-
Olee Otú Ịmụ Mmadụ Ọzọ Dịruru ná Mkpa?Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
-
-
N’ụka ahụ Jizọs na Nikọdimọs kparịtara, lee ihe Jizọs kwuru bụ́ nke gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ dị mkpa. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Okwu bụ́ “ọ bụrụ na” na “ọ pụghị” gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na mmadụ asị, “Ọ bụrụ na anwụ achaghị, a pụghị inwe ìhè,” ihe ọ na-ekwu bụ na anwụ bụ ihe dị oké mkpa na-eme ka e nwee ìhè. N’otu aka ahụ, Jizọs kwuru na ịmụ mmadụ ọzọ bụ ihe dị oké mkpa ga-eme ka mmadụ hụ Alaeze Chineke.
-
-
Ọ̀ Bụ Mmadụ Ga-ekpebi Ma À Ga-amụ Ya Ọzọ?Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
-
-
Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe ahụ Jizọs kwuru nke ọma, anyị ga-aghọta na Jizọs akụzighị na ọ bụ mmadụ ga-ahọrọ ma à ga-amụ ya ọzọ ma ọ bụ na a gaghị amụ ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Okwu Grik a sụgharịrị ‘ịmụ ọzọ’ nwekwara ike ịbụ “isi n’elu mụọ mmadụ.”a Ya mere, ụzọ nke abụọ a e nwere ike isi sụgharịa ya gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ ‘na-esi n’elu,’ ya bụ, ọ ‘na-esi n’eluigwe,’ ma ọ bụ “n’aka Nna” anyị. (Jọn 19:11; Jems 1:17) N’eziokwu, ọ bụ Chineke na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ.—1 Jọn 3:9.
-