“Na-ezekwa Ihe Ndị Farisii na Ndị Sadusii, Bụ́ Ihe Na-eko Achịcha”
MGBE Jisọs Kraịst kwuru okwu ndị ahụ ihe karịrị narị afọ 19 gara aga, ọ nọ na-adọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ozizi na omume okpukpe ndị na-emerụ ahụ. (Matiu 16:6, 12) Ihe ndekọ dị na Mak 8:15 kwuru kpọmkwem, sị: “Lezienụ anya ihe ndị Farisii, bụ́ ihe na-eko achịcha, na ihe Herọd, bụ́ ihe na-eko achịcha.” Gịnị mere e ji kpọtụ Herọd aha? N’ihi na ụfọdụ n’ime ndị Sadusii bụ ndị òtù Herọd, òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
N’ihi gịnị ka ụdị ịdọ aka ná ntị ahụ pụrụ iche ji dị mkpa? Ọ̀ bụ na ndị Farisii na ndị Sadusii abụghị ndị na-emegide Jisọs n’ụzọ pụtara ìhè? (Matiu 16:21; Jọn 11:45-50) Ee, ha bụ. Ma, ụfọdụ n’ime ha ga-emesịa nabata Iso Ụzọ Kraịst ma mgbe ahụ gbalịa ịmanye ọgbakọ ndị Kraịst ịnakwere echiche nke ha.—Ọrụ 15:5.
E nwekwara ihe ize ndụ nke na ndị na-eso ụzọ ahụ n’onwe ha pụrụ iṅomi ndị ndú okpukpe ahụ bụ́ ndị a zụlitere n’okpuru mmetụta ha. Mgbe ụfọdụ, nanị ịbụ ndị a zụlitere n’ụdị okpukpe ahụ ghọrọ ihe na-egbochi ha ịghọta ozizi Jisọs.
Gịnị mere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii ihe dị oké ize ndụ? Inyobatụ anya n’ọnọdụ okpukpe nke dị n’oge Jisọs ga-eme ka anyị mara.
Adịghị n’Otu nke Okpukpe
Banyere ógbè ndị Juu n’oge narị afọ nke mbụ O.A., ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Max Radin dere, sị: “Inwere onwe nke ọgbakọ ndị Juu dị iche iche pụọ n’ibe ha dị adị n’ezie, ọbụna a na-agba isi akwara ka ọ dịrị otú ahụ. . . . Ọtụtụ ugbo, mgbe e mesiri ike nsọpụrụ maka ụlọ nsọ na obodo nsọ, a pụrụ igosi ndị ji ịchịisi kasị elu n’oge ahụ ná mba a mụrụ nne na nna mmadụ oké ịkpọasị.”
Ọ bụ n’ezie ọnọdụ ime mmụọ dị mwute! Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị kpatara ya? Ọ bụghị ndị Juu nile bi na Palestine. Mmetụta nke ọdịbendị ndị Grik, bụ́ ebe ndị nchụàjà na-abụghị ndị ndú obodo, ekerewo òkè ya n’imebi nkwanye ùgwù e nwere maka ndokwa usoro ndị nchụàjà nke Jehova mere. (Ọpụpụ 28:29; 40:12-15) A gaghịkwa eleghara ndị nkịtị gụrụ akwụkwọ na ndị odeakwụkwọ anya.
Ndị Farisii
Aha ahụ bụ́ Farisii, ma ọ bụ Peru·shimʹ, yikarịrị ka ọ pụtara “ndị e kewapụrụ iche.” Ndị Farisii lere onwe ha anya ịbụ ndị na-eso ụzọ Mosis. Ha guzobere òtù ụmụnna nke ha (Hibru, chavu·rahʹ). Iji bụrụ onye a kpọbatara n’òtù ahụ, mmadụ ga-ekwe nkwa nke idebesi ike ịdị ọcha nke ndị Livaị n’ihu mmadụ atọ nke òtù ahụ, izere isoro ndị ʽam-ha·ʼaʹrets (ìgwè mmadụ na-agụghị akwụkwọ) nwee mkpakọrịta chiri anya, nakwa iji nlezianya na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Mak 2:16 na-ekwu banyere “ndị odeakwụkwọ dị n’etiti ndị Farisii.” Ụfọdụ n’ime ndị òtù a bụcha ndị ji ide akwụkwọ na nkụzi mere ọrụ, ebe ndị ọzọ bụ ndị nkịtị.—Matiu 23:1-7.
Ndị Farisii kwenyere na Chineke nọ ebe nile. Ha chere na ebe “Chineke nọ ebe nile, a pụrụ ife Ya ofufe ma n’ime Ụlọ Nsọ ma n’èzí ya, a gaghịkwa eji nanị ịchụ àjà kpọkuo ya. Ha si otú a wulite ụlọ nzukọ ndị Juu dị ka ebe a na-anọ efe ofufe, ebe ọmụmụ ihe, na ekpere, bulie ya elu ịbụ ebe bụ isi na ebe dị mkpa ná ndụ ndị mmadụ bụ́ nke mara Ụlọ Nsọ ahụ aka.”—Encyclopaedia Judaica.
Ndị Farisii enweghị ekele maka ụlọ nsọ Jehova. A pụrụ ịhụ nke a site n’okwu Jisọs: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị ndú ìsì, ndị sị, Onye ọ bụla nke ga-eji ụlọ nsọ Chineke ṅụọ iyi, ọ bụghị ihe; ma onye ọ bụla nke ga-eji ọlaedo nke ụlọ nsọ ahụ ṅụọ iyi, o ji ụgwọ. Ndị nzuzu na ndị ìsì: n’ihi na olee nke dịkarịrị ukwuu, ọlaedo ahụ, ma ọ bụ ụlọ nsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ? Unu sịkwa, Onye ọ bụla nke ga-eji ebe ịchụ àjà ṅụọ iyi, ọ bụghị ihe; ma onye ọ bụla nke ga-eji ihe onyinye dị n’elu ya ṅụọ iyi, o ji ụgwọ. Ndị ìsì: n’ihi na olee nke ka ukwuu, ihe onyinye, ma ọ bụ ebe ịchụ àjà nke na-edo ihe onyinye ahụ nsọ? Ya mere, onye ji ebe ịchụ àjà ahụ ṅụọ iyi, o ji ya, na ihe nile dị n’elu ya, ṅụọ iyi.”—Matiu 23:16-20.
Olee otú ndị Farisii pụrụ isiworị gbagọọ agbagọọ n’echiche ha otú a? Gịnị ka ha na-eleghara anya? Rịba ama ihe ọzọ Jisọs kwuru. “Onye jikwa ụlọ nsọ ahụ ṅụọ iyi, o ji ya, na Onye bi n’ime ya, ṅụọ iyi.” (Matiu 23:21) Banyere amaokwu nke a, ọkà mmụta E. P. Sanders kwuru, sị: “Ụlọ nsọ ahụ dị nsọ ọ bụghị nanị n’ihi na a na-efe Chineke ahụ dị nsọ ofufe n’ebe ahụ, kamakwa n’ihi na ọ nọ ebe ahụ.” (Judaism: Practice and Belief, 63 BCE—66 CE) Otú ọ dị, ọnụnọ pụrụ iche nke Jehova agaghị enwe oké ihe ọ pụtara nye ndị chere na ọ nọ ebe nile.
Ndị Farisii kwenyekwara ná njikọta nke akara aka na nnwere onwe ime nhọrọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, “a kara ihe nile aka, ma a na-enye nnwere onwe nke ime nhọrọ.” N’agbanyeghị nke ahụ ha kwenyere na a kara Adam na Iv aka ime mmehie na ọbụna ntakịrị mma e gburu ná mkpịsị aka bụ nke a kara aka.
Jisọs pụrụ ibu ụdị echiche ụgha ndị ahụ n’obi mgbe o kwuru banyere ọdịda nke otu ụlọ elu nke kpatara ọnwụ nke mmadụ 18. Ọ jụrụ, sị: “Ùnu na-eche na ndị ahụ [ndị nwụrụnụ] bụ ndị ji ụgwọ karịa mmadụ nile ndị bi na Jerusalem?” (Luk 13:4) Dị ka ọ bụ eziokwu banyere ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe ọghọm, nke a bụ ihe “mgbe na ihe ndapụta” kpatara, ọ bụghị akara aka dị ka ndị Farisii kụziri. (Eklisiastis 9:11) Olee otú ndị ahụ e chere na ha maara ihe ga-esi mesoo iwu nke Akwụkwọ Nsọ?
Ha Bụ Ndị Mgbanwe Okpukpe
Ndị Farisii kwenyere na ndị rabaị nke ọgbọ ọ bụla aghaghị ịkọwa iwu Akwụkwọ Nsọ n’ikwekọ n’ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ. N’ihi ya, akwụkwọ Encyclopaedia Judaica sịrị na ha “ahụghị oké ihe isi ike n’ime ka ozizi Torah na ihe ọmụma ha ndị kasị ọhụrụ kwekọọ, ma ọ bụ n’ịchọta ebe e gosiri ma ọ bụ kpọtụ echiche ha uche n’okwu ndị dị na Torah.”
Banyere Ụbọchị Ikpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ, ha nyefere ikike nke ikpuchi mmehie site n’onye isi nchụàjà gaa n’ụbọchị ahụ n’onwe ya. (Levitikọs 16:30, 33) N’ememe Ngabiga, ha mesiri ịgụgharị ihe mmụta nke ihe ndekọ Ọpụpụ ike mgbe a na-aṅụ mmanya ma na-eri achịcha na-ekoghị eko karịa nwa atụrụ ememe ngabiga ahụ.
Mgbe oge na-aga, ndị Farisii ghọrọ ndị ọnụ ha na-eru n’okwu n’ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ahụ ha guzobere usoro nke iburu mmiri site n’ọdọ mmiri nke Saịlọm kwụọ n’ahịrị n’ahịrị n’anyasị nke Ememe nke Nchịkọta Ihe, ịwụsa mmiri ahụ n’ebe nchụàjà n’ụtụtụ echi ya, iti osisi willow n’elu ebe ịchụ àjà mgbe ememe ahụ mechiri, na ekpere a na-ekpe kwa ụbọchị mgbe nile nke na-enweghị ebe ndabere n’Iwu ahụ.
“Nke dị ịrịba ama karịsịa” bụ “mgbanwe ndị Farisii mere banyere Ụbọchị Izu Ike,” ka The Jewish Encyclopedia na-asị. A na-atụ anya na onye bụ nwunye ga-anabata Ụbọchị Izu Ike ahụ site n’ịmụnye ọkụ n’oriọna. Ọ bụrụ na o yie ka ụfọdụ ihe omume pụrụ iduga n’ịrụ ọrụ iwu na-akwadoghi, ndị Farisii machibidoro ya iwu. Ọbụna ha gara n’ókè nke ịchịkwa ọgwụgwọ ọrịa ma gosipụta iwe n’ọrụ ebube ndị Jisọs rụrụ n’ịgwọ ndị mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike. (Matiu 12:9-14; Jọn 5:1-16) Otú ọ dị, ndị mgbanwe okpukpe ndị a akwụsịghị n’iguzobe ihe omume ọhụrụ ná mgbalị nke imepụta ihe mgbochi, ma ọ bụ ihe ngechi, maka nchebe nke iwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ.
Mwepụ
Ndị Farisii zọọrọ ikike ịmachibido ma ọ bụ iwepụ iwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. Echiche ha bụ nke e gosipụtara n’ilu nke Talmud: “Ọ ka mma na e fopụrụ otu iwu karịa na e chefuru Torah nile.” Otu ihe atụ bụ nkwụsị a kwụsịrị ime Jubilee ná ndabere nke na n’ihi egwu ịtụfu ihe mmadụ nwere ka oge ahụ bịaruru, ọ dịghị onye ga-ebinye onye ogbenye ihe.—Levitikọs, isi nke 25.
Ihe atụ ndị ọzọ bụ mwepụ nke ikpe nwanyị a na-enyo enyo na ọ kwara iko ikpe na n’ihe banyere igbu ọchụ na-edochaghị anya, ịkwụsị usoro ịnara ntaramahụhụ. (Ọnụ Ọgụgụ 5:11-31; Deuterọnọmi 21:1-9) Ọ bụ nanị ka nwa oge gafetụ tupu ndị Farisii ewepụ iwu Akwụkwọ Nsọ nke inye nne na nna mmadụ nọ ná mkpa ihe na-akpa ha.—Ọpụpụ 20:12; Matiu 15:3-6.
Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ ihe ndị Farisii, bụ́ ihe na-eko achịcha, nke bụ ihu abụọ.” (Luk 12:1) Ozizi ndị Farisii, ya na omume ya na-ekwekọghị n’ọchịchị Chineke, bụ nnọọ ihe ihu abụọ—ihe a na-agaghị ewebata n’ime ọgbakọ ndị Kraịst ma ọlị. N’agbanyeghị nke ahụ, akwụkwọ ihe ọmụma ndị Juu na-ekwu ihe dị mma banyere ndị Farisii karịa ndị Sadusii. Ka anyị tụlee ugbu a òtù a na-adịghị emekebe mgbanwe.
Ndị Sadusii
Aha ahụ bụ́ ndị Sadusii bụ nke ikekwe e sitere na Zedọk, onye isi nchụàjà n’ụbọchị Solomọn weta. (1 Ndị Eze 2:35, NW, okwu dị n’ala ala peji) Ndị Sadusii hiwere òtù ndị na-adịghị emekebe mgbanwe nke na-anọchite anya ọdịmma nke ụlọ nsọ ahụ na usoro ndị nchụàjà. N’adịghị ka ndị Farisii, bụ́ ndị zọọrọ ikike site n’ịmụ ihe na ime ka ndị ezi omume, ndị Sadusii gbakwasịrị ikike ha nwere ụkwụ n’usoro ọmụmụ na ọkwá. Ha megidere mgbanwe ndị Farisii ruo ná mbibi nke ụlọ nsọ ahụ na 70 O.A.
Tinyere ịjụ akara aka, ndị Sadusii jụrụ ịnakwere ozizi ọ bụla nke a na-akpọtụghị aha n’ụzọ pụtara ìhè na Pentateuch (akwụkwọ ise mbụ nke Bible), ọbụna ọ bụrụ na e kwuru ya n’ebe ọzọ n’Okwu Chineke. N’ezie, ha “lere ya anya dị ka omume ọma ịgbagha” okwu ndị a. (The Jewish Encyclopedia) Nke a na-echetara mmadụ oge ha mara Jisọs aka banyere mbilite n’ọnwụ.
N’iji ihe atụ nke nwanyị di ya asaa nwụrụ, ndị Sadusii jụrụ, sị: “Ná mbilite n’ọnwụ nwunye ònye n’etiti ha asaa ka ọ ga-abụ?” N’ezie, ọ masị nwanyị ahụ di ya nwụrụ ha chepụtara echepụta nke ha kpọtụrụ aha ya nwee di 14 ma ọ bụ 21. Jisọs kọwara, sị: “N’ime mbilite n’ọnwụ ha alụghị nwunye, e nyeghịkwa ha n’ọlụlụ di.”—Matiu 22:23-30.
Ebe ọ maara ọjụjụ ndị Sadusii jụrụ ndị dere ihe n’okpuru ike mmụọ nsọ e wezụga Mosis, Jisọs nwapụtara isi ihe O bu n’uche site n’ihota Pentateuch ahụ. O kwuru, sị: “N’okwu banyere ndị nwụrụ anwụ, na a na-eme ka ha si n’ọnwụ bilie; ùnu agụghị n’akwụkwọ Mosis, n’ebe e dere okwu banyere Osisi nta, otú Chineke gwara ya, sị, Mụ onwe m bụ Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb? Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ.”—Mak 12:26, 27.
Ndị Na-akpagbu Jisọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya
Ndị Sadusii kwenyere n’iji ọchịchị obodo emeso mba ndị ọzọ ihe karịa ichere Mesaịa ahụ—ma ọ bụrụ na ha kwenyedịrị n’ọbịbịa ya. N’okpuru nkwekọrịta ha na Rom, ha ga na-arụ ọrụ metụtara ụlọ nsọ ahụ, ha achọghịkwa Mesaịa ọ bụla ga-apụtanụ, na-akpaghasị ihe. N’ile Jisọs anya dị ka onye na-eyi ọnọdụ ha egwu, ha soro ndị Farisii gbakọta aka ịgba izu igbu ya.—Matiu 26:59-66; Jọn 11:45-50.
N’ịbụ ndị nwere echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ ndị Sadusii mere ka irubere Rom isi bụrụ ihe iseokwu ma tie mkpu, sị: “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza.” (Jọn 19:6, 12-15) Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, ọ bụ ndị Sadusii butere ụzọ n’ịgbalị ịkwụsị mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 4:1-23; 5:17-42; 9:14) Mgbe e bibisịrị ụlọ nsọ ahụ na 70 O.A., òtù nke a kwụsịrị ịdị.
Mkpa Ọ Dị Ịnọgide ná Nche
Lee ka ịdọ aka ná ntị Jisọs si ghọọ ihe kwesịrị ekwesị! Ee, ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị “na-ezekwa ihe ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ihe na-eko achịcha.” O nyeghị nsogbu mmadụ ịhụ mkpụrụ ọjọọ ya ná ndị Juu nakwa Krisendọm taa.
Otú ọ dị, n’ụzọ dị nnọọ iche, ndị okenye ndị Kraịst ruru eru n’ihe karịrị 75,500 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova gbaa ụwa gburugburu ‘na-arịba onwe ha na ozizi ha ama.’ (1 Timoti 4:16) Ha na-anakwere Bible dum dị ka ihe si n’obi Chineke pụta. (2 Timoti 3:16) Kama ịbụ ndị na-eme mgbanwe ma na-akwalite usoro okpukpe nke ha, ha na-arụkọ ọrụ ọnụ n’okpuru nduzi nke otu nzukọ dabeere na Bible nke na-eji magazin nke a na-eme ihe dị ka ngwá ọrụ bụ isi o ji enye ntụziaka.—Matiu 24:45-47.
Gịnị si na ya pụta? A na-ebuli ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa elu n’ime mmụọ ka ha na-abịa aghọta Bible, tinye ya n’omume ná ndụ ha, ma kụziere ya ndị ọzọ. Iji hụ otú a na-esi arụzu nke a, gịnị ma i jee leta ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị gị nso karị ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ?
[Igbe dị na peeji nke 26]
JISỌS CHEBAARA NDỊ NA-EGE YA NTỊ ECHICHE
JISỌS KRAỊST ziri ihe n’ụzọ doro anya, na-eburu echiche ndị na-ege ya ntị n’uche. Dị ka ihe atụ, o mere nke ahụ mgbe ọ gwara onye Farisii bụ́ Nikọdimọs okwu banyere ‘ịmụ mmadụ’ ọzọ. Nikọdimọs jụrụ, sị: “È si aṅaa pụ ịmụ mmadụ mgbe ọ kara nká? ọ̀ pụrụ ịba n’afọ nne ya nke ugbo abụọ, e wee mụọ ya?” (Jọn 3:1-5) N’ihi gịnị ka Nikọdimọs ji nwee ihe ijuanya otú a, ebe ndị Farisii kwenyere na ịmụgharị mmadụ dị mkpa maka ndị a tọghatara gaa n’okpukpe ndị Juu, okwu ndị rabaị jikwa onye a tọghatara tụnyere “nwa a mụrụ ọhụrụ”?
Akwụkwọ bụ́ A Commentary on the New Testament From the Talmud and Hebraica, nke John Lightfoot dere, na-enye nghọta nke a na-esonụ: “Echiche ndị Juu nke a na-ahụkarị banyere iru eru onye Israel . . . ka rapagidere n’uche nke onye Farisii nke a” bụ́ onye na-enweghị ike “iwepụ echiche ịkpa ókè mbụ ya n’ụzọ dị mfe . . . : ‘Ebe ndị Israel . . . nwere ikike ịbụ ndị a kpọbatara n’alaeze nke Mesaịa, site n’okwu gị a, ì buzi n’uche na ọ dị mkpa ka onye ọ bụla banye n’ime afọ nne ya nke ugbo abụọ, ka o nwee ike ịbụ onye Israel ọhụrụ?’”—Tụlee Matiu 3:9.
Ọ bụ ezie na ọ na-anakwere ọmụmụ ọhụrụ maka ndị a tọghatara atọghata, Nikọdimọs ga-ele usoro dị otú ahụ anya dị ka ihe na-apụghị ime eme nye ndị Juu anụ ahụ—ịbanyeghachi n’afọ dị ka a pụrụ isi kwuo ya.
N’oge ọzọ, ọtụtụ were iwe mgbe Jisọs kwuru banyere ‘iri anụ ahụ ya na ịṅụ ọbara ya.’ (Jọn 6:48-55) Otú ọ dị, Lightfoot na-arụtụ aka na “ọ bụ nnọọ ihe a na-ahụkarị n’ụlọ akwụkwọ ndị Juu ihota ahịrị okwu nke ‘iri ihe na ịṅụ ihe’ n’ụzọ iji ihe atụnyere ihe.” Ọ rịbakwara ama na Talmud kwukwara banyere “iri Mesaịa ahụ.”
Ya mere otú a ka o si bụrụ na echiche nke ndị Farisii na ndị Sadusii nwere nnọọ mmetụta n’echiche ndị Juu narị afọ mbụ. Otú ọ dị, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Jisọs na-ebu n’uche ihe ọmụma na ahụmahụ nke ndị na-ege ya ntị mgbe nile. Nke a bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ndị mere ya Onye Ozizi Ukwu ahụ.