Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/15 p. 27-30
  • Atọ n’Ime Otu—À Kụziri Ya n’Ime Bible?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Atọ n’Ime Otu—À Kụziri Ya n’Ime Bible?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Bible Na-ekwu
  • Echiche Doro Anya nke Akwụkwọ Nsọ
  • Mmụọ Nsọ Na-ekpughe Eziokwu Nile
  • Akụkụ 1—Jisọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ònye Bụ “Nanị Ezi Chineke Ahụ”?
    Teta!—2005
  • Ọ̀ Bụ Ozizi Bible n’Ụzọ Doro Anya?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
  • Ì Kwesịrị Ikwere Ya?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/15 p. 27-30

Atọ n’Ime Otu—À Kụziri Ya n’Ime Bible?

“Nke a bụ Okwukwe ndị Katọlik, na anyị na-efe otu Chineke dị n’Atọ n’Ime Otu nakwa Atọ n’Ime Otu nke nọ ná Njikọ. . . . Ya mere Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ ahụ bụkwa Chineke. Ma ha abụghị Chineke Atọ, kama Otu Chineke.”

N’IME okwu ndị a ka Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius kọwara ozizi bụ isi nke Krisendọm—Atọ n’Ime Otu.a Ọ bụrụ na ị bụ onye òtù chọọchị, Katọlik ma ọ bụ Protestant, a pụrụ ịgwa gị na nke a bụ ozizi kasị dịrị mkpa nke ị gaje ikwere na ya. Ma ị̀ pụrụ ịkọwa ozizi ahụ? Ụfọdụ n’ime ndị nwere ọgụgụ isi na Krisendọm ekwupụtawo na ha enweghị ike ịghọta Atọ n’Ime Otu.

Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka ha ji kwere ya? Ọ̀ bụ n’ihi na Bible na-akụzi ozizi ahụ? Bishọp ndị Anglikan ahụ nwụworo anwụ bụ́ John Robinson wepụtara azịza na-akpali iche echiche nye ajụjụ nke a n’akwụkwọ ya a kasị ree bụ́ Honest to God. O dere, sị:

“N’omume, nkwusa na ozizi a ma ama na-enye echiche dị oké elu banyere Kraịst bụ́ nke a na-apụghị ịnwapụta site n’Agba Ọhụrụ. Ọ na-asị nanị na Jisọs bụ Chineke, n’ụzọ na-emerịta ka okwu ndị ahụ bụ ‘Kraịst’ na ‘Chineke’ bụrụ ndị e ji eme ihe n’ọnọdụ ibe ha. Ma ọ dịghị ebe ọ bụla Bible ji ha eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ. Agba Ọhụrụ na-asị na Jisọs bụ Okwu nke Chineke, ọ na-asị na Chineke dị n’ime Kraịst, ọ na-asị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke; ma ọ dịghị asị na Jisọs bụ Chineke, otú ahụ ka ọ dị nnọọ.”

John Robinson bụ onye a na-eji ese okwu na Chọọchị Anglikan. Otú o sina dị, ò ziri ezi n’ikwu na “Agba Ọhụrụ” adịghị ebe ọ bụla ọ sịrị na “Jisọs bụ Chineke, otú ahụ ka ọ dị nnọọ”?

Ihe Bible Na-ekwu

Ụfọdụ pụrụ ịza ajụjụ ahụ site n’ihota amaokwu ahụ malitere Oziọma Jọn: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụkwa Chineke.” (Jọn 1:1, King James Version) Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị emegide ihe bishọp ndị Anglikan ahụ kwuru? Ọ dịghị ma ọlị. Dị ka John Robinson na-aghaghị ịmara, ụfọdụ ndị nsụgharị ọgbara ọhụrụ ekwetaghị ná nsụgharị nke King James Version nyere akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na n’okwu ahụ bụ́ “Okwu ahụ bụkwa Chineke” n’asụsụ Grik mbụ, okwu e ji mee ihe maka “Chineke” enweghị okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem, bụ́ “ahụ.” N’okwu nke bu ụzọ, “Okwu ahụ na Chineke dịkwara,” okwu e ji mee ihe maka “Chineke” na-ezo aka n’ihe kpọmkwem, ya bụ, o nwere okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem. Nke a na-eme ka e jiri n’aka na okwu abụọ ahụ apụtaghị otu ihe.

Ya mere, ụfọdụ nsụgharị na-enye nghọta nke ụdịdị ihe ná nsụgharị ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-asụgharị okwu ahụ ịbụ “Okwu ahụ dịkwa ka chi.” (An American Translation, Schonfield) Moffatt sụgharịrị ya ịbụ “Logos ahụ dịkwa ka chi.” Otú ọ dị, n’igosi na ‘ịdị ka chi’ agaghị abụ nsụgharị kasị kwesị ekwesị, John Robinson na onye Britain na-akatọ ihe odide bụ́ Sir Frederick Kenyon kọwara na ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe Jọn chọrọ ime ka ọ pụta ìhè, ọ gaara eji okwu Grik maka ‘ịdị ka chi,’ bụ́ theiʹos mee ihe. Nsụgharị New World Translation, n’ile okwu ahụ bụ́ “Chineke” anya n’ụzọ ziri ezi dị ka okwu na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem, nakwa n’inye nghọta nke ụdịdị ihe dị ka ụtọ asụsụ Grik na-egosi, ji okwu na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem na Bekee mee ihe: “Okwu ahụ bụkwa chi.”

Professor C. H. Dodd, onye nduzi nke nsụgharị New English Bible, kwuru okwu banyere nsụgharị nke a: “Nsụgharị ka mma . . . ga-abụ, ‘Okwu ahụ bụkwa chi’. Dị ka nsụgharị nkịtị ọ dịghị ntụpọ ọ bụla o nwere.” Otú ọ dị, The New English Bible asụgharịghị amaokwu ahụ otú ahụ. Kama, Jọn 1:1 ná nsụgharị ahụ na-agụ, sị: “Mgbe ihe nile malitere, Okwu ahụ adịworị. Okwu ahụ binyekwaara Chineke, ihe Chineke bụkwa, Okwu ahụ bụ ya.” N’ihi gịnị ka kọmitii nsụgharị ahụ na-ejighị họrọ nsụgharị dị mfe karị? Professor Dodd na-aza, sị: “Otu ihe mere o ji bụrụ nke a na-apụghị ịnakwere bụ na ọ na-emegide echiche Jọn nke dị ugbu a, nakwa n’ezie echiche ndị Kraịst n’ozuzu ya.”—Technical Papers for the Bible Translator, Mpịakọta nke 28, January 1977.

Echiche Doro Anya nke Akwụkwọ Nsọ

Ànyị ga-asị na echiche nke bụ na Jisọs bụkwa chi, ọ bụghịkwa otu onye ahụ dị ka Chineke Onye Okike, na-emegide echiche nke Jọn (ya bụ, nke Jọn onyeozi), tinyere echiche nke ndị Kraịst n’ozuzu ha? Ka anyị nyochaa akụkụ Bible ụfọdụ nke zoro aka n’ebe Jisọs na Chineke nọ, anyị ga-ahụkwa ihe ụfọdụ ndị na-akọwa okwu bụ́ ndị dịrị ndụ tupu e chepụta Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius chere banyere ha.

“Mụ onwe m na Nna m bụ otu.”—JỌN 10:30.

Novatian (ihe dị ka 200-258 O.A.) kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na Ọ sịrị ‘otu’ ihe,[b] ka ndị jụrụ okwukwe ghọta na Ọ sịghị ‘otu’ onye. N’ihi na otu nke e tinyere n’okwu na-egosi ihe nkịtị, na-akọwa ịdị n’otu ná mmekọrịta, ọ bụghị ịdị n’otu onwe onye. . . . Ọzọkwa, na Ọ sịrị otu, na-ezo aka ná nkwekọrịta, nakwa n’ọdịdị nke ikpe ọmụma ahụ, nakwa ná mkpakọrịta ịhụnanya ahụ n’onwe ya, ebe n’ụzọ ezi uche dị na ya, Nna ahụ na Ọkpara bụ otu ná nkwekọrịta, n’ịhụnanya, nakwa ná mmetụta ịhụnanya.”—Treatise Concerning the Trinity, isi nke 27.

“Nna m ka mụ onwe m ukwuu.”—JỌN 14:28.

Irenaeus (ihe dị ka 130-200 O.A.): “Anyị pụrụ ịmụta site n’ọnụ Ya [Kraịst] na Nna ahụ dị elu karịa ihe nile. N’ihi na ‘Nna ahụ,’ ka O kwuru, ‘ka mụ onwe m ukwuu.’ Ya mere, a kpọsawo Nna ahụ site n’ọnụ Onyenwe anyị dị ka onye kasị elu n’ihe banyere ihe ọmụma.”—Against Heresies, Akwụkwọ nke Abụọ, isi nke 28.8.

“Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—JỌN 17:3.

Clement nke Alexandria (ihe dị ka 150-215 O.A.): “Iji mara Chineke nke mgbe ebighị ebi, onye na-enye ihe na-adịru ebighị ebi, na inweta Chineke site n’ihe ọmụma na nghọta, bụ́ onye mbụ, na onye kasị elu, na otu onye, na onye ọma. . . . A na-enye onye ahụ nke ga-adị ezi ndụ iwu ibu ụzọ mara Ya ‘bụ́ onye nke onye ọ bụla na-amaghị, nanị ma Ọkpara ahụ o kpughere (Ya).’ (Mat. 11:27) Ihe ọzọ a ga-amụta bụ ịdị ukwuu nke Onye Nzọpụta ahụ ma a mụsịa banyere Ya.”—Who Is the Rich Man That Shall Be Saved? nke Asaa, nke Asatọ.

“Otu Chineke na Nna nke anyị nile dị, onye bụ isi anyị nile, onye sitekwara n’aka anyị nile na-arụ ọrụ, onye na-anọkwa n’ime anyị nile.”—NDỊ EFESỌS 4:6.

Irenaeus: “E sikwa otú a kwusaa otu Chineke bụ́ Nna, bụ́ onye kasị anyị nile, sitekwa n’anyị nile, nọrọkwa n’ime anyị nile. N’ezie Nna ahụ kasị anyị nile, Ọ bụkwa Isi nke Kraịst.”—Against Heresies, Akwụkwọ nke Ise, isi nke 18.2.

Ndị oge gboo ndị a dere akwụkwọ ghọtara n’ụzọ doro anya na amaokwu ndị a na-akọwa Nna ahụ dị ka onye kasị elu, bụrụ isi ihe nile na onye nile, gụnyere Jisọs Kraịst. Okwu ha enyeghị nkọwa ọ bụla na ha kwere n’Atọ n’Ime Otu.

Mmụọ Nsọ Na-ekpughe Eziokwu Nile

Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, a ga-enye ha mmụọ nsọ dị ka onye inyeaka. O kwere nkwa, sị: “Mgbe ọ bụla onye ahụ ga-abịa, bụ́ mmụọ nke eziokwu, ọ ga-eduba unu n’eziokwu nile: . . . ọ ga-akọkwara unu ihe nile nke na-abịa.”—Jọn 14:16, 17; 15:26; 16:13.

Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, e mezuru nkwa ahụ. Bible dekọrọ ụzọ e si kpughee ma ọ bụ mee ka ozizi ndị ọhụrụ doo anya nye ọgbakọ ndị Kraịst site n’enyemaka nke mmụọ nsọ. E deturu ozizi ọhụrụ ndị a n’akwụkwọ ndị mesịrị ghọọ akụkụ nke abụọ nke Bible, bụ́ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ.” Ná njupụta nke a nke ìhè ọhụrụ, ọ̀ dị mgbe e nwere mkpughe nke ịdị adị nke Atọ n’Ime Otu? Ee e. Mmụọ nsọ kpughere ihe dị nnọọ iche banyere Chineke na Jisọs.

Dị ka ihe atụ, na Pentikọst 33 O.A., mgbe mmụọ nsọ dakwasịchara n’isi ndị ahụ na-eso ụzọ zukọtara na Jerusalem, Pita onyeozi gbara àmà nye ìgwè mmadụ nọ n’èzí banyere Jisọs. Ò kwuru okwu banyere Atọ n’Ime Otu? Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru, ma kpebiere onwe gị: “Jisọs . . . , bụ́ nwoke nke Chineke gosiworo unu site n’ọrụ dị ike na ọrụ ebube na ihe ịrịba ama, nke Chineke mere site n’aka ya n’etiti unu.” “Jisọs nke a ka Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie, nke anyị onwe anyị nile bụ ndịàmà ya.” “Chineke mere ya ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst anyị, bụ́ Jisọs ahụ onye unu onwe unu [kpọgburu, NW].” (Ọrụ 2:22, 32, 36) N’adịghị ma ọlị ka ịkụzi ozizi Atọ n’Ime Otu, okwu ndị a nke sitere n’ọnụ Pita ahụ jupụtara ná mmụọ nsọ na-egosipụta ịnọ n’okpuru nke Jisọs n’ebe Nna ya nọ, na ọ bụ ngwá ọrụ maka imezu uche Chineke.

N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, onye Kraịst ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi kwuru okwu banyere Jisọs. A kpụtara Stifin n’ihu nnọkọ Sanhedrin ịzara ọnụ ya n’ebubo. Kama nke ahụ, Stifin chigharịrị ọnọdụ ahụ ihu, na-ebo ndị gbara ya akwụkwọ ebubo na ha dị ka ndị nna ha ochie na-enupụ isi. N’ikpeazụ, ihe ndekọ na-asị: “Ebe o jupụtara ná mmụọ nsọ, o legide anya n’eluigwe, wee hụ ebube Chineke, na Jisọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke, o wee sị, Lee, ana m ahụ eluigwe ka e megheworo ha, na Nwa nke mmadụ ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.” (Ọrụ 7:55, 56) N’ihi gịnị ka mmụọ nsọ ji kpughee Jisọs dị ka nanị “Nwa nke mmadụ” nke na-eguzo n’aka nri Chineke, ọ bụghịkwa dị ka akụkụ nke chiatọ nke ya na Nna ya hà nhata? N’ụzọ doro anya, Stifin amaghị ozizi ọ bụla banyere Atọ n’Ime Otu.

Mgbe Pita ji ozi ọma banyere Jisọs gaa na nke Kọniliọs, e nwekwara ohere nke ikpughe ozizi Atọ n’Ime Otu. Gịnị mere? Pita kọwara na Jisọs bụ “Onyenwe mmadụ nile.” Ma ọ gara n’ihu ịkọwa na ịbụ onyenwe mmadụ nke a sitere n’ebe ka ya elu. Jisọs bụ “Onye Chineke kaworo ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” Mgbe mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, Nna ya “werekwa ya nye [nyere ya ikike] ka e gosi ya n’ìhè” nye ndị na-eso ụzọ ya. Oleekwa banyere mmụọ nsọ? Ọ pụtara ná nkwurịta okwu a ma ọ bụghị dị ka onye nke atọ nke Atọ n’Ime Otu. Kama, “Chineke weere mmụọ nsọ na ike tee [Jisọs] dị ka mmanụ otite.” Otú a, mmụọ nsọ, n’abụghị onye ma ọlị, bụ nke e gosiri ịbụ ihe na-abụghị onye, dịkwa ka “ike” ahụ e hotara n’amaokwu ahụ. (Ọrụ 10:36, 38, 40, 42) Nyochaa Bible nke ọma, ị ga-ahụkwa ihe àmà ndị ọzọ na-egosi na mmụọ nsọ abụghị ọdịdị onye kama ike ọrụ nke pụrụ ijupụta n’ime ụmụ mmadụ, kpalie ha, mee ka ha na-anụ ọkụ n’obi, bụrụkwa nke a wụsara n’isi ha.

N’ikpeazụ, Pọl onyeozi nwere ohere dị mma ịkọwa Atọ n’Ime Otu—ma à sị na ọ bụrịị ezi ozizi—mgbe ọ na-ekwusara ndị Atens ozi ọma. N’okwu ya, o zoro aka n’ebe ịchụàjà ha “E Nyere Chi nke A Na-amaghị Ama” wee sị: “Ihe unu na-asọpụrụ n’amaghị ama, nke a ka mụ onwe m na-ekwusara unu.” Ò kwusara Atọ n’Ime Otu? Ee e. Ọ kọwara “Chineke onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya, ebe ọ bụ Onyenwe eluigwe na ala.” Ma gịnị banyere Jisọs? “[Chineke edebewo] otu ụbọchị, nke ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu nwoke ọ kara aka.” (Ọrụ 17:23, 24, 31) Ọ dịghị nkọwa ọ bụla banyere Atọ n’Ime Otu dị n’ebe ahụ!

N’ezie, Pọl kọwara otu ihe banyere nzube Chineke ndị na-eme ka ọ ghara ikwe omume na Jisọs na Nna ya bụ akụkụ hà nhata nke Atọ n’Ime Otu. O dere, sị: “Ihe nile ka [Chineke] doro n’okpuru ụkwụ [Jisọs] abụọ. Ma mgbe ọ bụla ọ ga-ekwuworị, sị, E dowo ihe nile n’okpuru ya, ọ pụtara ìhè na ọ nọghị ya, bụ́ onye doro ihe nile n’okpuru ya. Ma mgbe ọ bụla a ga-edoworị ihe nile n’okpuru ya, mgbe ahụ ka a ga-edo Ọkpara ahụ onwe ya n’okpuru onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ime ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 15:27, 28) Otú a, Chineke ga-abụkwa isi nke ihe nile, gụnyere Jisọs.

Mgbe ahụ, à kụziri Atọ n’Ime Otu n’ime Bible? Ee e. John Robinson kwuru ihe ziri ezi. Ọ dịghị n’ime Bible, ọ bụghịkwa akụkụ nke “echiche ndị Kraịst.” Ị̀ na-ele nke a anya dị ka ihe dị mkpa n’ofufe gị? I kwesịrị. Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na anyị ejiri ofufe anyị na-efe Chineke kpọrọ ihe, ọ dị oké mkpa ka anyị mara ya dị ka onye ọ bụ n’ezie, dị ka o kpugheworo onwe ya nye anyị. Nanị mgbe ahụ ka anyị pụrụ n’ezie ikwu na anyị so ná “ndị na-akpọ isiala n’ezie” bụ́ ndị “ga-akpọ isiala nye Nna [ahụ] n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka The Catholic Encyclopedia si kwuo, mbipụta 1907, mpịakọta nke 2, peji nke 33.

b Novatian na-ezo aka n’eziokwu ahụ bụ na okwu e ji eme ihe maka “otu” nke dị n’amaokwu nke a bụ nke na-egosi ihe nkịtị. Ya mere, ihe ọ na-apụtakarị bụ “otu ihe.” Tụlee Jọn 17:21, ebe e ji okwu Grik maka “otu” mee ihe kpọmkwem n’otu ụzọ ahụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, akwụkwọ New Catholic Encyclopedia (mbipụta 1967) n’ozuzu ya na-akwado De Trinitate nke Novatian, ọ bụ ezie na ọ rịbara ama na n’ime ya “e leghị Mmụọ Nsọ anya dị ka Onye bụ chi.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

Echiche doro anya nke Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè na Jisọs na Nna ya abụghị otu Chineke

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

N’ihi gịnị ka mmụọ nsọ ji ghara ikpughe na Jisọs bụ Chineke mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya