Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/1 p. 8-9
  • Inyekwu Ndụmọdu Mgbe Na-ahapụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inyekwu Ndụmọdu Mgbe Na-ahapụ Ha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ndụmọdụ O Ji Ahapụ Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/1 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi ‘Jisos

Inyekwu Ndụmọdu Mgbe Ọ Na-ahapụ Ha

JISỌS na ndị ozi ahụ adịwo njikere ịhapụ ụlọ ahụ dị n’elu ụlọ. Ọ gara n’ihu ikwu, sị, “Okwu ndị a ka m gwaworo unu ka a ghara ime ka unu ma n’ọnyà.” Mgbe ahụ o nyere ndụmọdụ ahụ dị mkpa, nke bụ: “Ha ga-achụpụ unu n’ime ụlọ nzukọ: ee, oge hour na-abịa, ka ọ ga-abụabụ na onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ọ na-ejere Chineke ozi.”

Ihe àmà gosiri na ịdọ aka ná ntị nke a nyere ndị ozi ahụ nsogbu nke ukwuu. Ọ bụ ezie na Jisọs ekwuworị na mbụ na ụwa gaje ikpọ ha asi, o kwughi na a gaje igbu ha egbu. Jisọs kowara, si, “Agwaghi m unu okwu ndị a site na mbụ, n’ihi na mụ na unu nọrịị.” Ma, lee nnọọ ka o si dị mma ibu ụzọ jiri ihe ọmụma nke a kwadebe ha tupu ọ hapụ ha!

Jisọs gara n’ihu, sị, “Ma ugbu a, ana m alakwuru onye zitere m; ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime unu na-ajụ m, Olee ebe ị na-ala?” Tupu mgbe ahụ n’anyasị ahụ, ha ajụwo banyere ebe ọ na-eje, ma ugbu a, ihe o kwuru mere ka ha maa jijiji nke na ha ajụkwaghị ya ajụjụ ọzọ banyere nke a. Dị ka Jisọs kwuru: “N’ihi na m gwawo unu okwu ndị a, ihe mwute ejupụtawo obi unu.” Ọ na-ewute ndị ozi ahụ, ọ bụghị nanị n’ihi na ha anụwo na ha gaje ịta ahụhụ mkpagbu dị egwu, bụrụkwa ndị e gburu egbu, kama n’ihi na Onyenwe ha na-ahapụ ha.

Ya mere, Jisọs kọwara, sị: “Ọ bụ ihe baara unu uru ka mụ onwe m laa: n’ihi na a sị na alaghị m, [ihe enyemaka, NW] ahụ agaghị abịakwute unu; ma ọ bụrụ na alaa m, m ga-ezite ya nye unu.” Jisọs pụrụ inọ nanị n’otu ebe n’otu mgbe, ma mgbe o ruru n’eluigwe, ọ ga-enwe ike izite ihe enyemaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ Chineke, nye ndị na-eso ụzọ ya n’ebe ọ bụla ha pụrụ ịnọ n’elu ala. Ya mere, ọlịla Jisọs ga-aba uru.

Jisọs kwuru na mmụọ nsọ ahụ “ga-atukwa ụwa mmehie, na ezi omume, na ikpe, n’anya.” A ga-ekpughe mmehie nke ụwa, bụ́ ntinye ọ na-etinyeghị okwukwe n’ebe Ọkpara Chineke nọ. Tukwasị na nke ahụ, a ga-enye ihe àmà pụtara ìhè banyere ezi omume nke Jisọs site ná nlakwuru ọ ga-alakwuru Nna ahụ. Ọdịda Setan na ụwa ajọ omume ya dara n’imebi nguzosi ike Jisọs bụkwa ihe àmà doro anya na a mawo onyeisi ụwa nke a ikpe.

Jisọs gara n’ihu ikwu, sị, “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ ịgwa unu, ma unu apụghị iburu ha ugbu a.” Ya mere Jisọs kwere nkwa na mgbe ya wụpụrụ mmụọ nsọ ahụ, nke bụ ike ọrụ nke Chineke, ọ ga-eduru ha gaa n’ịghọta ihe ndị a n’uzọ kwekọrọ n’ikike ha nwere ịghọta ha nke ọma.

Ndị ozi ahụ aghọtaghị n’uzọ bụ isi na Jisọs gaje ịnwụ, mesịakwa pụtaghachi n’ihu ha mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ. Ya mere, ha jụrịtara onwe ha, sị: “Gịnị bụ okwu a nke ọ na-agwa anyị, sị, Ọ fọdụrụ nwa oge, unu adịghị ahụkwa m ọzọ; ọzọkwa, ọ fọdụrụ nwa oge, unu ga-ahụkwa m: na, N’ihi na ana m alakwuru Nna m?”

Jisọs hụtara na ha na-achọ ijụ ya ajụjụ, ya mere ọ kọwara, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, na unu onwe unu, ga-eti mkpu ákwá, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ: ọ ga-ewute unu onwe unu, ma mwute unu ga-aghọ oṅụ.” N’ehihie echi ya, mgbe e gburu Jisọs, ndị ndú okpukpe ụwa ṅụrịrị ọṅụ, ma ndị ozi ahụ nwere mwute. Otú ọ dị, mwute ha ghọrọ ọṅụ mgbe Jisọs si n’ọnwụ bilie! Ọṅu ha gakwara n’ihu mgbe o nyere ha ike na Pentikọst ịbụ ndịàmà ya site n’ịwụkwasị ha mmụọ nsọ Chineke!

N’iji ọnọdụ ndị ozi ahụ tụnyere nke nwanyị ime na-eme, Jisọs sịrị: “Nwanyị, mgbe ọ bụla ime na-eme ya, o nwere ihe mwute, n’ihi na oge hour ya abịawo.” Ma, dị nnọọ ka ọ na-adịghị echetakwa ihe mwute ya ozugbo ọ mụpụtara nwa ya, Jisọs kwuru, sị: “Ya mere unu onwe unu na-enwekwa ihe mwute ugbu a: ma m ga-ahụ unu ọzọ [mgbe m bilitere n’ọnwụ], obi unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-anara unu ọṅụ unu.”

Ruo ugbu a, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ndị ozi ahụ rịọrọ ihe ọ bụla n’aha Jisọs. Ma ọ sịrị ugbu a: “Ọ bụrụ na unu ga-arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye unu ya n’aha m. . . . N’ihi na Nna m onwe ya na-ahụ unu n’anya, n’ihi na unu onwe unu hụworo m n’anya, kwerekwa na mụ onwe m siri n’ebe Nna m nọ pụta. Esiri m ná Nna m pụta, abịawokwa m n’ụwa: ọzọ, ana m ahapụ ụwa, na-agakwurukwa Nna m.”

Okwu Jisọs bụ ihe oké agbamume nye ndị ozi ahụ. Ha sịrị, “Nke a ka anyị ji kwere na i siri n’ebe Chineke nọ pụta.”

Jisọs jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ ugbu a ka unu kwere? Lee, oge hour na-abịa, ọ bịawokwa, ka unu ga-agbasa, onye ọ bụla ọ laa na nke ya, unu ga-ahapụkwa nanị m.” Ọ bụ ezie na nke a yiri ihe na-apụghị ime eme, o mere tupu anyasị ahụ agabiga!

Jisọs mechiri okwu ya, sị, “Okwu ndị a ka m gwaworo unu, ka unu wee nwee udo n’ime m. N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.” Jisọs meriri ụwa site n’iji ikwesị ntụkwasị obi mezuo ihe bụ uche Chineke n’agbanyeghị ihe nile Setan na ụwa ya mere iji mebie nguzosi ike nke Jisọs. Jọn 16:1-33; 13:36.

▪ Okwu ịdọ aka ná ntị dị aṅaa Jisọs kwuru nyere ndị ozi ya nsogbu?

▪ N’ihi gịnị ka ndị ozị ahụ na-ejighị jụọ Jisọs ajụjụ banyere ebe ọ na-eje?

▪ Gịnị ka ndị ozi ahụ na-aghọtaghị n’ụzọ bụ isi?

▪ Olee otú Jisọs si mee ihe atụ iji gosi na ọnọdụ ndị ozi ahụ ga-agbanwe site ná mwute gaa n’ọṅụ?

▪ Gịnị ka Jisọs sịrị na ndị ozi ahụ gaje ime n’oge na-adịghị anya?

▪ Olee otú Jisọs si merie ụwa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya