Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 3/1 p. 16-21
  • Ụbọchị nke Kwesịrị Ncheta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị nke Kwesịrị Ncheta
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Naịsan 14
  • Iyikwasị Ịdị Umeala n’Obi na Ịhụnanya
  • “Ụzọ, na Eziokwu, na Ndụ”
  • Ịtachi Obi ná Mkpagbu
  • Iwebata Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ
  • “Ka Unu Wee Na-echeta M”
  • “N’Alaeze Nna M”
  • Ekpere nke Sitere n’Ala Ala Obi
  • Na-eme Ihe Ị Mụtara n’Ekpere Dị Mkpa Jizọs Kpere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ì So ná Ndị Chineke Hụrụ n’Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Olee Otú E Si Echeta Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ihe Ndị Dị n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 3/1 p. 16-21

Ụbọchị nke Kwesịrị Ncheta

“Okwu ndị a ka m gwaworo unu, ka unu wee nwee udo n’ime m. N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.”—JỌN 16:33.

1, 2. Olee otu ụbọchị n’akụkọ ihe mere eme nke na-eguzopụ iche n’ụbọchị ndị ọzọ nile, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

ỤWA nke oge a nwere ọtụtụ ihe o nwere ikwu banyere udo. N’ọgwụgwụ nke Agha Ụwa nke Abụọ, e jikọtara udo na Ụbọchị V-E na Ụbọchị V-J ahụ.a Kwa afọ, Krismas na-eme ka ndị mmadụ na-eche echiche banyere ‘udo n’elu ala.’ (Luk 2:14) Ma e nwere otu ụbọchị n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nke na-eguzopụ iche site n’ụbọchị ndị ọzọ. Ọ bụ ụbọchị ahụ nke Jisọs kwuru okwu ahụ e hotara n’elu ebe a. N’ime ihe karịrị nde ụbọchị abụọ ihe a kpọrọ mmadụ dịworo ndụ n’elu ala ebe a, ọ bụ otu ụbọchị ahụ nke gbanwere kpam kpam ụzọ ihe siworo gaara ihe a kpọrọ mmadụ iji wetara ya ọdịmma ebighị ebi.

2 Ụbọchị oké ihe omume ahụ bụ Naịsan 14 na kalenda ndị Juu. N’afọ 33 nke Oge Anyị, Naịsan 14 malitere mgbe anyanwụ dasịrị n’April 1. Ka anyị tụlee ihe ndị mere n’ụbọchị oké ihe omume ahụ.

Naịsan 14

3. Olee ụzọ Jisọs si jiri hour ndị ikpeazụ a mee ihe?

3 Ka chi na-ejilata, o yiri ka ọnwa nke gbazuworo nnọọ na-eti dị ka ihe ncheta na Jehova na-ekpebi oge na mgbe dị iche iche. (Ọrụ 1:7) Ọ̀ bụkwa gịnị na-eme n’ụlọ ahụ dị n’elu ebe Jisọs na ndị ozi ya zukọtaworo maka ime Ememe Ngabiga ndị Juu ahụ a na-eme kwa afọ? Ka Jisọs na-akwadebe ‘isi n’ụwa nke a lakwuru Nna ya, ọ na-egosi ndị nke aka ya ịhụnanya ruo ọgwụgwụ.’ (Jọn 13:1) Olee ụzọ o si mee nke a? Site n’okwu ọnụ nakwa site n’ihe nlereanya, Jisọs nọgidere na-akụnye n’ime ndị na-eso ụzọ ya àgwà ndị ga-enyere ha aka imeri ụwa.

Iyikwasị Ịdị Umeala n’Obi na Ịhụnanya

4. (a) Olee ụzọ Jisọs si gosipụtara ndị na-eso ụzọ ya otu àgwà bụ isi? (b) Olee otú anyị si mata na Pita mụtara mkpa nke ịdị umeala n’obi?

4 Ndị ozi ahụ ka ga-ewepụchasị site n’onwe ha ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke iji oké ọchịchọ na-ekwo ekworo na ịdị mpako. Ya mere, Jisọs ji ákwà e ji ehicha ahụ kee onwe ya n’úkwù ma malite ịsa ụkwụ ha. Nke a abụghị ngosipụta nke ịdị umeala n’obi na-abụghị ezie, dị ka popu nke Krisendọm na-emeghachi ya na Rom kwa afọ. Ee e, ọ bụghị otú ahụ ma ọlị! Ezi obi umeala bụ mwepụta onwe onye nke na-esite ‘n’obi dị umeala nke na-agụ ndị ọzọ ná ndị ka onwe onye mma.’ (Ndị Filipaị 2:2-5) Ná mmalite, Pita aghọtaghị isi ihe ahụ, na-ajụ ikwe ka Jisọs saa ụkwụ ya. Mgbe a gbaziri ya olu, ọ rịọrọ Jisọs ka ọ saa ya ahụ dum. (Jọn 13:1-10) Otú ọ dị, ọ ghaghị ịbụ na Pita mụtara otu ihe. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, anyị hụrụ ka ọ na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ n’ụzọ ziri ezi. (1 Pita 3:8, 9; 5:5) Lee nnọọ ka o si dị mkpa taa ka anyị nile jeere Kraịst ozi n’ịdị umeala n’obi!—Leekwa Ilu 22:4; Matiu 23:8-12.

5. Olee iwu Jisọs nyere nke gosiri ịdị mkpa nke otu àgwà ọzọ bụ isi?

5 Otu n’ime mmadụ 12 ahụ eriteghị uru site na ndụmọdụ Jisọs. Onye a bụ Judas Iskariọt. Ka oriri Ememe Ngabiga ahụ na-aga n’ihu, Jisọs malitere inwe ihe mgbu ná mmụọ ya, wee mee ka a mata Judas dị ka onye gaje ịrara ya nye, wee hapụ ya ka ọ pụọ. Ọ bụ nanị mgbe nke a gasịrị ka Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya 11 ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:34, 35) Nke a bụ iwu ọhụrụ n’ezie, nke e ji ihe nlereanya na-enweghị atụ nke Jisọs gosipụta! Ka oge hour nke ọnwụ ọchụchụ àjà ya na-abịa nso, Jisọs gosipụtara ịhụnanya pụrụ iche. O jiri minit ọ bụla dị oké ọnụ ahịa mee ihe izi ndị ahụ na-eso ụzọ ya ihe na ịgba ha ume. Mgbe nke a gasịrị, o mesiri mkpa ịhụnanya dị ike, na-asị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịa nke a ukwu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.”—Jọn 15:12, 13.

“Ụzọ, na Eziokwu, na Ndụ”

6. Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka Jisọs na-eche ndị na-eso ụzọ ya dị ya nso n’ihu?

6 Jisọs gwara mmadụ 11 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ka obi unu ghara ịlọ mmiri: kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na mụ. N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị; ọ bụrụ na ọ bụghị otú a, m ga-agwaworị unu; n’ihi na ana m aga idoziri unu ebe.” (Jọn 14:1, 2) Ebe nke a gaje ịbụ ‘n’alaeze eluigwe.’ (Matiu 7:21) Jisọs kwuru ụzọ ìgwè nke a nke ndị na-eso ụzọ, ndị na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị dị ya nso, pụru isi ruo ihe mgbaru ọsọ ha. Ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Nke a metụtakwara ndị so n’ihe a kpọrọ mmadụ, ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi n’elu ala.—Mkpughe 7:9, 10; 21:1-4.

7-9. N’ihi gịnị ka Jisọs ji kọwaa onwe ya dị ka “ụzọ, na eziokwu, na ndụ”?

7 Jisọs bụ “ụzọ” ahụ. Nanị otu ụzọ a pụrụ isi bịakwute Chineke n’ekpere bụ site na Jisọs Kraịst. Jisọs n’onwe ya mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na Nna ya ga-enye ha ihe ọ bụla ha rịọrọ n’aha Jisọs. (Jọn 15:16) Ekpere ndị e kpegaara ihe osise na ihe ọkpụkpụ dị iche iche ma ọ bụ “ndị senti” nke okpukpe ma ọ bụ ndị jupụtara n’Ekele Marịa na okwu nkwughachi dị iche iche—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a Nna ahụ na-anụ ma ọ bụ na-anara. (Matiu 6:5-8) Ọzọkwa, anyị na-agụ banyere Jisọs n’Ọrụ Ndị Ozi 4:12, sị: “Aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.”

8 Jisọs bụ “eziokwu” ahụ. Jọn onyeozi kwuru banyere ya, sị: “Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ, bụ́ mmadụ, o wee biri n’etiti anyị, (anyị kirikwara otuto ya, bụ́ otuto dị ka otu nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya), o jupụtara n’amara na eziokwu.” (Jọn 1:14) N’ime Jisọs ka ọtụtụ narị amụma ndị dị n’Akwụkwọ nsọ Hibru ghọrọ eziokwu site ná mmezu o mezuru ha. (2 Ndị Kọrint 1:20; Mkpughe 19:10) O mere ka a mara eziokwu n’ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ ndị gere ya ntị okwu, ná nrụrịta ụka ya na ndị ndú okpukpe nwere ihu abụọ, nakwa site n’ihe nlereanya nke ịdị ndụ ya.

9 Jisọs bụ “ndụ” ahụ. Dị ka Ọkpara Chineke, Jisọs sịrị: “Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; ma onye na-ekwenyeghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ, kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.” (Jọn 3:36) Okwukwe nke e nwere n’àjà Jisọs na-eduje ná ndụ ebighị ebi—ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe nye “ìgwè atụrụ nta” nke ndị Kraịst e tere mmanụ na ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs nye oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ.”—Luk 12:32; 23:43; Jọn 10:16.

Ịtachi Obi ná Mkpagbu

10. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ‘merie ụwa,’ oleekwa agbamume Jisọs nyere n’ihe banyere nke a?

10 Ndị nwere olileanya ịdị ndụ n’ime usoro ihe ọhụrụ nke Jehova aghaghị ịgba mgba megide ụwa nke ‘na-atọgbọ n’aka ajọ onye ahụ,’ Setan bụ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ya mere, lee ka okwu Jisọs nke dị na Jọn 15:17-19 si bụrụ ihe agbamume! O kwuru, sị: “Ihe ndị a ka m na-enye unu n’iwu, ka unu wee hụrịta ibe unu n’anya. Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu maara na ọ kpọwo mụ onwe m asị mgbe ọ kakpọghị unu asị. Ọ bụrụ na unu sitere n’ụwa, ụwa ga-ahụ ihe nke aka ya n’anya: ma n’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.” A kpọwo ezi ndị Kraịst asị ruo kpọmkwem n’afọ nke a bụ 1992, leekwa ka anyị si na-aṅụrị ọṅụ n’ezi ihe nlereanya nke ndị ahụ nọgidere na-eguzosi ike, jiri obi dị umeala na-enweta ike n’okpuru aka dị ike nke Chineke! (1 Pita 5:6-10) Anyị nile pụrụ inwe ntachi obi n’ọnwụnwa site n’itinye okwukwe n’ebe Jisọs nọ, bụ́ onye ji okwu ndị a na-enye obi ụtọ mechie okwu ya: “N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.”—Jọn 16:33.

Iwebata Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ

11. Gịnị ka Jeremaịa buru n’amụma banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ?

11 N’uhuruchi ahụ, mgbe Ememe Ngabiga ahụ bịaruteworo ná njedebe, Jisọs kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Jeremaịa onye amụma buru amụma banyere nke a ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, na-asị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ . . . M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka m ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; m ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị: . . . M ga-agbaghara ajọ omume ha, m gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.” (Jeremaịa 31:31-34) Na Naịsan 14, 33 O.A., a gaje ịchụ àjà nke ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke a malite ịdị irè!

12. Olee ụzọ Jisọs si guzobe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, gịnịkwa ka ọ na-emezu?

12 Jisọs gwara mmadụ 11 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na ọ gụsiwo ya agụụ ike iso ha rie nri Ememe Ngabiga nke a. O wee were otu ógbè achịcha, keleekwa, nyawaa ya, wee nye ha ya, na-asị: “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” N’otu ụzọ ahụ, o nyere ha otu iko mmanya na-acha uhie uhie, na-asị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsị n’ihi unu.” (Luk 22:15, 19, 20) E mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malite ịdị irè site ‘n’ọbara dị oké ọnụ ahịa’ nke Jisọs, bụ́ nke bara uru nke ukwuu karịa ọbara anụmanụ nke e fesara iji mee ka ọgbụgba ndụ Iwu nke Israel dịrị irè! (1 Pita 1:19; Ndị Hibru 9:13, 14) Ndị a na-akpọbata n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-enweta mgbaghara mmehie zuru ezu. N’ihi ya, ha pụrụ iru eru iso na 144,000 ahụ, ndị ga-enweta ihe nketa ebighị ebi dị ka Israel ime mmụọ.—Ndị Galetia 6:16; Ndị Hibru 9:15-18; 13:20; Mkpughe 14:1.

“Ka Unu Wee Na-echeta M”

13. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịtụgharị uche banyere ya n’oge Ememe Ncheta? (b) Òle ndị nanị kwesịrị ikere òkè n’ihe nnọchianya ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

13 Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs nke ugbo 1,960 dabara n’April 17, 1992. Ka ụbọchị ahụ na-abịa nso, anyị ga-eme nke ọma ịtụgharị uche n’ihe nile àjà zuru okè nke Jisọs na-arụzu. Ndokwa nke a na-ebuli amamihe Jehova elu tinyere ịhụnanya dị omimi o nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Nguzosi ike n’ezi ihe zuru okè nke Jisọs, ọbụna ruo n’ọnwụ ihe mgbu, na-ewepụ Jehova n’ụta site n’ịkwa emo nke Setan na ụmụ mmadụ O kere eke nwere ntụpọ, na ha ga-adakwa n’okpuru ule. (Job 1:8-11; Ilu 27:11) Site n’ọbara ya o jiri chụọ àjà, Jisọs ghọrọ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, bụ́ ihe Jehova ji mee ihe n’ịhọpụta “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụaja ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” Mgbe ha ka nọ n’elu ala, ndị a ‘na-ekwusa ịdị mma nile’ nke Chineke ha, bụ́ Jehova, onye ‘kpọpụtaworo ha n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè ya dị ebube.’ (1 Pita 2:9; tụlee Ọpụpụ 19:5, 6.) N’ụzọ ziri ezi, ọ bụ nanị ha na-ekere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ kwa afọ.

14. Olee ụzọ ọtụtụ nde ndị na-ekiri ihe na-emenụ si erite uru?

14 N’Ememe Ncheta nke afọ gara aga, 10,650,158 mmadụ bịara gburugburu ụwa, ma n’etiti ndị a, ọ bụ nanị 8,850—ihe na-erughị otu ụzọ n’ụzọ iri nke 1 pasenti—keere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ. Ya mere, uru dị aṅaa ka ememe nke a baara ọtụtụ nde ndị bịara ịhụ ihe na-emenụ? Ọ bara uru nke ukwuu! Ọ bụ ezie na ha adịghị ekere òkè, a na-ewuli ha elu n’ime mmụọ site ná mkpakọrịta nke a nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, ka ha na-anụ banyere ihe nile dị ebube Jehova na-emezu site n’àjà nke Ọkpara ya.

15. Olee ụzọ ndị ọzọ na-abụghị ndị e tere mmanụ si erite uru site n’àjà Jisọs?

15 Ọzọkwa, onyeozi ahụ na-agwa anyị na 1 Jọn 2:1, 2, sị: “Anyị nwere otu onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ onye ezi omume: ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma ọ bụghị ihe ịjụrụ ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.” Ee, àjà Jisọs, ọ bụ ezie na o bu ụzọ baara òtù Jọn ahụ uru, bụ́ ndị e webatara n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, na-emekwa ka “ụwa dum” nweta mgbaghara mmehie. Ọ bụ ‘ihe ịjụrụ obi’ maka mmehie nke ndị ọzọ nile nọ n’ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ndị na-etinye okwukwe n’ọbara Jisọs nke a wụsịrị, nke na-emeghere ha ụzọ maka olileanya obi ụtọ nke ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs.—Matiu 20:28.

“N’Alaeze Nna M”

16. (a) Olee ihe o yiri ka Jisọs na ndị ya na ha so eketa ihe na-ekere òkè na ya ugbu a? (b) Gịnị ka a chọrọ n’oge a ma n’aka ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ma n’aka oké ìgwè mmadụ ahụ?

16 N’ịga n’ihu n’ịgba ndị ozi ya ume, Jisọs zoro aka gaa n’ụbọchị ahụ mgbe, n’ụzọ ihe atụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya ga-aṅụ ọhụrụ, ihe sitere n’osisi vine n’Alaeze nke Nna ya. (Matiu 26:29) Ọ gwara ha, sị: “Ma unu onwe unu bụ ndị soworo m n’ọnwụnwa m nile; mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m, ka unu wee rie ṅụọkwa na table nke m n’alaeze m; unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Luk 22:28-30) Eri mgbe Jisọs weere ike Alaeze n’eluigwe na 1914, anyị pụrụ ikwubi na ihe ka ọtụtụ ná ndị ha na Jisọs ga-eso ketakọọ ihe, ndị a chịkọtara n’ime ọtụtụ narị afọ gaworo aga, abụworị ndị a kpọlitere n’ọnwụ, iso ya ‘nọdụ n’ocheeze dị iche iche.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:15, 16) Ụbọchị ahụ na-abịa nso ngwa ngwa ka ndị mmụọ ozi ahụ tọhapụ “ifufe anọ” nke ‘oké mkpagbu’ ahụ! N’oge ahụ, a ga-akazuworị 144,000 ndị so n’Israel ime mmụọ akara, chịkọtazuokwa ọtụtụ nde ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. Ndị a nile aghaghị iguzosi ike n’ezi ihe, dị ka Jisọs mere, ka ha wee nwee ike ịnata ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi.—Mkpughe 2:10; 7:1-4, 9.

17 na igbe. (a) Ọ bụrụ na a jụ onye e tere mmanụ n’ihi eguzosighị ike n’ihe, ònye ka ezi uche dị na ya na a ga-eji dochie anya ya? (b) Ìhè dị aṅaa ka isokwu ndị dị n’Ụlọ Nche (Bekee) na 1938 nyere banyere mwulite na mgbasapụ nke nzukọ ọchịchị Chineke n’elu ala bụ́ nke e mesịrị nwee?

17 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ akwụsị ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe? Ugbu a mgbe oge gabigasịworo, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọnụ ọgụgụ ndị dị otú ahụ na-adịghị eguzosi ike n’ihe ga-adị ole na ole. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na ndị a ga-eji dochie anya ndị dị otú ahụ agaghị abịa site n’etiti ndị mere baptism ọhụrụ, kama ọ bụ site n’etiti ndị ahụ rapagidesiworo ike n’ahụ Jisọs n’ọnwụnwa ya nile site n’ọtụtụ afọ nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ìhè ime mmụọ na-enwu enwu ndị e nwetara site n’Ụlọ Nche (Bekee) n’afọ ndị 1920 na 1930 gosiri na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’oge ahụ ka e mezuru nchịkọta nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ. Ndị ‘na-asa uwe mwụda ha na-emekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ’ kemgbe ahụ nwere olileanya dị iche nke na-enye ọṅụ. Site na Kraịst, mmụọ Jehova na-eduru ha gaa “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ” n’elu ala nke bụ Paradaịs.—Mkpughe 7:10, 14, 17.

Ekpere nke Sitere n’Ala Ala Obi

18. Ihe mmụta siri ike ndị dịgasị aṅaa ka anyị na-enweta site n’ekpere Jisọs nke dị na Jọn isi 17?

18 Jisọs mechiri nnọkọ Ememe Ncheta ahụ ya na ndị na-eso ụzọ ya mere site n’ikpe ekpere ahụ sitere n’ala ala obi nke e dekọrọ na Jọn 17:1-26. O bu ụzọ kpee ekpere ka Nna ya nye ya otuto ebe ọ nọ na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo ọgwụgwụ. N’ụzọ dị otú a, a ga-enyekwa Jehova otuto, na-edo aha ya nsọ—wepụchasịa ya n’ịta ụta nile. N’ihi na, n’ezie, nwoke ahụ zuru okè, bụ́ Jisọs, na-anwapụta n’ezie na ụmụ mmadụ Chineke kere eke pụrụ ịnọ n’enweghị ntụpọ ọ bụla, ọbụna n’okpuru ule ndị kasị sie ike. (Deuterọnọmi 32:4, 5; Ndị Hibru 4:15) N’ịga n’ihu, ọnwụ ọchụchụ àjà nke Jisọs na-emeghere ụmụ Adam ohere dị ebube. Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” Lee nnọọ ka o si dị oké mkpa inweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na nke Ọkpara ya, bụ́ Nwa Atụrụ Chineke, onye nyere ndụ ya maka iwepụ Jehova n’ụta nakwa maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ! (Jọn 1:29; 1 Pita 2:22-25) Ì nwere ekele maka àjà ahụ nke na-egosi oké ịhụnanya ruo n’ókè nke ịrara onwe gị dum nye Jehova na ije ozi ya dị oké ọnụ ahịa?

19. Olee ụzọ ihe ahụ fọdụrụ na oké ìgwè mmadụ ahụ pụrụ isi nwee ịdị n’otu dị oké ọnụ ahịa?

19 N’ịga n’ihu, Jisọs kpekuru Nna ya Dị Nsọ ekpere ka O chee ndị na-eso ụzọ ya nche ebe ha na-egosipụta onwe ha na ha abụghị akụkụ nke ụwa, na-arapara n’okwu Ya dị ka eziokwu, nọgidekwa n’ịdị n’otu ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ha na Nna na Ọkpara ahụ. Ọ̀ bụ na a zabeghị ekpere a n’ụzọ dị ebube kpọmkwem ruo n’ụbọchị taa ka ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ na-ejekọ ozi n’ịdị n’otu n’ihe okike nke ịhụnanya, na-anọpụkwa iche pụọ n’ụwa, ime ihe ike ya, na ajọ omume ya nile? Lee ka okwu mmechi Jisọs gwara Nna ya bụ Jeahova si bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa! “Emekwara m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka ha mara ya,” ka Jisọs sịrị, “ka ịhụnanya i ji hụ m wee dị n’ime ha, mụ onwe m kwa n’ime ha.”—Jọn 17:14, 16, 26.

20. N’ihi gịnị ka Naịsan 14, 33 O.A., ji bụrụ n’ezie ụbọchị nke kwesịrị ncheta?

20 N’ịpụ gaa n’ogige Getsemane, Jisọs sokwa ndị na-eso ụzọ ya nwee mkpakọrịta dị mkpirikpi ma na-ewuli elu. Mgbe ahụ ndị iro ya bịakwasịrị ya! A pụghị iji okwu ọnụ kọwaa ihe mgbu anụ ahụ Jisọs nọ na ya, iru újú na-agbawa obi o nwere n’ihi nkọcha a na-ekpokwasị Jehova, nakwa ezi ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ezi ihe ya n’oge ahụ dum. Jisọs nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ, n’ogologo abalị ahụ dum nakwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’oge nile nke ìhè ehihie n’ụbọchị ahụ. O gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè na Alaeze ya abụghị akụkụ nke ụwa. O jikwa nkuume ikpeazụ ya tie mkpu, sị: “Ọ gwụwo!” (Jọn 18:36, 37; 19:30) Mmeri o meriri ụwa bụ nke zuru ezu. Naịsan 14, 33 O.A., bụ n’ezie ụbọchị nke kwesịrị ncheta!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Victory in Europe Day (Ụbọchị Mmeri na Europe) na Victory over Japan Day (Ụbọchị Mmeri megide Japan).

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ Gịnị ka Jisọs kụziri banyere obi umeala na ịhụnanya?

◻ Olee ụzọ Jisọs si ghọọ “ụzọ, na eziokwu, na ndụ”?

◻ Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?

◻ Ịdị n’otu na ịhụnanya dị aṅaa ka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ na-enwe?

[Igbe dị na peeji nke 20]

Amamihe nke Solomọn ahụ Ka Ukwuu

Ihe odide ndị ahụ isiokwu ha bụ́ “Nzukọ” ná mbipụta June 1 na June 15, 1938, nke Ụlọ Nche (Bekee) guzobere ndokwa ọchịchị Chineke bụ isi nke Ndịàmà Jehova na-agbaso ruo taa. Ha wetara ná njedebe ogologo oge kwesịrị ịrịba ama nke nhazigharị ihe banyere ozizi na otú nzukọ a si arụ ọrụ nke malitere na 1919. (Aịsaịa 60:17) N’iji ogologo oge ahụ dị 20 afọ tụnyere 20 afọ ahụ nke Solomọn ji wuo ụlọ nsọ ahụ na ụlọ eze nke dị na Jerusalem, Ụlọ Nche (Bekee) ahụ kwuru, sị: “Akwụkwọ nsọ na-egosi na, ka afọ iri abụọ nke atụmatụ owuwu ụlọ Solomọn gasịrị . . . , ọ bagidekwara otu atụmatụ owuwu ụlọ nke gbasara ruo mba ahụ nile. (1 Eze 9:10, 17-23; 2 Ihe Eme. 8:1-10) Mgbe ahụ eze nwanyị Sheba bịara ‘site n’ebe ụwa sọtụrụ bịa ịnụ amamihe Solomọn.’ (Mat. 12:42; 1 Eze 10:1-10; 2 Ihe Eme. 9:1-9, 12) Nke a na-ewelite ajụjụ ahụ bụ́: Gịnị ka ọdịnihu ga-ewetara ndị Jehova nọ n’elu ala? Anyị ga-eji ezi olileanya chere, anyị ga-ahụkwa.” Ezi olileanya ahụ alaghị n’iyi. N’okpuru usoro nhazi ihe ọchịchị Chineke, atụmatụ owuwu ihe zuru ụwa ọnụ achịkọtawo ihe karịrị nde mmadụ anọ nke oké ìgwè mmadụ ahụ. Dị ka eze nwanyị nke Sheba ahụ, ndị a esiwo n’ebe dị iche iche ụwa sọtụrụ wee bịa ịnụrụ amamihe nke Solomọn ahụ Ka Ukwuu, Kraịst Jisọs—bụ nke e si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-ewerutere ha.—Matiu 24:45-47.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya