Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
“Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”—MATIU 16:16.
1, 2. (a) Olee otú a pụrụ isi kpebie ịdị ukwuu nke mmadụ? (b) Ndị ikom dị aṅaa n’akụkọ ihe mere eme ka a kpọworo Ndị Ukwu, n’ihi gịnịkwa?
ÒNYE ka i chere na ọ bụ ya bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ? Olee otú i si ekpebi ịdị ukwuu nke mmadụ? Ọ̀ bụ site n’inwe nkà ya pụrụ iche n’ibu agha? ọ̀ bụ site n’ọgụgụ isi ka elu o nwere? ka ọ̀ bụ site n’ike efu ya?
2 A kpọwo ọtụtụ ndị na-achị achị Ndị Ukwu, dị ka Saịrọs Onye Ukwu, Aleksanda Onye Ukwu, na Charlemagne, bụ́ onye a kpọrọ “Onye Ukwuu” ọbụna na mgbe ọ ka dị ndụ. N’ihi ọnụnọ ha nke a na-atụ egwu, ndị ikom dị ka ndị a nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe ndị ha chịrị nọ.
3. (a) Gịnị bụ nnwale nke a ga-eji tụlee ịdị ukwuu nke mmadụ? (b) N’iji nnwale dị otú ahụ mee ihe, onye bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ?
3 Ọ bụ ihe dị mma ịmara, na onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ H. G. Wells kọwapụtara ihe nnwale nke ya maka ịtụle ịdị ukwuu nke mmadụ. Ihe karịrị 50 afọ gara aga, o dere, sị: “Ihe nnwale nke onye ọkọ akụkọ banyere ịdị ukwuu nke mmadụ bụ ‘Gịnị ka ọ hapụrụ ka o na-etolite? Ò mere ka ụmụ mmadụ malite iche echiche n’ụzọ dị iche, na-eji ikike nke dịgidere mgbe ọ nwụsịrị?’ Site ná nnwale nke a,” ka Wells kwubiri, “Jisọs guzopụtara dị ka onye mbụ.” Ọbụna Napoléon Bonaparte, onye bụ onye ukwu n’onwe ya, kwuru, sị: “Jisọs Kraịst enwewo mmetụta ma chịa ndị nọ n’okpuru Ya na-anọghị n’anụ ahụ Ya a na-ahụ anya.”
4. (a) Echiche ndị dị aṅaa na-emegide onwe ha ka e nwere banyere Jisọs? (b) Ọnọdụ dị aṅaa n’akụkọ ihe mere eme ka otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme nke na-abụghị onye Kraịst nyere Jisọs?
4 Ma, ụfọdụ arụwo ụka na Jisọs abụghị onye dịrị adị n’ezie, kama na ọ bụ akụkọ ifo. N’aka nke ọzọ nke imebiga ihe oké, ọtụtụ efewo Jisọs dị ka Chineke, na-ekwu na Chineke bịara n’ụwa. Otú ọ dị, n’ịdabere nanị n’ihe àmà nke akụkọ ihe mere eme ná mkpebi ya banyere ịdị adị nke Jisọs dị ka mmadụ, Wells, dere, sị: “Ọ bụ ihe dị mma na nke a ga-arịbakwa ama na onye ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke na-enweghị ịkpọasị ọ bụla n’ebe nkà mmụta okpukpe dị, ga-achọpụta na ya apụghị igosipụta ọganihu nke ihe a kpọrọ mmadụ n’obi eziokwu n’enyeghị onye ozizi ahụ na-enweghị penny nke sitere na Nazaret ọnọdụ mbụ. . . . Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme dị ka mụ onwe m, nke na-akpọdịghị onwe ya onye Kristian, na-achọpụta na ọganihu ihe a kpọrọ mmadụ na-adabere n’ụzọ a na-apụghị iguzogide eguzogide n’ebe ndụ na omume nke nwoke ahụ dịkarịsịrị ịrịba ama nọ.”
Jisọs Ọ̀ Dịrị Ndụ n’Ezie?
5, 6. Gịnị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells na Will Durant nwere ikwu banyere Jisọs ịbụ onye dịrị adị n’ezie n’akụkọ ihe mere eme?
5 Ma olee ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị na ọ dịghị mgbe Jisọs dịrị ndụ, ya bụ, na ọ bụ akụkọ ifo, nchepụta efu nke ndị ikom ụfọdụ biri na narị afọ nke mbụ? Olee otú ị ga-esi zaghachi ebubo nke a? Ọ bụ ezie na Wells kwetara na “anyị amaghị ihe banyere [Jisọs] ruo ókè anyị ga-achọ ịmara,” otú o sina dị o kwuru, sị: “Oziọma anọ ahụ . . . kwenyekọrọ n’inye anyị nkọwa banyere onye dị adị kpọmkwem; ha na-emesi obi ike banyere ihe mere eme. Ịdị na-eche na ọ dịghị mgbe ọ dịrị ndụ, na akụkọ ndị ahụ banyere ndụ ya bụ nchepụta efu, bụ ihe siri ike karị, na-ewelitekwa nsogbu ndị dị ukwuu karị nye onye ọkọ akụkọ ihe mere eme karịa ịnakwere ihe ndị bụ isi nke akụkọ Oziọma ndị ahụ dị ka eziokwu.”
6 Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme a na-enye nsọpụrụ bụ́ Will Durant nwekwara echiche yiri nke ahụ, na-akọwa, sị: “Na mmadụ ole na ole na-amụghị oké akwụkwọ [ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst] ga-echepụtaworị n’otu ọgbọ, ụdịdị onye nke dị ike nke ukwuu ma na-adọrọ mmasị, ụkpụrụ omume dị elu nke ukwuu na ọhụụ dị ebube banyere òtù ụmụnna nke ihe a kpọrọ mmadụ, ga-abụ ọrụ ebube siri ike ikwere nke ukwuu karịa nke ọ bụla e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ.”
7, 8. Ruo ókè ha aṅaa ka Jisọs nweworo mmetụta dị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ?
7 Ya mere, gị na onye dị otú ahụ nke na-arụ ụka pụrụ ịtụgharị uche otú a: Mmadụ nke akụkọ ifo—onye na-adịtụbeghị mgbe ọ dịrị ndụ n’ezie—ọ̀ pụrụ inweworị mmetụta dị ịrịba ama otú a n’akụkọ ihe mere eme mmadụ? Akwụkwọ ntụaka bụ The Historians’ History of the World kwuru, sị: “Ihe si n’ọrụ nile nke [Jisọs] pụta dị ka ọ dị n’akụkọ ihe mere eme, dị oké mkpa karịa ihe omume nke onye ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme, ọbụna ma e lee ya anya n’ụzọ na-abụghị nke okpukpe. Oge ọhụrụ, bụ́ nke ndị kasị mepee anya n’ụwa kwere na ya, malitere ịgụ site n’ọmụmụ ya.” Chee echiche banyere ya. Ọbụna kalenda ụfọdụ ndị e nwere n’oge a na-adabere n’afọ e chere na a mụrụ Jisọs. “A na-edepụta oge ndị dịrị tupu afọ ahụ dị ka B.C., ma ọ bụ before Christ (tupu Kraịst),” ka akwụkwọ The World Book Encyclopedia kọwara. “A na-edepụta oge ndị dịrị mgbe afọ ahụ gasịrị dị ka A.D., ma ọ bụ anno Domini (n’oge nke Onyenwe anyị).”
8 Site n’ozizi ya ndị na-akpalị akpali na site n’ụzọ o si bie ndụ nke kwenyekọrọ na ha, Jisọs emetụtawo ndụ nke ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ụzọ siri ike ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ. Dị ka otu onye edemede si kọwaa ya n’ụzọ ziri ezi: “E jikọta ndị agha nile zọworo njem, na ndị agha mmiri nile e guzobeworo, na òtù ndị òmé iwu nile zukọworonụ, ndị eze nile chịtụworo, ha enwebeghị mmetụta ná ndụ mmadụ n’elu ụwa nke a ruo otú o meworo.” Ma ndị nkatọ ka na-asịkwa: ‘Ihe nile anyị maara n’ezie banyere Jisọs bụ nke a hụrụ na Bible. Ọ dịghị ihe ndekọ ọzọ e dere n’otu mgbe ahụ banyere ya nke dị.’ Ma, nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?
9, 10. (a) Gịnị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị edemede nke oge gboo na-abụghị ndị okpukpe kwuru banyere Jisọs? (b) N’ịdabere na nkwupụta nke ndị ọkọ akụkọ oge gboo, gịnị ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma a na-asọpụrụ kwubiri?
9 Ọ bụ ezie na izo aka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge gboo zoro n’ebe Jisọs nọ dị nta, izo aka ndị dị otú ahụ dị adị n’ezie. Cornelius Tacitus, bụ́ onye Rom bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme narị afọ mbụ a na-akwanyere ùgwù, dere na onye ọchịchị alaeze Rom bụ Nero ‘bokwasịri ikpe ọmụma nke ịgba Rom ọkụ n’ahụ ndị Kraịst.’ Mgbe ahụkwa Tacitus kọwara, sị: “Aha ahụ bụ [Kristian] bụ nke e si na Kraịst nweta, bụ́ onye onye ọchịchị ahụ bụ Pọntịọs Paịlet gburu n’oge ọchịchị Taịbiriọs.” Suetonius na Pliny nke Nta, bụ́kwa ndị Rom na-ede edemede n’oge ahụ kwukwara banyere Kraịst. Tụkwasịkwa, onye Juu bụ Flavius Josephus, nke bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ, dere n’akwụkwọ ya bụ́ Antiquities of the Jews banyere ọnwụ nke onye na-eso ụzọ Kraịst bụ Jemes. Josephus kwuru ná nkọwa ya na Jemes bụ “nwanne Jisọs, onye a kpọro Kraịst.”
10 Otú a, akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwubi, sị: “Ihe ndekọ ndị a na-adabereghị n’ibe ha na-egosipụta na n’oge ochie, ọbụna ndị na-emegide Iso Ụzọ Kraịst adịghị mgbe ha rụrụ ụka banyere ịdị adị nke Jisọs, bụ́ nke a rụrụ ụka ya nke mbụ nakwa ná ndabere ndị na-ezighị ezi n’ọgwụgwụ narị afọ nke 18, n’oge narị afọ nke 19, nakwa ná mmalite narị afọ nke 20.”
Ònye Ka Jisọs Bụ n’Ezie?
11. (a) N’ụzọ bụ isi, olee nanị ebe a ga-esi nweta ihe ọmụma akụkọ ihe mere eme banyere Jisọs? (b) Gịnị bụ ajụjụ ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere banyere onye ọ bụ?
11 Otú ọ dị, n’ụzọ bụ isi, ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya nke narị afọ mbụ dekọrọ ihe nile a maara ugbu a banyere Jisọs. E chekwawo akụkọ ha n’Oziọma ndị ahụ—bụ́ akwụkwọ Bible ndị ozi ya abụọ bụ Matiu na Jọn, nakwa ndị na-eso ụzọ ya abụọ bụ́ Mak na Luk dere. Gịnị ka ihe ndekọ ndị ikom ndị a na-ekpughe banyere onye Jisọs bụ? Ònye ka ọ bụ n’ezie? Ndị ha na Jisọs na-akpakọ na narị afọ mbụ tụgharịrị uche n’ajụjụ ahụ. Mgbe ha hụrụ ka Jisọs sitere n’ọrụ ebube mee ka oké osimiri nke ifufe na-enugharị dere jụụ site n’ịbara ya mba, o juru ha anya ha wee jụọ, sị: “Ònye bụkwa onye a?” N’oge ọzọ, Jisọs jụrụ ndị ozi ya, sị: “Ma ọ̀ bụ ònye ka unu onwe unu sị na mụ bụ?”—Mak 4:41; Matiu 16:15.
12. Olee otú anyị si mara na Jisọs abụghị Chineke?
12 Ọ bụrụ na a jụọ gị ajụjụ ahụ, olee otú ị ga-esi zaa? Ònye ka Jisọs bụ n’ezie? N’ezie, ọtụtụ ndị na Krisendọm ga-asi na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile n’ụdị mmadụ, Chukwu e mere mmadụ. Ma, ndị ha na Jisọs na-akpachi anya adịghị mgbe ha ji kwenye na ọ bụ Chineke. Pita onyeozi kpọrọ ya “Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:16) N’agbanyeghịkwa otú i si mee nnyocha, ọ dịghị mgbe ị ga-agụta na Jisọs kwuru na ya bụ Chineke. Kama nke ahụ, ọ gwara ndị Juu na ya bụ “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị Chineke.—Jọn 10:36.
