Isi nke Asatọ
Jehova Chineke Nọ n’Ụlọukwu Ya Dị Nsọ
1, 2. (a) Olee mgbe Aịsaịa onye amụma nwetara ọhụụ ya banyere ụlọukwu ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ihu ọma Jehova ji funahụ Eze Ụzaịa?
“N’AFỌ nke ọnwụ eze, bụ́ Ụzaịa, m wee hụ Onyenwe anyị ka Ọ na-anọkwasị n’ocheeze dị elu nke e buliwokwara elu, ọnụ ọnụ ala nile nke uwe mwụda Ya jupụtakwara ụlọukwu Chineke.” (Aịsaịa 6:1) Isi nke 6 nke akwụkwọ Aịsaịa ji okwu ndị a onye amụma ahụ kwuru wee malite. Ọ bụ afọ 778 T.O.A.
2 Ihe ka ukwuu n’ime afọ 52 Ụzaịa chịrị dị ka eze na Juda gara nnọọ nke ọma. N’ịbụ onye mere “ihe ziri ezi n’anya Jehova,” o nwetara nkwado Chineke n’atụmatụ agha, iwu ihe, na ọrụ ugbo ya. Ma ihe ịga nke ọma ya ghọkwara ihe wetaara ya mbibi. N’ikpeazụ, ọ ghọrọ onye mpako “wee mekpuo emekpuo megide Jehova, bụ́ Chineke ya; o wee baa n’ụlọukwu Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” N’ihi omume mpako a na ọnụma ya megide ndị nchụàjà baara ya mba, Ụzaịa bu ekpenta nwụọ. (2 Ihe E Mere 26:3-22) Ọ bụ ihe dị ka n’oge a ka Aịsaịa malitere ozi amụma ya.
3. (a) Aịsaịa ọ̀ hụrụ Jehova n’ezie? Kọwaa. (b) Gịnị ka Aịsaịa hụrụ, n’ihi gịnịkwa?
3 A gwaghị anyị ebe Aịsaịa nọ mgbe ọ hụrụ ọhụụ ahụ. Ma o doro anya na ihe o ji anya nkịtị ya hụ bụ ọhụụ, ọ bụghị Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’ezie, ebe ọ na-adịghị “onye ọ bụla hụworo Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18; Ọpụpụ 33:20) N’agbanyeghị nke ahụ, ịhụ Onye Okike, bụ́ Jehova, ọbụna n’ọhụụ, bụ ihe na-atụ ụjọ. Onye Ọchịchị Eluigwe na Ala na Isi Iyi nke ọchịchị nile kwesịrị ekwesị na-anọkwasị n’ocheeze dị elu, bụ́ nke na-egosipụta ọkwá ya dị ka Eze mgbe ebighị ebi na Onyeikpe! Ọnụ ọnụ nke uwe mwụda ogologo ya, nke na-azaru ala, jupụtara ụlọukwu ahụ. A na-akpọ Aịsaịa òkù ije ozi ibu amụma nke ga-ebuli ike na ikpe ziri ezi na-enweghị atụ nke Jehova elu. Iji kwadebe ya, a ga-eme ka ọ hụ ọhụụ banyere ịdị nsọ Chineke.
4. (a) N’ihi gịnị ka nkọwa banyere Jehova dị ka e si hụ ya n’ọhụụ ma dekọọ ya na Bible na-aghaghị iji bụrụ ihe atụ? (b) Gịnị ka a na-amụta banyere Jehova site n’ọhụụ Aịsaịa?
4 Aịsaịa akọwaghị ọdịdị Jehova n’ọhụụ ya—n’adịghị ka ọhụụ ndị Ezikiel, Daniel, na Jọn, kọrọ. Akụkọ ndị ahụ dịgasịkwa iche ma a bịa n’ihe a hụrụ n’eluigwe. (Ezikiel 1:26-28; Daniel 7:9, 10; Mkpughe 4:2, 3) Otú ọ dị, a ghaghị iburu ọdịdị na nzube nke ọhụụ ndị a n’uche. Ha abụghị nkọwa nkịtị banyere ọnụnọ Jehova. Anya nkịtị apụghị ịhụ ihe bụ́ mmụọ, uche mmadụ nke nwere ebe ikike ya jedebere apụghịkwa ịghọta ógbè ndị mmụọ. N’ihi ya, ọhụụ ndị ahụ jiri asụsụ ụmụ mmadụ nye ihe ọmụma ahụ a chọrọ ka e nye. (Tụlee Mkpughe 1:1.) N’ọhụụ Aịsaịa, ịkọwa ọdịdị Chineke adịghị mkpa. Ọhụụ ahụ mere ka Aịsaịa mata na Jehova nọ n’ụlọukwu ya dị nsọ nakwa na ọ dị nsọ, ikpe ya nile zikwara ezi.
Ndị Seraf
5. (a) Olee ndị bụ ndị seraf, gịnịkwa ka okwu ahụ pụtara? (b) N’ihi gịnị ka ndị seraf ji na-ekpuchi ihu ha na ụkwụ ha?
5 Gee ntị! Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị seraf na-eguzo n’elu ya: nku isii nku isii ka seraf ọ bụla n’ime ha nwere; abụọ ka o ji ekpuchi ihu ya, abụọ ka o ji ekpuchi ụkwụ ya abụọ, abụọ ka o ji efe efe.” (Aịsaịa 6:2) Aịsaịa isi nke 6 agwụla ebe anyị hụrụ e hotara seraf n’ime Bible. N’ụzọ doro anya, ha bụ ndị mmụọ ozi e kere eke na-ejere Jehova ozi bụ́ ndị nwere ihe ùgwù na nsọpụrụ dị ukwuu, ebe ha na-eguzo gburugburu ocheeze Jehova nke dị n’eluigwe. N’adịghị ka Eze Ụzaịa dị mpako, ha ji ịdị umeala n’obi nile na ịmata otú ike ha ruru nọrọ n’ọnọdụ ha. N’ihi na ha nọ n’ihu Eze eluigwe ahụ, ha ji nku abụọ ekpuchi ihu ha; ná nsọpụrụ maka ebe dị nsọ ha nọ, ha jikwa abụọ ọzọ ekpuchi ụkwụ ha. N’ịnọdebe Eze Eluigwe na Ala, ndị seraf ahụ na-ekpuchi onwe ha karị, ka ha ghara ịdọpụ uche n’ebube Chineke n’onwe ya. Okwu bụ́ “ndị seraf,” nke pụtara “ndị yiri ọkụ” ma ọ bụ “ndị na-ere ọkụ,” na-enye echiche bụ́ na ha na-egbukepụ ìhè, ma n’agbanyeghị nke ahụ ha na-ekpuchi ihu ha pụọ ná mgbukepụ na ebube ka ukwuu nke Jehova.
6. Gịnị bụ ọnọdụ ndị seraf n’iji ya tụnyere ọnọdụ Jehova?
6 Ndị seraf na-eji nku abụọ ha nke fọrọ afọ efegharị, ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghịkwa ya na ha na-eji ha akwụ otu ebe wee na-efegharị nku ha, ma ọ bụ iji ‘guzoro’ n’ọnọdụ ha. (Tụlee Deuterọnọmi 31:15.) Banyere ọnọdụ ha, Prọfesọ Franz Delitzsch na-ekwu, sị: “Ndị seraf ahụ agaghị adị elu n’ezie gafere isi Onye ahụ nọkwasịrị n’ocheeze ahụ, kama ha kwụ otu ebe na-efegharị nku ha n’elu uwe Ya nke jupụtara ụlọ nzukọ ahụ.” (Commentary on the Old Testament) Nke a yiri ihe ezi uche dị na ya. Ha “na-eguzo n’elu,” ọ bụghị dị ka ndị dị elu karịa Jehova, kama dị ka ndị na-ejere ya ozi, ndị na-erube isi ma dị njikere ije ozi.
7. (a) Ọrụ dị aṅaa ka ndị seraf na-arụ? (b) N’ihi gịnị ka ndị seraf ahụ ji kpọsaa ịdị nsọ Chineke ugboro atọ?
7 Ugbu a, gee ndị seraf ahụ nwere ihe ùgwù ntị! “Otu wee kpọọ ibe ya òkù, sị, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha dị: uju ụwa nile bụ ebube Ya.” (Aịsaịa 6:3) Ọrụ ha bụ ịhụ na a na-akpọsa ịdị nsọ Jehova nakwa na a rịbara ịdị ebube ya ama n’eluigwe na ala. A na-ahụ ebube ya n’ihe nile o kere, ndị nile bi n’ụwa ga-aghọtakwa ya n’oge na-adịghị anya. (Ọnụ Ọgụgụ 14:21; Abụ Ọma 19:1-3; Habakuk 2:14) Mkpọsa ahụ e kwughachiri ugboro atọ, bụ́ “nsọ, nsọ, nsọ,” abụghị ihe àmà na-akwado Atọ n’Ime Otu. Kama nke ahụ, ọ bụ imesi ịdị nsọ nke Chineke ike ugboro atọ. (Tụlee Mkpughe 4:8.) Jehova dị nsọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu.
8. Gịnị si ná mkpọsa ndị seraf ahụ na-eme pụta?
8 Ọ bụ ezie na e kwughị ole ndị seraf dị, ọ pụrụ ịbụ na e nwere ihe karịrị otu ìgwè ndị seraf nọdewere ocheeze ahụ. Ha ji abụ na-atọ ụtọ na-ekwupụtaghachi ịdị nsọ na ebube Chineke, onye kwusịa ibe ya ekwuo. Olee ihe anyị rịbara ama si na ya pụta? Gee ntị ọzọ ka Aịsaịa na-aga n’ihu: “Ntọala nile nke mbata ụzọ nile wee mee mkpatụ site n’olu onye ahụ nke na-akpọ òkù, ụlọ wee jupụta n’anwụrụ ọkụ.” (Aịsaịa 6:4) N’ime Bible, anwụrụ ọkụ ma ọ bụ igwe ojii na-abụkarị ihe àmà a na-ahụ anya nke ọnụnọ Chineke. (Ọpụpụ 19:18; 40:34, 35; 1 Ndị Eze 8:10, 11; Mkpughe 15:5-8) Ọ na-egosi ebube nke anyị bụ́ mmadụ e kere eke na-apụghị ịbịaru nso.
Onye Na-erughị Eru, Ma Bụrụ Onye A Sachara
9. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ọhụụ ahụ nwere n’ahụ Aịsaịa? (b) Ọdịiche dị aṅaa pụtara ìhè n’etiti Aịsaịa na Eze Ụzaịa?
9 Ọhụụ a banyere ocheeze Jehova nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ Aịsaịa. Ọ na-ede, sị: “M wee sị, Ahụhụ na-adịrị m, n’ihi na alawo m n’iyi; n’ihi na onye egbugbere ọnụ ya abụọ rụrụ arụ ka m bụ, ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m na-ebi: n’ihi na ọ bụ Eze anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ka anya m abụọ hụworo.” (Aịsaịa 6:5) Lee nnọọ ọdịiche dị n’etiti Aịsaịa na Eze Ụzaịa! Ụzaịa weghaara ọrụ nke ndị nchụàjà e tere mmanụ ma wabanye n’enweghị nsọpụrụ ná nkebi Ebe Nsọ nke ụlọukwu ahụ. Ọ bụ ezie na Ụzaịa hụrụ ihe ndọba oriọna ndị e ji ọlaedo mee, ebe ịchụàjà e ji ọlaedo mee bụ́ ebe a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na tebụl nke “achịcha Ọnụnọ,” o nwetaghị ihu ọma Jehova ma ọ bụ nata ọrụ ọ bụla pụrụ iche site n’aka ya. (1 Ndị Eze 7:48-50, nkọwa ala ala peji nke NW) N’aka nke ọzọ, Aịsaịa onye amụma elegharaghị ndị nchụàjà anya ma ọ bụ wabanye n’ụlọukwu ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ hụrụ n’ọhụụ ebe Jehova nọ n’ụlọukwu ya dị nsọ, o nwetakwara ihe ùgwù nke ịnata ọrụ site n’aka Chineke kpọmkwem. Ọ bụ ezie na ndị seraf ahụ agaghị achọ ilekwasị Onyenwe ụlọukwu ahụ nke nọ n’ocheeze anya n’onwe ha, e kwere ka Aịsaịa lekwasị “Eze anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha” anya n’ọhụụ!
10. Gịnị mere Aịsaịa ji tụọ ụjọ mgbe ọ hụrụ ọhụụ ahụ?
10 Ọdịiche Aịsaịa hụrụ n’etiti ịdị nsọ nke Chineke na ime mmehie nke ya mere ka o nwee mmetụta nke adịtụghị ọcha. N’ịbụ onye ụjọ jisi ike, o chere na ya ga-anwụ. (Ọpụpụ 33:20) Ọ nụrụ ka ndị seraf ahụ ji egbugbere ọnụ dị ọcha na-eto Chineke, ma egbugbere ọnụ nke ya adịghị ọcha, adịghị ọcha nke egbugbere ọnụ ndị o bi n’etiti ha, ndị ọ na-anụkwa ihe ha na-ekwu mekwara ka nke ya rụkwuo arụọ. Jehova dị nsọ, ndị na-ejere ya ozi aghaghịkwa ịdị nsọ. (1 Pita 1:15, 16) Ọ bụ ezie na a họrọworị Aịsaịa ịbụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke, nghọta ọ ghọtara ọnọdụ ime mmehie ya nakwa na o nweghị egbugbere ọnụ dị ọcha nke kwesịrị onye bụ́ ọnụ na-ekwuchitere Eze ahụ dị ebube, nke dịkwa nsọ, metụrụ ya n’ahụ nke ukwuu. Gịnị ga-abụ mmeghachi omume sitere n’eluigwe?
11. (a) Gịnị ka otu n’ime ndị seraf ahụ mere, gịnịkwa ka ihe a o mere bụ ihe atụ ya? (b) Olee otú ịtụgharị uche n’ihe seraf ahụ gwara Aịsaịa si enyere anyị aka mgbe anyị na-eche na anyị erughị eru ịbụ ndị ohu Chineke?
11 Kama ịchụpụ Aịsaịa ahụ dị ala n’ihu Jehova, ndị seraf ahụ mere ihe iji nyere ya aka. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Otu n’ime ndị seraf wee fekwute m, jide otu nkume dị ọkụ n’aka ya, nke o ji mkpa wepụta n’elu ebe ịchụàjà: o wee were ya metụ ọnụ m, sị, Lee, nke a emetụwo egbugbere ọnụ gị abụọ; e wee wezụga ajọ omume gị, kpuchiekwa mmehie gị.” (Aịsaịa 6:6, 7) N’ụzọ ihe atụ, ọkụ na-eme ka ihe dị ọcha. Mgbe ọ na-emetụ icheku ọkụ si n’ọkụ ahụ dị nsọ nke dị n’ebe ịchụàjà n’egbugbere ọnụ Aịsaịa, seraf ahụ mesiri Aịsaịa obi ike na e kpuchiwo mmehie ya ruo n’ókè dị mkpa iji mee ka o nwee ike inweta ihu ọma Chineke na ịnata ọrụ. Lee ka nke a si na-emesi anyị obi ike! Anyị onwe anyị bụkwa ndị mmehie na ndị na-erughị eru ịgakwuru Chineke. Ma a napụtawo anyị site n’uru nke àjà mgbapụta Jisọs, anyị pụkwara inweta ihu ọma Chineke ma gakwuru ya n’ekpere.—2 Ndị Kọrint 5:18, 21; 1 Jọn 4:10.
12. Olee ebe ịchụàjà Aịsaịa hụrụ, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọkụ na-enwe?
12 Nhota e hotara “ebe ịchụàjà” na-echetaghachiri anyị na ihe a bụ ọhụụ. (Tụlee Mkpughe 8:3; 9:13.) E nwere ebe ịchụàjà abụọ n’ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem. Ntakịrị ebe ịchụàjà a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ dị kpọmkwem n’ihu ákwà mgbochi nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile ahụ, nnukwute ebe ịchụàjà nke onyinye, bụ́ nke ọkụ na-ere na ya mgbe nile, dịkwa n’ihu ọnụ ụzọ mbata nke ebe nsọ ahụ. (Levitikọs 6:12, 13; 16:12, 13) Ma ebe ịchụàjà ndị a dị n’elu ala bụ ihe atụ, ihe nnọchiteanya nke ihe ndị ka ukwuu. (Ndị Hibru 8:5; 9:23: 10:5-10) Ọ bụ ọkụ si n’eluigwe ripịara àjà nsure ọkụ a chụrụ n’elu ebe ịchụàjà ahụ mgbe Eze Solomọn raara ụlọukwu ahụ nye. (2 Ihe E Mere 7:1-3) Ugbu a kwa ọ bụ ọkụ si n’ezi ebe ịchụàjà ahụ dị n’eluigwe sachapụrụ adịghị ọcha nke egbugbere ọnụ Aịsaịa.
13. Olee ajụjụ Jehova jụrụ, ònyekwa ka ọ gụnyere mgbe ọ sịrị “anyị”?
13 Ka anyị soro Aịsaịa gee ntị. “M wee nụ olu Onyenwe anyị, ka ọ na-asị, Ònye ka M ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị? M wee sị, Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) O doro anya na ajụjụ ahụ Jehova jụrụ bụ iji nweta azịza site n’ọnụ Aịsaịa, ebe ọ na-adịghị onye amụma ọzọ bụ́ mmadụ e kwuru maka ya n’ọhụụ ahụ. O doro anya na ọ bụ òkù a na-akpọ Aịsaịa ka ọ bụrụ onye ozi Jehova. Ma gịnị mere Jehova ji jụọ, sị, “Ònye ga-ejekwara anyị?” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Site n’ịgbanwe ojiji o ji nnọchiaha na-egosi otu onye bụ́ “mụ” mee ihe gaa n’iji nnọchiaha na-egosi ọtụtụ ndị bụ́ “anyị” mee ihe, Jehova na-agụnyezi otu onye ọzọ ma ọ dịkarịa ala tinyere onwe ya? Ònye? Nke a ọ́ bụghị Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, onye mesịrị ghọọ nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst? N’ezie, ọ bụkwa Ọkpara a ka Chineke sịrị, “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jenesis 1:26; Ilu 8:30, 31) Ee, Ọkpara ọ mụrụ nanị ya nọ n’akụkụ Jehova n’ogige eluigwe.—Jọn 1:14.
14. Olee otú Aịsaịa si zaghachi n’ọkpụkpọ òkù Jehova, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka o setịpụụrụ anyị?
14 Aịsaịa egbughị oge n’ịzaghachi! N’agbanyeghị ihe ozi ahụ pụrụ ịbụ, ọ zara ozugbo, sị: “Lee m; ziga m.” Ọ jụwaghịkwa uru ọ ga-erite site n’ịnakwere ọrụ ahụ. Mmụọ ya nke ịdị njikere iwepụta onwe ya bụ ezi ihe nlereanya nye ndị ohu Chineke nile taa, bụ́ ndị e nyere ọrụ ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Matiu 24:14) Dị ka Aịsaịa, ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-anọgidesi ike n’ọrụ ha ma na-arụzu ọrụ ịgba “àmà nye mba nile,” n’agbanyeghị egeghị ntị zuru ebe nile. Ha jikwa obi ike na-aga n’ihu dị ka Aịsaịa mere, mara na ọ bụ onye kachasịnụ nyere ha ọrụ ahụ.
Ọrụ E Nyere Aịsaịa
15, 16. (a) Olee ihe Aịsaịa gaje ịgwa “ndị nke a,” gịnị ga-abụkwa mmeghachi omume ha? (b) Mmeghachi omume nke ndị ahụ ọ̀ bụ n’ihi emezighị emezi nke Aịsaịa? Kọwaa.
15 Jehova kọwapụtaziri ihe Aịsaịa ga-ekwu nakwa otú a ga-esi meghachi omume: “Jee, sị ndị nke a, Na-anụnụ, ma unu aghọtala; na-ahụnụ, ma unu amatala. Mee ka obi ndị nke a maa abụba, meekwa ka ntị ha dị arọ, techiekwa anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka a gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.” (Aịsaịa 6:9, 10) Nke a ọ̀ pụtara na Aịsaịa ga-agwa ha okwu n’ejighị akọ ma ọ bụ n’ụzọ enweghị mmetụta, na-achụkwa ndị Juu ahụ achụ, na-eme ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị a bụ ndị obodo Aịsaịa bụ́ ndị o weere dị ka ụmụnne ya. Ma ihe ndị Jehova kwuru na-egosi otú ndị ahụ ga-esi meghachi omume n’ozi ya, n’agbanyeghị otú Aịsaịa jiruru ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ ya.
16 Ọ bụ ndị ahụ ka ụta dịịrị. Aịsaịa ga-agwa ha okwu “ugboro ugboro,” ma ha agaghị anakwere ozi ahụ ma ọ bụ ghọta ya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ekwesi olu ike ma jụ ige ntị, dị ka a ga-asị na ha kpuru ìsì, bụrụkwa ndị ntị chiri kpam kpam. Site n’ịgakwuru ha ugboro ugboro, Aịsaịa ga-enye “ndị nke a” ohere igosi na ha achọghị ịghọta ihe. Ha ga-egosipụta na ha na-emechi uche na obi ha n’ozi Aịsaịa—ozi Chineke—na-ezi ha. Lee ka nke a si bụrụ eziokwu banyere ndị mmadụ taa! Ọtụtụ n’ime ha na-ajụ ige Ndịàmà Jehova ntị mgbe ha na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke nke na-abịanụ.
17. Mgbe Aịsaịa jụrụ sị, “Ruo ole mgbe?” gịnị ka ọ na-ezo aka na ya?
17 Ọ na-enye Aịsaịa nsogbu n’obi: “M wee sị, Ruo ole mgbe, Onyenwe anyị? O wee sị, Ruo mgbe obodo nile tọgbọrọ n’efu n’enweghị onye obibi, ụlọ nile kwa, n’enweghị mmadụ; ruo mgbe e meworo ka ala ndị ahụ tọgbọrọ n’efu, ọbụna ebe tọgbọrọ n’efu, ruo mgbe Jehova meworo ka mmadụ jee n’ebe dị anya, o wee hie nne, bụ́ ebe a hapụrụ ahapụ n’etiti ala ahụ.” (Aịsaịa 6:11, 12) Site n’ịjụ sị, “Ruo ole mgbe?” Aịsaịa adịghị ajụ ogologo oge ọ ga-anọgide na-ekwusara ndị jụrụ ige ntị ozi ọma. Kama nke ahụ, ọ na-echegbu onwe ya banyere ndị ahụ ma na-ajụ mgbe ajọ ọnọdụ ime mmụọ ha ga-adịru nakwa mgbe a ga-emetọru aha Jehova n’elu ala. (Leekwa Abụ Ọma 74:9-11.) Ya mere, ruo ole mgbezi ka ọnọdụ enweghị uche ahụ ga-adịru?
18. Ruo ole mgbe ka ajọ ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ahụ ga-adịru, Aịsaịa ọ̀ ga-adịkwa ndụ hụ mgbe amụma ahụ ga-emezucha?
18 Ewo, ihe Jehova zara na-egosi na ajọ ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ahụ ga-adịgide ruo mgbe e mezuru ihe nile si n’inupụrụ Chineke isi pụta, dị ka a kọwapụtara n’ọgbụgba ndụ ya. (Levitikọs 26:21-33; Deuterọnọmi 28:49-68) A ga-ebibi mba ahụ, a ga-akpụrụ ndị ahụ gaa ebe ọzọ, ala ahụ ga-atọgbọkwa n’efu. Aịsaịa agaghị adị ndụ hụ mgbe ndị agha Babilọn ga-ebibi Jerusalem na ụlọukwu ya na 607 T.O.A., ọ bụ ezie na ọ ga-ebu amụma ruo ihe karịrị afọ 40, ruo n’oge ọchịchị nke nwa nwa Eze Ụzaịa bụ́ Hezekaịa. N’agbanyeghị nke ahụ, Aịsaịa ga-eji ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ọrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ, n’ihe dị ka n’afọ 732 T.O.A., ihe karịrị 100 afọ tupu ọdachi ahụ bịakwasịrị mba ahụ.
19. Ọ bụ ezie na a ga-egbutu mba ahụ dị ka osisi, mmesi obi ike dị aṅaa ka Chineke nyere Aịsaịa?
19 Mbibi nke ga-eme ka Juda ghọọ “ebe tọgbọrọ n’efu” aghaghị ịbịa, ma olileanya dị. (2 Ndị Eze 25:1-26) Jehova na-emesi Aịsaịa obi ike, sị: “Ọ bụrụ na otu ụzọ n’ụzọ iri afọdụ n’ime ya, a ghaghị irechapụkwa ya ọzọ: dị ka osisi terebinth, na dị ka osisi oak, nke ogwe fọdụrụ [na] ha mgbe e gbutusịrị ha; mkpụrụ nsọ bụ ogwe ya.” (Aịsaịa 6:13) Ee, “otu ụzọ n’ụzọ iri, . . . mkpụrụ nsọ,” ga-afọdụ, dị ka ogwe nke nnukwute osisi oak e gbuturu egbutu. Obi abụọ adịghị ya na mmesi obi ike a kasiri Aịsaịa obi—a ga-ahụ ndị fọdụrụnụ, bụ́ ndị dị nsọ n’etiti ndị ya. Ọ bụ ezie na a ga-agba mba ahụ ọkụ ihe karịrị otu ugboro, dị ka nnukwute osisi oak e gbuturu egbutu iji mere nkụ, ogwe dị mkpa nke osisi ihe atụ ahụ bụ́ Israel ga-afọdụ. Ọ ga-abụ mkpụrụ, ma ọ bụ ụmụ, dị nsọ nye Jehova. Ka oge na-aga, ọ ga-epu ọzọ, osisi ahụ ga-etoliteghachi.—Tụlee Job 14:7-9; Daniel 4:26.
20. Olee otú e si mezuo akụkụ ikpeazụ nke amụma Aịsaịa ahụ na mbụ?
20 Ihe ndị e kwuru n’amụma ahụ hà mezuru? Ee. Iri afọ asaa mgbe e mesịrị ka ala Juda tọgbọrọ n’efu, ihe fọdụrụnụ na-atụ egwu Chineke si n’ebe e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na Babilọn lọta. Ha wughachiri ụlọukwu ahụ na obodo ahụ, ha weghachikwara ezi ofufe n’ala ahụ. Mweghachi a e weghachiri ndị Juu n’ala nna ha Chineke nyere ha mere ka mmezu nke abụọ nke amụma a Jehova nyere Aịsaịa kwe omume. Gịnị ka ọ gaje ịbụ?—Ezra 1:1-4.
Mmezu Ndị Ọzọ
21-23. (a) N’ahụ ole ndị ka amụma Aịsaịa mezuru na narị afọ mbụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa? (b) Ònye bụ “mkpụrụ nsọ” ahụ na narị afọ mbụ, oleekwa otú e si chekwaa ya?
21 Ọrụ ibu amụma Aịsaịa sere onyinyo ọrụ nke Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-arụ ihe dị ka afọ 800 n’ihu. (Aịsaịa 8:18; 61:1, 2; Luk 4:16-21; Ndị Hibru 2:13, 14) Ọ bụ ezie na ọ dị ukwuu karịa Aịsaịa, Jisọs dịkwa nnọọ njikere ka Nna ya nke eluigwe zipụ ya, na-asị: “Lee, abịawo m ime ihe Ị na-achọ.”—Ndị Hibru 10:5-9; Abụ Ọma 40:6-8.
22 Dị ka Aịsaịa, Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ e kenyere ya ma nweta otu mmeghachi omume ahụ. Ndị Juu nke oge Jisọs adịghị njikere ịnakwere ozi ya dịkwa ka ndị Aịsaịa mere nkwusa nye na-adịghị. (Aịsaịa 1:4) Iji ihe atụ eme ihe bụ otu akụkụ nke ozi Jisọs. Nke a kpaliri ndị na-eso ụzọ ya ịjụ ya, sị: “N’ihi gịnị ka Ị na-agwa ha okwu n’ilu?” Jisọs zara, sị: “Ọ bụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ. N’ihi nke a ka M na-agwa ha okwu n’ilu; n’ihi na ha adịghị ahụ n’ọhụhụ, ha adịghị anụkwa n’ọnụnụ, ha adịghị anụtakwa. Ma a na-emezuru ha amụma nke Aịsaịa, nke sị, N’ọnụnụ unu ga-anụ, ma unu agaghị anụta ma ọlị; n’ọhụhụ unu ga-ahụkwa, ma unu agaghị ahụta ma ọlị: n’ihi na obi ndị nke a mara abụba, ntị ha kpọchikwara, ha kpuchikwara anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ ma eleghị anya, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka M gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.”—Matiu 13:10, 11, 13-15; Mak 4:10-12; Luk 8:9, 10.
23 N’ihota ihe e kwuru n’Aịsaịa, Jisọs na-egosi na amụma ahụ mezuru n’oge ya. Ndị ahụ n’ozuzu ha nwere obi yiri nke ndị Juu nọ n’oge Aịsaịa. Ha mere onwe ha ka ha kpuo ìsì nakwa ka ntị ha kpọchie akpọchie n’ebe ozi ya dị, n’otu aka ahụ, e bibikwara ha. (Matiu 23:35-38; 24:1, 2) Nke a weere ọnọdụ mgbe ndị agha Rom bịakwasịrị Jerusalem na 70 O.A. n’okpuru Ọchịagha Titus ma bibie obodo ahụ na ụlọukwu ya. Ma, ụfọdụ gere Jisọs ntị ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Jisọs sịrị na “ngọzi na-adịrị” ndị a. (Matiu 13:16-23, 51) Ọ gwawo ha na mgbe ọ bụla ha hụrụ “Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu,” na ha kwesịrị ‘ịgbalaga n’ugwu.’ (Luk 21:20-22) N’ụzọ dị otú a, a zọpụtara “mkpụrụ nsọ” ahụ nwere okwukwe, ndị e mewokwara ka ha ghọọ mba ime mmụọ, bụ́ “Israel nke Chineke.”a—Ndị Galetia 6:16.
24. Olee otú Pọl si jiri amụma Aịsaịa mee ihe, gịnịkwa ka nke a na-egosi?
24 N’ihe dị ka na 60 O.A., a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ n’ụlọ ya dị na Rom. O mere ndokwa iso “ndị isi n’etiti ndị Juu” nakwa ndị ọzọ nwee nzukọ n’ebe ahụ, ọ gwasịrị ha ‘okwu alaeze Chineke ike.’ Mgbe ọtụtụ mmadụ jụrụ ịnakwere ozi ya, Pọl kọwara na nke a bụ iji mezuo amụma Aịsaịa. (Ọrụ 28:17-27; Aịsaịa 6:9, 10) Ya mere ndị na-eso ụzọ Jisọs rụrụ ọrụ yiri nke Aịsaịa.
25. Gịnị ka Ndịàmà Chineke nke oge a ghọtaworo, ha sikwa aṅaa emeghachi omume?
25 N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova taa na-aghọta na Jehova Chineke nọ n’ụlọukwu ya dị nsọ. (Malakaị 3:1) Dị ka Aịsaịa, ha na-asị: “Lee m; ziga m.” N’ịnụ ọkụ n’obi, ha na-akpọsa ozi ịdọ aka ná ntị ahụ banyere ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a nke na-eru nso. Ma, dị ka Jisọs gosiri, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-emeghe anya ha na ntị ha ịhụ na ịnụ ihe na ịbụ ndị a zọpụtara. (Matiu 7:13, 14) N’ezie, ndị doziri obi ha ịṅa ntị na ‘ịbụ ndị e mere ka ahụ dị ha ike,’ bụ ndị a gọziri agọzi!—Aịsaịa 6:8, 10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Na 66 O.A., n’ihi nnupụisi nke ndị Juu, ndị agha Rom n’okpuru Cestius Gallus gbara Jerusalem gburugburu ma baa n’ime obodo ahụ ruo ná mgbidi nke ụlọukwu ahụ. Ka e mesịrị ha laghachiri, wee nye ndị na-eso ụzọ Jisọs ohere ịgbalaga n’ugwu Perea tupu ndị Rom ahụ abịaghachi na 70 O.A.
[Foto dị na peeji nke 94]
“Lee m; ziga m.”
[Foto dị na peeji nke 97]
“Ruo mgbe obodo nile tọgbọrọ n’efu n’enweghị onye obibi”