-
Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?Ụlọ Nche—2011 | Julaị 15
-
-
3. Olee otú ihe Jizọs kwuru nke e dere na Jọn 5:16, 17 si gosi na a ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ n’oge Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’ụwa?
3 E nwere ihe abụọ mere anyị ga-eji sị na a ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ n’oge Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’ụwa. Nke mbụ bụ ihe Jizọs gwara ụfọdụ ndị iro ya, bụ́ ndị were iwe na ọ gwọrọ mmadụ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike. Ha weere na o so n’ọrụ Iwu Mozis kwuru ka a ghara ịrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ma Onyenwe anyị gwara ha, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.” (Jọn 5:16, 17) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? E boro Jizọs ebubo na ọ rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Jizọs zaara ọnụ ya mgbe ọ gwara ha, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ.” E nwere ike ịsị na ihe Jizọs gwara ndị iro ya ahụ bụ: ‘Mụ na Nna m na-arụ otu ọrụ ahụ. Ebe ọ bụ na Nna m ka na-arụ ọrụ kemgbe Ụbọchị Izu Ike ya nke werela ọtụtụ puku afọ, o nweghịkwa ihe o mere ma mụnwa na-arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike.’ Jizọs si otú a gosi na a bịa n’ihe banyere ụwa anyị a, oké Ụbọchị Izu Ike Chineke, ya bụ, ụbọchị nke asaa ahụ, agwụbeghị n’oge Jizọs nọ n’ụwa.a
-
-
Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?Ụlọ Nche—2011 | Julaị 15
-
-
5. Gịnị mere e ji nwee ụbọchị nke asaa, oleekwa mgbe a ga-emezucha ihe mere e ji nwee ya?
5 Tupu anyị azaa ajụjụ a, anyị ga-ebu ụzọ ghọta ihe mere e ji nwee ụbọchị nke asaa. Jenesis 2:3 sịrị: “Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ma mee ka ọ dị nsọ.” E mere ka ụbọchị ahụ “dị nsọ,” Jehova doro ya iche iji mezuo uche ya. Uche ya bụ ka naanị ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi biri n’ụwa ma na-elekọta ụwa na ihe niile dị ndụ dị n’ime ya. (Jen. 1:28) N’ihi ya, ihe mere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, bụ́ “Onyenwe ụbọchị izu ike,” ji “na-arụ ọrụ ruo ugbu a” bụ ka ha nwee ike mezuo ihe ahụ bụ uche Chineke. (Mat. 12:8) Ụbọchị izu ike Chineke agaghị agwụ ruo mgbe ihe bụ́ uche ya n’okwu a ga-emezucha, ya bụ, mgbe Ọchịchị Puku Afọ Kraịst gwụrụ.
-
-
Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?Ụlọ Nche—2011 | Julaị 15
-
-
a Ndị nchụàjà na ndị Livaị rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike n’ụlọ nsọ ma “bụrụ ndị ikpe na-amaghị.” Ebe Jizọs bụ nnukwu onye nchụàjà n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ Chineke, o nwekwara ike ịrụ ọrụ Chineke nyere ya n’echeghị na ya na-ada iwu e nyere ka a ghara ịrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike.—Mat. 12:5, 6.
-