Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/1 p. 29-31
  • “Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikesa Mmiri Ara nke Okwu Chineke
  • Na-enyezi Nri Siri Ike nke Okwu Chineke
  • Mmiri Na-enye Ume Ọhụrụ ma Na-asacha Mmadụ
  • Jiri Okwu Chineke Mee Ihe Dị Ka Enyo
  • Okwu Chineke Dị Ka Mma Agha
  • Ị̀ Na-erizi Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • ‘Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • ‘Na-ejizi Okwu Chineke Ejizi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ihe Mere O Ji Dị Gị Mkpa Ịdị Na-aga Nzukọ Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/1 p. 29-31

“Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ”

OKWU Chineke bụ ụlọ nkwakọba nke ụkpụrụ ndị dị mkpa maka ndụ na-aga nke ọma. Ọ pụrụ inyere onye ozi aka izi ihe, iji tụọ mmadụ mmehie ya n’anya, na iji gbazie olu. (2 Timoti 3:16, 17) Otú ọ dị, iji ritezuo uru site n’ihe nduzi a Chineke nyere, anyị aghaghị ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Timoti: “Na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.”—2 Timoti 2:15.

Tinyere ihe ndị ọzọ, e ji Okwu Chineke tụnyere mmiri ara na-emezi ahụ, nri siri ike, mmiri dị ọcha ma na-enye ume ọhụrụ, enyo, na mma agha dị nkọ. Ịghọta ihe okwu ndị a pụtara na-enyere onye ozi aka iji nkà jiri Bible na-eme ihe.

Ikesa Mmiri Ara nke Okwu Chineke

Mmiri ara bụ nri nke dị ụmụ a mụrụ ọhụrụ mkpa. Ka nwa ọhụrụ ahụ na-eto, a na-eji nwayọọ nwayọọ na-ewebata nri siri ike n’ihe oriri ya, ma iji malitegodị, ọ pụrụ ịgbari nanị mmiri ara. N’ọtụtụ ụzọ, ndị maara ihe dị nta banyere Okwu Chineke dị ka ụmụ ọhụrụ. Ma mmadụ ọ̀ bụ onye malitere ọhụrụ inwe mmasị n’Okwu Chineke ma ọ bụ bụrụ onye mawooro banyere ya ruo oge ụfọdụ, ọ bụrụ na o nwere nanị nghọta bụ́ isi nke ihe Bible na-ekwu, ọ bụ nwa ọhụrụ ime mmụọ, nri na-emezi ahụ dị mfe ịgbari dịkwa ya mkpa—“mmiri ara” ime mmụọ. Ọ ka enwebeghị ike ịgbari “nri siri ike,” ihe ndị dị omimi nke Okwu Chineke.—Ndị Hibru 5:12.

Nke a bụ ọnọdụ e nwere n’ọgbakọ ahụ e guzobere ọhụrụ na Kọrint mgbe Pọl degaara ha, sị: “Ejiri m ara zụọ unu, ọ bụghị ihe oriri; n’ihi na unu a ka apụghị ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 3:2) Ọ dị ndị Kọrint mkpa ibu ụzọ mụọ ihe bụ “ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta.” (Ndị Hibru 5:12) N’ebe ha toruru, ha agaraghị enwe ike ịgbari “ihe nile dị omimi nke Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:10.

Dị ka Pọl, ndị ozi bụ́ ndị Kraịst taa na-egosipụta nchegbu ha maka ụmụ ọhụrụ ime mmụọ site n’inye ha “mmiri ara,” ya bụ, site n’inyere ha aka ịgbadosi ụkwụ ike n’ozizi bụ isi nke ndị Kraịst. Ha na-agba ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-etozubeghị okè dị otú ahụ ume ka ‘agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi ha ike.’ (1 Pita 2:2) Pọl onyeozi gosiri na ọ ghọtara nlebara anya pụrụ iche dị ndị ọhụrụ mkpa mgbe o dere, sị: “Onye ọ bụla nke na-eketa mmiri ara bụ onye a ka anwaghị ya n’okwu ezi omume; n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ.” (Ndị Hibru 5:13) Ndidi, nchebara echiche, nghọta, na ịdị nro ka a chọrọ n’aka ndị ozi Chineke ka ha na-esoro ndị ọhụrụ na ndị na-enwebeghị ahụmahụ na-ekerịta mmiri ara dị ọcha nke Okwu ahụ site n’ọmụmụ Bible ebe obibi na n’ime ọgbakọ.

Na-enyezi Nri Siri Ike nke Okwu Chineke

Iji toruo nzọpụta, ihe karịrị “mmiri ara” dị onye Kraịst mkpa. Ozugbo ọ ghọtara eziokwu ndị bụ isi nke Bible nke ọma ma nabata ha, ọ dị njikere ịga n’ihu ná “nri siri ike bụ́ nke ndị tozuru okè.” (Ndị Hibru 5:14) Olee otú ọ pụrụ isi mee nke a? N’ụzọ bụ isi, site n’ihe omume chiri anya nke ọmụmụ ihe onwe onye na mkpakọrịta ná nzukọ ndị Kraịst. Ụdị àgwà ọma ndị dị otú ahụ ga-enye aka ime ka onye Kraịst sie ike, tozuo okè n’ime mmụọ, ma dị irè n’ozi. (2 Pita 1:8) Anyị ekwesịghị ichezọ na tinyere ihe ọmụma, ime ihe Jehova na-achọ bụkwa nri ime mmụọ.—Jọn 4:34.

Taa, a họpụtawo otu “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” inye ndị ohu Chineke nri n’oge ya na inyere ha aka ịghọta “ọtụtụ okpukpu amamihe Chineke dị iche iche.” Jehova, site na mmụọ ya, na-ekpughe eziokwu Akwụkwọ Nsọ ndị dị omimi site n’ohu a na-anọgidesi ike n’ihe, nke ji ikwesị ntụkwasị obi na-ebipụta ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ (Matiu 24:45-47; Ndị Efesọs 3:10, 11; tụlee Mkpughe 1:1, 2.) Ọ dịịrị onye Kraịst ọ bụla n’otu n’otu iji ndokwa ndị ahụ e bipụtara ebipụta na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu.—Mkpughe 1:3.

N’ezie, ụfọdụ ihe dị na Bible “dị ike ịghọta,” ọbụna nye ndị Kraịst tozuru okè. (2 Pita 3:16) E nwere okwu, amụma, na ihe atụ ndị siri ike nghọta bụ́ ndị chọrọ oké ịmụ ihe na ntụgharị uche. Ya mere, ọmụmụ ihe onwe onye gụnyere igwuba n’ime Okwu Chineke. (Ilu 1:5, 6; 2:1-5) Ndị okenye karịsịa nwere ibu ọrụ n’akụkụ nke a mgbe ha na-ezi ọgbakọ ihe. Ma hà na-eduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ma ọ bụ Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, na-ekwu okwu ihu ọha, ma ọ bụ na-eje ozi n’ọkwá izi ihe ọzọ, ndị okenye kwesịrị ịghọta ihe omume ha nke ọma ma dịrị njikere ilebara “ozizi” ha anya mgbe ha na-enye ọgbakọ nri ime mmụọ siri ike.—2 Timoti 4:2.

Mmiri Na-enye Ume Ọhụrụ ma Na-asacha Mmadụ

Jisọs gwara nwanyị Sameria n’ọdọ mmiri ahụ na ya ga-enye ya ihe ọ ga-aṅụ nke ga-aghọ n’ime ya “isi iyi mmiri na-asụpụta hie nne ruo ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:13, 14; 17:3) Mmiri a na-enye ndụ gụnyere ndokwa nile nke Chineke maka inweta ndụ site na Nwa Atụrụ Chineke, a kọwakwara ndokwa ndị a n’ime Bible. Dị ka ndị akpịrị “mmiri” ahụ na-akpọ nkụ, anyị na-anakwere ọkpụkpọ òkù ahụ sitere n’aka mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nke Kraịst ‘ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’ (Mkpughe 22:17) Ịṅụ mmiri a pụrụ ịpụta ndụ ebighị ebi.

Ọzọkwa, Bible na-esetịpụ ụkpụrụ omume na nke ime mmụọ maka ezi ndị Kraịst. Ka anyị na-etinye ụkpụrụ ndị a Chineke setịpụrụ n’ọrụ, Okwu Jehova na-eme ka anyị dị ọcha, ‘sachaa’ anyị pụọ n’omume nile nke Jehova Chineke na-akpọ asị. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ihi nke a, a na-akpọ eziokwu nke dị n’Okwu ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ “ọsịsa mmiri.” (Ndị Efesọs 5:26) Ọ bụrụ na anyị ekweghị ka eziokwu Chineke sachaa anyị n’ụzọ dị otú a, ọ gaghị anabata ofufe anyị.

N’ụzọ na-adọrọ mmasị, e jikwa ndị okenye “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ” tụnyere mmiri. Aịsaịa na-asị na ha dị ka “ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ndị okenye na-ahụ n’anya na-emezu nkọwa nke a mgbe ha na-eje eleta ụmụnna ha dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ, na-eji Okwu na-enye ume ọhụrụ nke Chineke na-enye ihe ọmụma ime mmụọ na-ewuli elu, na-akasi obi, nke na-enye ume ma na-ewusi ike.—Tụlee Matiu 11:28, 29.a

Ndị òtù ọgbakọ na-atụsi anya ike maka nleta nke ndị okenye. “Amaara m otú ndị okenye pụrụ isi na-akasi obi, obi dịkwa m ụtọ nke ukwuu na Jehova emewo ndokwa a,” ka Bonnie na-ekwu. Lynda, nne na-enweghị di, na-ede, sị: “Na-eji agbamume Akwụkwọ Nsọ, ndị okenye nyere m aka ịnagide. Ha ṅara ntị ma gosi ọmịiko.” Michael na-asị: “Ha mere ka m nwee mmetụta nke ịbụ akụkụ nke nzukọ na-echebara mmadụ echiche.” “Nleta ndị okenye nyeere m aka imeri oge ịda mbà n’obi siri ike,” ka onye ọzọ na-ekwu. Nleta na-ebuli elu n’ụzọ ime mmụọ nke onye okenye dị ka ihe ọṅụṅụ jụrụ oyi, nke na-enye ume ọhụrụ. A na-akasi ndị yiri atụrụ obi mgbe ndị okenye na-ahụ n’anya na-enyere ha aka ịhụ otú ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ si metụta ọnọdụ ha.—Ndị Rom 1:11, 12; Jemes 5:14.

Jiri Okwu Chineke Mee Ihe Dị Ka Enyo

Mgbe mmadụ riri nri siri ike, nzube ya abụghị nanị ịnụ ụtọ ya. Kama, ọ na-atụ anya inweta ihe ndị na-emezi ahụ iji mee ka ọ na-arụ ọrụ. Ọ bụrụ na ọ bụ nwata, ọ na-atụ anya na nri ahụ ga-enyere ya aka itolite ịbụ onye tozuru mmadụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa nri ime mmụọ. Ọmụmụ Bible onwe onye pụrụ ịdị ụtọ, ma nke ahụ abụghị nanị ihe mere anyị na-eji enwe ya. Nri ime mmụọ kwesịrị ịgbanwe anyị. Ọ na-enyere anyị aka ịmata na ịmị mkpụrụ nke mmụọ ahụ ma na-enyere anyị aka iyikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.” (Ndị Kọlọsi 3:10; Ndị Galetia 5:22-24) Nri ime mmụọ na-enyekwara anyị aka itozu okè, na-eme ka anyị nwee ike karị itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ n’ịnagide nsogbu anyị na n’inyere ndị ọzọ aka ịnagide nke ha.

Olee otú anyị pụrụ isi mara ma Bible ọ̀ na-enwe mmetụta ahụ n’ahụ anyị? Anyị na-eji Bible eme ihe dị ka enyo. Jemes kwuru, sị: “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị . . . A sị na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma ọ bụghị onye na-eme ya, onye ahụ yiri nwoke nke na-ekiri ihu ya n’enyo, bụ́ ihu o nwere mgbe a mụpụtara ya: n’ihi na o kiriri onwe ya, ọ pụwokwa, ngwa ngwa o wee chezọọ aha mmadụ ọ bụ. Ma onye nyochaworo n’ime iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe ya, nke na-anọgidekwa otú a, ghara ịghọ onye na-anụ anụ nke na-echezọ, kama ọ bụ onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ, onye a ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.”—Jemes 1:22-25.

Anyị ‘na-enyocha’ Okwu Chineke mgbe anyị tụlere ya n’ụzọ chiri anya ma jiri onye anyị bụ tụnyere onye anyị kwesịrị ịbụ dị ka ụkpụrụ nile nke Chineke si dị. N’ime nke a, anyị ga-aghọ ‘ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị nanị ndị na-anụ nanị.’ Bible ga na-enwe mmetụta dị mma n’ahụ anyị.

Okwu Chineke Dị Ka Mma Agha

N’ikpeazụ, Pọl onyeozi na-enyere anyị aka ịhụ otú anyị pụrụ isi jiri Okwu Chineke na-eme ihe dị ka mma agha. Mgbe ọ na-adọ anyị aka ná ntị megide ‘ịbụ ndị isi nile, megide ịchịisi nile, megide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, megide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe,’ ọ na-agba anyị ume ‘ịnara mma agha nke Mmụọ Nsọ, nke bụ okwu Chineke.’ (Ndị Efesọs 6:12, 17) Okwu Chineke bụ ngwá agha dị oké mkpa nke anyị pụrụ iji egbupụ echiche ọ bụla nke “e weliri elu imegide ọmụma Chineke.”—2 Ndị Kọrint 10:3-5.

N’ụzọ ajụjụ na-adịghị ya, “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Jehova na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ okwu site na peji nile nke Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Jizie ya n’izi ndị ọzọ ihe na n’ịgba ozizi ụgha ọtọ. Jiri ya mee ihe iji gbaa ndị ọzọ ume, wulie ha elu, nye ha ume ọhụrụ, kasie ha obi, kpalie ha, ma wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Ka Jehova ‘meekwa ka i zuo okè n’ezi ihe nile ọ bụla ime ihe Ọ na-achọ,’ ka i wee na-eme ihe “na-atọ ezi ụtọ n’ihu Ya” mgbe nile.—Ndị Hibru 13:21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu Ụlọ Nche a kpọrọ “Ha Ji Ọmịiko Na-azụ Ìgwè Atụrụ Nta Ahụ,” September 15, 1993, peji nke 20-23.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị okenye na-agba ndị ọzọ ume, “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya