Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 25 p. 196-202
  • “Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Eguzo M n’Ihu Oche Ikpe” (Ọrụ 25:1-12)
  • “Ọ Bụ Ihe Jizọs Gwara M . . . Ka M Mere” (Ọrụ 25:13–26:23)
  • “Ị Ga-eme Ka M Ghọọ Onye Kraịst” (Ọrụ 26:24-32)
  • Pọl Ejiri Obi Ike Gbaa Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Ana M Arịọ Ka Siza Kpegharịa Ikpe M!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 25 p. 196-202

ISI NKE 25

“Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”

Pọl gosiri na ọ bụ onye e ji ama atụ n’ịgbachitere ozi ọma

O Si n’Ọrụ Ndịozi 25:1–26:32

1, 2. (a) Olee otú ihe si dịrị Pọl? (b) Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ gbasara mkpebi Pọl mere ka Siza kpee ikpe ya?

NDỊ agha ka na-eche Pọl nche na Sizaria. Afọ abụọ gara aga, ndị Juu gbalịrị ugboro atọ, ma ọ dịkarịa ala, ka ha gbuo ya n’ime ụbọchị ole na ole ọ lọtara Judia. (Ọrụ 21:27-36; 23:10, 12-15, 27) Ruokwa ugbu a, ndị iro ya enwebeghị ike igbu ya, ma ike agwụbeghị ha. Mgbe Pọl matara na e nwere ike inyefe ya n’aka ha, ọ gwara onye Rom bụ́ Gọvanọ Festọs, sị: “Achọrọ m ka Siza kpee ikpe a.”​—Ọrụ 25:11.

2 Jehova ọ̀ kwadoro mkpebi a Pọl mere ka eze ukwu Rom kpee ikpe ya? Azịza ajụjụ a dị anyị mkpa ebe ọ bụ na anyị na-agba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke n’oge ikpeazụ a. Ọ dị mma ka anyị mata ma ànyị kwesịrị ime ka Pọl “n’ịgbachitere ozi ọma nakwa n’ịgbalị iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.”​—Fil. 1:7.

“Eguzo M n’Ihu Oche Ikpe” (Ọrụ 25:1-12)

3, 4. (a) Gịnị mere ndị Juu ji rịọ ka a kpọta Pọl Jeruselem, oleekwa otú e si zọọ ya ndụ? (b) Olee otú Jehova si enyere ndị na-efe ya n’oge a aka otú o nyeere Pọl?

3 Ụbọchị atọ Festọs, onye Rom bụ́ gọvanọ ọhụrụ Judia, malitechara ịchị, ọ gara Jeruselem.a Ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị Juu nọ ebe ahụ kọọrọ ya na Pọl mere ihe jọgburu onwe ya. Ha ma na ndị Rom chọrọ ka gọvanọ ọhụrụ a mee ka ha na ndị Rom na ndị Juu niile dịrị n’udo. N’ihi ya, ha rịọrọ Festọs ka o meere ha otu ihe, ya bụ, ka ọ kpọta Pọl na Jeruselem nọrọ ebe ahụ kpee ya ikpe. Ma, ha bu ihe ọjọọ n’obi rịọ arịrịọ a. Ndị iro ahụ bu n’obi igbu Pọl n’ụzọ ma o si Sizaria gawa Jeruselem. Festọs jụrụ ime ihe ha rịọrọ ya. Ọ sịrị: “Ka ndị isi unu soro m gaa ma kwuo ihe o mere, ma ọ bụrụ n’eziokwu na o mere ihe na-adịghị mma.” (Ọrụ 25:5) Ihe a bụ otú e si zọọ Pọl ndụ ọzọ.

4 N’oge niile ahụ a na-ekpe Pọl onyeozi ikpe, Jehova si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gbaa ya ume. Ọ̀ kwa i chetara na Jizọs gwara ya n’ọhụụ, sị: “Obi sie gị ike”? (Ọrụ 23:11) Taa, a na-enyekwa ndị na-efe Chineke nsogbu ma na-eyi ha egwu. Jehova anaghị echebe anyị ka nsogbu ọ bụla ghara ịbịara anyị, ma ọ na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji die nsogbu. Obi siri anyị ike na Chineke anyị hụrụ anyị n’anya ga na-enye anyị “ike karịrị ike mmadụ.”​—2 Kọr. 4:7.

5. Olee otú Festọs si kpee Pọl ikpe?

5 Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, Festọs ‘nọdụrụ ala n’oche ikpe’ na Sizaria.b Pọl na ndị na-ebo ya ebubo guzo n’ihu ya. Mgbe ha bochara Pọl ebubo na-enweghị isi na ọdụ, o kwuru, sị: “Emebighị m Iwu ndị Juu. Emerụghị m ụlọ nsọ, emehieghịkwa m Siza.” Aka onyeozi a dị ọcha, e kwesịkwara ịhapụ ya. Olee ihe Festọs ga-eme? Ebe Festọs chọrọ ịzụrụ ụtọ ndị Juu, ọ jụrụ Pọl, sị: “Ị̀ chọrọ ịga Jeruselem ka a nọrọ ebe ahụ kpee gị ikpe n’ihu m?” (Ọrụ 25:6-9) Ihe a o kwuru adịtụdịghị mma. Ọ bụrụ na a kpọga Pọl Jeruselem ka e kpee ya ikpe, ọ bụ ndị ahụ na-ebo ya ebubo ga-ekpe ya ikpe, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ. Ihe ka Festọs mkpa bụ ịchọwa ime ihe ndị mmadụ chọrọ kama ikpe ikpe ziri ezi. Pọntiọs Paịlet, bụ́ gọvanọ bú ya ụzọ, mere ụdị ihe a mgbe ọ na-ekpe Jizọs ikpe. (Jọn 19:12-16) Ndị ọkàikpe e nwere n’oge a nwekwara ike ikpe ikpe na-ezighị ezi iji zụrụ ụtọ ndị mmadụ. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya ma ụlọikpe kpee ndị na-efe Chineke ikpe na-ezighị ezi.

6, 7. Gịnị mere Pọl ji sị na ya chọrọ ka Siza kpee ikpe ya, oleekwa ihe o ji ya kụziere ezigbo Ndị Kraịst n’oge a?

6 Ọchịchọ Festọs chọrọ ime ihe dị ndị Juu mma gaara akpatara Pọl ọnwụ. Ọ bụ ya mere Pọl ji jiri ikike o nwere dị ka nwa amaala Rom zọrọ isi ya. Ọ sịrị Festọs: “Eguzo m n’ihu oche ikpe Siza. Ọ bụkwa ebe e kwesịrị ikpe m ikpe. O dokwara gị anya na o nweghị ihe ọjọọ m mere ndị Juu. . . . Achọrọ m ka Siza kpee ikpe a.” Mmadụ kwuo ka Siza kpee ikpe ya, ọ bụ Siza ga-ekperịrị ya. Festọs mere ka o doo anya mgbe ọ sịrị: “Ebe ị sị na ị chọrọ ka Siza kpee ikpe a, ọ bụ Siza ga-ekpe ya.” (Ọrụ 25:10-12) Pọl si n’ihe a o mere, ya bụ, ikwu ka Siza kpee ikpe ya, na-akụziri ezigbo Ndị Kraịst taa ihe ha kwesịrị ime. Ọ bụrụ na ndị na-emegide anyị akpawa nkata ‘ka ha jiri iwu kpatara anyị nsogbu,’ anyị na-eji ihe e kwuru n’iwu obodo agbachitere ozi ọma.c​—Ọma 94:20.

7 Ọ bụ otú a ka Pọl si nweta ohere ịzara ọnụ ya na Rom mgbe ọ nọrọla n’ụlọ mkpọrọ ihe karịrị afọ abụọ n’agbanyeghị na aka ya dị ọcha. Ma tupu ya agawa Rom, e nwere onye ọchịchị ọzọ chọrọ ịhụ ya.

Ebe ndị nọ n’ụloikpe na-egosi otú obi dị ha mgbe e kpebiri ikpe. Obi adịchaghị otu nwanna na ọkàiwu ya nakwa ọtụtụ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nọ n’ụlọikpe ahụ mma. Ma, obi na-atọ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ụtọ, ha na-ekelekwa ndị ọkàiwu ha maka mbọ ha gbara ka e kpelaara ha ikpe.

Ọ bụrụ na e kpee anyị ikpe mkpegbu, anyị na-etinye akwụkwọ ka e kpegharịa ya

“Ọ Bụ Ihe Jizọs Gwara M . . . Ka M Mere” (Ọrụ 25:13–26:23)

8, 9. Gịnị mere Eze Agrịpa ji gaa Sizaria?

8 Ụbọchị ole na ole Pọl nọchara n’ihu Festọs kwuo na ya chọrọ ka Siza kpee ikpe ya, Eze Agrịpa na Benis nwanne ya nwaanyị “bịara” “ka ha kelee” gọvanọ ọhụrụ ha.d N’oge ndị Rom na-achị ụwa, ọ na-abụ e nwee gọvanọ ọhụrụ, ndị ọchịchị nọ n’okpuru ya na-agakarị ekele ya. O doro anya na ihe mere Agrịpa ji gaa ikele Festọs mgbe e mere ya gọvanọ bụ ka ya na ya dịrị ná mma ebe ọ ga-abara ya uru n’ọdịnihu.​—Ọrụ 25:13.

IWEPỤ OKWU N’ỤLỌIKPE N’OGE ANYỊ A N’IHI EZIGBO OFUFE

Ndịàmà Jehova ewepụla okwu ha n’ụlọikpe n’oge ụfọdụ ka ha nwee ike ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Lee ihe atụ abụọ ndị a.

Na Mach 28, 1938, Ụlọikpe Kacha Elu n’Amerịka kagburu ikpe ụlọikpe dị na Jọjịa kpere ma kwuo na Ndịàmà Jehova e jidere maka na ha na-ekesa akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’obodo Grifin adaghị iwu. Ihe a bụ nke mbụ n’ime ọtụtụ ugboro Ndịàmà Jehova wepụrụ okwu n’ụlọikpe a kacha elu ka ha nwee ike na-ezisa ozi ọma.g

Ikpe ọzọ bụ nke e kpere otu Onyeàmà Jehova a na-akpọ Minos Kokkinakis na Gris. N’ime afọ iri anọ na asatọ, e jidere ya ihe karịrị ugboro iri isii maka “ime ka ndị mmadụ gbanwee okpukpe ha.” A kpọpụrụ ya n’ụlọikpe ugboro iri na asatọ. A tụrụ ya mkpọrọ ọtụtụ afọ, chụgakwa ya n’agwaetiti ndị dị ezigbo anya n’Oké Osimiri Ejiyan. Mgbe a machara Nwanna Kokkinakis ikpe ikpeazụ n’afọ 1986, ụlọikpe mkpegharị ikpe ndị dị na Gris makwara ya ikpe mgbe o tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ya. Nwanna a wepụziri okwu ya n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ka ha leba ya anya. Na Mee 25, 1993, ụlọikpe a kwuru na mba Gris dara iwu kwuru na Nwanna Kokkinakis nweere onwe ya ikpe okpukpe masịrị ya.

Ndịàmà Jehova etinyela ọtụtụ akwụkwọ mkpegharị ikpe n’ụlọikpe a, meriekwa n’ọtụtụ n’ime ha. E nweghị òtù ma ọ bụ okpukpe meriri ọtụtụ ugboro n’ụlọikpe a n’ikpe gbasara ihe ndị ruuru mmadụ ka Ndịàmà Jehova.

Mmeri Ndịàmà Jehova meririla n’ụlọikpe ọ̀ na-abara ndị ọzọ uru? Otu ọkà mmụta aha ya bụ Charles C. Haynes dere, sị: “Anyị kwesịrị ikele Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị ugboro ole a kparịrị ha, chụpụ ha n’obodo, ma ọ bụdị lụso ha ọgụ, ha na-agba mbọ ka a hapụ ha ka ha na-ekpe okpukpe masịrị ha (nke na-eme ka a hapụkwa anyịnwa ka anyị na-ekpe nke masịrị anyị). Ha merie, anyị niile emeriela.”

g Gụọ Teta! nke January 8, 2003, peeji nke 3-11, ka ị hụ ikpe Ụlọikpe Kacha Elu n’Amerịka kpere banyere ikike mmadụ nwere ikwu okwu.

9 Festọs kọọrọ Eze Agrịpa banyere Pọl, Agrịpa achọọ ka ya na Pọl kwuo okwu ka ọ matakwuo ya. N’echi ya, ndị isi abụọ a nọdụrụ ọdụ n’oche ikpe. Ma, okwu Pọl bụ́ onye mkpọrọ ga-anọ n’ihu ha kwuo ga-eru ndị nọ ebe ahụ n’obi karịa ike eze abụọ a na-akpa nakwa okomoko ha na-eme.​—Ọrụ 25:22-27.

10, 11. Olee otú Pọl si kwanyere Agrịpa ùgwù, oleekwa ihe Pọl kọọrọ eze a banyere ụdị ndụ o biburu?

10 Pọl kwanyeere Eze Agrịpa ùgwù ma kelee ya maka ohere o nyere ya ịzara ọnụ ya n’ihu ya. O kwuru na eze a bụ ọkachamara n’okwu gbasara omenala niile nke ndị Juu nakwa na ihe na-esere ha okwu doro ya anya. Pọl kwuziri ụdị ndụ o biburu, sị: “M bụbu onye Farisii. Ị makwa na ndị Farisii ka ndị Juu ndị ọzọ ekwu otú a ga-esi na-edebe iwu dị iche iche.” (Ọrụ 26:5) Ebe Pọl bụ onye Farisii, ọ nọ na-atụ anya na Mezaya ga-abịa. Ma ugbu a ọ bụ Onye Kraịst, o ji obi ike na-ekwu na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ onye ahụ ha nọ na-atụ anya ya kemgbe. Ihe mere e ji na-ekpe Pọl ikpe n’ụbọchị ahụ bụ ihe ya na ndị na-ebo ya ebubo kweere otu ihe na ya, ya bụ, na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ndị nna nna ha. Ihe Pọl kwuru mere ka Agrịpa nwekwuo mmasị ịnụ ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ikwu.e

11 Pọl gwara ha otú o si mekpọọ Ndị Kraịst ọnụ. O kwuru, sị: “E nwere oge m kpebiri na m ga na-emegide Jizọs onye Nazaret. . . . M na-agadị obodo dị iche iche na-akpagbu ha [ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst] n’ihi otú m si kpọ ha asị.” (Ọrụ 26:9-11) Pọl etinyeghị ihe ọ na-ekwu nnu na ose. Ọtụtụ ndị ma ahụhụ ọ tara Ndị Kraịst. (Gal. 1:13, 23) Agrịpa nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị meziri nwoke a ji gbanwee?’

12, 13. (a) Olee otú Pọl si kọwaa otú o si ghọọ Onye Kraịst? (b) Olee otú o si bụrụ na Pọl “na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ”?

12 Ihe ọzọ Pọl kwuru zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “M nọ na-aga Damaskọs n’ihi na ndị isi nchụàjà nyere m ikike ka m gaa kpagbuo ha otú m na-eme. Eze, ka m nọ na-aga n’okporo ụzọ n’etiti ehihie, ìhè karịrị ìhè anyanwụ si n’eluigwe nwuo gburugburu mụ na ndị so m na-aga. Mgbe anyị niile dara n’ala, anụrụ m olu gwara m n’asụsụ Hibru, sị: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ́ ma ị na-alụso m ọgụ.’ Ma asịrị m, ‘Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?’ Onyenwe anyị asị: ‘Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu.’”f​—Ọrụ 26:12-15, na ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu nke 14.

13 Tupu ihe niile a emee, e nwere ike ikwu na Pọl nọ ‘na-emerụ onwe ya ahụ́ mgbe ọ na-alụso Chineke ọgụ.’ Ọ nọ na-eme ka jakị nke na-emerụ onwe ya ahụ́ mgbe ọ na-agba ọnụ ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ. Pọl nọ na-emebiri onwe ya ihe mgbe ọ nọ na-agba uche Chineke ụkwụ. Mpụta Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ pụtara n’ihu ya mgbe ọ na-aga Damaskọs mere ka ọ gbanwee echiche ya. O doro anya na e duhiere Pọl eduhie.​—Jọn 16:1, 2.

14, 15. Gịnị ka Pọl kwuru banyere ihe ndị ọ gbanwere ná ndụ ya?

14 N’eziokwu, Pọl gbanwere ndụ ya kpamkpam. Ọ gwara Agrịpa, sị: “Ọ bụ ihe Jizọs gwara m n’ọhụụ ahụ ka m mere. Ma, ebu m ụzọ zie ndị bi na Damaskọs ozi ahụ, mechaakwa zie ndị bi na Jeruselem, na Judia niile, nakwa ndị mba ọzọ, ka ha niile chegharịa, na-emekwa ihe gosiri na ha echegharịala ma lọghachikwute Chineke.” (Ọrụ 26:19, 20) Kemgbe ọtụtụ afọ, Pọl nọ na-arụ ọrụ Jizọs Kraịst nyere ya n’ọhụụ ahụ ọ hụrụ n’etiti ehihie. Olee uru ọrụ a ọ rụrụ barala? O mere ka ndị nabatara ozi ọma o ziri ha chegharịa, kwụsị ime omume rụrụ arụ na ịghọ aghụghọ ma mewezie uche Chineke. Ha ghọrọ ezigbo ụmụ amaala ndị na-erube isi ma na-eme udo n’obodo.

15 Ma o nweghị ihe ndị Juu ahụ na-emegide Pọl ji uru ozi ọma ọ na-ezisa bara kpọrọ. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ ihe a ka ndị Juu kwo jide m n’ụlọ nsọ, chọọkwa igbu m. Ma, n’ihi aka Chineke na-enyere m, ana m ezi ma ndị nta ma ndị ukwu ozi ọma ruo taa.”​—Ọrụ 26:21, 22.

16. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl mgbe anyị na-agwa ndị ọkàikpe na ndị ọchịchị gbasara ihe ndị anyị kweere?

16 Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ‘ịdị njikere mgbe niile ịza ndị mmadụ ajụjụ gbasara ihe’ anyị kweere. (1 Pita 3:15) Mgbe anyị na-agwa ndị ọkàikpe na ndị ọchịchị gbasara ihe ndị anyị kweere, ime ihe Pọl mere mgbe ọ na-agwa Agrịpa na Festọs okwu ga-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị ejiri nkwanye ùgwù kọọrọ ha otú eziokwu dị na Baịbụl si mee ka ndụ anyị na ndụ ndị nabatara ozi ọma anyị na-ezisa ka mma, o nwere ike ime ka ha ghara ịna-ele anyị anya ọjọọ.

“Ị Ga-eme Ka M Ghọọ Onye Kraịst” (Ọrụ 26:24-32)

17. Olee ihe Festọs mere mgbe Pọl na-azara ọnụ ya, oleekwa otú ndị mmadụ si eme ihe yiri ya n’oge a?

17 Ka ndị ọchịchị abụọ ahụ nọ na-ege ntị n’okwu na-eru n’obi Pọl na-ekwu, ha enwelighị ike ilefuru ya anya. Legodị ihe merenụ: “Ka Pọl na-ekwu ihe ndị a iji zara ọnụ ya, Festọs ji oké olu, sị: ‘Pọl, isi emebiela gị! Oké akwụkwọ ị ma na-agbazi gị ara!’” (Ọrụ 26:24) Ihe a Festọs mere bụkwa ihe ndị mmadụ na-emekarị n’oge a. Ọtụtụ ndị na-ewere ndị na-akụzi ihe Baịbụl kwuru ka ndị iberiibe. Ọtụtụ mgbe, ọ na-esiri ndị e weere ka ndị ma ihe n’ụwa ike ịnabata ihe Baịbụl na-akụzi gbasara ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

18. Gịnị ka Pọl gwara Festọs, oleekwa ihe Agrịpa kwuru?

18 Ma Pọl zara gọvanọ ahụ, sị: “Festọs Onye Ukwu, ara anaghị agba m, kama, ihe m na-ekwu bụ eziokwu, uche zukwara m okè. N’eziokwu, ihe mere m ji tụsara ahụ́ na-agwa eze ihe ndị a bụ maka na ọ ma ha nke ọma. . . . Eze Agrịpa, ì kweere ihe ndị amụma kwuru? Ama m na i kweere.” Agrịpa sịrị ya: “N’oge na-adịghị anya, ị ga-eme ka m ghọọ Onye Kraịst.” (Ọrụ 26:25-28) Ma ihe ahụ Agrịpa kwuru ò si ya n’obi ma ọ bụ na o sighị, o gosiri na àmà ahụ Pọl gbara ruru ya n’obi.

19. Gịnị ka Festọs na Agrịpa kpebiri banyere Pọl?

19 Agrịpa na Festọs biliziri ọtọ, nke gosiri na ikpe ụbọchị ahụ agwụla. “Ka ha na-apụ, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: ‘O nweghị ihe nwoke a mere a ga-eji maka ya gbuo ya ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ.’ Agrịpa wee sị Festọs: ‘E wezụga na nwoke a sị na ọ chọrọ ka Siza kpee ikpe ya, a gaara ahapụ ya.’” (Ọrụ 26:31, 32) Ha ma na aka Pọl dị ọcha. Ihe a nwere ike ime ka ha bido lewe Ndị Kraịst anya ọma.

20. Olee uru àmà Pọl gbaara ndị ọchịchị bara?

20 Ọ ga-abụ na ndị ọchịchị abụọ a aghọghị Ndị Kraịst mgbe Pọl zichara ha ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ̀ baranụ uru na Pọl onyeozi pụtara n’ihu ha? Eenụ! Mkpụga ‘a kpụgara Pọl n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ’ na Judia mere ka e zie ndị ọchịchị Rom ozi ọma, bụ́ ndị ọ gaara esi ezigbo ike ịga n’ụlọ ha zie ozi ọma. (Luk 21:12, 13) Ihe ọzọ bụ na ihe ndị mere ya nakwa okwukwe ya mgbe a na-akpagbu ya gbara ụmụnna ya ume.​—Fil. 1:12-14.

21. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, olee uru o nwere ike ịba?

21 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ọnwụnwa na mmegide, o nwere ike ịrụpụta ọtụtụ ihe ọma. O nwere ike ime ka anyị zie ndị ọchịchị ozi ọma, ndị ọ gaara esi ike ịga n’ụlọ ha zie ha ozi ọma. Anyị nwee okwukwe ma tachie obi, ọ ga-agba ụmụnna anyị ume, meekwa ka ha jirikwuo obi ike na-agba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke.

ONYE ROM BỤ́ GỌVANỌ PỌSHIỌS FESTỌS

Ọ bụ naanị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nakwa n’akwụkwọ ndị Fleviọs Josifọs dere ka e kwuru gbasara Pọshiọs Festọs. Festọs nọchiri Feliks bụrụzie gọvanọ Judia n’ihe dị ka afọ 58 O.N.K. Ọ ga-abụ na ọ nwụrụ n’ọchịchị mgbe ọ chịchara naanị afọ abụọ ma ọ bụ atọ.

Pọshiọs Festọs.

O yiri ka Festọs adịghị ka Feliks onye bu ya ụzọ chịa ma ọ bụ ka Albinọs onye nọchiri ya. Ọ dị akọ, ọchịchị dokwara ya anya. Mgbe Festọs malitere ịchị, e nwere ọtụtụ ndị ohi na Judia. Josifọs kwuru na “Festọs . . . kpebiri ime ka ndị ọjọọ nọ n’obodo ahụ gbanwee. N’ihi ya, o jidere ọtụtụ n’ime ndị ohi ahụ ma gbuo ọtụtụ n’ime ha.” N’oge ọ na-achị, ndị Juu rụrụ mgbidi gburugburu ụlọ nsọ ka Eze Agrịpa ghara ịma ihe a na-eme ebe ahụ. Ná mmalite, Festọs nyere ha iwu ka ha kụtuo mgbidi ahụ. Ma mgbe ndị Juu rịọrọ ya, o mechara kwe ka ha weta okwu ahụ n’ihu eze ukwu Rom bụ́ Niro.

O yiri ka Festọs ò mesiri ndị omekome na ndị nnupụisi ike. Ma, o kpere ikpe na-ezighị ezi n’ikpe Pọl, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, maka na ọ chọrọ ka ya na ndị Juu dịrị ná mma.

EZE HERỌD AGRỊPA NKE ABỤỌ

Agrịpa a kọrọ akụkọ ya n’Ọrụ Ndịozi isi nke 25 bụ Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ. Ọ bụ nwa nwa nwa Herọd Onye Ukwu, bụrụkwa nwa Herọd ahụ kpagburu ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Jeruselem afọ iri na anọ tupu mgbe ahụ. (Ọrụ 12:1) Agrịpa bụ eze ikpeazụ chịrị n’ezinụlọ eze Herọd.

Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ.

Agrịpa dị afọ iri na asaa mgbe nna ya nwụrụ n’afọ 44 O.N.K. Ọ nọ na Rom mgbe ahụ na-agụ akwụkwọ n’obí eze ukwu Rom bụ́ Klọdiọs. Ndị ndụmọdụ eze ukwu ekweghị ka Agrịpa nọchie nna ya n’ọchịchị n’ihi na ha lere ya anya ka nwatakịrị. Ọ bụ ya mere ha ji họpụta gọvanọ bụ́ onye Rom ka ọ chịwa. Ma, Fleviọs Josifọs kwuru na mgbe Agrịpa ka nọ na Rom, ọ na-agbachitere ndị Juu ma na-ekwuchite ọnụ ha.

Klọdiọs mere Agrịpa eze Kalsis n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K., meekwa ya eze Ituria, Trakọnaịtis, nakwa Abilini n’afọ 53 O.N.K. E mekwara Agrịpa onye na-ahụ maka ụlọ nsọ dị na Jeruselem, nyekwa ya ikike ịhọpụta nnukwu ndị nchụàjà ndị Juu. Niro, bụ́ onye nọchiri Klọdiọs, mekwara Agrịpa eze obodo ụfọdụ dị na Peria na Galili. Agrịpa na nwanne ya nwaanyị bụ́ Benis, onye hapụrụ di ya bụ́ eze Silishia, nọ na Sizaria n’oge Agrịpa na Pọl hụrụ.​—Ọrụ 25:13.

N’afọ 66 O.N.K., mgbe mgbalị niile Agrịpa mere ka ndị Juu kwụsị inupụrụ ndị Rom isi kụrụ afọ n’ala, ndị nnupụisi ahụ amalitekwa ịlụso ya ọgụ, o sonyeziiri ndị Rom. Mgbe e merichara ndị Juu ahụ na-enupụ isi, eze ukwu ọhụrụ na-achị Rom, bụ́ Vespasian, nyekwuru Agrịpa obodo ndị ọ ga na-achị, jiri ya kwụọ ya ụgwọ.

a Gụọ igbe bụ́ “Onye Rom Bụ́ Gọvanọ Pọshiọs Festọs.”

b “Oche ikpe” bụ oche e dowere n’ebe a rụlitere elu. Otú ahụ e dowere ya n’ebe a rụlitere elu na-egosi na e kwesịghị iji ikpe ọ bụla ọkàikpe kpebiri na ya gwuo egwu, e nweghịkwa ike ịgbagha ya agbagha. Paịlet nọ ọdụ n’oche ikpe mgbe o lebara anya n’ebubo ndị e boro Jizọs.

c Gụọ igbe bụ́ “Iwepụ Okwu n’Ụlọikpe n’Oge Anyị A n’Ihi Ezigbo Ofufe.”

d Gụọ igbe bụ́ “Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ.”

e Ebe Pọl bụ Onye Kraịst, o kwetara na Jizọs bụ Mezaya. Ndị Juu na-ekweghị na Jizọs weere Pọl ka onye kwụsịrị ife Chineke.​—Ọrụ 21:21, 27, 28.

f E nwere ihe otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru banyere ihe ahụ Pọl kwuru, nke bụ́ na ọ nọ na-aga n’okporo ụzọ “n’etiti ehihie.” Ọ sịrị: “Onye njem na-ezurịrị ike mgbe anwụ na-achasi ike n’etiti ehihie, ọ gwụkwala ma ihe ọ na-aga ọ̀ dị ya ngwa ngwa. Ihe a na-enyere anyị aka ịghọta na Pọl ezughị ike ọ bụla ná mbọ ọ nọ na-agba ịkpagbu Ndị Kraịst.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya