Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 55 p. 134-p. 135 para. 10
  • Jizọs Ekwuo Ihe Wụrụ Ọtụtụ Ndị Akpata Oyi n’Ahụ́

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ekwuo Ihe Wụrụ Ọtụtụ Ndị Akpata Oyi n’Ahụ́
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọtụtụ Ndị Na-eso Ụzọ Akwụsị Iso Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ndụ Ebighị Ebi?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Jizọs Bụ “Achịcha Na-enye Ndụ”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 55 p. 134-p. 135 para. 10
Mgbe Jizọs na-agwa ndịozi ya iri na abụọ okwu, Judas ana-ele anya ebe ọzọ, ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ amalite ịtamu ntamu ma lawa

ISI NKE 55

Jizọs Ekwuo Ihe Wụrụ Ọtụtụ Ndị Akpata Oyi n’Ahụ́

JỌN 6:48-71

  • IRI ANỤ AHỤ́ JIZỌS NA ỊṄỤ ỌBARA YA

  • ỌTỤTỤ NDỊ GHỌTAHIERE JIZỌS MA KWỤSỊ ISO YA

Jizọs nọ n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm na-akụzi na ya bụ ezi achịcha nke si n’eluigwe. O yiri ka ọ̀ na-akụzi ihe a iji kọwakwuo ihe ọ gwaburu ndị ahụ si n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Galili chọrọ ya bịa, ya bụ, ndị ahụ o ji achịcha na azụ̀ nyejuo afọ.

Jizọs gwaziri ha, sị: “Nna nna unu hà riri mana n’ala ịkpa ma mechaa nwụọ.” Jizọs kwuziri ihe dị iche na mana ahụ ha riri na achịcha a ọ na-agwa ha banyere ya. Ọ sịrị: “Abụ m achịcha na-enye ndụ nke si n’eluigwe bịa; ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; n’eziokwu, achịcha ahụ m ga-enye bụ anụ ahụ́ m n’ihi ndụ nke ụwa.”—Jọn 6:48-51.

N’oge opupu ihe ubi n’afọ 30, Jizọs gwara Nikọdimọs na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye Nzọpụta. Ugbu a, Jizọs na-emezi ka o doo anya na ọ dị mkpa iri anụ ahụ́ ya. Otú a ga-esi eri anụ ahụ́ ya bụ inwe okwukwe n’àjà ọ gaje ịchụ. Ọ bụ ya bụ ihe mmadụ ga-eme iji nweta ndụ ebighị ebi.

Ma, ndị mmadụ ekwetaghị ihe a Jizọs kwuru. Ha jụrụ, sị: “Olee otú nwoke a ga-esi enye anyị anụ ahụ́ ya ka anyị rie?” (Jọn 6:52) Jizọs chọrọ ka ha ghọta na o nwere ihe ihe ya na-ekwu pụtara. Ihe ọzọ o kwuru gosiri na ihe ọ na-ekwu abụghị iri anụ ahụ́ ya nkịtị.

Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́ Nwa nke mmadụ, ṅụọkwa ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu. Onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, . . . n’ihi na anụ ahụ́ m bụ ezi nri, ọbara m bụkwa ezi ihe ọṅụṅụ. Mụ na onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m dị n’otu.”—Jọn 6:53-56.

Chegodị ụdị iwe ihe ahụ o kwuru ga-ewe ndị Juu na-ege ya ntị. Ha nwere ike iche na Jizọs na-asị ha rie anụ mmadụ ma ọ bụ na-agwa ha ka ha mebie iwu Chineke nyere banyere ọbara. (Jenesis 9:4; Levitikọs 17: 10, 11) Ma, ihe Jizọs na-ekwu abụghị iri anụ mmadụ ma ọ bụ ịṅụ ọbara mmadụ. Ihe ọ na-ekwu bụ na ndị niile chọrọ inweta ndụ ebighị ebi kwesịrị inwe okwukwe n’àjà ọ na-aga iji ahụ́ ya zuru okè na ọbara ya chụọ. Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya aghọtadịghị ihe ihe ahụ o kwuru pụtara. Ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ ige ntị na ya?”—Jọn 6:60.

Mgbe Jizọs chọpụtara na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu, ọ jụrụ ha, sị: “Ihe a ò mere ka unu sụọ ngọngọ? Ọ́ bụrụkwanụ na unu ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọbu? . . . Okwu m gwara unu si n’ike mmụọ nsọ, ọ na-enyekwa ndụ. Ma e nwere ụfọdụ n’ime unu na-ekweghị.” Mgbe o kwuru ihe a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya lawara ma kwụsị iso ya.—Jọn 6:61-64.

Jizọs jụrụ ndịozi iri na abụọ ya, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi. Anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.” (Jọn 6:67-69) Ihe a Pita kwuru gosiri na ọ kwụsiri ike n’akụkụ Jizọs, n’agbanyeghị na mgbe ahụ, Pita na ndịozi ndị ọzọ aghọtachabeghị ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara.

Ihe a Pita zara tọrọ Jizọs ụtọ, Jizọs asị ha: “M họọrọ unu mmadụ iri na abụọ, ọ́ bụghị ya? Ma otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.” (Jọn 6:70) Onye Jizọs na-ekwu banyere ya bụ Judas Iskarịọt. O nwere ike ịbụ na n’oge a, Jizọs achọpụtala na Judas ebidola ime ihe ọjọọ ndị dị ya n’obi.

Ma, obi tọrọ Jizọs ezigbo ụtọ ịhụ na ihe ahụ ndị ọzọ mere emeghị ka Pita na ndịozi ndị ọzọ kwụsị iso ya, o meghịkwa ka ha kwụsị ịrụ ọrụ Jizọs na-arụ nke ga-eme ka ndị mmadụ dị ndụ.

  • Olee otú Jizọs si nye ndị mmadụ anụ ahụ́ ya, oleekwa otú mmadụ nwere ike isi ‘rie anụ ahụ́ Jizọs’?

  • Gịnị mere ihe Jizọs kwuru banyere anụ ahụ́ ya na ọbara ya ji wụọ ndị mmadụ akpata oyi n’ahụ́, ma gịnị ka Jizọs na-ekwu banyere ya?

  • Mgbe ọtụtụ ndị kwụsịrị iso Jizọs, gịnị ka Pita mere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya