Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 3/15 p. 24-25
  • Akụ Dị Oké Onụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Jọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụ Dị Oké Onụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Jọn
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụkarịrị Iji Mejupụta Akụkọ
  • Obi Umeala na Ọṅụ
  • Nchegbu Jisọs maka Ndị Mmadụ
  • Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ Na-enye Nlekọta!
  • Ọkpara Chineke Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Mgbe Nile
  • Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma na Ogige Atụrụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ogige Atụrụ Ndị ahụ na Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ònye Na-eduga n’Ụzọ nke Mgbapụta?
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • “Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M”—Gịnị Ka Jizọs Bu n’Obi?
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 3/15 p. 24-25

Akụ Dị Oké Onụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Jọn

MMỤỌ Jehova kpaliri Jọn onyeozi meworo okenye idetu akụkọ na-akpali akpali nke ndụ na ije ozi Jisọs Kraịst. E dere Oziọma nke a n’ihe dị ka n’afọ 98 O.A. n’Efesọs ma ọ bụ ebe dị ya nso. Ma olee otú ihe ndekọ ahụ dị? Gịnị bụkwa akụ ụfọdu dị oké ọnụ ahịa dị n’ime ya?

Ọ Bụkarịrị Iji Mejupụta Akụkọ

Jọn mere nhọrọ, na-ekwughachi ihe ole na ole nke Matiu, Mak, na Luk dere. N’ezie, akụkọ ya nke onye hụrụ ihe merenụ bụkarịrị iji mejupụta akụkọ ndị ọzọ n’ihi na ihe karịrị 90 pasenti n’ime ya metụtara ihe ndị a na-akpọtụghị uche n’Oziọma ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, nanị ya kọọrọ anyị banyere ịdị adị Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ nakwa na “Okwu ahụ (ghọrọ) anụ ahụ.” (1:1-14) Ebe ndị ọzọ dere Oziọma kwuru na Jisọs mere ka ụlọ nsọ ahụ dị ọcha ná ngwụsị nke ozi ya, Jọn kwuru na Kraịst mekwara otú ahụ ná mmalite. (2:13-17) Nanị onyeozi ahụ meworo okenye gwara anyị banyere ọrụ ebube ụfọdụ ndị Jisọs rụrụ, dị ka ime ka mmiri ghọọ mmanya, ịkpọlite Lazarọs nwụrụ anwụ n’ọnwụ, na igbute azụ n’ụzọ ọrụ ebube mgbe mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị.—2:1-11; 11:38-44; 21:4-14.

Ndị nile dere Oziọma kọrọ otú Jisọs si guzobe Ememe Ncheta nke ọnwụ ya, ma nanị Jọn na-egosi na Kraịst nyere ndị ozi ahụ ihe mmụta banyere inwe obi umeala site n’ịsa ụkwụ ha n’abalị ahụ. E wezugakwa nke ahụ, nanị Jọn dekọrọ okwu dị iche iche bụ eziokwu Jisọs kwuru banyere onwe ya na ekpere o kpere n’ihi ha n’oge ahụ.—13:1-17:26.

N’Oziọma nke a, aha ahụ bụ Jọn na-ezo aka n’ebe Onye ahụ na-eme baptism nọ, ebe onye dere ya na-akpọ onwe ya “onye Jisọs hụrụ n’anya.” (13:23) Onyeozi ahụ hụrụ Jisọs n’anya n’ezie, a na-emesiwanyekwa ịhụnanya nke anyị n’ebe Kraịst nọ ike mgbe Jọn na-egosi ya dị ka Okwu ahụ, achịcha nke ndụ, ìhè nke ụwa, Onye ọzụzụ atụrụ Oma ahụ, ụzọ ahụ, eziokwu ahụ, na ndụ. (1:1-3, 14; 6:35; 8:12; 10:11; 14:6) Nke a na-emezu nzube Jọn kwupụtara, sị: “E dewo ihe ndị a n’akwụkwọ, ka unu wee kwere na Jisọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke; ka unu wee nweekwa ndụ n’aha ya n’ihi na unu kwere.”—20:31.

Obi Umeala na Ọṅụ

Oziọma Jọn kọwara Jisọs dị ka Okwu ahụ na Nwa Atụrụ nke na-ekpuchi mmehie wee na-ehota ọrụ ebube dị iche iche na-anwapụta na ọ bụ “Onye nsọ ahụ nke Chineke.” (1:1-9:41) Gụnyere ihe ndị ọzọ, ihe ndekọ ahụ mere ka ịdị obi umela na ọṅụ nke Jọn Onye na-eme baptism pụta ìhè. Ọ bụ onye na-ebute Kraịst ụzọ ma ọ sịrị: “Onye mụ onwe m na-ekwesịghị ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.” (1:27) A na-ejibu eriri akpụkpọ anụ ma ọ bụ owu kedo akpụkpọ ụkwụ. Onye bụ ohu pụrụ ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ onye ọzọ ma chịtara ya ya, ebe nke a bụ ọrụ na-ewetụ mmadụ ala. Otú a Jọn Onye na-eme baptism gosipụtara obi umeala ma mara na ọ dịghị ihe ọ bụla o ruru ma e jiri ya tụnyere Onyenwe ya. Nke a bụ ezi ihe mmụta, ebe ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi kwesịrị ekwesị maka iịere Jehova na Eze Mesaịa ya ozi!—Abụ Ọma 138:6; Ilu 21:4.

Kama iji mpako kwosoo Jisọs ekworo, Jọn Onye na-eme baptism sịrị: “Enyi nke onye na-alụ nwunye ọhụrụ, onye na-eguzo na-anụkwa okwu ya, ọ na-aṅụrị ọṅiụ nke ukwuu n’ihi olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ: ya mere e mezuwo ọṅụ m.” (3:29) Dị ka onye nnọchianya nke onye na-alụ nwunye ọhụrụ, ọ bụ enyi onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ na-eme nkwekọrịta alụmdi na nwunye, mgbe ụfọdụ na-edokwa alụmdi na nwunye ahụ ma na-enye nwanyị a na-alụ ọhụrụ onyinye, na-enyekwa nna ya ego isi nwanyị. Onye nnọchianya nke a n’ezie nwere ihe mere ọ ga-eji nwee ọṅụ mgbe ọ rụzuru ọrụ ya. N’otu aka ahụ, Jọn ṅụrịrị ọṅụ n’iwekọta Jisọs na ndị mbụ nke nwanyị Ya ọ na-alụ ọhụrụ ọnụ n’otu. (Mkpughe 21:2, 9) Dị ka iịe ozi nke enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-adịru nwa oge, ya mere ọrụ Jọn gwụsịrị mgbe na-adịghị anya. Ọ nọgidere na-ebelata ala, ebe Jisọs gara n’ihu na-amụba amụba.—Jọn 3:30.

Nchegbu Jisọs maka Ndị Mmadụ

N’otu olulu mmiri dị nso obọdo Saịka, Jisọs gwara otu nwanyị onye Sameria banyere mmiri ihe atụ nke na-enye ndụ ebighị ebi. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya bịarutere, “o wee ju ha anya na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu.” (4:27) Gịnị kpatara mmeghachi omume dị otú a? Ndị Juu kpọrọ ndị Sameria asị, ha adịghị esokwa ha emekọrịta ihe ọ bụla. (4:9; 8:48) Onye ozizi bụ onye Juu adịghị esokarịkwa nwanyị ekwurịta okwu n’ihu ọha mmadụ. Ma nchegbu ọmịiko Jisọs nwere maka ndị mmadụ kpaliri ya ịgba àmà nke a, n’ihi ya kwa, ndị bi n’obọdo ahụ ‘malitere ịbịakwute ya.’—4:28-30.

Nchegbu maka ndị mmadụ kpaliri Jisọs ịsị: “Ọ bụrụ na akpịrị kpọrọ mmadụ ọ bụla nkụ, ya bịakwute m, ṅụọ mmiri.” (7:37) O doro anya na o si otú a na-ezo aka n’omenala nke a gbakwụnyere n’Ememe Ụlọ Ntu ahụ a na-eme ụbọchị asatọ. Kwa ụtụtụ ruo ụbọchị asaa, otu onye nchụàịà na-adọta mmiri site n’ọdọ mmiri Saịloam ma wụpụ ya n’elu ebe ịchụ àịà n’ụlọ nsọ ahụ. Gụnyere ihe ndị ọzọ, a sịrị na nke a na-anọchi anya mwụpụ nke mmụọ. Na-amalite na Pentikọst 33 O.A., mmụọ Chineke kpaliri ndị na-eso ụzọ Jisọs iwegara ndị mmadụ gburugburu ụwa mmiri nke na-enye ndụ. Ọ bụ nanị n’aka Jehova, bụ́ “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,” site na Kraịst ka onye ọ bụla ga-anata ndụ ebighị ebi.—Jeremaịa 2:13; Aịsaịa 12:3; Jọn 17:3.

Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ Na-enye Nlekọta!

Nchegbu Jisọs maka ndị mmadụ pụtara ìhè n’òkè ọ na-ekere dị ka Onye Ozụzụ Atụrụ Ọma ahụ nke na-elekọta ndị na-eso ụzọ ya yiri atụrụ. Ọbụna ka ọnwụ ya na-abịaru nso, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ịhụnanya ma kpee ekpere n’ihi ha. (10:1-17:26) N’adịghị ka onye ohi ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe, ọ na-esi n’ọnụ ụzọ na-abanye n’ogige atụrụ ahụ. (10:1-5) Ogige atụrụ bụ ebe e gechiri egechi nke a na-edebe atụrụ na ya maka ichebe ha n’abalị pụọ n’aka ndị ohi na anụmanụ ndị na-eri ibe ha. Ọ na-enwe mgbidi e ji nkume doo, ma eleghị anya nwee n’elu ya alaka osisi ndị nwere ogwu, na ọnụ ụzọ nke onyenche na-eche ọnụ ụzọ na-echegide.

A pụrụ idebe ìgwè atụrụ nke ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ n’otu ogige atụrụ, ma atụrụ ndị ahụ na-aza nanị òkù nke onye ọzụzụ atụrụ nke ha kpọrọ. N’akwụkwọ ya bụ Manners and Customs of Bible Lands, Fred H. Wight kwuru, sị: “Mgbe ọ dịrị mkpa ikewa ìgwè atụrụ dị iche iche, otu onye ọzụzụ atụrụ na-ebili ma kpọọ òkù mgbe onye ọzọ kpọsịrị: ‘Tahuu! Tahuu!’ ma ọ bụ òkù yiri ya nke ọ họọrọ. Atụrụ ndị ahụ na-eweli isi ha, mgbe e nwesịkwara ọgba aghara ngwa oge, atụrụ nke ọ bụla na-amalite iso onye ọzụzụ atụrụ ya. Ha matara nke ọma ụda olu nke onye ọzụzụ atụrụ nke ha. Ndị a na-amaghị ama akpọwo otu òkù ahụ, ma mgbalị ha ime ka ìgwè atụrụ ahụ soro ha na-ada mgbe nile.” Jisọs kwuru n’ụzọ na-akpali mmasị, sị: “Atụrụ nke m na-anụ olu m, mụ onwe m makwaara ha, ha na-esokwa m; mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” (10:27, 28) Ma “ìgwè atụrụ nta” ahụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ na-aza òkù Jisọs, na-eso idu ndú ya, ma na-enwe ọṅụ nke nlekọta ịhụnanya ya.—Luk 12:32; Jọn 10:16.

Ọkpara Chineke Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Mgbe Nile

Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile nye Chineke ma na-esetịpụ ihe nlereanya dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya n’oge nile nke ndụ ya n’elu ala. E gosipụtakwara ọmịiko ya ná ngosi o gosiri onwe ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. Ọ bụ nchegbu ọmịiko maka ndị ọzọ kpaliri Jisọs ịgba Pita ume ịzụ ìgwè atụrụ Ya.—18:1-21:25.

Dị ka onye a kpọgburu n’elu osisi, Jisọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya bụ isi nke ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Otu ihe ihere e mere ya n’ihu ọha iji mezuo amụma bụ na ndị agha ‘keere onwe ha uwe ya.’ (Abụ Ọma 22:18) Ha fere nza iji kpebie onye ga-ewere uwe ime ya (Grik, khi-ton’), bụ́ nke a kpara n’enweghị ebe a dụkọtara isi ákwà abụọ. (19: 23, 24) A pụrụ iji ajị anụ ma ọ bụ ogho n’otu ùkwù kpaa uwe dị otú ahụ, ọ pụkwara ịdị na-acha ọcha ma ọ bụ nwee àgwà dị iche iche. Ọ dịghị enwekarị aka, a na-eyikwasị ya n’elu ahụ n’eyighị ihe ọ bụla ọzọ n’ime, ọ na-erukwa n’ikpere ma ọ bụ ọbụna n’ikiri ụkwụ. Otú ọ dị, Jisọs ahụghị ihe onwunwe n’anya, ma o yiri ezigbo uwe dị otú ahụ, bụ́ uwe mwuda ya na-enweghị ebe a dụkọtara isi ákwà abụọ ọnụ.

N’otu oge Jisọs gosipụtara onwe ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, o kelere ndị na-eso ụzọ ya n’okwu ndị a: “Udo dịrị unu.” (20:19) N’etiti ndị Juu, nke a bụ ekele a na-anụkarị. (Matiu 10:12, 13) Nye ọtụtụ ndị, iji okwu ndị dị otú ahụ eme ihe pụrụ ịbụ ihe na-abụchaghị oké ihe. Ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe Jisọs nọ, n’íhi na ọ gwawo ndị na-eso ụzọ ya n’oge gara aga, sị: “Udo ka m hapụụrụ unu; udo nke m ka m na-enye unu.” (Jọn 14:27) Udo ahụ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya dabeere n’okwukwe ha n’ebe ọ nọ dị ka Ọkpara Chineke, o mekwara ihe ime ka ha nọrọ jụụ n’obi na n’uche.

N’otu aka ahụ, anyị pụrụ inweta “udo nke Chineke.” Ka anyị were ịdị jụụ nke a na-enweghị atụ nke na-esite n’iso Jehova nwee mmekọrịta chiri anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, bụ nke a na-enweta site n’Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 25]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya