ISI NKE 6
Onye Ozizi Ukwu ahụ Jeere Ndị Ọzọ Ozi
Ọ̀ NA-AMASỊ gị mgbe mmadụ meere gị ihe ọma?— Ọ na-amasịkwa ndị ọzọ mgbe mmadụ meere ha ihe ọma. Ọ na-amasị anyị nile. Onye Ozizi Ukwu ahụ maara otú ahụ, ọ na-emekwara ndị mmadụ ihe mgbe nile. Ọ sịrị: ‘Abịara m, ọ bụghị ka e jeere m ozi, kama ka m jee ozi.’—Matiu 20:28.
Gịnị ka ụmụazụ Jizọs nọ na-arụ ụka maka ya?
Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ka Onye Ozizi Ukwu ahụ, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?— Anyị aghaghị ịdị na-ejere ndị ọzọ ozi. Anyị aghaghị ịdị na-emere ha ihe ọma. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị adịghị eme nke a. N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-achọ mgbe nile ka ndị ọzọ na-ejere ha ozi. N’otu oge, ọ dị ọbụna ụmụazụ Jizọs otú a. Onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye kasị ukwuu ma ọ bụ onye kasị mkpa.
Otu ụbọchị, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, ndị bụ́ ụmụazụ ya, so na-eme njem. Mgbe ha banyesịrị n’obodo Kapaniọm, nke dị nso n’Oké Osimiri Galili, ha nile banyere n’otu ụlọ. N’ebe ahụ, Jizọs jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka ya n’okporo ụzọ?” Ha gbachiri nkịtị n’ihi na mgbe ha ka nọ n’ụzọ ha rụrịtara ụka n’etiti onwe ha banyere onye ka ukwuu.—Mak 9:33, 34.
Jizọs maara na o zighị ezi ka onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya na-eche na ọ bụ ya kasị ukwuu. Ya mere, dị ka anyị mụtara n’isi mbụ nke akwụkwọ a, ọ kpọọrọ otu nwatakịrị mee ka o guzoro n’etiti ha ma gwa ha na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi ka nwatakịrị ahụ. Ma, ha amụtaghị ihe na nke ahụ. Ya mere, ntakịrị oge tupu ya anwụọ, Jizọs kụziiri ha ihe ha na-agaghị echefu echefu. Gịnị ka o mere?—
Mgbe ha nile zukọtara ka ha rikọọ ihe ọnụ, Jizọs si na tebụl bilie, yipụ uwe elu ya. Ọ chịịrị ákwà nhicha ahụ́ kee ya n’úkwù ya. O buruziiri efere ịkwọ aka wee gbanye mmiri n’ime ya. Ụmụazụ ya aghaghị ịnọworị na-eche ihe ọ chọrọ ime. Ka ha nọ na-ele ya, Jizọs gakwuuru ha nile n’otu n’otu ebe ha nọ, hulata ala ma saa ha ụkwụ. Ka e mesịrị, o jiri ákwà nhicha ahụ́ ahụ hichaa ha ụkwụ. Cheedị nnọọ echiche! Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị nọ ebe ahụ? Olee otú ọ gaara adị gị?—
Gịnị ka Jizọs nọ na-akụziri ụmụazụ ya?
Ụmụazụ ya echeghị na o ziri ezi ka Onye Ozizi Ukwu ahụ jeere ha ozi otú a. O mere ha ihere. N’ezie, Pita ekweghị ka Jizọs jeere ya ozi a dị ala. Ma, Jizọs sịrị na ọ dị mkpa ka ya mee ya.
Taa, anyị adịghị asakarị ụkwụ ibe anyị. Ma, a na-eme nke a n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— N’ala ebe Jizọs na ụmụazụ ya biri, ndị mmadụ na-eyi akpụkpọ ụkwụ ghere oghe n’ụkwụ nkịtị. Ya mere, mgbe ha jere ije n’ụzọ ájá, uzuzu na-ejupụta ha n’ụkwụ. Ọ bụ omume obiọma bụ́ ịsachapụ uzuzu n’ụkwụ onye ọbịa batara n’ụlọ.
Ma, n’oge a, ọ dịghị otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs wepụtara onwe ya ịsa ụkwụ ndị ọzọ. Ya mere, Jizọs mere ya n’onwe ya. Site n’ime nke a, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otu ihe dị mkpa. Ọ dị ha mkpa ịmụta nke a. Ọ bụkwa ihe dị mkpa ka anyị mụta taa.
Ị̀ ma ihe mmụta ọ bụ?— Mgbe Jizọs yirighachiiri uwe elu ya ma laghachi n’ebe ọ nọ na tebụl, ọ kọwara, sị: “Ùnu maara ihe m mewooro unu? Unu na-akpọ m, ‘Onye Ozizi,’ na, ‘Onyenwe anyị,’ ihe unu na-ekwu zikwara ezi, n’ihi na abụ m nke ahụ. Ya mere, ọ bụrụ na mụ onwe m, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwenụ na Onye Ozizi, sara unu ụkwụ, unu kwesịkwara ịsarịta ụkwụ ibe unu.”—Jọn 13:2-14.
Gịnị ka ị pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka?
N’ebe a, Onye Ozizi Ukwu ahụ gosiri na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-ejerịtara ibe ha ozi. Ọ chọghị ka ha na-eche nanị banyere onwe ha. Ọ chọghị ka ha chee na ha dị oké mkpa nke na ndị ọzọ kwesịrị ịdị na-ejere ha ozi mgbe nile. Ọ chọrọ ka ha dị njikere ijere ndị ọzọ ozi.
Nke ahụ ọ́ bụghị ihe mmụta dị mma?— Ị̀ ga-adị ka Onye Ozizi Ukwu ahụ ma jeere ndị ọzọ ozi?— Anyị nile pụrụ imere ndị ọzọ ihe. Nke a ga-eme ka obi tọọ ha ụtọ. Ma, nke kasị nke, ọ ga-eme ka obi tọọ Jizọs na Nna ya ụtọ.
Ijere ndị ọzọ ozi esighị ike. Ọ bụrụ na ị na-eleru anya, ị ga-ahụ ọtụtụ ihe ị pụrụ imere ndị ọzọ. Cheedị echiche: Ọ̀ dị ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji nyere nne gị aka? Ị ma na ọ na-emere gị na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ unu ọtụtụ ihe. Ị̀ pụrụ inyere ya aka?— Gịnị ma ị jụọ ya?
Ma eleghị anya, ị pụrụ idozi tebụl mgbe ezinụlọ unu chọrọ iri nri. Ma ọ bụ, ma eleghị anya, ị pụrụ iwepụsị ihe ndị e ji rie nri n’elu tebụl mgbe ezinụlọ unu risịrị nri. Ụmụaka ụfọdụ na-aga ekpofu ahịhịa kwa ụbọchị. Ihe ọ bụla i nwere ike ime, ọ ga-abụ ijere ndị ọzọ ozi, ọbụna dị ka Jizọs jeere ndị ọzọ ozi.
Ì nwere ụmụnne ndị ị tọrọ, ndị ị pụrụ ijere ozi? Cheta na Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, jeere ọbụna ndị na-eso ụzọ ya ozi. Site n’ijere ụmụnne gị ndị ị tọrọ ozi, ị na-eṅomi Jizọs. Gịnị ka ị pụrụ imere ha?— Ma eleghị anya, ị pụrụ inyere ha aka ịmụta ịdị na-edebe ihe ndị ha na-eji egwuri egwu n’ebe ha kwesịrị ịdị mgbe ha gwusịrị egwu. Ma ọ bụ, ma eleghị anya ị pụrụ inyere ha aka iyiri uwe. Ma ọ bụ, ikekwe, ị pụrụ inyere ha aka idozi ihe ndina ha. Ị̀ ga-echetali ihe ọ bụla ọzọ ị pụrụ imere ha?— Ha ga-ahụ gị n’anya ma ị na-eme ihe ndị a, dị nnọọ ka ụmụazụ Jizọs hụrụ ya n’anya.
N’ụlọ akwụkwọ, ị pụkwara ijere ndị ọzọ ozi. O nwere ike ịbụ ụmụ klas gị ma ọ bụ onye nkụzi gị. Ọ bụrụ na akwụkwọ mmadụ adapụnahụ ya, ọ ga-abụ omume obiọma ma i nyere ya aka tụtụlite ya. Ị pụrụ iwepụta onwe gị ihicha bọọdụ unu ji ede ihe ma ọ bụ imere onye nkụzi gị ihe ọzọ. Ọbụna ijidere mmadụ ọnụ ụzọ bụ omume obiọma.
Mgbe ụfọdụ, anyị ga-achọpụta na ndị mmadụ agaghị ekele anyị maka ozi anyị jeere ha. Ì chere na nke a kwesịrị ime ka anyị kwụsị ime ihe ọma?— Ee e! Ọtụtụ mmadụ ekeleghị Jizọs ekele maka ọrụ ọma ndị ọ rụrụ. Ma, nke ahụ emeghị ka ọ kwụsị ime ihe ọma.
Ya mere, akwụsịla ijere ndị ọzọ ozi. Ka anyị na-echeta Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs, ma na-agbalị ịgbaso ihe nlereanya ya mgbe nile.
Maka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-ekwu banyere inyere ndị ọzọ aka, gụọ Ilu 3:27, 28; Ndị Rom 15:1, 2; nakwa Ndị Galeshia 6:2.