-
“O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
“Ihe Ọma Pụrụ Iche” (Ọrụ 28:1-10)
18-20. Olee otú ndị Mọlta si meere ndị ahụ “ihe ọma pụrụ iche,” oleekwa ọrụ ebube Chineke si n’aka Pọl rụọ?
18 Ọ dabara na ọ bụ n’agwaetiti Mọlta, nke dị n’ebe ndịda Sisili, ka ndị ahụ si n’ụgbọ ahụ nọ. (Gụọ igbe dị na peeji nke 209 bụ́ “Olee Ebe Mọlta Dị?”) Ndị bi n’agwaetiti a, bụ́ ndị na-asụ asụsụ ọzọ, meere ha “ihe ọma pụrụ iche.” (Ọrụ 28:2) Ha kwanyeere ndị ahụ ha na-amaghị ndị ha bụ ọkụ n’ihi na uwe ha edechaala mmiri, oyi na-atụkwa ha. Ọkụ ahụ mere ka ahụ́ kporo ha ọkụ n’agbanyeghị na oyi na-atụ, mmiri ana-ezokwa. Pọl rụkwara ọrụ ebube.
-