Obi Ụtọ Ebighị Ebi Na-echere Ndị Na-enye Ihe n’Ụzọ Chineke
“Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—JỌN 3:16.
1, 2. (a) Ònye bụ Onye Na-enye Ihe nke kachasị ukwuu, gịnị bụkwa onyinye ya kachasị ukwuu nye ihe a kpọrọ mmadụ? (b) N’inye onyinye ya kachasị ukwuu, ụdị àgwà dị aṅaa ka Chineke gosipụtara?
JEHOVA CHINEKE bụ Onye Na-enye Ihe kachasị ukwuu. Ọ bụ banyere ya, Onye Kere eluigwe na ala, ka onye Kraịst ahụ na-eso ụzọ bụ Jemes dere: “Ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye si n’elu bịa, ebe o si n’aka Nna nke ìhè rịdata, onye ọghụgha ọ bụla na-apụghị ịdị n’ebe ọ nọ, ma ọ bụ onyinyo nke nchigharị na-eweta.” (Jemes 1:17) Jehova bụkwa Onye Na-enye Ihe nke nyere onyinye kachasị ukwuu a pụrụ inye mgbe ọ bụla. Banyere onyinye kachasị ukwuu o nyere ihe a kpọrọ mmadụ, e kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
2 Onye kwuru okwu ndị ahụ abụghị onye ọ bụla ọzọ karịakwa Ọkpara ahụ Chineke mụrụ nanị ya n’onwe ya. Ọkpara nna ya mụrụ nanị ya ga-enwe nnọọ obi ekele ma hụ nna dị otú ahụ n’anya dị ka isi iyi nke ndụ ya na nke ihe ọma nile e nyere maka ya inweta ọṅụ ná ndụ. Ma ịhụnanya Chineke abụghị nanị n’ebe otu Ọkpara nke a nọ. Inye ndị ọzọ bụ ihe o kere eke ụdị onyinye ahụ ga-egosipụta Chineke ịbụ onye na-ahụ n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ. (Tụlee Ndị Rom 5:8-10.) Nke a na-apụta ìhè karị mgbe anyị nyochara ihe okwu a bụ “nyere” pụtara n’ezie n’ebe a.
Onyinye Chineke nke “Ọkpara nke Ịhụnanya Ya”
3. E wepụ “Ọkpara nke ịhụnanya ya,” olee onye ọzọ nwetara ịhụnanya nke Nna nke eluigwe?
3 Ruo oge a na-akpọghị aha, Chineke esorowo Ọkpara nke a a mụrụ nanị ya nwee mmekọrịta chiri anya—“Ọkpara nke ịhụnanya ya”—n’ime eluigwe. (Ndị Kọlọsi 1:13) N’oge ahụ nile, Nna na Ọkpara ahụ etowo nke ukwuu n’ịhụnanya na ezi mmetụta maka ibe ha nke na e nwebeghị ụdị inwerịta ịhụnanya dị ka nke ha. Ihe ndị e kere eke ndị ọzọ bụ́ ndị Chineke meworo ka ha dị adị site n’Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya bụkwa ndị ọ hụrụ n’anya dị ka ndị so n’ezinụlọ eluigwe nke Jehova. Ya mere, ịhụnanya na-achị n’ezinụlọ nile nke Chineke. E kwuru ya n’ụzọ ziri ezi n’ime Akwụkwọ nsọ na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ya mere, ezinụlọ eluigwe bụ nke ndị Nna ahụ, bụ́ Jehova Chineke, hụrụ n’anya ga-emejupụta.
4. Olee otú onyinye Chineke nyere Ọkpara ya si gụnye ihe karịrị mfu nke mmekọrịta onwe onye, ọ̀ bụkwa n’ihi ole ndị?
4 Mmekọrịta dị n’etiti Jehova na Ọkpara ya chiri nnọọ anya nke na ha ịnapụ onwe ha ụdị mmekọrịta dị otú ahụ chiri anya ga-abụ oké mfu n’onwe ya. (Ndị Kọlọsi 1:15) Ma ‘onyinye’ nke Ọkpara nke a a mụrụ nanị ya pụtara ihe karịrị Chineke ịnapụ onwe ya mmekọrịta onwe onye n’ebe “Ọkpara nke ịhụnanya ya” nọ. Ọ garuru ọbụna n’ókè nke na Jehova nyere ohere ka Ọkpara ya nwụọ wee si otú a bụrụ onye e wepụrụ n’ịdị adị ruo nwa oge dị ka onye so n’ime ezinụlọ eluigwe na ala nke Chineke. Nke a bụ ọnwụ a nwụrụ n’ihi ndị na-abụtụbeghị ndị òtù nke ezinụlọ Chineke. Jehova apụghị inye onyinye ka ukwuu n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ nọ ná mkpa karịa onyinye o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ onye Akwụkwọ nsọ gosikwara dị ka “isi nke ihe nile Chineke kere.”—Mkpughe 3:14.
5. (a) Gịnị bụ nsogbu nke ụmụ Adam, gịnịkwa ka ikpe ziri ezi nke Chineke chọrọ n’akụkụ nke otu n’ime ụmụ Ya kwesịrị ntụkwasị obi? (b) Gịnị ka onyinye kachasị ukwuu nke Chineke ga-achọ n’akụkụ ya onwe ya?
5 Di na nwunye mbụ, bụ Adam na Iv, dara ada n’ịnọgide na-enwe ọnọdụ ha dị ka ndị òtù nke ezinụlọ Chineke. Nke ahụ bụ ọnọdụ ha hụtara onwe ha mgbe a chụpụsịrị ha site n’ubi nke Iden n’ihi imehie megide Chineke. Ọ bụghị nanị na ha abụkwaghị ndị òtù nke ezinụlọ Chineke kama ha nọkwa n’okpuru ikpe ọmụma nke ọnwụ. Ya mere, nsogbu dị na ya abụghị nanị nke iweghachi ụmụ ha gaa n’ihu ọma Chineke dị ka ndị òtù nke ezinụlọ ya kamakwa nke isite n’ebe ha nọ wepụ ọmụma ikpe ọnwụ nke Chineke mara ha. Dị ka ịrụ ọrụ nke ikpe ziri ezi Chineke si dị, nke a ga-achọ ka otu onye n’ime ụmụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova Chineke nwụọ ọnwụ dị ka ihe ndochi, ma ọ bụ ihe mgbapụta. N’ihi ya, ajụjụ ukwu dị na ya bụ: Onye ahụ a họọrọ ọ̀ ga-adị njikere ịnwụ ọnwụ nnwụchite n’ihi ndị mmadụ na-eme mmehie? Ọzọkwa, imezu nke a chọrọ ịrụ ọrụ ebube n’akụkụ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ ga-achọkwa ngosi ịhụnanya Chineke n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ.—Ndị Rom 8:32.
6. Olee ụzọ Ọkpara Chineke si ruo eru igbo mkpa nke ọnọdụ ahụ metụtara ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie, gịnịkwa ka o kwuru banyere nke a?
6 Nanị Ọkpara Jehova e buru ụzọ mụọ pụrụ iru eru maka mkpa pụrụ iche nke ọnọdụ ahụ metụtara ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. Ọ bụ nnọọ onyinyo nke Nna ya nke eluigwe n’igosi ịhụnanya maka ndị òtù nke ezinụlọ ahụ e sitere n’aka Chineke wepụta nke na e nweghị onye ya na ya hà n’etiti ụmụ nke Chineke. Ebe ihe e kere eke ndị ọzọ nile nwere ọgụgụ isi bụ ndị e mere ka ha dị adị site na ya, ịhụnanya maka ha ga-abụ nke bara ụba n’ezie. N’ịgakwa n’ihu, ịhụnanya bụ àgwà bụ isi nke Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, “ebe ọ bụ nnwupụ nke ebube [Chineke] na onyinyo nke ụdị ya.” (Ndị Hibru 1:3) N’igosi njikere ya iji gosipụta ịhụnanya nke a n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu site n’inyefe ndụ ya n’ihi ụmụ mmadụ na-emehie emehie, Jisọs gwara ndị ozi ya, sị: “Nwa nke mmadụ onwe ya abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Mak 10:45; leekwa Jọn 15:13.
7, 8. (a) Gịnị bụ nzube Jehova n’izite Jisọs Kraịst n’ime ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Ụdị ije ozi dị aṅaa ka Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ije?
7 Jehova Chineke nwere ihe pụrụ iche kpatara o ji zite Jisọs n’ime ụwa nke a tọgbọrọ na nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ịhụnanya nke Chineke bụ ihe kpaliri nke a n’ihi na Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya n’ụwa ka o kpee ụwa ikpe; kama ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.”—Jọn 3:16, 17.
8 Ọ bụ ije ozi nke nzọpụta ka Jehova ji wee jiri ịhụnanya zite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya. Chineke eziteghị Ọkpara ya ebe a iji kpee ụwa ikpe. Ọ bụrụ na e zitere Ọkpara Chineke n’ụdị ije ozi okwu ikpe dị otú ahụ, ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ gaara abụworị nke na-adịghị eweta olileanya. Ọmụma ikpe nke ikpe mbibi nke Jisọs Kraịst gaara ekwupụta nye ezinụlọ ụmụ mmadụ gaara abụ ọmụma ikpe gaa n’ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) N’ihi nke a, site ná ngosipụta nke a pụrụ iche nke ịhụnanya Chineke, Chineke mere ka ọmụma ikpe ọnwụ nke ikpe ziri ezi gaara achọ ghara ịdị irè.
9. Echiche dị aṅaa ka onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid nwere banyere inye ihe nke Jehova?
9 N’ihe nile, Jehova Chineke gosiri ma mee ihe atụ ịhụnanya dị ka akụkụ kasị elu nke ụdị onye ọ bụ. A pụkwara ikwu n’ụzọ ziri ezi na Chineke jiri ịhụnanya na-enye ndị na-efe ya ofufe kwesịrị ntụkwasị obi n’elu ala ihe ọma dị iche iche n’ụzọ dị ukwuu. Onye ọbụ abụ bụ Devid nwere ụdị mmetụta ahụ banyere okwu ahụ mgbe ọ gwara Chineke, sị: “Lee ka ezi ihe gị si baa ụba, nke ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu gị, nke ị rụworo nye ndị na-agbaba n’ime gị n’ihu ụmụ mmadụ!” (Abụ Ọma 31:19) N’oge ọbụbụ eze Devid ná mba Israel—ee, n’oge ndụ ya nile dị ka onye so ná mba ahụ Chineke họọrọ n’ụzọ pụrụ iche—o nwetara mgbe mgbe ịdị mma nke Jehova. Devid hụtakwara ya ịbụ ihe bara ụba.
Ntụfu Israel Tụfuru Onyinye Dị Ukwuu Sitere n’Aka Chineke
10. N’ihi gịnị ka Israel oge ochie na-ejighị dịrị ka mba ọ bụla ọzọ n’elu ala?
10 N’inwe Jehova dị ka Chineke ya, Israel oge ochie adịghị ka mba ndị ọzọ n’elu ala. Site n’aka onye amụma bụ Mosis dị ka onye ogbugbo, Jehova webatara ụmụ Abraham, Aịsak, na Jekọb n’ime ọgbụgba ndụ mmekọrịta n’ebe ya onwe ya nọ. Ọ ka emesobeghị mba ọ bụla n’ụzọ dị otú a. Ya mere, onye ọbụ abụ ahụ nwere ike mmụọ nsọ pụrụ ikwupụta, sị: “Ọ na-egosi Jekọb okwu ya, na-egosikwa Israel ụkpụrụ ya nile na ikpe ya nile. O mesoghị mba ọ bụla otú a: ma ikpe ya nile, ha amaghị ha. Toonụ Jaa.”—Abụ Ọma 147:19, 20.
11. Ruo ole mgbe ka Israel nwetara ọnọdụ dị mma n’ebe Chineke nọ, oleekwa ụzọ Jisọs si kwupụta mgbanwe ná mmekọrịta ha?
11 Mba Israel anụ ahụ nọgidere n’isoro Chineke na-enwe mmekọrịta ọma dị otú a ruo mgbe ọ jụrụ Jisọs Kraịst dị ka Mesaịa ahụ n’afọ 33 nke Oge Anyị. Ọ bụ n’ezie ụbọchị dị mwute maka Israel mgbe Jisọs tiri mkpu iru újú nke a: “Jerusalem, Jerusalem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-ewerekwa nkume atụ ndị e zitewooro ya! Ọtụtụ mgbe ole ka m chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọ ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Matiu 23:37, 38) Okwu Jisọs ndị a gosiri na mba Israel, ọ bụ ezie na ha abụworị ndị natara ihu ọma Jehova, etufuwo ihe pụrụ iche sitere n’ebe Chineke nọ. Olee ihe mere o ji dị otú a?
12. Olee ndị bụ ‘ụmụ nke Jerusalem,’ oleekwa ihe Jisọs ịchịkọta ha gaara apụtaworị?
12 Site n’iji okwu ahụ bụ “ụmụ” mee ihe, Jisọs zoro aka nanị ná ndị Juu anụ ahụ e biri úgwù bụ́ ndị bi na Jerusalem ma nọchie anya mba Juu nile. Ka Jisọs wee chịkọta ‘ụmụ nke Jerusalem’ gaara apụtara ya iwebata “ụmụ” ndị a n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke ha na Chineke ga-agba, ya onwe ya ịdị na-eje ozi dị ka Onye Ogbugbo n’etiti Jehova na ndị Juu anụ ahụ ndị a. (Jeremaịa 31:31-34) Nke a ga-apụtaworị mgbaghara mmehie, n’ihi na ịhụnanya Chineke ruru na nke ahụ. (Tụlee Malakaị 1:2.) Nke a n’ezie gaara abụworị onyinye dị ukwuu.
13. Mfu dị aṅaa ka ọjụjụ Israel jụrụ Ọkpara Chineke kpatara, ma gịnị mere ọṅụ Jehova ji bụrụ ihe na-adịghị ebelata ebelata?
13 Iji mee ihe dị ka Okwu amụma ya si dị, Jehova nọrọ ogologo oge ezi uche dị n’ime ya tupu o nye ndị na-abụghị ndị Juu onyinye nke ịbụ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ma site n’ịjụ Ọkpara Chineke, Mesaịa ahụ, mba nke Israel anụ ahụ tụfuru onyinye a dị ukwuu. Ya mere, Jehova mere ka ọjụjụ ọ jụrụ Ọkpara ya ghara ịdị irè site n’inye ndị mmadụ na-esiteghị ná mba ndị Juu onyinye nke a. N’ụzọ dị otú ahụ, ọṅụ Jehova dị ka Onye Ukwu Na-enye Ihe nọgidere bụrụ nke na-adịghị ebelata ebelata.
Ọṅụ nke Inye Ihe
14. Gịnị mere Jisọs Kraịst ji bụrụ ihe e kere eke kasị nwee obi ụtọ n’elu ụwa nile?
14 Jehova bụ “Chineke dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW].” (1 Timoti 1:11) Inye ndị ọzọ ihe bụ otu ihe na-eme ya obi ụtọ. Na narị mbụ nke O.A., Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya kwuru, sị: “Ọ dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW] inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) N’ikwekọ n’ụkpụrụ a, Jisọs abụrụwo onye e kere eke kasị nwee obi ụtọ n’ihe nile Onye Okike nke elu na ala nile kere. Olee otú o si dị otú a? Ọ dị mma, dị ka onye na-esote Jehova Chineke n’onwe ya, Jisọs Kraịst enyewo onyinye kasị ukwuu site n’ịtọgbọ ndụ ya maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, ọ bụ ‘Onye Dị Ike, onye obi ụtọ.’ (1 Timoti 6:15) Otú a, Jisọs gosiri ihe nlereanya nke ihe o kwuru banyere obi ụtọ ka ukwuu nke inye ihe.
15. Banyere gịnị ka Jehova ga-anọgide na-abụ ihe nlereanya ya, oleekwa ụzọ ihe nile o kere eke nwere uche pụrụ isi nweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi ụtọ ya?
15 Site na Jisọs Kraịst, Jehova Chineke agaghị ahapụ ịbụ Onye Na-enye Ihe n’ụba nye ihe nile o kere eke nwere ọgụgụ isi, ọ ga-anọgidekwa na-abụ ihe nlereanya ha kasị mma n’inye ihe. Ọbụna dị ka Chineke na-enweta ọṅụ n’inye ndị ọzọ ezi onyinye, otú a o tinyewo mmụọ nke imesapụ aka n’ime obi nke ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi nọ n’elu ala. N’ụzọ dị otú ahụ, ha na-egosipụta ma na-eṅomi àgwà ya ma na-enweta ọ̀tụ̀tụ̀ nke obi ụtọ ya. (Jenesis 1:26; Ndị Efesọs 5:1) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya: “Na-enyenụ, a ga-enyekwa unu; ọ̀tụ̀tụ̀ ọma, nke a bịadaworo ala, yọkọta, nke na-ejubigakwa ókè, ka ha ga-enye n’obi unu. N’ihi na ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọkwara unu ọzọ.”—Luk 6:38.
16. Ụdị inye ihe dị aṅaa ka Jisọs rụtụrụ aka na ya na Luk 6:38?
16 Jisọs setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ihe nlereanya magburu onwe ya site n’inwe àgwà nke inye ihe. O kwuru na a ga-enwe nzaghachi dị mma nye ụdị inye ihe dị otú ahụ n’aka nke ndị na-anata ya. Na Luk 6:38, Jisọs adịghị arụ aka nanị n’inye onyinye nke ihe e ji ebi ndụ. Ọ dịghị agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha chụsoo ụzọ nke ga-eme ka ha daa ogbenye n’ihe onwunwe. Kama nke ahụ, ọ na-edu ha gaa n’ụzọ nke ga-enye ha mmetụta nke mmezu ihe ime mmụọ.
Obi Ụtọ Ebighị Ebi Bụ Ihe E Ji n’Aka
17. Ụdị onyinye ọma dị aṅaa ka Chineke nyeworo Ndịàmà ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a?
17 Lee onyinye dị ebube ọ bụ nke Jehova, Onyeisi nke ihe nile e kere eke, nyeworo Ndịàmà ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a! O nyewo anyị ozi ọma nke Alaeze ya. Anyị nwere oké ihe ùgwù nke ịbụ ndị nkwusa nke Alaeze nke Chineke e guzobeworo nke dị n’aka Ọkpara ya na-achị achị, Jisọs Kraịst. (Matiu 24:14; Mak 13:10) Ịbụ ndị e mere Ndịàmà na-ekwuru Chineke Kasị Ihe Nile Elu bụ onyinye na-enweghị atụ, ụzọ anyị pụkwara isi na-enye ihe n’iṅomi Chineke bụ isoro ndị ọzọ kerịta ozi Alaeze ahụ tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ nke a abịa.
18. Dị ka Ndịàmà Jehova, gịnị ka anyị kwesịrị inye ndị ọzọ?
18 Pọl onyeozi rụtụrụ aka n’ihe isi ike ndị o nwetara mgbe ọ na-ekwusara ndị ọzọ ozi Alaeze ahụ. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) Ndịàmà Jehova nke oge ugbu a enwetawokwa ihe isi ike dị iche iche ma wezụga ọchịchọ onwe onye n’ụsọ ná mgbalị nke inye ndị ọzọ olileanya nke Alaeze ahụ. Anyị pụrụ ịbụ ndị na-enweghị mkpali ịga n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ, karịsịa, ọ bụrụ na anyị na-eme ihere. Ma dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị apụghị izere, ma ọ bụ ime ihe iji zere, ihe ùgwù nke inye ndị ọzọ ihe ime mmụọ site n’ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 24:14) Ọ dị anyị mkpa inwe ụdị mmetụta Jisọs nwere. Mgbe o chere ọnwụ ihu, o kpere ekpere, sị: “Nna m, . . . ọ bụghị dị ka mụ onwe m na-achọ, kama dị ka gị onwe gị na-achọ.” (Matiu 26:39) N’okwu nke inye ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze ahụ, ndị na-ejere Jehova ozi aghaghị ime ihe Chineke na-achọ, ọ bụghị nke ha onwe ha—ihe ọ chọrọ, ọ bụghị ihe ha pụrụ ịchọ.
19. Olee ndị bụ Ndị Ji “ụlọ ikwuu ebighị ebi,” oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi mee ha enyi?
19 Ụdị inye ihe ahụ ga-agụnye oge anyị na ihe anyị nwere, ma site n’ịbụ ndị na-enye ihe n’ụzọ Chineke, anyị na-eji n’aka na obi ụtọ anyị ga-adị ruo ebighị ebi. N’ihi gịnị? N’ihi na Jisọs sịrị: “Meenụ ndị enyi nye onwe unu site n’àkụ̀ nke ajọ omume [“àkụ̀ nke ụwa,” New International Version]; ka, mgbe ọ bụla ọ ga-agwụ, ka ha wee kpọbata unu n’ụlọ ikwuu ebighị ebi.” (Luk 16:9) O kwesịrị ịbụ mkpebi anyị iji “àkụ̀ nke ajọ omume” mee Ndị Ji “ụlọ ikwuu ebighị ebi” enyi. Dị ka Onye Okike, Jehova nwe ihe nile, Ọkpara ya sokwa nwere ihe onwunwe ndị ahụ dị ka Onye Nketa nke ihe nile. (Abụ Ọma 50:10-12; Ndị Hibru 1:1, 2) Iji mee ha enyi, anyị kwesịrị iji àkụ̀ mee ihe n’ụzọ ga-eweta nnwapụta ha. Nke a gụnyere inwe ezi àgwà n’iji ihe onwunwe eme ihe maka ọdịmma nke ndị ọzọ. (Tụlee Matiu 6:3, 4; 2 Ndị Kọrint 9:7.) Anyị pụrụ iji ego mee ihe n’ụzọ ziri ezi iji mee ka ọbụbụ enyi anyị na Jehova Chineke na Jisọs Kraịst siwanye ike. Dị ka ihe atụ, anyị na-eme nke a site n’iji ihu ọchị were ihe anyị nwere mee ihe iji gbatara ndị nọ ná mkpa pụtara ìhè ọsọ enyemaka na imefu ihe anyị nwere iji mee ka ọdịmma nke Alaeze nke Chineke na-aga n’ihu.—Ilu 19:17; Matiu 6:33.
20. (a) Gịnị mere Jehova na Jisọs pụrụ iji kpọba anyị n’ime “ụlọ ikwuu ebighị ebi,” oleekwa ebe ha pụrụ ịdị? (b) Ihe ùgwù dị aṅaa ga-abụ nke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi?
20 N’ihi anwụghị anwụ ha, Jehova Chineke na Jisọs Kraịst pụrụ ịbụ ndị enyi anyị ruo mgbe ebighị ebi ma nweekwa ike ịkpọba anyị n’ime “ụlọ ikwuu ebighị ebi.” Otú a ka ọ dị ma ụlọ ndị a hà ga-adị n’eluigwe ebe ndị mmụọ ozi nile dị nsọ nọ ma ọ bụ n’elu ala nke a n’ime Paradaịs e weghachiri eweghachi. (Luk 23:43) Onyinye Chineke ji ịhụnanya nye Jisọs Kraịst mere ka ihe ndị a nile dị irè. (Jọn 3:16) Jehova Chineke ga-ejikwa Jisọs mee ihe iji nọgide na-enye ihe nile e kere eke ihe, maka obi ụtọ nke Ya pụrụ iche. N’ezie, ruo mgbe nile ebighị ebi anyị onwe anyị ga-enwe ihe ùgwù nke inye ihe n’okpuru ịchịisi eluigwe na ala dum nke Jehova Chineke na ọbụbụ eze nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jisọs Kraịst. Nke a ga-eweta obi ụtọ ebighị ebi nye ndị nile na-enye ihe n’ụzọ Chineke.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị ka onyinye kachasị ukwuu nke Chineke ga-achọ n’akụkụ nke ya?
◻ Ụdị ije ozi dị aṅaa ka Chineke zitere Ọkpara ya ije?
◻ Ònye bụ ihe e kere eke kasị nwee obi ụtọ n’eluigwe na ala nile, n’ihi gịnịkwa?
◻ Olee ụzọ ndị na-enye ihe n’ụzọ Chineke ga-esi nweta obi ụtọ ebighị ebi?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ì nwere obi ekele maka onyinye Chineke nyere Ọkpara ya dị ka àjà mgbapụta?
[Foto ndị dị na peeji nke 12]
Ị̀ na-eburu ụzọ achọ Alaeze Chineke site n’ikwusa ozi ọma na site n’iji ihe i nwere na-akwado ọrụ ahụ