Ị̀ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi n’Ihe Nile?
“Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’oké ihe.”—LUK 16:10.
1. Olee otu n’ime ụzọ ndị Jehova si ekwesị ntụkwasị obi?
Ị̀ HỤTỤLA ihe na-eme onyinyo nke osisi ka anwụ na-achapụta? Onyinyo ahụ na-anọgide nnọọ na-agbanwe ma n’ibu ma n’ebe o chere ihu! Mgbalị ndị ụmụ mmadụ na-eme na nkwa ha na-abụkarị ihe a na-ejighị n’aka dị ka onyinyo. N’aka nke ọzọ, Jehova Chineke adịghị agbanwe ka oge na-aga. N’izo aka n’ebe ọ nọ dị ka “Nna nke ìhè eluigwe,” Jems onye na-eso ụzọ na-ekwu, sị: “E nweghịkwa mgbanwe nke ntụgharị nke onyinyo n’ebe ọ nọ.” (Jems 1:17) Jehova adịghị agbanwe agbanwe, a pụkwara ịtụkwasị ya obi, ọbụna n’ihe ndị kasị nta. Ọ bụ “Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi.”—Deuterọnọmi 32:4.
2. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị inyocha onwe anyị iji mara ma ànyị na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Olee ajụjụ ndị metụtara ikwesị ntụkwasị obi ndị anyị ga-atụle?
2 Olee otú Chineke si ele ọbụbụ ndị na-efe ya ofufe bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi anya? Ọ na-ele ha anya otú ahụ Devid si lee ha anya, bụ́ onye kwuru banyere ha, sị: “Anya m abụọ dị n’ahụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ala, ka mụ na ha wee biri: onye na-eje ije n’ụzọ zuru okè, onye ahụ ga-ejere m ozi.” (Abụ Ọma 101:6) Ee, Jehova na-enwe obi ụtọ n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ohu ya. Pọl onyeozi nwere ezigbo ihe mere o ji dee, sị: “Ihe a na-achọ n’aka ndị nlekọta ụlọ bụ ka a hụ mmadụ dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi.” (1 Ndị Kọrint 4:2) Gịnị ka ikwesị ntụkwasị obi na-agụnye? N’akụkụ ndị dị aṅaa nke ndụ ka anyị kwesịrị ime ihe n’ikwesị ntụkwasị obi? Olee ngọzi ndị a na-enweta ‘n’ije ije n’ụzọ zuru okè’?
Ihe Ikwesị Ntụkwasị Obi Pụtara
3. Gịnị ka e ji amata ma ànyị na-ekwesị ntụkwasị obi?
3 Ndị Hibru 3:5 na-ekwu, sị: “Mozis, dịkwa ka onye na-eje ozi, kwesịrị ntụkwasị obi.” Gịnị mere Mozis onye amụma ji bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi? N’ihe banyere iwu na iguzobe ụlọikwuu ahụ, ‘Mozis mere ya: dị ka ihe nile si dị nke Jehova nyere ya n’iwu, otú a ka o mere.’ (Ọpụpụ 40:16) Dị ka ndị na-efe Jehova, anyị na-egosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi site n’iji nrubeisi na-ejere ya ozi. N’ezie, nke a na-agụnye anyị ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova ka anyị na-eche ule ndị siri ike ma ọ bụ ọnwụnwa ndị tara akpụ ihu. Otú ọ dị, inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ule ndị siri ike abụghị ihe e ji amata ma ànyị kwesịrị ntụkwasị obi. Jizọs kwuru, sị: “Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’oké ihe, onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe kasị nta na-abụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) Anyị aghaghị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna n’ihe ndị yiri ka ha dị obere.
4, 5. Gịnị ka anyị ikwesị ntụkwasị obi “n’ihe kasị nta” na-egosi?
4 Ịdị na-erube isi kwa ụbọchị “n’ihe kasị nta” dị mkpa n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, ọ na-egosi otú anyị si ele ọbụbụeze Jehova anya. Chee banyere ule metụtara iguzosi ike n’ihe nke bịaara nwoke na nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv. Ihe a chọrọ ha n’aka esighị ike ma ọlị. Ọ bụ ezie na ha nwere ụdị nri dịgasị iche n’ogige Iden, nanị ihe a gwara ha bụ ịghara iri mkpụrụ nke nanị otu osisi—“osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:16, 17) Ha ikwesị ntụkwasị obi site n’irube isi n’iwu ahụ dị mfe gaara egosi na di na nwunye mbụ ahụ kwadoro ịchịisi Jehova. Ịgbaso ntụziaka Jehova ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị na-egosi na anyị na-akwado ọbụbụeze Jehova.
5 Nke abụọ, omume anyị “n’ihe kasị nta” na-emetụtakwa ihe anyị ga-eme “n’oké ihe,” ya bụ, mgbe anyị chere okwu ndị ka sie ike ihu. N’akụkụ a, tụlee ihe mere Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru kwesịrị ntụkwasị obi—Hananaịa, Mishael, na Azaraịa. E mere ka ha jee biri na Babilọn na 617 T.O.A. Mgbe ha ka na-eto eto, ikekwe mgbe ha dị afọ iri na ụma, ụmụ okorobịa anọ a hụrụ onwe ha n’obí Eze Nebukadneza. N’ebe ahụ, e ‘kepụtaara ha òkè nke ọ bụla n’ụbọchị ya site n’ihe oriri ọma nke eze, na site ná mmanya vaịn nke ọ na-aṅụ, ka e mee ka ha topụta afọ atọ, ka ha wee guzo n’ihu eze n’ọgwụgwụ afọ atọ ahụ.’—Daniel 1:3-5.
6. Ule dị aṅaa ka Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru chere ihu n’obí eze Babilọn?
6 Otú ọ dị, ihe eze Babilọn kwuru ka a na-enye ụmụ okorobịa Hibru anọ a wetaara ha ihe ịma aka. O yiri ka ihe oriri ndị Iwu Mozis machibidoro hà so n’ihe ndị dị n’ihe oriri ọma nke eze. (Deuterọnọmi 14:3-20) Ọ pụrụ ịbụ na a dịghị egbupụ anụ ha ọbara nke ọma, irikwa anụ dị otú ahụ gaara abụ imebi Iwu Chineke. (Deuterọnọmi 12:23-25) Ọ pụkwara ịbụ na a na-ebu ụzọ eche ihe oriri ahụ n’ihu arụsị, dị ka ndị Babilọn na-ekpere arụsị na-eme tupu ha erikọọ nri ọnụ.
7. Gịnị ka nrubeisi Daniel na ndị enyi ya atọ gosiri?
7 O doro anya na mmachibido iwu ndị metụtara nri adịghị ihe ọ bụụrụ ndị ezinụlọ eze Babilọn. Otú ọ dị, Daniel na ndị enyi ya atọ kpebiri n’obi ha na ha agaghị eji iri nri a machibidoro n’Iwu Chineke nyere Izrel merụọ onwe ha. Nke a bụ okwu metụtara iguzosi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi ha nye Chineke. N’ihi ya, ha rịọrọ ka e nye ha akwụkwọ nri na mmiri, e mekwaara ha otú ahụ. (Daniel 1:9-14) Nye ụfọdụ ndị taa, ihe ahụ ụmụ okorobịa anọ ahụ mere pụrụ iyi ihe na-enweghị ihe ọ bụ. Otú ọ dị, nrubeisi ha nye Chineke gosiri ebe ha kwụ n’ihe iseokwu ahụ metụtara ọbụbụeze Jehova.
8. (a) Ule dị aṅaa tara akpụ nke metụtara iguzosi ike n’ihe ka ndị Hibru atọ ahụ chere ihu? (b) Gịnị si n’ule ahụ pụta, gịnịkwa ka nke a na-egosi?
8 Ikwesị ntụkwasị obi n’ihe pụrụ iyi ka o nweghị ihe ọ bụ kwadebere ndị enyi atọ Daniel ịnagide ule siri ike karị. Sapeta isi nke 3 nke akwụkwọ Bible bụ́ Daniel ma gụọ n’onwe gị otú ndị Hibru atọ ahụ si chee ọnwụ ihu n’ihi ịjụ ịkpọ isiala nye onyinyo ọlaedo nke Eze Nebukadneza guzobere. Mgbe a kpọtara ha n’ihu eze, ha ji obi ike kwupụta mkpebi ha, sị: “A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ Onye anyị onwe anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị, ọ bụ n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu na n’aka gị, eze, ka Ọ ga-anapụta anyị. Ma a sị na Ọ pụghị ịnapụta anyị, ka ị mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.” (Daniel 3:17, 18) Jehova ọ̀ napụtara ha? Ndị nche tụbara ụmụ okorobịa ahụ n’ime oké ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu nwụrụ, ma ndị Hibru atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi pụtara ná ndụ—ire ọkụ emetụdịghị ha! Aha ha meerela onwe ha dị ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nyere aka kwadebe ha ikwesị ntụkwasị obi n’ule ahụ tara akpụ. Nke a ọ̀ dịghị egosi ịdị mkpa nke ịbụ onye na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe ndị dị nta?
Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Ihe Banyere “Akụ̀ Ajọ Omume”
9. Gịnị ka ihe gbara okwu Jizọs e dekọrọ na Luk 16:10 gburugburu na-ekwu?
9 Tupu Jizọs ekwupụta ụkpụrụ ahụ bụ́ na onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe ndị yiri ka hà dị nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’ihe ndị dị mkpa, ọ dụrụ ndị na-ege ya ntị ọdụ, sị: “Jirinụ akụ̀ ajọ omume meere onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị, ha ewee nabata unu n’ebe obibi ebighị ebi.” O kwuziri banyere ikwesị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta. Mgbe Jizọs kwusịrị nke ahụ, ya asị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu egosipụtabeghị na unu na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe metụtara akụ̀ ajọ omume, ònye ga-enyefe ihe bụ ezie n’aka unu? . . . Ọ dịghị odibo nke pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara otu n’ahụ́ ma leda nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke bụrụkwa nke Akụ̀.”—Luk 16:9-13.
10. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị kwesịrị ntụkwasị obi site n’otú anyị si eji “akụ̀ ajọ omume” eme ihe?
10 Dị ka ihe gbara okwu ahụ gburugburu si kwuo, mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ e dere na Luk 16:10, ọ na-ekwu banyere iji “akụ̀ ajọ omume,” ihe onwunwe anyị, eme ihe. A kpọrọ ya nke ajọ omume n’ihi na ọ bụ ụmụ mmadụ na-eme mmehie na-achịkwa akụ̀—karịsịa ego. Ọzọkwa, ọchịchọ nke inweta akụ̀ pụrụ iduga n’ajọ omume. Anyị na-egosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi site n’iji ihe onwunwe anyị eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Kama iji ya na-emere nanị onwe anyị ihe, anyị kwesịrị iji ya akwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ, jirikwa ya na-enyere ndị nọ ná mkpa aka. Site n’ikwesị ntụkwasị obi n’ụzọ dị otú a, anyị na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, bụ́ ndị nwe ‘ebe obibi ebighị ebi,’ na-aghọ enyi. Ha ga-anabata anyị n’ebe a, na-enye anyị ndụ agwụghị agwụ n’eluigwe ma ọ bụ na Paradaịs elu ala.
11. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịla azụ ịkọwara ndị nwe ụlọ na anyị na-anabata onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-arụ?
11 Tụleekwa ohere anyị na-enye ndị anyị nyefere Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible ka anyị na-akpọsa ozi Alaeze ahụ ma na-akọwara ha na anyị na-anabata onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ndị Jehova na-arụ. Ọ̀ bụ na anyị adịghị enye ha ohere iji ihe onwunwe ha mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya? Ọ bụ ezie na e ji ihe ahụ dị na Luk 16:10 mee ihe nke mbụ ya n’ihe metụtara ihe onwunwe, ụkpụrụ dị na ya metụtakwara akụkụ ndị ọzọ nke ndụ.
