-
Olileanya E Ji n’Aka Maka Ndị Nwụrụ AnwụMgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
-
-
Mmeghachi omume Jisọs n’ebe ọnwụ Lazarọs dị na-ekpughe mmetụta dị nro nke Ọkpara Chineke. Mmetụta ya dị omimi n’oge a na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè ọchịchọ ya siri ike nke ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Anyị na-agụ, sị: “Meri, mgbe ọ bịara n’ebe Jisọs nọ, mgbe ọ hụrụ Ya, ọ daa n’ala n’ụkwụ Ya, na-asị Ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị nọrị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa ákwá, na ndị Juu ndị soro ya bịa ka ha na-akwakwa ákwá, Ọ sụọ ude n’ime mmụọ Ya, meekwa ka obi lọọ Ya mmiri, O wee sị, Olee ebe unu tọgbọworo ya? Ha sị Ya, Onyenwe anyị, Bịa, leekwa. Anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs. Ya mere ndị Juu na-asị, Lee otú Ọ hụrụ ya n’anya!”—Jọn 11:32-36.
E ji okwu atọ n’ebe a gosipụta ọmịiko si n’ala ala obi nke Jisọs: “sụọ ude,” ‘mee ka obi lọọ mmiri,’ na “anya mmiri pụrụ n’anya.” Okwu nke asụsụ mbụ ndị e ji mee ihe n’idekọ ihe omume nke a na-emetụ n’ahụ na-egosi na ọnwụ nke ezi enyi ya bụ́ Lazarọs na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne nwanyị Lazarọs ka ọ na-akwa ákwá kpaliri Jisọs n’ụzọ dị omimi nke ukwuu nke na anya mmiri jupụtara n’anya Ya.a
Ihe dị ịrịba ama nke ukwuu bụ na tupu mgbe a Jisọs emewo ka mmadụ abụọ ndị ọzọ bịaghachi ná ndụ. O zubekwara n’ụzọ zuru ezu ime otu ihe ahụ n’ebe Lazarọs nọ. (Jọn 11:11, 23, 25) Ma, “anya mmiri pụrụ n’anya” ya. Mgbe ahụ iweghachi ndị mmadụ ná ndụ abụghị usoro ime ihe nkịtị nye Jisọs. Mmetụta ya dị nro na nke dị omimi dị ka e gosipụtara ya n’oge a na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè ọchịchọ ya siri ike imezi ihe nile ọnwụ mebiri.
-
-
Olileanya E Ji n’Aka Maka Ndị Nwụrụ AnwụMgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
-
-
a Okwu Grik a sụgharịrị “sụọ ude” sitere na ngwaa okwu bụ́ (em·bri·maʹo·mai) nke na-egosipụta ịbụ onye a kpaliri n’ụzọ dị mwute, ma ọ bụ n’ụzọ dị omimi. Otu onye mmụta Bible na-ekwu, sị: “N’ebe a ọ pụrụ nanị ịpụta na mmetụta uche dị omimi dị otú ahụ jichiri Jisọs nke na ịsụ ude ọ na-apụghị ịchịkwa si n’ime obi Ya pụta.” Okwu ahụ a sụgharịrị ‘mee ka obi lọọ mmiri’ na-esite n’okwu Grik bụ́ (ta·rasʹso) nke na-egosi nsogbu. Dị ka ihe otu onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru si dị, ọ pụtara “ịkpatara mmadụ ọgba aghara n’ime, . . . ịbụ onye oké ihe mgbu ma ọ bụ iru újú metụtara.” Okwu ahụ bụ́ “anya mmiri pụrụ n’anya” sitere ná ngwaa okwu Grik bụ́ (da·kryʹo) nke pụtara “ibepụta anya mmiri, ịkwa ákwá n’olu dị ala.”
-