-
Gịnị Na-eme Anyị ma Anyị Nwụọ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Chọpụta ihe na-eme mmadụ n’eziokwu ma ọ nwụọ
N’ebe dị iche iche n’ụwa, e nwegasịrị ihe ndị mmadụ kweere gbasara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. O doro anya na ha niile agaghị abụcha eziokwu.
N’ebe i bi, olee ihe ọtụtụ ndị kweere gbasara ndị nwụrụ anwụ?
Unu chọọ ịmata ihe Baịbụl kwuru, kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Ekliziastis 3:20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka amaokwu a kwuru na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?
Ebe a ọ̀ sịrị na ọ na-abụ mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya ma ọ bụ mmụọ ya adịrị ndụ na-aga?
Baịbụl gwara anyị ihe mere mgbe Lazarọs, bụ́ ezigbo enyi Jizọs, nwụrụ. Ka unu na-agụ Jọn 11:11-14, chọpụtanụ ihe Jizọs kwuru mere Lazarọs mgbe ọ nwụrụ. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jizọs ji tụnyere ọnwụ?
Gịnị ka ihe a Jizọs ji tụnyere ọnwụ na-akụziri anyị gbasara ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ?
Ì chere na ihe a Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ bụ eziokwu?
-
-
Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ ỌzọNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
4. Jizọs gosiri na ọ ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ
Chọpụtakwuo gbasara ihe Jizọs meere Lazarọs enyi ya. Gụọnụ Jọn 11:14, 38-44. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị si mara na Lazarọs nwụrụ n’eziokwu? —Leruonụ anya n’amaokwu nke 39.
A sị na Lazarọs gara eluigwe mgbe ahụ ọ nwụrụ, ì chere na ọ gaara abụ ihe ọma ka Jizọs meere ya kpọlite ya ka ọ bịakwa dịrị ndụ n’ụwa?
-