-
Mmụọ Jehova Na-edu Ndị YaỤlọ Nche—1992 | Septemba 15
-
-
Ụzọ Mmụọ ahụ Si Enye Aka
9. (a) Olee ụzọ mmụọ nsọ si arụ ọrụ dị ka “onye inyeaka”? (b) Olee ụzọ anyị si mara na mmụọ nsọ abụghị onye? (Lee ntụaka ala ala peji.)
9 Jisọs Kraịst kpọrọ mmụọ nsọ “onye inyeaka.” Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, ọ ga-enyekwa unu onye nkasi obi [“onye inyeaka,” NW] ọzọ, ka ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu: onye ụwa na-apụghị ịnara; n’ihi na ọ dịghị ahụ ya, ọ dịghị amakwa ya: unu onwe unu maara ya; n’ihi na ya na unu na-anọgide, ọ ga-anọkwa n’ime unu.” Gụnyere ihe ndị ọzọ, “onye inyeaka” ahụ ga-abụ onye ozizi, n’ihi na Kraịst kwere nkwa, sị: “Onye nkasị obi [“onye inyeaka,” NW] ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, onye Nna m ga-ezite n’aha m, onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile mụ onwe m gwara unu.” Mmụọ nsọ ahụ ga-agbakwa àmà banyere Kraịst, o mesikwara ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “Ọ bụ ihe baara unu uru ka mụ onwe m laa: n’ihi na a sị na alaghị m, onye nkasi obi [“onye inyeaka,” NW] ahụ agaghị abịakwute unu; ma ọ bụrụ na ala m, m ga-ezite ya nye unu.”—Jọn 14:16, 17, 26; 15:26; 16:7.a
10. N’ụzọ ndị dịgasị aṅaa ka mmụọ nsọ siworo ghọọ onye inyeaka?
10 Site n’eluigwe, Jisọs wụsara mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa n’isi ndị na-eso ụzọ ya n’ụbọchị Pentikọst na 33 O.A. (Ọrụ 1:4, 5; 2:1-11) Dị ka onye inyeaka, mmụọ nsọ ahụ nyere ha nghọta hiri nne nke uche na nzube Chineke ma mepeere ha Okwu amụma ya. (1 Ndị Kọrint 2:10-16; Ndị Kọlọsi 1:9, 10; Ndị Hibru 9:8-10) Onye inyeaka ahụ mekwara ka ndị na-eso ụzọ Jisọs nwee ike ịbụ ndịàmà ya n’ụwa nile. (Luk 24:49; Ọrụ 1:8; Ndị Efesọs 3:5, 6) Taa, mmụọ nsọ pụrụ inyere onye Kraịst raara onwe ya nye aka ito eto n’ihe ọmụma ma ọ bụrụ na o jiri ndokwa ime mmụọ nke Chineke na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-eme ihe. (Matiu 24:45-47) Mmụọ Chineke pụrụ iwepụta enyemaka site n’inye obi ike na ume dị mkpa iji gbaa àmà dị ka otu n’ime ndị ohu Jehova. (Matiu 10:19, 20; Ọrụ 4:29-31) Otú ọ dị, mmụọ nsọ na-enyekwara ndị Chineke aka n’ụzọ ndị ọzọ.
-
-
Mmụọ Jehova Na-edu Ndị YaỤlọ Nche—1992 | Septemba 15
-
-
a Ọ bụ ezie na e mere ka o yie onye dị ka “onye inyeaka,” mmụọ nsọ abụghị onye, n’ihi na nnọchiaha Grik na-egosi ihe na-abụghị oké ma ọ bụ nwunye (nke e ji “ọ” sụgharịa) bụ nke e ji mee ihe maka mmụọ nsọ. Nnọchiaha Hibru maka nwunye bụkwa nke e ji mee ihe maka amamihe e mere ka o yie onye. (Ilu 1:20-33; 8:1-36) Ọzọkwa, a “wụsara” mmụọ nsọ, bụ́ nke a na-apụghị iji onye mee.—Ọrụ 2:33.
-