Ihe Ihe Ndị E Kere Eke “Maara Ihe nke Ukwuu” Pụrụ Ịkụziri Anyị
NTỤ oyi, ihe na-egbochi mkpụkọ ice, ịzapụ nnu, na iji ụzarị sonar achọpụta ihe bụcha ihe nchọpụta ndị ihe a kpọrọ mmadụ mazuuru ebe nile na narị afọ nke 20. Ma, ha dịrị adị n’ụwa ụmụ anụmanụ ọtụtụ puku afọ tupu ugbu a. Ee, ihe a kpọrọ mmadụ na-erite uru site n’ịmụ ihe ndị ahụ e kere eke “maara ihe nke ukwuu.” (Ilu 30:24-28; Job 12:7-9) O yiri ka ụfọdụ anụmanụ abụrụwo ndị na-ezi ihe a kpọrọ mmadụ ihe n’ekwughị okwu, ọ ga-abụkwa ihe na-adọrọ mmasị nke ukwuu inyocha ha.
Ànyị pụrụ irite uru site n’ịtụle àgwà nke ụfọdụ anụmanụ? Jisọs Kraịst ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere atụrụ, agwọ, nduru, na ọbụna igurube. Gịnị ka o bu n’uche mgbe o ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere ihe e kere eke ndị a? Ka anyị lee.
“Atụrụ nke M Na-anụ Olu M”
A kpọrọ atụrụ aha na Bible ihe karịrị 200 ugboro. Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Smith’s Bible Dictionary na-akọwa, “atụrụ bụ ihe nnọchianya nke obi umeala, ndidi, na ịnọ n’okpuru.” N’Aịsaịa isi nke 53, e ji Jisọs n’onwe ya tụnyere atụrụ n’ụzọ amụma. Lee ka o si daba nnọọ na o kwesịrị iji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere otu ụdị anụmanụ ahụ! Ma olee njimara atụrụ kpọmkwem nke Jisọs bu n’uche?
“Atụrụ nke m na-anụ olu m, Mụ onwe m makwaara ha, ha na-esokwa m,” ka Jisọs sịrị. (Jọn 10:27) O si otú a mee ka obi umeala nke ndị na-eso ụzọ ya na ọchịchọ siri ike ha nwere iso ya pụta ìhè. Atụrụ nkịtị na-anụ olu onye na-azụ ha ma jiri obi ha na-eso ya. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-enwekwa nkekọ chiri anya n’ebe ìgwè atụrụ ahụ nọ.
A pụrụ ịgbasasị otu ìgwè atụrụ n’ala ahịhịa mgbe ha na-ata nri, ma atụrụ nke ọ bụla na-anọgide na-esonyere ìgwè ahụ n’ozuzu ha. N’ihi ya, mgbe anụmanụ ndị ahụ nwere mmetụta nke enweghị nchebe ma ọ bụ ndị egwu tụrụ, “ha pụrụ ịgbakọ ngwa ngwa,” ka akwụkwọ bụ́ Alles für das Schaf (Ihe Nile Maka Atụrụ) na-ekwu. Ọ bụrụ na atụrụ agbalaga iji lanarị ihe ize ndụ, ha na-eme otú ahụ dị ka otu ìgwè, na-akwụsị mgbe ụfọdụ iji tụleghachi ọnọdụ ahụ. “A gbatụ a kwụsị na-enye ụmụ atụrụ na anụmanụ ndị na-esighị ike ohere ịgbakwute ndị ọzọ. Ọbụna ịnọ n’ìgwè na-enye ha nchebe pụrụ iche.” Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’akparamàgwà a?
A gbasasịghị ezi ndị Kraịst taa n’ime òtù okpukpe na ịrọ òtù dị iche iche nke Krisendọm. Kama nke ahụ, a chịkọtara ha n’otu ìgwè atụrụ. Onye Kraịst nke ọ bụla na-enwe mmetụta nke inwe nkekọ onwe onye n’ebe ìgwè atụrụ a nke Chineke dị, nke a na-atụnyekwa ụtụ n’ịdị n’otu nke nzukọ Ndịàmà Jehova. Ebe ọ bụla ọgba aghara weere ọnọdụ—ma ọ bụ ajọ ọrịa, agha, ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ha—ebee ka onye nke ọ bụla na-efe ofufe na-achọ nduzi na nchebe? Ná nzukọ Jehova, bụ́ nke na-enye nchebe ime mmụọ.
Olee otú e si eme ka e nweta ndụmọdụ Bible? Site ná mbipụta ndị dị ka Ụlọ Nche na nke a na-ebipụtakọ ya na ya, bụ́ Teta! Magazin ndị a na nzukọ ndị Kraịst ọbụna na-enye ndị chọkwuru nlekọta enyemaka pụrụ iche, dị ka ụmụ atụrụ na atụrụ ndị na-adịghị ike n’ime ìgwè atụrụ ahụ. Dị ka ihe atụ, a na-elebara ndị bụ nanị nne ma ọ bụ nna na-azụ nwa na ndị na-enwe ịda mbà n’obi anya. Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe amamihe ịgụ magazin nke ọ bụla, ịga nzukọ nile nke ọgbakọ, na itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ! Anyị na-esi otú ahụ egosipụta obi umeala na nkekọ siri ike n’ebe ìgwè atụrụ Chineke dị.—1 Pita 5:2.
‘Inwe Uche Dị Ka Agwọ, Na-adịghị Aghụghọ Dị Ka Nduru’
Smith’s Bible Dictionary na-ekwu, sị: “N’akụkụ nile nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ a na-eji agwọ eme ihe dị ka ihe nnọchianya nke ajọ ụkpụrụ, nke mmụọ nnupụisi.” N’aka nke ọzọ, “nduru m” bụ okwu ngosipụta ịhụnanya. (Abụ nke Abụ 5:2) Ya mere, gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịbụ ndị “nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru”?—Matiu 10:16.
Jisọs nọ na-enye ntụziaka maka ime nkwusa na izi ihe. Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ịtụ anya mmeghachi omume gwara ọgwa. Ole na ole ga-egosi mmasị, ebe ndị ọzọ ga-ajụ ozi ọma ahụ. Ọbụna ụfọdụ ga-akpagbu ezi ndị ohu Chineke ndị a. (Matiu 10:17-23) Olee otú ndị ahụ na-eso ụzọ ga-esi emeghachi omume ná mkpagbu?
N’akwụkwọ bụ́ Das Evangelium des Matthäus (Oziọma Matiu), Fritz Rienecker na-ekwu banyere Matiu 10:16, sị: “Inwe ezi uche . . . bụ nke a na-aghaghị ijikọta ya na iguzosi ike n’ezi ihe, obi eziokwu, ịkwụwa aka ọtọ, ka ihe ọ bụla ghara ime iji nye ndị iro ezi ihe mere ha ga-eji eme mkpesa. Ndị nnọchianya nke Jisọs so n’ime ndị mmegide kwara obi n’azụ, bụ́ ndị na-enweghị nchebara echiche, ndị na-awakpokwa ndị ozi ahụ n’emeghị ebere na n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Ya mere, ọ dị mkpa—dị ka agwọ—ịnọ na nche megide ndị mmegide, na ịtụleghachi ọnọdụ ahụ site n’anya na echiche mụ anya; ịchịkwa ọnọdụ ahụ n’ejighị aghụghọ ma ọ bụ nduhie mee ihe, ịdị ọcha na izi ezi n’okwu na n’omume wee si otú ahụ gosipụta onwe ha ịbụ ndị dị ka nduru.”
Gịnị ka ndị ohu Chineke nke oge a pụrụ ịmụta site n’okwu Jisọs dị na Matiu 10:16? Taa, ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ebe ozi ọma ahụ dị n’otu ụzọ ahụ ha mere na narị afọ mbụ. Mgbe ha chere mkpagbu ihu, ọ dị ezi ndị Kraịst mkpa ijikọ inwe ezi uche nke agwọ na ịdị ọcha nke nduru. Ọ dịghị mgbe ndị Kraịst na-eji nghọgbu ma ọ bụ emeghị ihe n’eziokwu eme ihe kama ha na-abụ ndị na-arụghị arụ, ndị eziokwu, na ndị na-akwụwa aka ha ọtọ n’ikwusara ndị ọzọ ozi Alaeze ahụ.
Iji maa atụ: Ndị ọrụ ibe gị, ndị ntorobịa nọ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ọbụna ndị òtù ezinụlọ nke onwe gị pụrụ ikwu okwu na-afụ ụfụ n’obi banyere nkwenkwe gị dị ka Onyeàmà Jehova. Omume a ga-emeghachi ozugbo pụrụ ịbụ ịgwagwara ha site n’ikwukwa ihe na-agba agba ná ntị banyere nkwenkwe ha. Ma nke ahụ ọ̀ bụ aghọghị aghụghọ? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ bụrụ na i gosi ndị na-akatọ gị na okwu ha enweghị mmetụta ọ bụla n’ezi àgwà gị, ha pụrụ nnọọ ịgbanwe àgwà ha. Mgbe ahụ ị ga-abụ ma onye nwere ezi uche ma onye a na-apụghị ịta ụta—‘onye nwere uche dị ka agwọ, na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.’
“Oyiyi Igurube ahụ Yiri Ịnyịnya E Doziworo Ije Agha”
Magazin bụ́ GEO na-akọ na na 1784, “oké ìgwè [nke igurube] nke e dekọtụworo n’akụkọ ihe mere eme” tiri South Africa ihe otiti. Ìgwè igurube ahụ gazuru ókèala nke 5,200 square kilomita, nke bụ ihe dị ka okpukpu ise nke ókèala Hong Kong. Akwụkwọ bụ́ Smith’s Bible Dictionary na-asị na igurube “na-ebibi ihe ọkụkụ nke ukwuu ná mba ndị ọ na-eleta.”
Ná mkpughe nke Chineke kpugheere ya banyere ihe ndị gaje iwere ọnọdụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” Jisọs jiri ọhụụ nke ìgwè igurube mee ihe. Banyere ha e kwuru, sị: “Oyiyi igurube ahụ yiri ịnyịnya e doziworo ije agha.” (Mkpughe 1:1, 10; 9:3-7) Gịnị ka ihe atụ a pụtara?
Ọ dịwo anya Ndịàmà Jehova ghọtara na igurube nke Mkpughe isi nke 9 na-ese onyinyo ndị ohu Chineke e tere mmanụ nọ n’elu ala na narị afọ a.a E nyewo ndị Kraịst a otu ọrụ kpọmkwem—ikwusa ozi Alaeze n’elu ụwa nile na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Nke a chọrọ n’aka ha imeri ihe mgbochi na ịrapagidesi ike n’ọrụ ha. Gịnị pụrụ ime ihe atụ nke a n’ụzọ ka mma karịa igurube a na-apụghị imeri emeri?
Ọ bụ ezie na o ji ihe nta karịa sentimita ise n’ogologo, igurube na-emekarị njem ruo ihe nọ n’agbata 100 na 200 kilomita otu ụbọchị. Igurube ọzara pụrụ ịgbatịkwu nke a ruo 1,000 kilomita. GEO na-akọwa na “nkù ya na-efe 18 ugboro n’otu sekọnd nakwa ruo ihe hà ka hour 17 otu ụbọchị—ihe ọ na-adịghị ahụhụ ọzọ nwere ike ime ya.” Lee oké ọrụ ọ bụụrụ ihe e kere eke dị ntakịrị otú ahụ!
Dị ka otu ìgwè, Ndịàmà Jehova na-anọgidesi ike n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ha na-eme nkwusa ugbu a n’ihe karịrị 230 ala. Ndị ohu Chineke a na-emeri ọtụtụ ihe isi ike iji kere òkè n’ịrụ ọrụ ahụ. Ụdị nsogbu ndị dị aṅaa ka ha na-eche ihu? Mbunobi, mgbochi iwu, nrịanrịa, nkụda mmụọ, na mmegide site n’aka ndị ikwu bụ nanị ole na ole. Ma ọ dịghị ihe nweworo ike ịkwụsị ịga n’ihu ha. Ha na-arapara n’ọrụ Chineke nyere ha.
Nọgide Na-egosipụta Àgwà Ndị Kraịst
Ee, Jisọs ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere atụrụ, agwọ, nduru, na igurube. Nke a n’ezie dabara adaba maka oge anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na ọgwụgwụ nke usoro ihe a dị nso, nsogbu na-esiwanyekwa ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
N’iburu n’uche okwu ihe atụ nke Jisọs, ezi ndị Kraịst na-anọdewe ìgwè atụrụ Chineke nso ma jiri obi umeala na-anara ndụmọdụ site n’aka nzukọ Jehova. Ha na-anọ na nche ma mụrụ anya n’ọnọdụ ndị pụrụ igbochi ọrụ ndị Kraịst ha, ka ha na-anọgide na-abụ ndị a na-apụghị ịkọcha n’ihe nile. Ọzọkwa, ha na-anọgidesi ike n’ime uche Chineke n’ihu ihe mgbochi dị iche iche. Ha na-anọgidekwa na-amụta ihe site n’ihe e kere eke ụfọdụ ndị “maara ihe nke ukwuu.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, isi nke 22.