị na Jehova Chineke ike. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) E nweghịkwa ihe ọ bụla ọzọ dịruru mma ka inwe ezi mmekọrịta nke anyị na Jehova iji nyere anyị aka mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ihu. Gịnị mere ka Josef nwee ike iguzogide ya mgbe nwunye Pọtifa nwara ya ọnwụnwa? Ọ̀ bụkwa gịnị mere Daniel akwụsịghị ikpe ekpere mgbe iwu ndị Midia na Peasia machibidoro ya ikpeku Jehova ekpere? (Jenesis 39:7-16; Daniel 6:4-11) Ee, ezi mmekọrịta dị n’etiti ha na Chineke nyeere ndị ikom ahụ aka inwe mmeri, ọbụna dị ka ọ ga-enyere anyị aka imekwa!

15. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee nzukọ ndị Kraịst anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

15 Ọzọkwa, ruo ókè ha aṅaa ka anyị na-ele ijezu nzukọ ise ndị anyị na-enwe n’izu anya dị ka ihe dị mkpa? Anyị na-ekwe ka ike ọgwụgwụ, ahụ esichaghị ike, ma ọ bụ ọnọdụ ihu igwe na-adịchaghị mma gbochie anyị imezu ihe dịịrị anyị nke bụ ịghara ịhapụ nzukọ nke anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị? (Ndị Hibru 10:24, 25) Otu onye America nke na-eji ígwè ọrụ arụ ọrụ, onye a na-akwụ ụgwọ dị mma hụrụ na ọrụ ya na-egbochi ya ọtụtụ mgbe ije nzukọ ndị Kraịst dị iche iche. Ya mere, ọ gbanwere ọrụ ya, na-anara mfu nke ego ka o wee nwee ike ijezu nzukọ ọgbakọ nile. Nzukọ anyị nile na-eme ka anyị nwee ike inweta ọṅụ site ná mgbanwerịta nke agbamume nakwa iwulirịta okwukwe ibe anyị elu. (Ndị Rom 1:11, 12) N’ihe ndị a nile, ọ̀ bụ na anyị adịghị achọpụta na “onye ghara mkpụrụ n’ụba ga-ewetakwa ihe ubi n’ụba.” (2 Ndị Kọrint 9:6, NW) Ee, igosipụta ezi ịhụnanya n’ụzọ ndị dị otú a na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nke ukwuu.

Ezi Ịhụnanya na Ije Ozi Anyị

16. Gịnị ka ọ pụrụ ịrụpụta mgbe ịhụnanya kpaliri anyị ịgba àmà mberede?

16 Ịhụnanya na-akpali anyị ikwusa ozi ọma ahụ dị ka ndị Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ na-akpali anyị ikere òkè n’ịgba àmà mberede. Anyị pụrụ ịla azụ n’ịgba àmà mberede, ma ịhụnanya ga-akwagide anyị ikwu okwu. N’eziokwu, ịhụnanya ga-eme ka anyị chepụta ụzọ ndị dị akọ anyị ga-eji malite mkparịta ụka, wee duzie ya gaa n’ihe banyere Alaeze ahụ. Iji mee ihe atụ: Mgbe ọ nọ n’ime ụgbọ elu, otu onye Kraịst bụ okenye ọgbakọ hụrụ na ya nọdụrụ ala n’akụkụ onye ụkọchukwu Roman Katọlik. Ná mmalite, onye okenye ahụ ji ajụjụ ndị na-adịghị akpasu iwe na-awụkwasị onye ụkọchukwu ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọ na-erule oge onye ụkọchukwu ahụ hapụrụ ụgbọ elu ahụ, mmasị o nwere akpaliwo ya ịnata akwụkwọ anyị abụọ. Lee nnọọ ezi ihe a rụpụtara site n’ịgba àmà mberede!

17, 18. Ịhụnanya ga-akpali anyị ime gịnị n’ihe banyere ije ozi ndị Kraịst?

17 Ezi ịhụnanya na-akpalikwa anyị ikere òkè mgbe nile n’ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ụdị ndị ọzọ nke ije ozi ndị Kraịst. Ruo ókè anyị nwere ike inwe mkparịta ụka ndị dabeere na Bible, anyị ga na-ewetara Jehova Chineke nsọpụrụ, na-enyekwara ndị yiri atụrụ aka ịbata n’ụzọ ahụ nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi. (Tụlee Matiu 7:13, 14.) Ọbụna ma a sị na anyị enweghị ike inwe mkparịta ụka ndị dabeere na Bible, mgbalị anyị nile agaghị abụ ihe laworo n’iyi. Nanị ọbịbịa anyị bịara n’ụlọ ndị mmadụ nọ dị ka ịgba àmà, anyị onwe anyị na-eritekwa uru site n’ije ozi ahụ, n’ihi na anyị apụghị ikwusa eziokwu ndị dị na Bible n’ewusighị okwukwe nke anyị onwe anyị ike. N’eziokwu, ọ na-ewe ịdị umeala n’obi ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ‘na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma ahụ, ka anyị wee bụrụ ndị na-eso ndị ọzọ na-ekekọ ya.’ (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Ma n’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị nọ, anyị na-eji obi dị umeala na-etinye mgbalị, a na-ejikwa ngọzi ndị bara ụba na-enyeghachi anyị ụgwọ ọrụ.—Ilu 10:22.

18 Ọ na-ewekwa ezi ịhụnanya ka ndị ohu Jehova jiri ezi akọ na uche na-eme nletaghachi n’ụlọ ndị gosiri mmasị n’eziokwu Bible. Iduzi ọmụmụ Bible kwa izu nakwa kwa ọnwa bụ ngosipụta nke ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi anyị nọ, n’ihi na ọrụ nke a chọrọ mmefu nke oge, mgbalị, na ihe onwunwe ndị ọzọ. (Mak 12:28-31) Ma n’agbanyeghị nke a, mgbe anyị hụrụ ka otu n’ime ndị mmụta Bible ndị a mere baptism nakwa ọbụna banye n’ozi oge nile ahụ, ọ̀ bụ na a dịghị eme ka anyị kwenye na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ?—Tụlee 2 Ndị Kọrint 3:1-3.

19. Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ịhụnanya na ije ozi oge nile?

19 Ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na-akpali anyị iji ntụsara ahụ nke na-abịa site n’ihe onwunwe chụọ àjà maka ije ozi oge nile ahụ ma ọ bụrụ na o kwere anyị mee ikere òkè n’ọrụ dị otú ahụ. Ọtụtụ puku Ndịàmà pụrụ ịgba akaebe na igosipụta ịhụnanya ha ruo n’ókè ahụ abụwo ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị ekwere ka i kere òkè n’ije ozi oge nile ma ị dịghị eji ohere ahụ eme ihe, ị maghị nnọọ ọtụtụ ngọzi ndị na-efunarị gị.—Tụlee Mak 10:29, 30.

Ọ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ n’Ụzọ Ndị Ọzọ

20. Olee ụzọ ịhụnanya na-esi enyere anyị aka ịbụ ndị na-agbaghara agbaghara?

20 Ụzọ ọzọ ezi ịhụnanya na-esi enyeghachi ụgwọ ọrụ bụ na ọ na-enyere anyị aka ịbụ ndị na-agbaghara agbaghara. Ee, ịhụnanya ‘adịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.’ N’eziokwu, “ịhụnanya na-ekpuchi ìgwè mmehie.” (1 Ndị Kọrint 13:5, NW; 1 Pita 4:8) “Ìgwè” pụtara ọtụtụ mmehie, ọ́ bụghị otú ahụ? Leekwa nnọọ ka ọ na-esi enyeghachi ụgwọ ọrụ ịbụ onye na-agbaghara agbaghara! Mgbe ị gbaghaara mmadụ, nke a na-eme ka ma gị ma onye ahụ nke mehiere megide gị nwee mmetụta dị mma karị. Ma, ọ dị mkpa nke ukwuu karị, bụ́ eziokwu ahụ nke bụ na ọ gwụlakwa ma anyị agbagharaworịị ndị ahụ na-emehie megide anyị, anyị apụghị ịtụ anya na Jehova ga-agbaghara anyị.—Matiu 6:12; 18:23-35.

21. Olee ụzọ ezi ịhụnanya na-esi enyere anyị aka ido onwe anyị n’okpuru?

21 Ọzọkwa, ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’echiche nke bụ na ọ na-enyere anyị aka ido onwe anyị n’okpuru. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị ga-edo onwe anyị n’okpuru aka ya dị ike. (1 Pita 5:6) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ ga-akpalikwa anyị ido onwe anyị n’okpuru ihe ọrụ ahụ ọ họpụtaworo, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” Nke a gụnyere ido onwe anyị n’okpuru ndị ahụ na-edu ndú n’ọgbakọ. Nke a na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ihi na ịghara ime otú ahụ ‘agaghị abara anyị uru.’ (Matiu 24:45-47; Ndị Hibru 13:17) N’eziokwu, ụkpụrụ nke a nke ido onwe anyị n’okpuru bụkwa nke a pụrụ iji mee ihe n’ime ezinụlọ. Ịgbaso ụzọ dị otú ahụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ihi na ọ na-akwalite ọṅụ, udo, na ịdị n’otu n’ime ezinụlọ, na-enyekwa anyị afọ ojuju nke na-abịa site n’ịmata na anyị na-eme ihe dị Chineke mma.—Ndị Efesọs 5:22; 6:1-3.

22. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ n’ezie?

22 Ya mere, ọ bụ ihe doro anya na àgwà kasị elu anyị pụrụ ịzụlite bụ aga’pe, bụ́ ụdị ịhụnanya ahụ na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị nke ezi ụkpụrụ na-achịkwa. A pụghịkwa inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. N’ihi ya, anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na anyị azụlite, na-egosipụtakwa àgwà nke a n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịwanye ukwuu iji wetara Chineke anyị nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, otuto.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova Chineke siworo gosipụta ezi ịhụnanya?

◻ Olee ụzọ Jisọs Kraịst siworo gosipụta ịhụnanya?

◻ Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl onyeozi setịpụrụ n’igosi ezi ịhụnanya?

◻ Olee ụzọ Ndịàmà Jehova siworo na-egosipụta ịhụnanya?

◻ N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na ezi ịhụnanya na-enyeghachi ụgwọ ọrụ?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ihe a kporo mmadụ nọ kpaliri ya inye Ọkpara ya ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. Ị̀ nwere ekele maka ezi ịhụnanya dị otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ezi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-akpali anyị ‘ịnọgidesi ike n’ikpe ekpere’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya