-
Atọ n’Ime Otu—À Kụziri Ya n’Ime Bible?Ụlọ Nche—1993 | Ọktoba 15
-
-
“Mụ onwe m na Nna m bụ otu.”—JỌN 10:30.
Novatian (ihe dị ka 200-258 O.A.) kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na Ọ sịrị ‘otu’ ihe,[b] ka ndị jụrụ okwukwe ghọta na Ọ sịghị ‘otu’ onye. N’ihi na otu nke e tinyere n’okwu na-egosi ihe nkịtị, na-akọwa ịdị n’otu ná mmekọrịta, ọ bụghị ịdị n’otu onwe onye. . . . Ọzọkwa, na Ọ sịrị otu, na-ezo aka ná nkwekọrịta, nakwa n’ọdịdị nke ikpe ọmụma ahụ, nakwa ná mkpakọrịta ịhụnanya ahụ n’onwe ya, ebe n’ụzọ ezi uche dị na ya, Nna ahụ na Ọkpara bụ otu ná nkwekọrịta, n’ịhụnanya, nakwa ná mmetụta ịhụnanya.”—Treatise Concerning the Trinity, isi nke 27.
-
-
Atọ n’Ime Otu—À Kụziri Ya n’Ime Bible?Ụlọ Nche—1993 | Ọktoba 15
-
-
b Novatian na-ezo aka n’eziokwu ahụ bụ na okwu e ji eme ihe maka “otu” nke dị n’amaokwu nke a bụ nke na-egosi ihe nkịtị. Ya mere, ihe ọ na-apụtakarị bụ “otu ihe.” Tụlee Jọn 17:21, ebe e ji okwu Grik maka “otu” mee ihe kpọmkwem n’otu ụzọ ahụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, akwụkwọ New Catholic Encyclopedia (mbipụta 1967) n’ozuzu ya na-akwado De Trinitate nke Novatian, ọ bụ ezie na ọ rịbara ama na n’ime ya “e leghị Mmụọ Nsọ anya dị ka Onye bụ chi.”
-