Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/1 p. 8-9
  • Ndụmọdụ O Ji Ahapụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụmọdụ O Ji Ahapụ Ha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Inyekwu Ndụmọdu Mgbe Na-ahapụ Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • ‘Ọkpara ahụ Chọrọ Ikpughe Nna Ya’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/1 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Ndụmọdụ O Ji Ahapụ Ha

NRI ememe ncheta ahụ agasịwo, ma Jisọs na ndị ozi ya ka nọ n’ime ụlọ ahụ dị n’elu. Ọ bụ ezie na Jisọs gaje ịla n’oge na-adịghị anya, ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ chọrọ ikwu. Ọ kasiri ha obi, sị: “Ka obi unu ghara ịlọ mmiri: kwerenụ na Chineke.” Ma a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. O kwukwara, sị, “Kwerekwanụ na mụ.”

Jisọs gara n’ihu ikwu, sị, “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị.” “Ana m aga idoziri unu ebe . . . ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe mụ onwe m nọ. Ebe mụ onwe m na-ala, unu matakwara ụzọ ya.” Ndị ozi ahụ aghọtaghị na Jisọs na-ekwu okwu banyere ịla n’eluigwe, ya mere, Tọmas jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, anyị amataghị ebe ị na-ala; ànyị si aṅaa mata ụzọ ya?”

Jisọs zara, sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.” Ee, ọ bụ nanị site n’ịnakwere ya na iṅomi ụzọ ndụ ya ka onye ọ bụla pụrụ ịbanye n’ebe obibi eluigwe nke Nna ahụ n’ihi na, dị ka Jisọs kwuru: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na mụ.”

Filip rịọrọ, sị, “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ, ọ ga-ezukwara anyị.” O yiri ka Filip ọ̀ chọrọ ka e gosipụta Chineke n’ụzọ ha ga-ahụ anya, dị ka e mere n’oge ochie n’ọhụụ ndị ahụ Mosis, Elaịja, na Aịsaịa hụrụ. Ma, n’ezie, ndị ozi ahụ nwere ihe dị mma nke ukwuu karịa ụdị ọhụụ ndị ahụ, dị ka Jisọs kwuru, sị, “Ogologo oge dị otú a ka mụ na gị nọ, ma ị̀ mataghị m, Filip? Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”

Jisọs na-egosipụta ọdịdị nke Nna ya n’ụzọ zuru okè nke na iso ya bikọọ na ilegide ya anya yiri nnọọ ịhụ Nna ahụ anya n’ezie. Otú o sina dị, Nna ahụ ka Ọkpara ahụ ukwuu, dị ka Jisọs kwetara, sị: “Okwu mụ onwe m na-agwa unu ekwughị m n’onwe m.” N’ụzọ ziri ezi, Jisọs nyere Nna ya nke eluigwe otuto nile maka ozizi ihe ya nile.

Lee nnọọ ihe agbamume ọ na-aghaghị ịbụworị nye ndị ozi ahụ ịnụ ka Jisọs na-agwa ha ugbu a, sị: “Onye kweere na mụ, ọrụ mụ onwe m na-arụ ka onye ahụ ga-arụkwa; ọrụ ka ndị a ukwuu ka ọ ga-arụkwa”! Ihe Jisọs na-ekwu abụghị na ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe ike ọrụ ebube ndị dị ukwuu karị nke o nwere. Ee e, kama ihe ọ na-ekwu pụtara na ha ga-eje ozi ahụ ruo ogologo oge karị, gazuokwa ókèala dị ukwuu karị, ruokwa ebe ọtụtụ ndị nọ karị.

Jisọs agaghị agbakụta ndị na-eso ụzọ ya azụ mgbe ọ hapụsịrị ha. O kwere nkwa, sị: “Ihe ọ bụla unu ga-arịọkwa n’aha m, ihe ahụ ka m ga-eme.” N’ịga n’ihu, ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, ọ ga-enyekwa unu onye [inyeaka, NW] ọzọ, ka ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu.” Mgbe oge gasịrị, mgbe ọ lagosịrị n’eluigwe, Jisọs wụpụrụ mmụọ nsọ ahụ, bụ́ onye inyeaka nke ọzọ ahụ, n’isi ndị na-eso ụzọ ya.

Oge ụla Jisọs adịla nso, dị ka ọ sịrị: “Ọ fọdụrụ nwa oge, ụwa ahụkwaghị m ọzọ.” Jisọs gaje ịbụ mmụọ nke ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ ya anya. Ma ọzọkwa, Jisọs kwere ndị ozi ya na-ekwesị ntụkwasị obi nkwa, sị: “Ma unu onwe unu na-ahụ m: unu onwe unu ga-adịkwa ndụ, n’ihi na mụ onwe m na-adị ndụ.” Ee, ọ bụghị nanị na Jisọs ga-apụta n’ihu ha n’ọdịdị mmadụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, kama mgbe oge ya ruru, ọ ga-akpọlite ha gaa ná ndụ, ha na ya ga-anọkọ n’eluigwe dị ka ndị bụ mmụọ.

Ugbu a, Jisọs kwupụtara ụkpụrụ ahụ dị mfe, sị: “Onye nwere ihe m nyere n’iwu, nke na-edebekwa ha, ọ bụ onye ahụ na-ahụ m n’anya: onye na-ahụ m n’anya, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, mụ onwe m ga-ahụkwa ya n’anya, werekwa onwe m gosi ya.”

Mgbe o kwuru nke a, onyeozi ahụ bụ Judas, onye ahụ a na-akpọkwa Tadiọs naara ya okwu n’ọnụ wee sị: “Onyenwe anyị, gịnị pụtaworo na ị gaje iwere onwe gị gosi anyị, ma ọ bụghị ụwa?”

Jisọs zara, sị, “Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m: Nna m ga-ahụkwa ya n’anya . . . Onye na-adịghị ahụ m n’anya adịghị edebe okwu m nile.” N’ụzọ na-adịghị ka ndị na-eso ụzọ ya ndị na-erube isi, ụwa na-elefuru ozizi nile nke Kraịst anya. Ya mere, ọ dịghị ewere onwe ya gosi ha.

N’oge ije ozi elu ala ya, Jisọs eziwo ndị ozi ya ọtụtụ ihe. Olee ụzọ ha ga-esi chetachaa ihe nile, karịsịa ebe ọ bụ na ruokwa ugbu a, ha aghọtabeghị ihe dị ukwuu? Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jisọs kwere nkwa, sị: “Onye nkasi obi ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, [nke, NW] Nna m ga-ezite n’aha m, onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile mụ onwe m gwara unu.”

N’ịkasikwa ha obi ọzọ, Jisọs sịrị: “Udo ka m hapụụrụ unu; udo nke m ka m na-enye unu: . . . Ka obi unu ghara ịlọ mmiri, ka ọ gharakwa ịtụ ụjọ.” Ọ bụ eziokwu na Jisọs na-ahapụ ha, ma ọ kọwara, sị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrịworị ọṅụ, n’ihi na ana m agakwuru Nna m: n’ihi na Nna m ka mụ onwe m ukwuu.”

Oge fọdụụrụ Jisọs iji nọnyere ha dị nnọọ nta. Ọ sịrị, “Ọ dịghị ọtụtụ okwu mụ na unu ga-ekwu ọzọ site n’ugbu a, n’ihi na onyeisi nke ụwa nke a na-abịa: ọ dịghịkwa ihe ọ bụla o nwere n’ime m.” Setan bụ Ekwensu, onye ahụ nke nwere ike ịbanye n’ime Judas wee were ọnọdụ n’ime ya, bụ onyeisi nke ụwa nke a. Ma ọ dịghị adịghị ike ọ bụla nke mmehie dị n’ime Jisọs nke Setan pụrụ iji mee ihe iji dọpụ ya site n’ijere Chineke ozi. Jọn 14:1-31; 13:27; Luk 22:3, 4; Ọpụpụ 24:10; 1 Ndị Eze 19:9-13; Aịsaịa 6: 1-5.

▪ Olee ebe Jisọs na-aga, azịza dịkwa aṅaa ka Tọmas nwetara n’ihe banyere ụzọ e si eje ebe ahụ?

▪ Site n’arịrịọ ya, gịnị ka o yiri ka Filip ọ chọrọ ka Jisọs mee?

▪ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na onye hụworo Jisọs ahụwokwa Nna ahụ?

▪ Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esi rụọ ọrụ dị ukwuu karịa otú ọ rụrụ?

▪ N’echiche dị aṅaa ka Setan na-enweghị ihe ọ bụla n’ime Jisọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya