-
Ihe Ịdị Iche n’Ụwa PụtaraNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 45
Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara
Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ na ha ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa ma ọ bụ n’agha. N’eziokwu, ime ihe a anaghị adịcha mfe mgbe niile. O nwere ike ime ka ndị mmadụ jiri anyị na-eme ihe ọchị. Olee otú anyị ga-esi rubere Jehova Chineke isi ma gosi na anyị dị iche n’ụwa?
1. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ndị ọchịchị anya?
Ndị Kraịst na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. Anyị na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza.” Ọ pụtara na anyị ga na-erubere iwu obodo anyị isi, dị ka iwu nke kwuru ka anyị na-atụ ụtụ isi anyị. (Mak 12:17) Baịbụl kwuru na ihe mere ụmụ mmadụ ji na-achị bụ maka na Jehova hapụrụ ha. (Ndị Rom 13:1) Ihe a na-egosi na o nwere ebe ike ndị ọchịchị ruru kwụsị, ya bụ, ọ bụghị ihe niile ka ha nwere ike ime. Anyị na-atụ anya na oge na-abịa mgbe Chineke anyị ga-eji Alaeze ya dị n’eluigwe kwụsị nsogbu niile na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala.
2. Olee otú anyị ga-esi na-egosi na anyị dị iche n’ụwa?
Dị ka Jizọs, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ndị mmadụ chọrọ ime Jizọs eze ha n’ihi ọrụ ebube ha hụrụ ọ rụrụ, o kweghị. (Jọn 6:15) Maka gịnị? Ọ bụ maka ihe o mechara kwuo. Ọ sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) E nwere ụzọ dị iche iche anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs si egosi na anyị dị iche n’ụwa. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aga agha. (Gụọ Maịka 4:3.) Anyị na-akwanyere ihe ndị na-anọchi anya obodo, dị ka ọkọlọtọ, ùgwù, mana anyị anaghị efe ha ofufe. (1 Jọn 5:21) E nweghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị na-akwado, e nweghịkwa onye na-azọ ọkwá anyị na-akwado. Ụzọ ndị a bụ ụfọdụ n’ime ụzọ anyị si egosi na ọ bụ naanị ọchịchị Chineke, ya bụ, Alaeze Chineke, ka anyị na-akwado.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta oge ụfọdụ ime ihe ga-egosi na anyị dị iche n’ụwa nwere ike isiri anyị ike. Chọpụtakwa ihe ị ga-eme ga-eme Jehova obi ụtọ.
3. Ezigbo Ndị Kraịst dị iche n’ụwa
Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Gụọnụ Ndị Rom 13:1, 5-7 na 1 Pita 2:13, 14. Unu gụchaa ha, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù?
Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere ha isi?
Obodo abụọ lụwa agha, ụfọdụ mba nwere ike ịna-ekwu na o nweghị ndị nke ha na-adụnyere úkwù, ma ha na-akwadocha obodo abụọ ahụ. Oleezi ihe ịdị iche pụtara n’eziokwu? Gụọnụ Jọn 17:16. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka ịdị iche n’ụwa pụtara?
Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị mee ihe iwu Chineke sịrị anyị emela? Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:28, 29. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ọ bụrụ na ndị ọchịchị enye iwu dị iche n’iwu Chineke nyere, olee iwu nke anyị kwesịrị idebe?
Ì nwere ike icheta otu ihe Ndị Kraịst na-agaghị ekwe eme ma ndị ọchịchị gwa ha mee ya?
4. Ka ihe ị na-eche na omume gị gosi na ị dị iche n’ụwa
Gụọnụ 1 Jọn 5:21. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a anyị lere, gịnị mere Ayenge ekweghị abanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ soro na-eme ememme e ji eto mba, dị ka igbuchapụrụ ọkọlọtọ?
Ì chere na ihe a o mere dị mma?
Olee ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ịdị iche n’ụwa siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị iche n’ụwa ma a bịa n’ihe gbasara asọmpi egwuregwu ndị si ebe dị iche iche n’ụwa na-eme?
Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị iche n’ụwa ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị mere ihe baara anyị uru ma ọ bụ ihe kpataara anyị nsogbu?
Olee otú ụdị akụkọ ụwa anyị na-ege ma ọ bụ ndị anyị na ha na-akpa nwere ike isi mee ka o siere anyị ike ịna-adị iche n’ụwa?
Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị Onye Kraịst ga-esi n’ihe ọ na-eche na n’omume ya gosi na aka ya adịghị na ha?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere ị naghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ ihe mere ị naghị ekwe ukwe e ji eto mba.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ndị Kraịst na-agbasi mbọ ike ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma n’echiche ha ma n’okwu ha ma n’omume ha.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ụgwọ anyị ji ndị ọchịchị?
Gịnị mere anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị iche n’ụwa?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Olee ihe ụfọdụ anyị ga-agba mbọ hapụ ka anyị nwee ike ịdị iche n’ụwa?
Gịnị ka ezinụlọ dị iche iche nwere ike ime iji jikere maka oge ndị o nwere ike isiri ha ike igosi na ha dị iche n’ụwa?
Gịnị mere na mmadụ ịlụrụ obodo ya agha abụghị ihe kacha eme ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù?
Mgbe anyị na-ekpebi ụdị ọrụ anyị ga-arụ, chọpụta otú anyị ga-esi egosi na anyị dị iche n’ụwa.
-
-
Ị Ga-atachili Obi Mgbe A Na-akpagbu GịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Ndị mmadụ na-emegide Ndị Kraịst. Ha na-akpagbudị ha. Ọ bụrụ na ha akpagbughị anyị taa, ha ka ga-akpagbu anyị echi. Ihe a ò kwesịrị ime ka ụjọ tụwa anyị?
1. Olee ihe mere anyị ji atụ anya na a ga-akpagbu anyị?
Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “A ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.” (2 Timoti 3:12) A kpagburu Jizọs n’ihi na ọ bụghị nke ụwa a Setan na-achị. Anyịnwa abụghịkwa nke ụwa. Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya ma ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị okpukpe kpagbuwe anyị.—Jọn 15:18, 19.
2. Olee otú anyị nwere ike isi jikere maka mkpagbu?
Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ịbịakwu Jehova nso. Kwa ụbọchị, wepụta oge gwa ya okwu n’ekpere, wepụtakwa oge gụọ Okwu ya. Na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ihe ndị a ga-eme ka i nwee obi ike ma kwụsie ike mgbe a na-akpagbu gị, ya sọkwa ya ya bụrụ ndị ezinụlọ unu na-akpagbu gị. Pọl onyeozi, bụ́ onye mkpagbu zooro ka mmiri, dere, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.”—Ndị Hibru 13:6.
Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka inwekwu obi ike bụ izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile. Izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi, meekwa ka anyị ghara ịna-atụ mmadụ ụjọ. (Ilu 29:25) Ọ bụrụ na ị na-akata obi ezi ozi ọma ugbu a, ọ ga-enyere gị aka ịdị ezigbo njikere izi ndị mmadụ ozi ọma n’ọdịnihu ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị amachie anyị izi ozi ọma.—1 Ndị Tesalonaịka 2:2.
3. Olee uru mkpagbu na-abara anyị?
Nke bụ́ eziokwu bụ na mkpagbu anaghị atọ anyị ụtọ. Ma, okwukwe anyị na-esikwu ike mgbe ọ bụla anyị diri mkpagbu. Anyị na Jehova na-adịkwu ná mma maka na anyị hụrụ otú o si nyere anyị aka mgbe anyị chere na nke anyị na-eme agwụla. (Gụọ Jems 1:2-4.) Ahụhụ anyị na-ata na-ewute Jehova. Ma, anyị tachie obi, obi na-atọ ya ụtọ. Baịbụl sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-atachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ maka na unu mere ihe dị mma, ọ na-amasị Chineke.” (1 Pita 2:20) Anyị tachie obi ruo ọgwụgwụ, Jehova ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ. N’oge ahụ, a gaghịzi na-akpagbu anyị maka na anyị na-efe ya.—Matiu 24:13.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere o ji bụrụ na anyị ga-atachili obi mgbe a na-akpagbu anyị. Chọpụtakwa otú Jehova ga-esi kwụọ anyị ụgwọ ma anyị tachie obi.
4. Ị ga-atachili obi mgbe ndị ezinụlọ unu na-akpagbu gị
Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ ma na obi agaghị adị ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị ụtọ ma anyị kpebie ife Jehova. Gụọnụ Matiu 10:34-36. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mmadụ malite ife Jehova, gịnị ka ụfọdụ ndị ezinụlọ ha nwere ike ime?
Unu chọọ ịhụ ihe ndị ezinụlọ mmadụ nwere ike ime, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka i nwere ike ime ma onye ezinụlọ unu ma ọ bụ enyi gị gwa gị ka ị kwụsị ife Jehova?
Gụọnụ Abụ Ọma 27:10 na Mak 10:29, 30. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ihe ebe a kwuru nwere ike isi nyere gị aka ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị na-akpagbu gị?
5. Nọgide na-efe Jehova n’agbanyeghị mkpagbu
Ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova mgbe a na-akpagbu anyị bụ inwe obi ike. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ihe ụmụnna mere na vidio a si eme ka obi sie gị ike?
Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:27-29 na Ndị Hibru 10:24, 25. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-efe Jehova ọ bụrụgodị na a machiri anyị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ ịga ọmụmụ ihe?
6. Jehova ga-enyere gị aka ịtachi obi
Ọ bụrụgodị na a na-akpagbu Ndịàmà Jehova, ma ụmụaka ha ma ndị okenye ha na-eji obi ha niile efe Jehova. Unu chọọ ịhụ ihe na-enyere ha aka, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị nyeere Ndịàmà Jehova ndị a anyị lere na vidio aka ịtachi obi?
Gụọnụ Ndị Rom 8:35, 37-39 na Ndị Filipaị 4:13. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ebe a anyị gụrụ si eme ka obi sie gị ike na i nwere ike idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị?
Gụọnụ Matiu 5:10-12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere i kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na a na-akpagbu gị?
E nweela ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova tachiri obi mgbe a na-akpagbu ha. Ị ga-atachili obi ka ha
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha agaghị atachili obi ma a kpagbuwe ha.
Olee amaokwu Baịbụl i chere nwere ike ime ka obi sie ha ike na ha ga-atachili obi?
NCHỊKỌTA
Jehova ji mbọ anyị na-agba ife ya kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na a na-akpagbu anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere Ndị Kraịst ji atụ anya na a ga-akpagbu ha?
Olee ihe i nwere ike ime ugbu a iji jikere maka mkpagbu?
Olee ihe nwere ike ime ka obi sie gị ike na ị ga-anọgideli na-efe Jehova n’agbanyeghị ụdị mkpagbu ọ bụla?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Lee vidio a ka ị hụ ihe otu nwa okorobịa kwuru nyeere ya aka ịtachi obi mgbe a tụrụ ya mkpọrọ maka na ọ jụrụ ịga agha.
Chọpụta ihe nyeere otu nwoke na nwunye ya aka iji obi ha niile na-efe Jehova ruo ọtụtụ afọ n’agbanyeghị mmegide.
Chọpụta ihe ga-eme ka i nwee obi ike mgbe a na-akpagbu gị.
Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele mkpagbu ndị ezinụlọ anyị na-akpagbu anyị anya. Oleekwa ihe anyị ga-eme ka ọ ghara ime ka anyị kwụsị ife Jehova?
“Eziokwu Na-eweta ‘Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha’” (Ụlọ Nche, Ọktoba 2017)
-