Ime Ihe n’Eziokwu Dị Ezigbo Mkpa
12, 13. N’ihe ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ igosi na anyị bụ ndị na-eme ihe n’eziokwu?
12 Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị tụkwasịrị obi na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) N’ezie ‘ihe nile’ na-agụnye ihe nile metụtara ego. Anyị na-akwụ ụgwọ ndị anyị ji n’oge ma na-atụzu ụtụ isi anyị. N’ihi gịnị? Anyị na-eme nke ahụ n’ihi akọ na uche anyị nakwa n’ụzọ bụ́ isi n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma na-erube isi ná ntụziaka ya. (Ndị Rom 13:5, 6) Olee ihe anyị na-eme mgbe anyị hụrụ ihe na-abụghị nke anyị? Anyị na-agbalị inyeghachi ya onye nwe ya. Lee ezigbo àmà nke a na-abụ mgbe anyị kọwara ihe kpaliri anyị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ihe ya!
13 Ịbụ onye na-ekwesị ntụkwasị obi na onye na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ebe ọrụ. Ime ihe n’eziokwu n’otú anyị si arụ ọrụ na-eme ka ndị mmadụ mata ụdị Chineke anyị na-anọchite anya ya. Anyị adịghị “ezu” oge n’ohi site n’ịdị umengwụ. Kama nke ahụ, anyị na-arụsi ọrụ ike, dị ka ànyị na-arụrụ ya Jehova. (Ndị Efesọs 4:28; Ndị Kọlọsi 3:23) E mere atụmatụ na n’otu mba dị na Europe, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị e were n’ọrụ na-eji aghụghọ agwa dọkịta ka o nye ha akwụkwọ ozi na-ekwu na ha agaghị agali ọrụ. Ezi ndị ohu Chineke adịghị echepụta ihe ndị ha ga-akụnye aka ghara ịga ọrụ. Mgbe ụfọdụ, a na-ebuli Ndịàmà Jehova n’ọkwá n’ihi na ndị were ha n’ọrụ na-ahụ na ha bụ ndị na-eme ihe n’eziokwu na ndị na-arụsi ọrụ ike.—Ilu 10:4.
Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Ozi Ndị Kraịst Anyị
14, 15. Olee ụzọ ụfọdụ ndị anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ozi Ndị Kraịst?
14 Olee otú anyị si egosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi n’ozi e nyefere anyị n’aka? Bible na-ekwu, sị: “Ka anyị . . . chụọrọ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.” (Ndị Hibru 13:15) Ụzọ kasị mma isi egosipụta na anyị kwesịrị ntụkwasị obi n’ozi ubi bụ ikerechi òkè anya na ya. Gịnị mere anyị ga-eji nọọ otu ọnwa n’agbaghị àmà banyere Jehova na nzube ya? Ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa na-enyekwara anyị aka inwekwu nkà na ịdịkwu irè.
15 Ụzọ ọzọ dị mma isi gosi ikwesị ntụkwasị obi n’ozi ubi bụ itinye aro ndị dị n’Ụlọ Nche na Ozi Alaeze Anyị n’ọrụ. Mgbe anyị kwadebere ma jiri ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha ma ọ bụ ndị ọzọ dị irè mee ihe, ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ na ozi anyị na-arụpụtakwu ihe? Mgbe anyị zutere onye gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ, ànyị na-esochi mmasị ahụ n’egbughị oge? Gịnịkwanụ banyere ọmụmụ Bible ebe obibi anyị maliteere ndị nwere mmasị? Ànyị na-eji ikwesị ntụkwasị obi eduzi ha? Anyị ikwesị ntụkwasị obi n’ozi pụrụ iduga anyị na ndị na-ege anyị ntị ná ndụ.—1 Timoti 4:15, 16.
Ịnọpụ Iche n’Ụwa
16, 17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ igosi na anyị nọpụrụ iche n’ụwa?
16 N’ekpere o kpegaara Chineke, Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyewo m ha okwu gị, ma ụwa akpọwo ha asị, n’ihi na ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa. M na-arịọ gị arịrịọ, ọ bụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:14-16) Anyị pụrụ ikpebisi ike ịghara ịbụ akụkụ nke ụwa n’okwu ndị siri ike, dị ka nnọpụiche, ezumike na omenala okpukpe, nakwa omume rụrụ arụ. Otú ọ dị, gịnị banyere ihe ndị ka nta? Omume ụwa ọ̀ pụrụ ịdị na-emetụta anyị mgbe anyị na-amaghị? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ejiji anyị nwere nnọọ ike gharazie ịdị ùgwù na ikwesị ekwesị. Ikwesị ntụkwasị obi na-achọ mmadụ ‘imeru ihe n’ókè na inwe uche zuru okè’ n’ihe metụtara uwe na ejiji. (1 Timoti 2:9, 10) Ee, “ọ dịghị ụzọ ọ bụla anyị si na-eweta ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị; kama n’ụzọ ọ bụla anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.”—2 Ndị Kọrint 6:3, 4.
17 N’ihi ọchịchọ anyị nwere ịsọpụrụ Jehova, anyị na-eji ejiji kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-aga nzukọ ọgbakọ. Otú ahụkwa ka anyị na-eme mgbe anyị na-aga mgbakọ ukwu na ndị nke nta. Uwe anyị kwesịrị ikwekọ n’ebe anyị nọ ma dị mma n’anya. Nke a na-agbara ndị ọzọ na-ekiri anyị àmà. Ọbụna ndị mmụọ ozi na-ahụ ihe anyị na-eme, dị ka ha hụrụ ihe Pọl na Ndị Kraịst ibe ya mere. (1 Ndị Kọrint 4:9) N’ezie, anyị kwesịrị iyi uwe kwesịrị ekwesị mgbe nile. Nye ụfọdụ, ikwesị ntụkwasị obi n’ihe banyere ịhọrọ uwe ha ga-eyi pụrụ iyi ihe dị nta, ma n’anya Chineke ọ bụ oké ihe.
Ngọzi Ndị Na-esite n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
18, 19. Olee ngọzi ndị na-abịa site n’ikwesị ntụkwasị obi?
18 E kwuru na ezi Ndị Kraịst bụ “ezi ndị nlekọta ụlọ nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke bụ́ nke a na-egosipụta n’ụzọ dị iche iche.” N’ihi ya, ha “na-adabere n’ike nke Chineke na-enye.” (1 Pita 4:10, 11) Ọzọkwa, dị ka ndị na-elekọta ụlọ, e nyefere anyị ihe na-abụghị nke anyị—ngosipụta nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke, nke gụnyere ozi ahụ. Iji gosipụta na anyị bụ ezi ndị nlekọta ụlọ, anyị na-adabere n’ike nke Chineke na-enye, “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Lee ka nke ahụ si enye anyị ezigbo ọzụzụ iji nyere anyị aka iche ule ọ bụla ga-abịa n’ọdịnihu ihu!
19 Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Hụnụ Jehova n’anya, ndị ebere Ya nile: ọ bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ka Jehova na-echezi.” (Abụ Ọma 31:23) Ka anyị kpebisie ike igosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi, na-enwe obi ike na Jehova bụ “Onye Nzọpụta nke ụdị mmadụ nile, karịsịa nke ndị na-ekwesị ntụkwasị obi.”—1 Timoti 4:10.
Ị̀ Na-echeta?
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ‘ịdị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta’?
• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi
n’ihe banyere ime ihe n’eziokwu?
n’ozi?
n’ịnọpụ iche site n’ụwa?
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Ikwesị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta, ikwesịkwa ntụkwasị obi n’oké ihe
[Foto dị na peeji nke 29]
“Na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile”
[Foto dị na peeji nke 29]
Ụzọ dị mma isi gosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi bụ ịkwadebe nke ọma maka ozi ubi
[Foto dị na peeji nke 30]
Na-emeru ihe n’ókè n’uwe na n’ejiji