Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/1 p. 20-23
  • ‘Gịnị Ka Oge Kwuru?’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Gịnị Ka Oge Kwuru?’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Chineke Nyere Iji Gosi Oge
  • Okwu Ilu Ndị Metụtara Oge
  • Oge Hour Anyasị nke Ndị Hibru
  • N’ime Narị Afọ Mbụ
  • Nkebi Dị Iche Iche nke Oge Abalị
  • Mara Ihe Oge Nyere n’Ụbọchị
  • Ị̀ Ma Ihe Na-akụnụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • “Nọgidenụ Na-eche Nche”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/1 p. 20-23

‘Gịnị Ka Oge Kwuru?’

‘GỊNỊ ka oge na-ekwu?’ Ugbo ole ka ị jụworo ajụjụ ahụ? N’ọgbọ ọgbara ọhụrụ anyị nke ihe nile na-aga ngwa ngwa n’ime ya, anyị na-ebukarị ihe banyere oge n’uche. Ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị—ibilite n’ụtụtụ, ije ọrụ, iri nri, izute ndị enyi, na ihe ndị ọzọ—bụcha ndị oge na-eduzi n’ụzọ chiri anya. Anyị na-adaberekwa n’ọtụtụ ihe dị iche iche—klọkụ, elekere ndị a na-agba n’aka, ihe ndị na-akụ mgbịrịgba mgbe oge ya ruru, redio—iji gwa anyị ihe oge na-ekwu.

Gịnị banyere n’oge Bible mgbe ụmụ mmadụ na-enweghị ihe ndị e ji agụ oge yiri ndị anyị nwere? Olee ụzọ ha si agụ oge? Ihe ndekọ Bible ò nyere ihe àmà ọ bụla banyere nke a? Ịmara oge ihe e dere banyere ya n’ime Bible mere n’ụbọchị pụrụ inye gị nghọta ọhụrụ banyere Okwu Chineke, mụbawanyekwa ọṅụ ị na-enweta n’ọmụmụ Bible gị.

Ihe Ndị Chineke Nyere Iji Gosi Oge

N’oge ochie, a na-amatakarị ihe bụ oge site n’ile anya n’anyanwụ ma ọ bụ n’ọnwa, bụ́ ‘ihe ukwu abụọ ahụ na-enye ìhè’ ndị Onye Okike ahụ debere na mbara igwe “ịkpa ókè n’etiti ehihie na abalị.” (Jenesis 1:14-16) Dị ka ihe atụ, ọ bụ “mgbe chi bọrọ” ka ndị mmụọ ozi abụọ ahụ gbara Lọt na ezinụlọ ya ume ka ha gbapụ site n’obodo ahụ nke mbibi gaje ịbịakwasị, bụ́ Sọdọm. (Jenesis 19:15, 16) Ọ bụkwa “na mgbe anyasị” ka ohu Abraham ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bịarutere n’olulu mmiri ahụ ebe o zutere Rebeka.—Jenesis 24:11, 15.

Mgbe ụfọdụ, a na-enye nkọwa ndị kapịrị ọnụ karị banyere oge. Dị ka ihe atụ, a gwara Abimelek, bụ́ nwa na-eme ihe ike nke Onye Ikpe bụ Gideọn, ka ọ wakwasị obodo Shekem n’ike “n’ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-awa.” (Ndị Ikpe 9:33) Ihe àmà gosiri na e nwere ihe metụtara nkà ibu agha kpatara nke a. Ụcha anyanwụ nke na-ebili ebili n’azụ usuu ndị agha Abimelek aghaghị imeworị ka o siere ndị na-echebe Shekem ike nke ukwuu ịhụta usuu ndị agha ahụ na-ebuso ha agha ‘n’onyinyo ugwu ndị ahụ.’—Ndị Ikpe 9:36-41.

Okwu Ilu Ndị Metụtara Oge

Ndị Hibru ji okwu dị iche iche ndị mara mma, na-akpalikwa mmasị, mee ihe iji gosi ihe oge na-ekwu. Ọ bụghị nanị na ha na-eme ka anyị nwee mmetụta nke ọnọdụ na omenala dị n’ebe ahụ, kama ha na-ekpughekwa ihe ụfọdụ banyere ọnọdụ gbara ihe omume ahụ gburugburu.

Dị ka ihe atụ, Jenesis 3:8 na-agwa anyị na ọ bụ “mgbe ifufe na-efe n’ụbọchị” ka Jehova gwara Adam na Iv okwu n’ụbọchị ahụ ha mehiere. A na-aghọta nke a ịbụ oge dị nso mgbe anyanwụ na-ada, mgbe ikuku jụrụ oyi na-eji abịa, na-eme ka okpomọkụ nke ụbọchị ahụ dajụlata. Dị ka ọ na-adịkarị, ka ụbọchị na-eru ọgwụgwụ ya nso, ọ na-abụ oge ịtụsara ahụ na izuru ike. Ma, Jehova ekweghị ka okwu nke a siri ike nke metụtara ikpe chere ruo echi ya ebe a ka nwere oge iji lebara ya anya.

N’aka nke ọzọ, Jenesis 18:1, 2 na-egosi anyị na ndị mmụọ ozi Jehova bịara n’ụlọ ikwuu nke Abraham nke dị na Mamre “n’ikpo ọkụ nke ehihie.” Jiri anya nke uche gị hụ ka anyanwụ ahụ nke na-ekpo ọkụ nke ukwuu na-etikwasị elu ugwu Judia ndị ahụ. Okpomọkụ ahụ pụrụ isi ike nke ukwuu. Ọ bụ oge a na-ejikarị eri nri, zurukwa ike. (Lee Jenesis 43:16, 25; 2 Samuel 4:5.) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Abraham “na-anọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ ikwuu ya,” ebe ọ pụrụ ịbụ na obere ikuku na-efegharịtụ, ma eleghị anya na-ezuru ike mgbe o risịrị nri. Anyị pụrụ ịghọta nke ọma karị àgwà ile ọbịa anya nke ọma nke nwoke nke a meworo agadi mgbe anyị na-agụ na ‘ọ gbara ọsọ izute’ ndị ọbịa ahụ “wee mee ngwa baa n’ụlọ ikwuu” ahụ ịgwa Sera ka ọ kwadebe achịcha, mesịakwa “gbaga n’ìgwè ehi ya” wee “mee ngwa idozi ya.” Ihe a nile mere n’oge okpomọkụ nke ehihie!—Jenesis 18:2-8.

Oge Hour Anyasị nke Ndị Hibru

Ihe àmà gosiri na ndị Hibru kewara oge anyasị ụzọ atọ, ndị a na-akpọ “nche” dị iche iche. Nke ọ bụla nọchiri anya otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oge dị n’etiti anwụ ọdịda na anwụ ọwụwa, ma ọ bụ ihe dị ka hour anọ, na-adabere n’oge ọ bụ n’afọ. (Abụ Ọma 63:6) Ọ bụ “ná mmalite nche etiti abalị,” bụ́ nke na-amalite n’ihe dị ka elekere iri nke anyasị ruo ihe dị ka elekere abụọ nke isi ụtụtụ, ka Gideọn mere mwakwasị ya n’ọmụma ụlọ ikwuu ndị Midian. O doro anya na mwakwasị a wakwasịrị ha n’oge a bịara ndị nche ahụ na mberede. N’ezie, Gideọn ahụ dị akọ apụghị ịhọrọworịị oge dị mma karịa nke a maka mwakwasị ya!—Ndị Ikpe 7:19.

N’oge Ọpụpụ ahụ, Jehova weere “ifufe ihu anyanwụ dị ike mee ka oké osimiri ahụ jee n’azụ n’abalị ahụ nile,” na-enye ndị Israel ohere ịgabiga n’ala akọrọ. Tupu o ruo mgbe ndị Ijipt chụkwutere ha, ọ bụworị oge “iche nche ụtụtụ,” Jehova wee tinye ọgba aghara n’etiti ọmụma ụlọ ikwuu ndị Ijipt, o mesịa bibie ha site n’ime ka mmiri ahụ “lata n’oruru ọ na-eru mgbe nile mgbe chi bọrọ.” (Ọpụpụ 14:21-27) Ya mere, o were ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ogologo abalị dum iji kewaa oké osimiri ahụ nakwa ime ka ụmụ Israel gabiga n’etiti ya.

N’ime Narị Afọ Mbụ

Ka ọ na-erule narị afọ mbụ, ndị Juu amalitewo ịgụ hour 12 maka ehihie. Nke a bụ ihe mere na n’otu n’ime ihe atụ ndị o nyere, Jisọs sịrị: “Ọ́ bụghị oge hour iri na abụọ dị n’ehihie?” (Jọn 11:9) A na-agụ hour ndị a site n’anwụ ọwụwa ruo n’anwụ ọdịda, ma ọ bụ site n’ihe dị ka n’elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere isii nke uhuruchi. Otú a, “oge hour nke atọ” ga-abụ ihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ. Ọ bụ n’oge a n’ụbọchị Pentikọst ahụ ka a wụpụrụ mmụọ nsọ. Mgbe ndị mmadụ boro ndị ahụ na-eso ụzọ ebubo na ‘ha ṅụjuru mmanya vine ọhụrụ afọ,’ Pita mere ngwa ịkagbu ebubo ahụ. O doro anya na ọ dịghị onye mmanya ga-amaliteworị igbu n’oge dị otú ahụ n’ụtụtụ!—Ọrụ 2:13, 15.

N’otu aka ahụ, isi ihe dị n’okwu Jisọs nke bụ “ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ” na-apụtakwu ìhè mgbe anyị tụlere oge o kwuru ya. Dị ka Jọn 4:6 na-ekwu ‘ọ bụ ihe dị ka oge hour nke isii’ ma ọ bụ ihe dị ka etiti ehihie. Mgbe o jisịrị ụkwụ gaa n’ebe ahụ dị ugwu ugwu nke ime obodo Sameria n’ụtụtụ ahụ dum, agụụ ga na-agụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, akpịrị ga na-akpọkwa ha nkụ. Ọ bụ nke ahụ mere ndị na-eso ụzọ ya ji gbaa ya ume ka o rie nri mgbe ha ji nri lọghachite. Ha amatachaghị banyere ike na ntụrụ ndụ Jisọs nwetara site n’ịrụ ọrụ Jehova. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu Jisọs karịrị okwu ihe atụ nkịtị. Ọ na-enweta nkwado nkịtị site n’ịrụ ọrụ Chineke, ọ bụ ezie na ọ ghaghị iruworị ọtụtụ hour kemgbe o riri nri ikpeazụ.—Jọn 4:31-34.

Ka anwụ ọwụwa na anwụ ọdịda na-agbanwegharị dị ka oge a nọ n’ime ya n’afọ si dị, ọ na-abụkarị ihe dị ka mgbe ihe mere ka a na-ekwu. Otú a, anyị na-agụkarị banyere ihe ndị mere n’oge hour nke atọ, nke isii, ma ọ bụ nke itoolu—bụ́ nke na-apụtakarị ihe mere na nso oge ndị ahụ. (Matiu 20:3, 5; 27:45, 46; Mak 15:25, 33, 34; Luk 23:44; Jọn 19:14; Ọrụ 10:3, 9, 30) Otú ọ dị, mgbe ihe banyere oge dị mkpa n’ihe a na-akọ, a na-ekwu okwu ndị kapịrị ọnụ karị banyere oge. Dị ka ihe atụ, nye nwoke ahụ nke ọ dị oké mkpa ịmara ma ahụ ọ̀ dịrị nwa ya nwoke mma n’ezie site n’ike Jisọs, ndị ohu ya zara, sị: “[Ụnyahụ] n’oge hour nke asaa [ihe dị ka elekere mbụ nke ehihie] ka ahụ ọkụ hapụrụ ya.”—Jọn 4:49-54.

Nkebi Dị Iche Iche nke Oge Abalị

Ka ọ na-erule oge ọchịchị ndị Rom, o yiri ka ndị Juu hà anakwerewo nkewa ndị Grik na ndị Rom kewara anyasị gaa n’oge nche anọ kama ịbụ atọ nke ha na-ejibu eme ihe. Na Mak 13:35, o doro anya na Jisọs zoro aka ná nkewa anọ ndị a. Nche nke ‘anyasị’ malitere site n’anwụ ọdịda ruo ihe dị ka elekere itoolu nke anyasị. Nke abụọ, bụ́ nche nke ‘etiti abalị’ malitere n’ihe dị ka elekere itoolu ma gwụsịa n’etiti abalị. “Mgbe oké ọkụkọ kwara” na-amalite n’etiti abalị ruo ihe dị ka elekere atọ. Nke ikpeazụ, bụ́ nke ‘ụtụtụ,’ na-agwụsị n’isi ụtụtụ, ma ọ bụ n’ihe dị ka elekere isii.

Nche nke “mgbe oké ọkụkọ kwara” na-akpali mmasị n’ihi okwu Jisọs gwara Pita na Mak 14:30: “Mgbe oké ọkụkọ akakwaghị ákwá ugbo abụọ, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-enye nkọwa nọgidere na-ekwu na “ugbo abụọ” ahụ na-ezo aka kpọmkwem n’oge abụọ dị iche iche—etiti abalị na n’isi ụtụtụ—akwụkwọ A Dictionary of Christ and the Gospels, nke James Hastings haziri, na-egosi na “n’eziokwu, oké ọkụkọ na-akwa ákwá n’ime abalị, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dịkwa ka n’ebe ndị ọzọ, n’oge ndị a na-akaghị aka site n’etiti abalị gaa n’ihu.” O yiri ka ọ bụ na Jisọs adịghị ezo aka kpọmkwem n’oge ọ bụla mgbe Pita ga-agọnarị ya. Kama nke ahụ, ọ na-enye ihe ịrịba ama iji kaa okwu ọ gwara Pita akara, bụ́ ndị mezuru kpọmkwem n’anyasị ahụ.—Mak 14:72.

Ọ bụ “na nche nke anọ n’abalị”—n’agbata elekere atọ na elekere isii nke ụtụtụ—ka Jisọs, site n’ije ije n’elu Osimiri Galili, bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, ndị nọ n’ime ụgbọ nke “dị n’etiti oké osimiri.” Ma eleghị anya, ọ dị mfe ịghọta ihe mere ndị na-eso ụzọ ji nwee ‘obi ịlọ mmiri, na-asị, Ọ bụ mmụọ; ha wee tie mkpu site n’egwu.’ (Matiu 14:23-26) N’aka nke ọzọ, nke a na-egosi na Jisọs aghaghị ịnọworị ogologo oge na-ekpe ekpere nanị ya n’elu ugwu ahụ. Ebe ọ bụ na nke a bụ nwa oge nta mgbe Herọd Antipas bepụsịworo isi Jọn Onye Na-eme Baptism, nakwa nwa mgbe nta tupu Ememe Ngabiga ahụ, bụ́ nke kara akara mmalite nke afọ ikpeazụ nke ije ozi elu ala nke Jisọs, o doro anya na Jisọs nwere ọtụtụ ihe ọ ga-atụgharị uche na ha n’ekpere onwe onye ọ na-ekpegara Nna ya.

Gụnyere oge nche anọ ndị ahụ, a na-ejikwa ịgụ oge nke hour 12 eme ihe maka oge anyasị. Iji wee duru Pọl gaa Sizaria n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla, onye ọchịagha bụ Klọdịọs Lisias gwara ndị ozi ya ka ha kwadebe ìgwè 470 ndị agha “n’oge hour nke atọ n’abalị.” (Ọrụ 23:23, 24) Otú a, e duuru Pọl pụọ na Jerusalem ná mkpuchi nke ọchịchịrị abalị.

Mara Ihe Oge Nyere n’Ụbọchị

Ịgụ na ịtụgharị uche n’ihe ndekọ banyere ihe ndị mere n’etiti ndị oge ochie nke Chineke bụ ihe na-enye ọṅụ na ume ime mmụọ. Ọ bụrụ na ị pụrụ ịgụnye ihe metụtara oge ná ntụle ị na-eme, o doro anya na ọ ga-amụbawanye ọṅụ ị na-enweta n’ọmụmụ Bible gị. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? N’ihi na n’ụzọ dị otú ahụ, ị pụrụ inwe ezi ihe ọmụma banyere Okwu Chineke. Akwụkwọ ndị dị ka Insight on the Scriptures na New World Translation of the Holy Scriptures With References bụ ihe enyemaka ndị na-enweghị atụ n’ihe banyere nke a. (Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ha abụọ). Ha ga-enyere gị aka ịchọta azịza mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka oge kwuru?’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya