Jisọs—Onye Ọchịchị “Ọpụpụ Ya Nile Sitere na Mgbe Ochie”
MKPALI na-arị elu ka ị na-eche mbịarute nke onye ikwu ị na-ahụbeghị kemgbe. N’ikpeazụ, i zute ya ma kelee ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ. I gee ntị nke ọma ka ọ na-agwa gị ihe mere nna ya ji zite ya ka ọ bịa leta gị. E mesịa oge eruo ngwa ngwa ka ọ laghachi. Ná mwute, ị sị ya laa nke ọma. Mwute ọ na-ewute gị na ọ hapụrụ na-ebelata mgbe ozi ruru gị ntị na ọ laruwo ụlọ n’enweghị nsogbu ọ bụla.
E mesịa, mgbe ị na-enyocha ụfọdụ akwụkwọ ochie, ị chọta akwụkwọ ozi ndị kwuru ná mkpirikpi ihe onye ikwu ahụ mere ogologo oge tupu ọ malite njem ya ịbịa zute gị. Ihe akwụkwọ ozi ndị ahụ na-agwa gị na-enye gị nghọta na-adọrọ mmasị banyere nzụlite ya ma na-eme ka i nwekwuo ekele maka ma nleta ya ma ọrụ ọ na-arụ ugbu a.
“Sitere na Mgbe Ochie”
N’ime akwụkwọ ochie ndị Juu narị afọ mbụ nwere bụ ihe odide nke onye amụma Chineke bụ́ Maịka, nke e dekọrọ n’ihe dị ka narị afọ asaa tupu mgbe ahụ. Ndị a na-ekwu kpọmkwem ebe a mụrụ Mesaịa. “Gị onwe gị, Betlehem Efrata, nke dị nta ịdị n’etiti usuu nile nke [ọtụtụ puku] nke Juda, n’ime gị ka otu onye ga-esi pụtara m ịbụ onye na-achị achị n’Israel; onye ọpụpụ ya nile sitere na mgbe ochie, site n’ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.” (Maịka 5:2) Ná mmezu nke okwu ndị a, a mụrụ Jisọs n’obodo nta Judia bụ́ Betlehem n’ihe a na-akpọ ugbu a afọ 2 T.O.A. Ma olee otú ọpụpụ ya pụrụ isi bụrụ nke “sitere na mgbe ochie”?
Jisọs dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, Pọl onyeozi kọwara Jisọs dị ka “onyinyo nke Chineke ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.—Ndị Kọlọsi 1:15.
Jehova, bụ́ Isi Iyi nke amamihe, kere Ọkpara ya “tupu ọrụ Ya nile,” ma e jiri okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Eze Solomọn dekọrọ n’akwụkwọ Ilu mee ihe. Mgbe Jisọs bịasịrị n’ụwa ma laghachi n’eluigwe, ọ gbara akaebe na ya bụ n’ezie “Isi nke ihe nile Chineke kere.” Dị ka amamihe a kọwara dị ka mmadụ, Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ kwupụtara, sị: “Mgbe [Jehova] doziri eluigwe, n’ebe ahụ ka m nọ.”—Ilu 8:22, 23, 27; Mkpughe 3:14.
Site ná mmalite, Ọkpara Chineke natara ọrụ pụrụ iche, nke ịbụ “onye ọkà” n’akụkụ Nna ya. Lee ọṅụ nke a wetaara Jehova! “M wee bụrụ ihe na-atọ Ya [Jehova] ụtọ kwa ụbọchị,” ka Ilu 8:30 na-ekwu, na-agbakwụnye, sị, “na-egwuri egwu n’ihu Ya mgbe nile.”
Ka oge na-aga Jehova gwara Ọkpara ya ka ọ bịa soro n’ike ihe a kpọrọ mmadụ. “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị,” ka o kwuru, “dị ka oyiyi anyị si dị.” (Jenesis 1:26) Dị ka ihe si na ya pụta, ịtọ ụtọ ọzọ malitere. “Ihe na-atọ m ụtọ,” ka Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ kọwara, “dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Ilu 8:31) Ná mmalite nke Oziọma ya, Jọn onyeozi kwetara òkè Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ keere n’okike, sị: “E kere ihe nile site n’aka Ya; e keghịkwa otu ihe ọ bụla nke e keworo ma Ọ nọghị ya.”—Jọn 1:3.
Ọnụ Na-ekwuru Jehova
Okwu Jọn na-adọrọ uche gaa n’ihe ùgwù ọzọ nke Ọkpara Chineke nwere, ya bụ, ịbụ ọnụ na-ekwuru Chineke. Site ná mmalite, o jere ozi dị ka Okwu ahụ. N’ihi ya, mgbe Jehova gwara Adam okwu, e mesịakwa mgbe ọ gwara Adam na Iv okwu, o yiri ka o mere otú ahụ site n’Okwu ahụ. Ònyekwa ruru eru inye ntụziaka Chineke maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ karịa onye ahụ ihe ha na-atọ ụtọ?—Jọn 1:1, 2.
Lee otú ọ na-aghaghị isiworị wute Okwu ahụ ịhụ Iv, e mesịakwa Adam ka ha nupụụrụ Onye Okike ha isi! Leekwa otú ọ na-aghaghị isiworị gụsie ya agụụ ike ịgwọta nsogbu nke nnupụisi ha wetaara ụmụ ha! (Jenesis 2:15-17; 3:6, 8; Ndị Rom 5:12) Ka ọ na-agwa Setan, bụ́ onye gbara Iv ume ka o nupụ isi, okwu, Jehova kwupụtara, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya.” (Jenesis 3:15) Ebe ọ hụworo ihe mere n’Iden, Okwu ahụ ghọtara na dị ka akụkụ bụ́ isi nke “mkpụrụ” nwanyị ahụ, ọ ga-abụ onye a ga-akpọ asị n’ụzọ obi ịta mmiri. Ọ maara na Setan bụ ogbu mmadụ.—Jọn 8:44.
Mgbe Setan mesịrị rụọ iguzosi ike n’ezi ihe nke Job kwesịrị ntụkwasị obi ụka, ọ ghaghị ịbụworị na Okwu ahụ were oké iwe n’ebubo nkwutọ ahụ e boro Nna ya. (Job 1:6-10; 2:1-4) N’ezie, n’ọrụ ya dị ka onyeisi ndị mmụọ ozi, a maara Okwu ahụ dị ka Maịkael, bụ́ onye aha ya pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?” ma na-egosi otú o si na-alụchitere Jehova ọgụ megide ndị nile na-ezube iweghara ọbụbụeze Chineke n’ike.—Daniel 12:1; Mkpughe 12:7-10.
Ka akụkọ ihe mere eme nke Israel na-apụtawanye ìhè, Okwu ahụ hụrụ mgbalị Setan na-eme ichigharị ụmụ mmadụ pụọ n’ofufe dị ọcha. Ka Ọpụpụ ahụ site n’Ijipt gasịrị, Chineke gwara Israel site n’ọnụ Mosis, sị: “Lee, Mụ onwe m na-eziga mmụọ ozi n’ihu gị, idebe gị n’ụzọ, na ime ka ị bata n’ebe ahụ M doziworo. Lezie anya n’ihu ya, geekwa ntị n’olu ya; enupụla isi n’okpuru ya: n’ihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu; n’ihi na aha m dị n’ime ya.” (Ọpụpụ 23:20, 21) Ònye bụ mmụọ ozi a? Ikekwe, ọ bụ Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ.
Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
Mosis nwụrụ na 1473 T.O.A., e likwara ozu ya “na ndagwurugwu ahụ n’ala Moab ná ncherịta ihu Bet-peoa.” (Deuterọnọmi 34:5, 6) Dị ka ihe ama na-egosi, Setan chọrọ iji ozu ya mee ihe, ikekwe iji kwalite ikpere arụsị. Maịkael megidere nke a ma jiri ido onwe onye n’okpuru nakwere ịbụisi nke Nna ya, bụ́ Jehova. ‘N’enweghị anya ike ikpe Setan ikpe nkwulu,’ Maịkael dọrọ Setan aka ná ntị, sị: “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”—Jud 9.
Ọzọ Israel malitere imeri Ala Nkwa ahụ bụ́ Kenean. Na nso obodo Jeriko, Joshua natara mmesi obi ike nke nlekọta nke Okwu ahụ ga-anọgide na-elekọta mba ahụ. N’ebe ahụ o zutere otu nwoke bu mma agha a mịpụtara amịpụta. Joshua jekwuuru onye ahụ ọ na-amaghị wee jụọ, sị: “Ọ̀ bụ anyị ka ị dịịrị [ka] ọ̀ bụ ndị na-emegide anyị?” Chetụdị ihe ijuanya Joshua nwere mgbe onye ahụ ọ na-amaghị kpughere onye ọ bụ, na-asị: “Ee e; kama mụ onwe m bụ onyeisi usuu ndị agha Jehova; ugbu a ka m bịaworo.” Ka a sịkwa ihe mere Joshua ji daa kpuo ihu ya n’ala n’ihu onye nnọchite anya a e buliworo elu nke Jehova, onye ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ bụ́ onye ga-emesị ghọọ “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú.”—Joshua 5:13-15; Daniel 9:25.
Nzute ọzọ nke ya na Setan weere ọnọdụ n’ụbọchị onye amụma Chineke bụ́ Daniel. N’oge a Maịkael kwadoro mmụọ ozi ibe ya mgbe onyeisi ndị mmụọ ọjọọ nke Peasia ‘na-eguzo ná ncherịta ihu ya’ ruo izu atọ. Mmụọ ozi ahụ kọwara, sị: “Lee, Maịkael, bụ́ otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi, bịara inyere m aka: mụ onwe m wee fọdụ n’ebe ahụ n’akụkụ ndị eze Peasia.”—Daniel 10:13, 21.
Ebube Ya Tupu Ọ Ghọọ Mmadụ na Mgbe Ọ Bụ Mmadụ
Na 778 T.O.A., afọ ahụ Eze Uzaịa nke Juda nwụrụ, onye amụma Chineke bụ́ Aịsaịa hụrụ otu ọhụụ ebe Jehova nọ n’ocheeze ya dị elu. “Ònye ka M ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” ka Jehova jụrụ. (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche) Aịsaịa wepụtara onwe ya, ma Jehova dọrọ ya aka ná ntị na ndị Israel ibe ya agaghị aṅa okwu ya ntị. Jọn onyeozi ji ndị Juu na-ekweghị ekwe nke narị afọ mbụ tụnyere ndị biri n’ụbọchị Aịsaịa, kwuokwa, sị: “Ihe ndị a ka Aịsaịa kwuru, n’ihi na ọ hụrụ ebube Ya.” Ebube ònye? Nke Jehova na nke Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ nọ n’akụkụ ya ná nnọkọ eluigwe ahụ.—Aịsaịa 6:1, 8-10; Jọn 12:37-41.
Narị afọ ụfọdụ n’ihu Jisọs nwetara ọrụ ya kasị ukwuu ruo oge ahụ. Jehova bufere ike ndụ nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya site n’eluigwe gaa n’akpa nwa Meri. Ọnwa itoolu n’ihu ọ mụrụ nwa nwoke, bụ́ Jisọs. (Luk 2:1-7, 21) N’okwu nke Pọl onyeozi: “Mgbe oge ahụ zuru, Chineke zipụtara Ọkpara Ya, Onye a mụrụ site na nwanyị.” (Ndị Galetia 4:4) N’otu aka ahụ, Jọn onyeozi kwetara, sị: “Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ, bụ́ mmadụ, O wee biri n’etiti anyị, (anyị kirikwara otuto Ya, bụ́ otuto dị ka otu nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya), O jupụtara n’amara na eziokwu.”—Jọn 1:14.
Mesaịa Apụta
Ọ dịkarịa ala ka ọ na-erule afọ 12, Jisọs ahụ na-eto eto aghọtawo na ọ ghaghị iji ọrụ n’aka na-arụ ọrụ Nna ya nke eluigwe. (Luk 2:48, 49) Ihe dị ka afọ 18 n’ihu, Jisọs bịakwutere Jọn Onye Na-eme Baptism n’Osimiri Jọdan, e wee mee ya baptism. Ka Jisọs na-ekpe ekpere, eluigwe meghere, mmụọ nsọ dakwasịkwara ya. Chetụdị imirikitimi ihe ncheta nubatara n’uche ya ka ọ na-echeta ọtụtụ puku afọ ọ nọworo n’akụkụ Nna ya jee ozi dị ka onye ọkà, ọnụ na-ekwuru Chineke, onyeisi nke usuu ndị agha Chineke, nakwa dị ka onyeisi ndị mmụọ ozi, bụ́ Maịkael. Ihe sochiziri nke ahụ bụ mkpali nke ịnụ olu Nna ya ka ọ na-agwa Jọn Onye Na-eme Baptism, sị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma.”—Matiu 3:16, 17; Luk 3:21, 22.
Jọn Onye Na-eme Baptism enweghị obi abụọ ọ bụla banyere ịdị adị Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ. Ka Jisọs na-abịakwute ya, Jọn kwupụtara, sị: “Lee, Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!” Ọ gbakwụnyekwara: “Onye a bụ Onye mụ onwe m kwuru okwu banyere Ya, sị, Otu Nwoke na-abịa n’azụ m Onye ghọworo Onye buru m ụzọ: n’ihi na Ọ bụrịị Onye mbụ n’ebe m nọ.” (Jọn 1:15, 29, 30, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Jọn onyeozi makwaara banyere ịdị adị Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ. “Onye si n’elu bịa ka ihe nile elu,” ka o dere, nakwa: “Onye si n’eluigwe bịa ka ihe nile elu. Ihe nke ọ hụworo na nke Ọ nụrụ, nke a ka Ọ na-agba àmà.” Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.—Jọn 3:31, 32.
Ihe dị ka n’afọ 61 O.A., Pọl onyeozi gbara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst ume ịghọta ịdị oké mkpa nke mbịarute Mesaịa n’ụwa na ọrụ ya dị ka Onyeisi Nchụàjà. N’ịdọrọ uche gaa n’ọrụ Jisọs dị ka Ọnụ Na-ekwuru Chineke, Pọl dere, sị: “Chineke . . . gwara anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a n’ime Ọkpara . . . Onye O sitekwara n’aka Ya mee ụwa nile.” Ma nke a ọ̀ na-ezo aka n’ọrụ Jisọs dị ka “onye ọkà” n’okike ma ọ bụ ná ntinye aka ya ná ndokwa Chineke nke na-aga n’ihu maka ime ka ya na mmadụ dịghachi n’udo, n’ebe a Pọl na-agbakwụnye akaebe ya nye ịdị adị nke Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ.—Ndị Hibru 1:1-6; 2:9.
Iguzosi Ike n’Ihe Site “na Mgbe Ochie”
Pọl nyere ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Filipaị agbamume a, sị: “Nweenụ uche a n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs: Onye, ọ bụ ezie na Ọ dịrịị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma Ọ gụghị ya n’ihe Ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama O mere Onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee Ya n’oyiyi nke mmadụ; ebe a hụrụ Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi Ya, O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ [n’osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ndị Filipaị 2:5-8) Jehova meghachiri omume n’ụzọ ịhụnanya nye iguzosi ike n’ihe nke Jisọs site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ na ịnabataghachizi ya n’eluigwe. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke iguzosi ike n’ezi ihe n’ime ogologo oge a na-amaghị ama Jisọs hapụụrụ anyị!—1 Pita 2:21.
Lee obi ekele anyị nwere maka azụ̀ a Bible na-atụpenyetụ anyị banyere ịdị adị nke Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ! N’ezie ha na-ewusi mkpebi anyị iṅomi ihe nlereanya nke ije ozi n’iguzosi ike n’ihe ya ike, karịsịa ugbu a ọ na-achị achị dị ka Eze nke Alaeze Mesaịa Chineke. Ka anyị too “Onyeisi Udo,” bụ́ Kraịst Jisọs, Onyeisi na Onye Ọchịchị anyị bụ́ “onye ọpụpụ ya nile sitere na mgbe ochie”!—Aịsaịa 9:6; Maịka 5:2.
[Igbe dị na peeji nke 24]
Akaebe Nye Ịdị Adị Tupu Ọ Ghọọ Mmadụ
Okwu Jisọs n’onwe ya, dị ka a rịbara ha ama n’okpuru, na-agba akaebe n’ụzọ bara ụba nye ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ:
◻ ‘Ọ dịghị onye ọ bụla rigoworo n’eluigwe, ma ọ bụghị Onye siri n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.’—Jọn 3:13.
◻ ‘Ọ bụghị Mosis nyere unu nri ahụ nke sitere n’eluigwe; kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi nri ahụ nke sitere n’eluigwe. N’ihi na nri nke Chineke bụ nke ahụ nke na-esi n’eluigwe arịdata, nke na-enyekwa ụwa ndụ. . . . Esiwo m n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ka M na-eme ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ.’—Jọn 6:32, 33, 38.
◻ ‘Nke a bụ nri nke si n’eluigwe rịdata, ka mmadụ wee rie ụfọdụ n’ime ya, gharakwa ịnwụ anwụ. Mụ onwe m bụ nri dị ndụ nke siri n’eluigwe rịdata: ọ bụrụ na mmadụ erie ụfọdụ n’ime nri a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’—Jọn 6:50, 51.
◻ ‘Ùnu agaghị amakarịkwa n’ọnyà ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-arịgo n’ebe Ọ nọrịị mbụ?’—Jọn 6:62.
◻ ‘Àmà nke m bụ ezie; n’ihi na amatara m ebe M siri bịa, na ebe M na-ala; . . . Unu onwe unu si n’ebe dị ala pụta; Mụ onwe m si n’ebe dị elu pụta: unu onwe unu si n’ụwa nke a pụta; Mụ onwe m esighị n’ụwa nke a pụta.’—Jọn 8:14, 23.
◻ ‘Ọ bụrụ na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m n’anya: n’ihi na Mụ onwe m siri n’ebe Chineke nọ pụta wee bịa; n’ihi na abịaghị m n’Onwe m, kama Ya onwe ya zitere m.’—Jọn 8:42.
◻ ‘N’ezie, n’ezie, asị m unu, Mgbe a ka-amụghị Abraham Mụ onwe m dị.”—Jọn 8:58.
◻ ‘Nna, Gị onwe gị werekwa otuto nke M nwere n’ebe Ị nọ mgbe ụwa aka-adịghị nye m otuto ugbu a n’ebe Gị onwe Gị nọ. Nna, ihe I nyeworo m, ana m achọ ka, ebe Mụ onwe m nọ, ka Mụ na ndị ahụ nọọkwa; ka ha wee hụ otuto m, nke I nyeworo m: n’ihi na Ị hụrụ m n’anya mgbe a ka-atọghị ntọala ụwa.’—Jọn 17:5, 24.
[Foto dị na peeji nke 23]
Joshua ezute onyeisi nke usuu ndị agha Jehova