13. Olee otú Jisọs si dịrị iche n’ebe ndị ikom ọzọ nọ?
13 Mgbe Jisọs jere ije gafere oké osimiri ebili mmiri na-enugharị, o metụtara ndị na-eso ụzọ ya bụ́ eziokwu ahụ nke bụ na ọ bụghị mmadụ dịnnọ ka mmadụ ọ bụla ọzọ. (Jọn 6:18-21) Ọ bụ onye pụrụ nnọọ iche. Nke a bụ n’ihi na ọ dịwo ndụ dị ka onye bụ mmụọ n’eluigwe ya na Chineke, ee, dị ka mmụọ ozi, nke e hotara n’ime Bible dị ka onye isi mmụọ ozi. (1 Tesalọnika 4:16; Jud 9) Chineke kere ya tupu O kee ihe ọ bụla ọzọ. (Ndị Kọlọsị 1:15) Otú a, ruo ogologo oge dị anya, eleghị anya ọtụtụ ijeri afọ tupu e kee ọbụna elu na ala anya na-ahụ, Jisọs nwere mkpakọrịta chiri anya nke ya na Nna ya bụ Chineke, bụ́ Onye Okike Ukwu ahụ n’eluigwe.—Ilu 8:22, 27-31; Eklisiastis 12:1.
14. Olee otú Jisọs si ghọọ mmadụ?
14 Mgbe ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Chineke bufere ndụ nke Ọkpara ya n’afọ nke otu nwanyị. N’ụzọ dị otú a, ọ ghọrọ nwa Chineke bụ mmadụ, nke a mụrụ n’ụzọ e si amụ nwa site na nwanyị. (Ndị Galetia 4:4) Mgbe Jisọs na-etolite n’afọ nne ya bụ Meri, na mgbe e mesịkwara ka ọ na-etolite dị ka nwata, ọ dabeere n’ebe ndị ahụ Chineke hopụtaworo ịbụ nne na nna elu ala ya nọ. Jisọs mesịrị toruo ogo nwoke, e mekwara ka o cheta mmekọrịta ya na Chineke na mbụ n’eluigwe. Nke a mere ‘mgbe e meghere eluigwe nye ya’ na baptism ya.—Matiu 3:16; Jọn 8:23; 17:5.
15. Olee otú anyị si mara na Jisọs bụ mmadụ zuru ezu mgbe ọ dị ndụ n’elu ala?
15 N’ezie, Jisọs bụ mmadụ pụrụ iche. Otú ọ dị, ọ bụ mmadụ, onye ya na Adam, bụ́ onye Chineke kere na mbụ ma debe n’ogige Iden hà nhata. Pọl onyeozi kọwara, sị: “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ. Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ nke na-enye ndụ.” A kpọrọ Jisọs “Adam ikpeazụ” n’ihi na, dị ka Adam nke mbụ, Jisọs bụ mmadụ zuru okè. Ma mgbe Jisọs nwụsịrị, e mere ka o si n’ọnwụ bilie, o sonyekwaara Nna ya n’eluigwe dị ka onye bụ mmụọ.—1 Ndị Kọrint 15:45.
Ụzọ Kasị Mma Isi Mụọ Banyere Chineke
16. (a) Gịnị mere iso Jisọs kpakọrịta ji bụrụ oké ihe ùgwù otú a? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụ Jisọs anya bụ otu ihe ahụ dị ka ihụ Chineke?
16 Chee echiche nwa oge banyere ùgwù dị ịtụnanya nke ụfọdụ nwere dị ka ndị ha na Jisọs so kpachie anya mgbe ọ nọ n’elu ala! Tụleedị ihe ọ pụtara ige ntị, ikiri, na ọbụna isoro Onye ya na Jehova Chineke nweworo mkpakọrịta chiri anya ruo ma eleghị anya ọtụtụ ijeri afọ n’eluigwe kwurịta okwu ma rụkọọ ọrụ! Dị ka ọkpara kwesịrị ntụkwasị obi, Jisọs ṅomiri Nna ya nke eluigwe n’ihe nile o mere. N’ezie, o ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè nke na ọ pụrụ ịgwa ndị ozi ya mgbe ọ fọdụrụ nwa oge tupu ogbugbu ya, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9, 10) Ee, n’ọnọdụ nile nke o zutere n’ụwa ebe a, Jisọs mere dị nnọọ ka Nna ya, bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, gaara emeworị ma ọ bụrụ na Ọ nọrọ n’ebe a. Ya mere, mgbe anyị na-amụ banyere ndụ na ije ozi Jisọs Kraịst, n’otu aka ahụ, anyị na-amụ kpọmkwem ụdị onye Chineke bụ.
17. Nzube ọma dị aṅaa ka usoro isiokwu Ụlọ Nche bụ́ “Ndụ na Ije Ozi Jisọs” jere ozi ya?
17 Ya mere, usoro isiokwu ahụ bụ “Ndụ na Ije Ozi Jisọs,” nke pụtara n’usoro n’usoro ná mbipụta nile nke Ụlọ Nche (Bekee) malite n’April 1985 ruo June 1991, abụghị nanị na o nyere ezi nghọta nke nwoke ahụ bụ Jisọs kama o zikwara ihe dị ukwuu banyere Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke. Mgbe e bipụtasịrị akụkụ nke abụọ ya, otu onye ozi ọsụ ụzọ deere Watch Tower Society akwụkwọ igosi obi ekele, na-asị: “Ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma isi rutekwuo Nna ahụ nso karịa ịmatakwu Ọkpara ahụ nke ọma!” Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Nlekọta obi ebere nke Nna ahụ na-elekọta ndị mmadụ na omume inye onyinye na afọ ọma ya bụ nke e mere ka ọ pụta ìhè karị ná ndụ nke Ọkpara ahụ.
18. Ònye bụ Isi Iyi nke ozi Alaeze ahụ, oleekwa otú Jisọs si kwupụta nke a?
18 Ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe Nna ya nọ, nke pụtara ìhè n’ido onwe ya kpam kpam n’okpuru uche Nna ya, bụ nnọọ ihe mara mma ikiri. “Ọ dịghịkwa ihe m na-eme n’onwe m,” ka Jisọs gwara ndị Juu na-achọ igbu ya, “kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndi a.” (Jọn 8:28) Ya mere, mgbe ahụ, Jisọs abụghị isi iyi nke ozi Alaeze ahụ o kwusara. Ọ bụ Jehova Chineke! Ọtụtụ mgbe Jisọs nyekwara Nna ya otuto n’ihe ọ na-eme. “Mụ onwe m ekwughị site n’onwe m,” ka o kwuru, “kama Nna m nke zitere m, ya onwe ya enyewo m iwu, ihe m ga-ekwu, na otú m ga-ekwu ya. . . . Ya mere ihe mụ onwe m na-ekwu, dị ka Nna m gwaworo m okwu, otú a ka m na-ekwu.”—Jọn 12:49, 50.
19. (a) Olee otú anyị si mara na Jisọs ziri ihe n’ụzọ Jehova si ezi? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs ji bụrụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ?
19 Ma, ọ bụghị nanị na Jisọs kwuru ma ọ bụ kụzie ihe Nna ya gwara ya. O mere ihe dị nnọọ ukwuu karịa nke ahụ. O kwuru ya ma ọ bụ kụzie ya n’ụzọ nke Nna ya gaara esiworị kwuo ya ma ọ bụ kụzie ya. Ọzọ, n’ihe nile o mere ná mmekọrịta ya na ndị ọzọ, ọ kpara àgwà ma mee ihe dị nnọọ ka Nna ya gaara esiworị kpaa àgwà ma mee ihe n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ. “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya,” ka Jisọs kọwara, “ma ọ bụghị ihe ọ hụrụ na Nna ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara ya na-emekwa otú ahụ.” (Jọn 5:19) N’ụzọ nile, Jisọs bụ ihe ngosipụta zuru okè nke Nna ya, bụ́ Jehova Chineke. Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya na Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ! Mgbe ahụ, n’ezie, ọ dị ezi mkpa ka anyị tụlee nwoke a nke pụrụ iche n’ụzọ dị ukwuu nke ọma!
A Hụrụ Ịhụnanya Chineke n’Ime Jisọs
20. Olee ụzọ Jọn onyeozi ga-esiworị mata na “Chineke bụ ịhụnanya?
20 Gịnị ka anyị na-amụta karịsịa site n’iji ezi nlezi anya mụọ ihe n’ụzọ miri emi banyere ndụ na ije ozi Jisọs? Otú ọ dị, Jọn onyeozi kwetara na “ọ dịghị onye ọ bụla hụworo Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Otú o sina dị, Jọn ji obi ike nile dee na 1 Jọn 4:8, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” Jọn pụrụ ikwu nke a n’ihi na ọ maara ịhụnanya Chineke site n’ihe ọ hụrụ n’ebe Jisọs nọ.
21. Gịnị banyere Jisọs mere ya nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ?
21 Dị ka Nna ya, Jisọs nwere obi ebere, obi ọma, bụrụ onye wedara onwe ya ala na onye a pụrụ ịbịakwute. Ndị na-adịghị ike na ndị a na-emegbu emegbu nwere obi iru ala n’ebe ọ nọ, dịkwa ka ụdị mmadụ dị iche iche—ndị ikom, ndị inyom, ụmụntakịrị, ndị ọgaranya, ndị ogbenye, ndị dị ike, na ndị mmehie a ma ama n’otu aka ahụ. N’ezie, ọ bụ ihe atụ ịhụnanya pụrụ iche nke Jisos n’iṅomi Nna ya, karịsịa bụ ihe mere ya nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ọbụna Napoléon Bonaparte ka e kwuru na ọ sịrị: “Aleksanda, Siza, Charlemagne, na mụ onwe m guzobere alaeze ukwuu dị iche iche, ma n’elu gịnị ka anyị dabeere nchepụta nile nke oké ọgụgụ isi anyị? Ọ bụ n’ime ihe n’ike. Ọ bụ nanị Jisọs Kraịst mere ntọala alaeze ya n’elu ịhụnanya, n’oge a kwa, ọtụtụ nde ndị mmadụ ga-achọ ịnwụ maka ya.”
22. Gịnị bụ ihe dị iche banyere ozizi Jisọs?
22 Ozizi Jisọs dị nnọọ iche. “Eguzogidela onye bụ ajọ onye,” ka Jisọs kwuru, “kama onye ọ bụla na-akpụ gị ụra ná nti aka nri, tụgharịkwaara ya nti ọzọ.” “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.” ‘Na-meso ndị ọzọ otú ị ga-achọ ka ha mesoo gị.’ (Matiu 5:39, 44; 7:12) Lee nnọọ otú ụwa gaara esi bụrụ ebe dị iche n’otú ọ dị ugbu a ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbaso ozizi ndị a dị elu!
23. Gịnị ka Jisọs mere iji ruo n’obi ma na-akpali ndị mmadụ ime ihe ọma?
23 Ilu, ma ọ bụ ihe atụ nile nke Jisọs na-eru n’obi, na-akpali ndị mmadụ ime ihe ọma ma zere ihe ọjọọ. Ị pụrụ icheta akụkọ ya a maara nke ọma banyere onye Sameria a na-eleda anya nke nyeere nwoke onye agbụrụ ọzọ e merụrụ ahụ aka mgbe ndị na-eme nsọ nsọ nke agbụrụ nwoke ahụ na-enyeghịrị ya aka. Ma ọ bụ akụkọ banyere nna nwere obi ebere nke na-agbaghara mmehie na nwa mmefu ya. Oleekwanụ banyere akụkọ nke otu eze onye gbaghaara otu ohu ya ụgwọ nke 60 nde shilling ma ohu ahụ atụgharịa tụba ohu ibe ya nke na-enweghị ike ịkwụ ụgwọ nanị 100 shilling nke o ji, n’ụlọ mkpọrọ? Site n’ilu ndị dị mfe, Jisọs mere ka ọchịchọ onwe onye nanị na anyaukwu bụrụ ihe na-aso oyi nakwa ka omume nke ịhụnanya na ebere bụrụ ihe na-adọrọ mmasị!—Matiu 18:23-35; Luk 10:30-37; 15:11-32.
24. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ n’ụzọ ịrụ ụka na-adịghị ya?
24 Otú ọ dị, ihe dọtakarịsịrị mmasị ndị mmadụ n’ebe Jisọs nọ ma kpaliekwa ha ime ezi ihe bụ na ndụ ya kwekọrọ n’ụzọ zuru okè n’ihe o ziri. Ọ na-etinye ihe ọ na-ekwusa n’ọrụ. O ji ndidi na-anagide ezughị okè nile nke ndị ọzọ. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya rụrịtara ụka banyere onye kachasị ukwuu, o ji obi ọma gbazie ha olu kama iji olu ike baara ha mba. O jere ozi n’obi dị umeala iji gboo mkpa ha, ọbụna saa ụkwụ ha. (Mak 9:30-37; 10:35-45; Luk 22:24-27; Jọn 13:5) N’ikpeazụ, ọ nakweere ịnwụ ọnwụ ihe mgbu, ọ bụghị nanị n’ihi ha, kama n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ! N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee ihe àmà e nwere na Jisọs bụ onye dịrị adị n’ezie n’akụkọ ihe mere eme?
◻ Olee otú anyị si mara na Jisọs bụ mmadụ, ma olee otú o si dị iche n’ebe ndị ikom nile ọzọ nọ?
◻ N’ihi gịnị ka ịmụ banyere ndụ Jisọs ji bụrụ ụzọ kasị mma isi mụọ banyere Chineke?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ịhụnanya Chineke site n’ịmụ banyere Jisọs?
[Foto dị na peeji nke 10]
O juru ndị na-eso ụzọ Jisọs anya ha wee jụọ, sị: “Ònye bụkwa onye a?”