ISI NKE IRI NA ANỌ
‘Oké Ìgwè Mmadụ Bịakwutere Ya’
“Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m”
1-3. Gịnị mere mgbe ndị mụrụ ụmụ kpọtaara Jizọs ụmụ ha, gịnịkwa ka ihe a na-egosi banyere Jizọs?
JIZỌS maara na ndụ ọ dị n’ụwa ga-agwụcha n’oge na-adịghị anya. Naanị izu ole na ole fọdụụrụ ya. Ma, ọ ka nwere ihe dị ukwuu ọ ga-eme! Ya na ndịozi ya nọ na-ekwusa ozi ọma na Peria, bụ́ ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ha na-ekwusa ozi ọma ka ha chere ihu n’ebe ndịda wee na-aga Jeruselem, bụ́ ebe Jizọs ga-anọ mee Ememme Ngabiga ikpeazụ ya nke ga-apụ iche.
2 Mgbe Jizọs na ndị ndú okpukpe nwesịrị mkparịta ụka dị mkpa, e nwetụrụ mkpọtụ. Ndị mmadụ na-akpọta ụmụ ha ka ha hụ ya. O doro anya na afọ ndụ ụmụaka ahụ dịgasị iche, n’ihi na okwu Mak ji kọwaa ha bụ otu okwu ahụ o ji kọwaa otu nwata nke dị afọ iri na abụọ. Ma, a pụrụ ịsụgharị okwu Luk ji kọwaa ha “obere ụmụaka.” (Luk 18:15; Mak 5:41, 42; 10:13) N’ezie, ụzụ na mkpọtụ na-adịkarị n’ebe ọ bụla ụmụaka nọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs baara ndị mụrụ ụmụaka ahụ mba. Ikekwe, ha chere na Nna ha ukwu enweghị ohere ilebara ụmụaka ahụ anya. Gịnị ka Jizọs mere?
3 Mgbe Jizọs hụrụ ihe na-emenụ, o were iwe. Ole ndị ka o wesoro iwe? Ọ̀ bụ ụmụaka ahụ? Ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ha? Ee e—ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya! Ọ sịrị ha: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m; unu anwala igbochi ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ. N’ezie, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-anabataghị alaeze Chineke dị ka nwatakịrị agaghị aba n’ime ya ma ọlị.” Mgbe ahụ, Jizọs ‘kuuru’ ụmụaka ahụ wee gọzie ha. (Mak 10:13-16) Okwu Mak kwuru n’ebe a gosiri na Jizọs ji ịhụnanya makụọ ha. Ma eleghị anya, ‘o ji aka ya kuru’ ọbụna ụfọdụ n’ime obere ụmụaka ahụ, dị ka otu onye nsụgharị si kwuo. O doro anya na Jizọs nwere mmasị n’ebe ụmụaka nọ. Ma, o nwere ihe ọzọ anyị na-amụta banyere ya n’ebe a—ọ bụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute.
4, 5. (a) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jizọs bụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya n’Isi nke Iri na Anọ a?
4 A sị na Jizọs bụ onye aka ike, onye na-adịghị atụpụrụ mmadụ ọnụ, ma ọ bụ onye mpako, ikekwe, ụmụaka ahụ agaraghị enwe mmasị n’ebe ọ nọ; ahụ́ agaraghị eru ndị mụrụ ha ala ịgakwuru ya. Jiri anya nke uche gị hụ ihe mere mgbe ahụ. Ọ̀ bụ na ị naghị ahụ ka ndị mụrụ ụmụ na-amụmụ ọnụ ọchị ka nwoke obiọma a na-egosi na ya hụrụ ụmụaka ha n’anya, gosi na ụmụaka ahụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke, ma gọzie ha? N’eziokwu, ọ bụ ezie na Jizọs na-echegbu onwe ya banyere ọrụ ndị kasị mkpa o nwere ịrụ, ọ bụ onye ọ kasị adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute.
5 Olee ndị ọzọ ọ dịịrị mfe ịbịakwute Jizọs? Olee ihe mere o ji bụrụ onye ọ na-adị mfe otú a ịbịakwute? Olee otú anyị pụrụ isi mụta ịdị ka Jizọs na nke a? Ka anyị tụlee ya.
Olee Ndị Ọ Dịịrị Mfe Ịbịakwute Jizọs?
6-8. Olee ndị ha na Jizọs na-anọkarị, oleekwa otú omume o mesoro ha si dị iche n’omume ndị ndú okpukpe ahụ?
6 Mgbe ị na-agụ Matiu, Mak, Luk na Jọn, ọ pụrụ iju gị anya ịhụ otú ọtụtụ mmadụ si bịakwute Jizọs n’alaghị azụ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-agụ banyere ya, anyị na-ahụkarị okwu bụ́ “oké ìgwè mmadụ.” “Oké ìgwè mmadụ si na Galili . . . soro ya.” “Ìgwè mmadụ gbakọkwara n’ebe ọ nọ.” ‘Oké ìgwè mmadụ bịakwutere ya.’ “Oké ìgwè mmadụ so ya na-eme njem.” (Matiu 4:25; 13:2; 15:30; Luk 14:25) N’ezie, oké ìgwè mmadụ gbara Jizọs gburugburu ọtụtụ ugboro.
7 Ìgwè mmadụ ahụ na-abụkarị ndị nkịtị. Ndị ndú okpukpe na-akpọ ha “ndị ala” n’ụzọ ịkwa emo. Ndị Farisii na ndị nchụàjà kwuru n’ihu ọha, sị: “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Ihe dị iche iche ndị rabaị mesịrị dee gosiri na ha lere ha anya otú ahụ. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe lere ndị dị otú ahụ anya dị ka ndị na-abaghị n’ihe. Ha adịghị ekwe iso ha eri ihe, ịzụ ha ihe, ma ọ bụ ka ha na ha kpakọrịta. N’ezie, ụfọdụ n’ime ha kwuru na olileanya mbilite n’ọnwụ adịrịghị ụdị ndị ahụ na-amaghị iwu a na-edeghị ede! Ọ ghaghị ịbụ na ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-agbara ndị ndú ahụ ọsọ kama ịrịọ ha ka ha nyere ha aka ma ọ bụ duzie ha. Ma, Jizọs adịghị ka ha.
8 Jizọs na ndị nkịtị na-akpakọrịta. Ya na ha rikọrọ nri. Ọ gwọrọ ha, kụziere ha ihe, meekwa ka ha nwee olileanya. Ma, Jizọs atụghị anya na ha niile ga-eme ihe o kwuru. O kwuru na ọtụtụ n’ime ha ga-ajụ ohere e nyere ha ijere Jehova ozi. (Matiu 7:13, 14) Otú ọ dị, o nwere olileanya n’ebe onye nke ọ bụla n’ime ha nọ, marakwa na ọtụtụ n’ime ha nwere ike ime ihe ziri ezi. Lee otú nke a si dị iche n’omume ndị nchụàjà na ndị Farisii ahụ obi kpọrọ nkụ! Ma, ọ bụ ihe ijuanya na ọbụna ndị nchụàjà na ndị Farisii bịakwutere Jizọs. Ọtụtụ n’ime ha gbanwekwara ụzọ ha wee soro ya. (Ọrụ 6:7; 15:5) Ọ dịkwaara ụfọdụ n’ime ndị ọgaranya na ndị ukwu mfe ịbịakwute Jizọs.—Mak 10:17, 22.
9. Gịnị mere o ji dịrị ndị inyom mfe ịbịakwute Jizọs?
9 Ndị inyom alaghị azụ ịbịakwute Jizọs. Ọ ghaghị ịbụ na ndị ndú okpukpe ejiriwo omume nlelị gbaa ha ka akpị ọtụtụ ugboro. Ndị rabaị adịghị ele onye ọ bụla na-akụziri ndị inyom ihe anya ọma. N’ezie, a dịghị ekwe ka ndị inyom gbaa akaebe n’ụlọikpe; a na-ewere ha dị ka ndị akaebe a na-apụghị ịtụkwasị obi. Ndị rabaị na-ekpe ekpere kelee Chineke na ha abụghị ụmụ nwaanyị! Ma, Jizọs emesoghị ndị inyom ụdị omume nlelị ahụ. Ọtụtụ n’ime ha bịakwutere ya, ọ gụkwara ha agụụ ịmụta ihe. Dị ka ihe atụ, anyị hụrụ ka nwanne Lazarọs bụ́ Meri nọdụrụ ala n’akụkụ ụkwụ Onyenwe anyị, na-ege ntị nke ọma n’ihe Jizọs na-ekwu. Ma, nwanne ya, bụ́ Mata, nọ na-agbagharị, na-enye onwe ya nsogbu ka ọ kwadebe ihe oriri. Jizọs jara Meri mma maka ibute ihe ka mkpa ụzọ.—Luk 10:39-42.
10. Olee otú Jizọs si dị iche ná ndị ndú okpukpe n’otú o si meso ndị ọrịa omume?
10 Ndị ọrịa bịakwutekwara Jizọs, ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe na-emesokarị ha dị ka ndị a jụrụ ajụ. Iwu Mozis kwuru na a ga-akpọpụ ndị ekpenta iche ka ndị ọzọ ghara ibute ọrịa ahụ. Ma, o nweghị ihe mere a ga-eji rụsa ha arụrụala. (Levitikọs, isi nke iri na atọ) Otú ọ dị, iwu ndị rabaị mesịrị kwuo na ndị ekpenta na-asọ oyi ka nsị. Ụfọdụ ndị ndú okpukpe rụsara ndị ekpenta arụrụala nke na ha na-atụ ha nkume ka ha ghara ịbịa ha nso! O siri ike ịghọta otú ndị ahụ a na-emeso omume otú ahụ pụrụ isi nwee obi ike ịbịakwute onye nkụzi ọ bụla. Ma, ndị ekpenta bịakwutere Jizọs. Otu n’ime ha kwuru okwu ahụ a ma ama nke na-egosi okwukwe, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” (Luk 5:12) N’Isi nke Iri na Ise, anyị ga-atụle ihe Jizọs mere. Ka ọ dị ugbu a, o zuola ikwu na nke a bụ ihe kasị pụta ìhè nke na-egosi na Jizọs bụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute.
11. Olee ihe atụ na-egosi na ahụ́ ruru ndị obi ha na-ama ikpe ala ịbịakwute Jizọs, gịnịkwa mere nke a ji dị mkpa?
11 Ndị obi ha na-ama ikpe bịakwutere Jizọs n’alaghị azụ. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere mgbe Jizọs nọ na-eri nri n’ụlọ otu onye Farisii. Otu nwaanyị nke a maara na ọ bụ onye mmehie batara, gbuo ikpere n’ala n’akụkụ ụkwụ Jizọs, na-akwa ákwá n’ihi obi amamikpe. Anya mmiri ya dere ụkwụ Jizọs, o wee were ntutu isi ya hichaa ya. Ọ bụ ezie na onye kpọrọ Jizọs òkù lara azụ ná mwute, katọọ ya n’obi ya maka ikwe ka nwaanyị ahụ bịa ya nso, Jizọs ji obiọma jaa nwaanyị ahụ mma maka ezi nchegharị ya, meekwa ka obi sie ya ike na Jehova agbagharawo ya. (Luk 7:36-50) Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, taa, ahụ́ kwesịrị iru ndị obi ha na-ama ikpe ala ịgakwuru ndị pụrụ inyere ha aka ka ha na Chineke dị ná mma! Olee ihe mere Jizọs ji bụrụ onye ọ na-adị mfe otú a ịbịakwute?
Olee Ihe Mere O Ji Dị Mfe Ịbịakwute Jizọs?
12. Gịnị mere ọ bụghị ihe ijuanya na Jizọs bụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute?
12 Cheta na Jizọs ṅomiri Nna ya nke eluigwe n’ụzọ zuru okè, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya. (Jọn 14:9) Baịbụl na-echetara anyị na Jehova ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ 17:27) Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” Ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ịgakwuru ya mgbe ọ bụla, tinyere ndị ọ bụla ọzọ ji obi eziokwu na-achọ ka ha chọta ya ma jeere ya ozi. (Abụ Ọma 65:2) Chegodị echiche banyere Onye kasị ike, bụ́ Onye kasị mkpa n’eluigwe na ụwa! Ọ bụ ya bụ onye ọ kasị adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute. Dị ka Nna ya, Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya. N’isiokwu ndị ka dị n’ihu, anyị ga-atụle ịhụnanya nke si Jizọs n’ala ala obi. Ma, isi ihe mere Jizọs ji bụrụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute bụ na ọ dị mfe ịhụ na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ àgwà Jizọs nwere ndị na-egosi na o nwere ụdị ịhụnanya ahụ.
13. Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi ṅomie Jizọs?
13 Ndị mmadụ na-amata ngwa ngwa na Jizọs nwere mmasị n’ebe ha nọ. Mmasị ahụ adịghị akwụsị mgbe ihe na-ara Jizọs ahụ́. Dị ka anyị hụworo, mgbe ndị ahụ mụrụ ụmụ kpọtaara Jizọs ụmụ ha, o gosiri na ha pụrụ ịbịakwute ya n’agbanyeghị na o nwere ihe ọ na-eme, na-echegbukwa onwe ya banyere ọrụ ndị dị mkpa o nwere ịrụ. Nke a bụ ihe nlereanya o setịpụụrụ ndị mụrụ ụmụ. Ịzụ ụmụ siri ike n’oge a. Ma, o kwesịrị ka ọ dịrị ụmụaka mfe ịbịakwute ndị mụrụ ha. Ọ bụrụ na ị bụ onye mụrụ ụmụ, ị maara na ọ dị mgbe ụfọdụ ị na-adịghị enwe ohere ilebara nwa gị anya otú ọ chọrọ. Ma, ị̀ pụrụ ime ka obi sie ya ike na ị ga-ewepụtara ya oge ozugbo o kwere gị omume? Ọ bụrụ na i mezuo ihe i kwuru, nwa gị ga-amụta uru ọ bara inwe ndidi. Ọ ga-amụtakwa na ọ pụrụ iwere nsogbu ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla na-echegbu ya bịakwute gị mgbe ọ bụla ọ chọrọ.
14-16. (a) Gịnị bụ ihe ndị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube mbụ ya, gịnịkwa mere o ji bụrụ ọrụ dị ịtụnanya? (b) Gịnị ka ọrụ ebube Jizọs rụrụ na Kena na-egosi banyere ya, gịnịkwa ka ndị mụrụ ụmụ na-amụta na ya?
14 Jizọs mere ka ndị mmadụ mata na ihe na-echegbu ha na-echu ya ụra. Dị ka ihe atụ, tụlee ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. O jere oriri agbamakwụkwọ na Kena, bụ́ obodo nke dị na Galili. E nwere nsogbu na-emenye ihere n’ebe ahụ—mmanya gwụrụ! Meri, nne Jizọs, kọọrọ nwa ya ihe merenụ. Gịnị ka Jizọs mere? Ọ gwara ndị na-eje ozi ka ha gbajuo mmiri ná nnukwu ite nkume isii. Mgbe e kuuru ya bugara onye nhazi oriri ahụ, lee, ọ bụ ezigbo mmanya! Ihe ahụ ọ̀ bụ aghụghọ, ya bụ, imegharị ha anya? Ee e, ‘e mere ka mmiri ahụ ghọọ mmanya.’ (Jọn 2:1-11) Ọ dịla anya ndị mmadụ chọwara ka ha mee ka otu ihe ghọọ ihe ọzọ. N’ime ọtụtụ narị afọ, ndị ọkà mmụta oge ochie nwara ime ka opu ghọọ ọlaedo. Ha emelighị ya ma ọlị—ọ bụ ezie na opu na ọlaedo nwere nnọọ ihe ndị ha ji yie.a Olee banyere mmiri na mmanya? Mmiri abụghị ihe dị mgbagwoju anya. Ọ bụ naanị isi ihe abụọ mere o ji bụrụ mmiri. Ma, mmanya nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku isi ihe mere o ji bụrụ mmanya, ọtụtụ n’ime ha dịkwa mgbagwoju anya! Gịnị mere Jizọs ji rụọ ụdị ọrụ a dị ịtụnanya naanị iji gboo obere mkpa a bụ́ na mmanya gwụnahụrụ mmadụ n’oriri agbamakwụkwọ?
15 Nke ahụ abụrụghị nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ obere nsogbu. N’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu n’oge ochie, ile ndị a kpọrọ òkù ọbịa nke ọma bụ ihe dị oké mkpa. Mmanya ịgwụ n’oriri agbamakwụkwọ ahụ ga-abụrụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ ihe ihere na ihe mmechuihu. Mgbe ha gbasịrị akwụkwọ, obi ga na-agbawa ha mgbe ọ bụla ha chetara ụbọchị ha gbara akwụkwọ. Nsogbu a abụrụghị ha obere ihe. Jizọs n’onwe ya elefurughị ya anya. Ya mere, o mere ihe maka ya. Ị̀ hụla ihe mere ndị mmadụ ji eburu ihe na-enye ha nsogbu n’obi abịakwute ya?
Mee ka ọ dịrị nwa gị mfe ịbịakwute gị, gosikwa ya na ihe ya na-emetụ gị n’obi n’ezie
16 Ndị mụrụ ụmụ pụkwara ịmụta ihe bara uru n’ebe a. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa gị eburu ihe na-enye ya nsogbu n’obi bịakwute gị? Ị pụrụ ile ihe na-enye ya nsogbu n’obi anya dị ka ihe na-adịghị mkpa. Ọ pụrụ ọbụna ịtọ gị ọchị. Ọ bụrụ na i were ibu ndị i bu tụnyere nsogbu nwatakịrị ahụ, n’ezie, nke ya pụrụ iyi ihe na-enweghị ihe ọ bụ. Ma, cheta na ọ bụrụghị nwa ahụ ihe na-adịghị mkpa! Ọ bụrụ na ọ na-echu onye ị hụrụ n’anya ụra, ọ̀ bụ na o kwesịghịkwa ichu gị ụra? Ime ka nwa gị mata na ihe na-enye ya nsogbu n’obi na-emetụ gị n’obi ga-eme ka ị bụrụ nne ma ọ bụ nna nke ọ na-adịrị nwa ya mfe ịbịakwute.
17. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ịdị nwayọọ, gịnịkwa mere àgwà a ji bụrụ ihe na-egosi na mmadụ dị ike?
17 Dị ka anyị tụlere n’Isi nke Atọ, Jizọs dị nwayọọ, dịrịkwa umeala n’obi. (Matiu 11:29) Ịdị nwayọọ bụ àgwà magburu onwe ya. Ọ bụ ihe na-egosi nke ọma na mmadụ dị umeala n’obi. O so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Ọ bụ otu n’ime ihe e ji mara amamihe nke Chineke. (Ndị Galeshia 5:22, 23; Jems 3:13) Ọbụna mgbe a kpasuru Jizọs iwe nke ukwuu, ọ na-ejide onwe ya. Ịdị nwayọọ ya abụtụdịghị adịghị ike. Otu onye ọkà mmụta kwuru banyere àgwà a, sị: “Onye dị nwayọọ siri ike dị ka ígwè.” N’ezie, mmadụ ijide onwe ya mgbe iwe na-ewe ya na imeso ndị ọzọ ihe n’ịdị nwayọọ chọrọ ike dị ukwuu. Ma, ọ bụrụ na Jehova agọzie mgbalị anyị, anyị pụrụ iṅomi Jizọs n’igosi ịdị nwayọọ. Nke ahụ ga-emekwu ka anyị bụrụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute.
18. Olee ihe atụ gosiri na Jizọs nwere ezi uche, gịnịkwa mere i ji chee na àgwà a ga-eme ka mmadụ bụrụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute?
18 Jizọs nwere ezi uche. Mgbe Jizọs nọ n’obodo Taya, otu nwaanyị bịakwutere ya n’ihi na “mmụọ ọjọọ ji nwa ya nwaanyị aka ọjọọ.” N’ụzọ atọ dịgasị iche, Jizọs gosiri na ya achọghị ime ihe nwaanyị ahụ chọrọ. Nke mbụ, Jizọs atụpụrụghị nwaanyị ahụ ọnụ; nke abụọ, Jizọs gwara nwaanyị ahụ ihe mere na ya agaghị eme ihe ọ rịọrọ; nke atọ, Jizọs meere ya ihe atụ nke mere ka nwaanyị ahụ ghọtakwuo ihe mere na ya agaghị eme ihe ọ rịọrọ. Ma, ò gosiri nwaanyị ahụ na ya enweghị mmasị n’ebe ọ nọ nakwa na ya bụ ekwe ekwe? Ò gosiri nwaanyị ahụ na ọ banyela ná nsogbu n’ihi ịnwa anwa rụọ nwoke kasị ukwuu ụka? Ee e, o doro anya na obi ruru nwaanyị a ala. Ọ bụghị naanị na nwaanyị ahụ rịọrọ ka e nyere ya aka, kamakwa, ọ nọgidere na-arịọ ya arịrịọ ọbụna mgbe o yiri ka ọ̀ bụ na ọ chọghị inyere ya aka. Jizọs hụrụ okwukwe pụrụ iche nke kpaliri nwaanyị ahụ ịnọgide na-arịọ ya arịrịọ, o wee gwọọ nwa ya nwaanyị. (Matiu 15:22-28) N’ezie, ezi uche Jizọs nwere na mmasị o nwere ige ntị na ikweta ime ihe mgbe o kwesịrị ekwesị mere ka ndị mmadụ na-achọsi ike ịbịakwute ya!
Ọ̀ Na-adịrị Ndị Mmadụ Mfe Ịbịakwute Gị?
19. Olee otú anyị pụrụ isi mara ma ànyị bụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute?
19 Ọ na-amasị ndị mmadụ iche na ha bụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ndị nwere ikike na-asịkarị na ha na-anabata onye ọ bụla chọrọ ịhụ ha, na ndị nọ n’okpuru ha pụrụ ịbịakwute ha mgbe ọ bụla ha chọrọ. Otú ọ dị, Baịbụl dọsiri aka ná ntị ike, sị: “Onye ọ bụla n’etiti ìgwè mmadụ ga-akpọsa obiọma nke ya, ma onye kwesịrị ntụkwasị obi, ònye pụrụ ịchọta ya?” (Ilu 20:6) Ọ dị mfe ikwu na anyị bụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute, ma ànyị kwesịrị ntụkwasị obi n’ezie n’iṅomi ụzọ Jizọs si gosi ịhụnanya ya? Azịza ya adabereghị n’otú anyị si ele onwe anyị anya, kama, ọ bụ n’otú ndị ọzọ si ele anyị anya. Pọl sịrị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ, sị: ‘Olee otú ndị ọzọ si ele m anya? Olee ihe e ji mara m?’
Ndị okenye kwesịrị ịgbalị ka ha bụrụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute
20. (a) Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ndị okenye ọgbakọ bụrụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ezi uche n’ihe anyị na-atụ anya ya n’aka ndị okenye ọgbakọ?
20 Ndị okenye ọgbakọ, karịsịa, na-agbalị ka ha bụrụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute. Ha na-achọsi ike ka ha mezuo ihe a kọwara n’Aịzaya 32:1, 2, sị: “Onye nke ọ bụla ga-adị ka ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.” Okenye pụrụ inye ndị mmadụ nchebe otú a, meekwa ka ha nwee ume na ahụ́ iru ala otú a, naanị ma ọ bụrụ na ọ bụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute. N’ezie, ọ dịghị mfe mgbe niile ime otú a, n’ihi na ndị okenye nwere ọrụ dị ukwuu ha na-arụ n’oge a nke siri ike. N’agbanyeghị nke a, ndị okenye ekwesịtụdịghị ime ka ndị ọzọ chee na ha enweghị ohere igbo mkpa atụrụ Jehova. (1 Pita 5:2) Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kwesịrị iji ezi uche mara ihe ha ga na-atụ anya ya n’aka ndị ikom ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, na-egosi mmụọ ịdị umeala n’obi na mmụọ nrubeisi.—Ndị Hibru 13:17.
21. Olee otú ndị mụrụ ụmụ ga-esi bụrụ ndị ụmụ ha pụrụ ịbịakwute mgbe ọ bụla, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Ise?
21 Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịgba mbọ ka ha na-ewepụtara ụmụ ha ohere mgbe ọ bụla ụmụ ha chọrọ. Ihe a abụghị ihe e ji egwuri egwu! Ha kwesịrị ime ka ụmụ ha mara na ahụ́ kwesịrị iru ha ala ịkọrọ nne ha ma ọ bụ nna ha ihe nzuzo ha. N’ihi ya, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ha bụrụ ndị dị nwayọọ na ndị nwere ezi uche, ghara iwebiga iwe ókè mgbe nwa ha kwupụtara ihe o mehiere ma ọ bụ gosipụta echiche na-adịghị mma. Ka ndị mụrụ ụmụ ji ndidi na-azụ ụmụ ha, ha na-agbalị ka ha na ụmụ ha na-ekwurịta okwu nke ọma. N’ezie, anyị niile kwesịrị ịbụ ndị ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute, dị ka Jizọs. N’Isi nke Iri na Ise, anyị ga-eleba anya n’ọmịiko Jizọs nke si ya n’ala ala obi, bụ́ otu n’ime àgwà ndị bụ́ isi mere o ji bụrụ onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute.
a Ihe ndị dị n’ime opu na ihe ndị dị n’ime ọlaedo yiri nke ukwuu.