Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 5 p. 36-43
  • “Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Mmụọ Ozi Jehova Meghere Ụzọ” (Ọrụ 5:12-21a)
  • “Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ” (Ọrụ 5:21b-33)
  • “Unu Agaghị Akwụsịli Ha” (Ọrụ 5:34-42)
  • A Họpụtara Ụmụ Nwoke Ruru Eru Ka Ha Na-ahụ Maka ‘Ọrụ Dị Mkpa’ (Ọrụ 6:1-6)
  • “Okwu Chineke Nọ Na-agbasa” (Ọrụ 6:7)
  • ‘Anyị Apụghị Ịkwụsị Ikwu Banyere Jizọs’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ònye Ka Ị Na-erubere Isi—Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Ha Kpọkọrọ Sanhedrin”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 5 p. 36-43

ISI NKE 5

“Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”

Ndịozi Jizọs mere ihe ezigbo Ndị Kraịst niile ga na-eme

O Si n’Ọrụ Ndịozi 5:12–6:7

1-3. (a) Gịnị mere e ji kpọta ndịozi Jizọs n’ụlọikpe Sanhedrin, oleekwa ihe na-ese? (b) Gịnị mere ihe ndịozi ahụ mere ji gbasa anyị?

IWE juru ndị ọkàikpe Sanhedrin obi. Ụlọikpe a kacha elu na-ekpe ndịozi Jizọs ikpe. Gịnị mere e ji na-ekpe ha ikpe? Josef Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà na onyeisi Sanhedrin, ji iwe gwa ha, sị: “Anyị gwasiri unu ike ka unu kwụsị ịkụziri ndị mmadụ ihe n’aha a.” Keyafas a iwe ji achọtụdịghị ịkpọ aha Jizọs. Ma o kwukwara, sị: “Unu emeela ka ihe unu na-akụzi gbasaa ebe niile na Jeruselem. Unu chọkwara ka ọbara nwoke a dị anyị n’isi.” (Ọrụ 5:28) Ihe ọ na-ekwu doro anya. Ọ na-asị ha: Ọ bụrụ na unu akwụsịghị ikwusa ozi ọma, a ga-ata unu ahụhụ.

2 Gịnị ka ndịozi ahụ ga-eme? Ọ bụ Jizọs, onye Chineke nyere ikike, gwara ha ka ha kwusaa ozi ọma. (Mat. 28:18-20) Ụjọ ọ̀ ga-eme ka ndịozi ahụ kwụsị ikwusa ozi ọma? Ka hà ga-akata obi na-ekwusa ya? Ihe dị ezigbo mkpa n’okwu a bụ: Hà ga-erubere Chineke isi ka ọ̀ bụ mmadụ? N’egbughị oge, Pita onyeozi kwuchitere ọnụ ndịozi ibe ya. O ji obi ike kwuo okwu n’amaghị ọnụ jijiji.

3 Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, ihe ndịozi ahụ mere mgbe ndị Sanhedrin yiri ha egwu gbasakwara anyị. A gwara anyị ka anyị kwusaa ozi ọma otú ahụ a gwara ha. Ndị mmadụ nwekwara ike ịna-enye anyị nsogbu mgbe anyị na-arụ ọrụ a Chineke nyere anyị. (Mat. 10:22) Ndị mmegide nwere ike ime ka ikwusa ozi ọma siere anyị ike ma ọ bụkwanụ ha amachie ọrụ anyị iwu. Gịnị ka anyị ga-eme? Ileba anya n’ihe ndịozi Jizọs mere nakwa n’ihe kpatara e ji na-ekpe ha ikpe n’ụlọikpe Sanhedrina ga-abara anyị uru.

SANHEDRIN BỤ ỤLỌIKPE NDỊ JUU KACHA ELU

Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Alaeze Ukwu Rom na-achị Judia, ndị Rom hapụrụ ndị Juu ka ha na-eme omenala ha ma na-ekpebi ọtụtụ ihe ha na-eme n’onwe ha. Ọ bụ ụlọikpe ndị dị n’obodo nke ọ bụla na-ekpe ndị mere ihe na-adịchaghị oké njọ ikpe. Ma a na-ewegara Nnukwu Ụlọikpe Sanhedrin, nke dị na Jeruselem, ikpe ụlọikpe ndị ahụ na-enweghị ike ikpe. Ụlọikpe Sanhedrin bụ ụlọikpe ndị Juu kacha elu, bụrụkwa ebe ndị ọchịchị ndị Juu na-ezukọ. Ụlọikpe a bụ okwuchaa obie ma a bịa n’ịkọwa iwu ndị Juu. Ndị Juu nọ n’ebe niile na-akwanyekwara ụlọikpe a ùgwù.

E nwere ụlọ ebe ndị ikpe Sanhedrin na-ezukọta. O nwere ike ịbụ na ụlọ a dị n’ụlọ nsọ ma ọ bụ n’ebe dị ya nso. E nwere mmadụ iri asaa na otu so ná ndị Sanhedrin. Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà bụ onyeisi ha. Ndị ọzọ so n’ime ha bụ ndị nchụàjà a ma ama, ndị Sadusii, ndị aka ji akụ̀ na-abụghị ndị nchụàjà, na ndị odeakwụkwọ gụrụ akwụkwọ. A naghị agbanwe ihe ọ bụla ụlọikpe ahụ kpebiri agbanwe.

“Mmụọ Ozi Jehova Meghere Ụzọ” (Ọrụ 5:12-21a)

4, 5. Gịnị mere ‘iwe ji ju’ Keyafas na ndị Sadusii obi?

4 Cheta na mgbe mbụ e nyere ndịozi Jizọs iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, Pita na Jọn kwuru, sị: “Anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.” (Ọrụ 4:20) Mgbe Pita na Jọn na ndịozi ndị ọzọ si n’ụlọikpe Sanhedrin pụta, ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nsọ. Ndịozi ahụ rụrụ ọrụ ebube, dị ka ịgwọ ọrịa na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ha mere ihe ndị ahụ na “Varanda Solomọn.” Ebe a bụ ebe sara mbara e kpuchiri elu ya ekpuchi nke e si abanye n’ụlọ nsọ. Ọ dị n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ, ọtụtụ ndị Juu na-ezukọtakwa na ya. Ọ ga-abụ na onyinyo Pita medịrị ka ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa gbakee. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ a gwọrọ ọrịa nabatara ozi ọma e ziri ha. N’ihi ya, ‘ọtụtụ ndị nọ na-ekwere n’Onyenwe anyị, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.’​—Ọrụ 5:12-15.

5 ‘Iwe juru’ Keyafas na ndị Sadusii ibe ya obi, ha atụba ndịozi Jizọs n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 5:17, 18) Gịnị mere iwe ji ju ndị Sadusii obi? Ndịozi Jizọs nọ na-akụzi na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, ma ndị Sadusii ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Ndịozi Jizọs nọ na-ekwu na naanị ihe ga-eme ka a zọpụta mmadụ bụ inwe okwukwe na Jizọs. Ma ndị Sadusii na-atụ ụjọ na ndị Rom ga-emekpọ ha ọnụ ma ndị mmadụ were Jizọs ka Onye Ndú ha. (Jọn 11:48) Ka a sịkwa ihe mere ndị Sadusii ji foro ntutu taa na ha ga-eme ka ndịozi Jizọs kwụsị ikwusa ozi ọma.

6. Olee ndị kacha akpata mkpagbu a na-akpagbu ndị na-efe Jehova taa, gịnịkwa mere na o kwesịghị iju anyị anya?

6 Taakwa, ndị kacha akpata mkpagbu a na-akpagbu ndị na-efe Jehova bụ ndị okpukpe na-achọghị iji anya ahụ anyị. Ọtụtụ mgbe, ha na-agbalị ka ha si n’aka ndị ọchịchị nakwa n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi mee ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. Ihe a ò kwesịrị iju anyị anya? Mba. Ozi ọma anyị na-ezisa na-agba okpukpe ụgha n’anwụ. Ọ bụrụ na ndị nwere ezi obi anabata eziokwu ndị dị na Baịbụl, a na-atọpụ ha agbụ nkwenkwe na omenala ụgha kere ha. (Jọn 8:32) Ò kwesịziri iju anyị anya na ozi ọma anyị na-ezisa na-emekarị ka ndị isi okpukpe mewere anyị anyaụfụ?

7, 8. Gịnị ka iwu mmụọ ozi nyere ndịozi Jizọs mere ka ha mee, oleekwa ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

7 Mgbe ndịozi Jizọs nọ n’ụlọ mkpọrọ na-eche ka e kpee ha ikpe, o nwere ike ịbụ na ha na-eche na ndị iro ha ga-egbu ha n’ihi okwukwe ha. (Mat. 24:9) Ma n’abalị, ihe a na-atụghị anya ya mere. “Mmụọ ozi Jehova meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ.”b (Ọrụ 5:19) Mmụọ ozi ahụ gwara ha kpọmkwem ihe ha ga-eme. Ọ sịrị ha: “Gaanụ n’ụlọ nsọ, na-agwakwanụ ndị mmadụ” okwu. (Ọrụ 5:20) O doro anya na iwu a e nyere ndịozi Jizọs mere ka obi sie ha ike na ihe ha na-eme dị mma. O nwekwara ike ịbụ na ihe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara ha mere ka obi sie ha ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Okwukwe na obi ike ndịozi ahụ nwere mere ka ha ‘banye n’ụlọ nsọ mgbe chi bọrọ ma malite ịkụziri ndị mmadụ ihe.’​—Ọrụ 5:21.

8 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee m, m̀ ga-enwe okwukwe na obi ike m ga-eji na-ekwusa ozi ọma?’ Ịmara na ndị mmụọ ozi na-akwado ma na-eduzi ọrụ a dị ezigbo mkpa na-eme ka anyị nọgide ‘na-akọwara ndị mmadụ okwu gbasara Alaeze Chineke nke ọma.’​—Ọrụ 28:23; Mkpu. 14:6, 7.

“Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ” (Ọrụ 5:21b-33)

Ebe Keyafas ji iwe na-ebo ndịozi Jizọs ebubo, ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin ana-ele ihe na-emenụ.

“Ha kpọtara ha, ha eguzoro n’ihu ndị zukọrọ na Sanhedrin.”—Ọrụ 5:27

9-11. Gịnị ka ndịozi Jizọs mere mgbe ụlọikpe Sanhedrin gwara ha ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, oleekwa otú ihe a si bụrụ ihe ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme?

9 Keyafas na ndị ikpe Sanhedrin ndị ọzọ ejikerela ugbu a imesi ndịozi Jizọs ike. Ebe ọ bụ na ha amaghị ihe merenụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ha zipụrụ ndị nche ka ha gaa kpọta ndịozi Jizọs. Chegodị otú ihe niile si ju ndị nche ahụ anya mgbe ha ruru hụ na ndịozi Jizọs anọghịzi n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’agbanyeghị ‘na a kpọchisiri ụlọ mkpọrọ ahụ ike, ndị nche ka guzokwa n’ọnụ ụzọ.’ (Ọrụ 5:23) Obere oge, onyeisi ndị nche ụlọ nsọ nụrụ na ndịozi Jizọs agaghachila n’ụlọ nsọ na-agba àmà banyere Jizọs Kraịst, bụ́ ọrụ mere e ji tụọ ha mkpọrọ. Onyeisi ndị nche ahụ na ndị nche ibe ya gawara n’ụlọ nsọ ahụ ozugbo ka ha jide ndịozi Jizọs ma duru ha bịa n’ụlọikpe Sanhedrin.

10 Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, ndị isi okpukpe ahụ iwe juru obi gwara ndịozi Jizọs hoo haa ka ha kwụsị izi ozi ọma. Gịnị ka ndịozi ahụ kwuru? Pita kwuchitere ọnụ ha. O ji obi ike sị: “Anyị ga-erubere Chineke isi karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ndịozi ahụ mere ihe ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-eme. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị emela ihe Chineke sịrị anyị mee ma ọ bụ gwa anyị mee ihe Chineke sịrị anyị emela, anyị ekwesịghị irubere ha isi. N’ihi ya, ọ bụrụ na “ndị ọchịchị” amachie anyị ikwusa ozi ọma n’oge anyị a, anyị agaghị ahapụ ịrụ ọrụ a Chineke nyere anyị rụọ. (Rom 13:1) Kama, anyị ga-achọta ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi na-agba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke.

11 Ihe ahụ ndịozi Jizọs ji obi ike kwuo kpasukwuru ndị ikpe ahụ ezigbo iwe. Ha kpebisiri ike “igbu” ndịozi ahụ. (Ọrụ 5:33) Ugbu a, ọ dịzi ka à ga-egburịrị ndịozi ahụ ji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ma, Jehova ga-esi n’ụzọ ha na-atụghị anya ya napụta ha.

“Unu Agaghị Akwụsịli Ha” (Ọrụ 5:34-42)

12, 13. (a) Olee ndụmọdụ Gameliel nyere ndị ọkàiwu ibe ya, gịnịkwa ka ha mere? (b) Olee otú Jehova nwere ike isi gbachitere ndị ya n’oge anyị a, oleekwa ihe obi ga-esi anyị ike na ha ma ọ bụrụ na o kwere ka anyị ‘taa ahụhụ n’ihi na anyị na-eme ihe dị mma’?

12 Gameliel gbachiteere ndịozi Jizọs.c “Ọ bụ onye na-akụzi Iwu, ndị Juu niile na-asọpụkwara ya.” Ọ ga-abụrịrị na ndị ọkàiwu ndị ọzọ na-akwanyere ya ezigbo ùgwù n’ihi na o weghaara okwu, ‘kwuodị ka a kpọpụtụ ndịozi ahụ n’èzí.’ (Ọrụ 5:34) Gameliel kọrọ gbasara òtù dị iche iche na-enupụ isi e nwere n’oge gara aga na otú ha si gbasasịa mgbe ndị isi ha nwụrụ. Ọ gwara ndị ikpe ahụ ka ha nweere ndịozi Jizọs ndidi ma hapụ ha ebe ọ bụ na ọ dịbeghị anya Onyeisi ha, bụ́ Jizọs, nwụrụ. Okwu Gameliel gwara ha ruru ha n’obi. Ọ sịrị: “Unu akpala ndị a aka, kama hapụnụ ha. Ọ bụrụ na atụmatụ ha ma ọ bụ ihe a ha na-eme si n’aka mmadụ, ọ ga-akụ afọ n’ala. Ma ọ bụrụ na o si n’aka Chineke, unu agaghị akwụsịli ha. Kpacharanụ anya, n’ihi na o nwedịrị ike ịbụ na unu na-alụso Chineke ọgụ.” (Ọrụ 5:38, 39) Ndị ikpe ahụ nabatara ndụmọdụ o nyere ha. Ma, ha pịara ndịozi Jizọs ihe ma nye ha iwu “ka ha kwụsị ikwu okwu n’aha Jizọs.”​—Ọrụ 5:40.

13 N’oge anyị a kwa, Jehova nwere ike ime ka ndị a ma ama, dị ka Gameliel, gbachitere ndị ya. (Ilu 21:1) Jehova nwere ike iji mmụọ ya mee ka ndị ọchịchị a ma ama, ndị ikpe, ma ọ bụ ndị omeiwu mee ihe ọ chọrọ. (Nehe. 2:4-8) Ma, ọ bụrụgodị na o kwere ka anyị ‘taa ahụhụ n’ihi na anyị na-eme ihe dị mma,’ e nwere ihe abụọ obi ga-esi anyị ike na ha. (1 Pita 3:14) Nke mbụ bụ na Chineke ga-enye anyị ike anyị ga-eji die ya. (1 Kọr. 10:13) Nke abụọ bụ na ndị na-emegide anyị “agaghị akwụsịli” ọrụ Chineke.​—Aịza. 54:17.

14, 15. (a) Gịnị ka ndịozi Jizọs mere mgbe a pịara ha ihe, gịnịkwa mere ha ji mee otú ahụ? (b) Kọọ ihe mere otu nwanna nke gosiri na ndị Jehova na-enwe ọṅụ mgbe ha na-edi ahụhụ a na-ata ha.

14 Ihe ahụ a pịara ndịozi Jizọs ò mere ka ike gwụ ha ma ọ bụ ka ha gbanwee obi ha? Mbanụ! Ha “si ebe ahụ ndị Sanhedrin nọ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ.” (Ọrụ 5:41) Gịnị mere ha ji “na-aṅụrị ọṅụ”? O doro anya na ọ bụghị maka na ihe a pịara ha dị ha ụtọ. Kama, ha ṅụrịrị ọnụ n’ihi na ha ma na a kpagburu ha maka na ha na-erubere Jehova isi, na-esokwa ụzọ Onye nlereanya ha, bụ́ Jizọs.​—Mat. 5:11, 12.

15 Dị ka ụmụnna anyị mere n’oge ndịozi, anyị na-enwe ọṅụ mgbe anyị na-edi ahụhụ a na-ata anyị n’ihi ozi ọma. (1 Pita 4:12-14) Ọ pụtaghị na obi na-atọ anyị ụtọ ma e yiwe anyị egwu, kpagbuwe anyị, ma ọ bụ tụọ anyị mkpọrọ. Kama, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ na anyị na-erubere Jehova isi. Dị ka ihe atụ, legodị ihe mere Nwanna Henryk Dornik. Ndị ọchịchị aka ike tara ya ahụhụ ruo ọtụtụ afọ. O kwuru na n’Ọgọst 1944, ndị ọchịchị kpebiri ịkpọga ya na nwanne ya nwoke n’ogige ịta ahụhụ. Ndị na-ata ha ahụhụ kwuru, sị: “E nweghị ike ịmanye ha amanye ka ha mee ihe ha na-achọghị ime. Ọ na-atọ ha ụtọ ka e gbuo ha n’ihi okwukwe ha.” Nwanna Dornik kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na achọghị m ka e gbuo m n’ihi okwukwe m, ma obi ike m nwere na otú obi si ruo m ala maka na m na-erubere Jehova isi mere ka m nwee ọṅụ.”​—Jems 1:2-4.

Ebe di na nwunye ji akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na-ezi nwoke guzo n’ihu ụlọ ya ozi ọma.

Anyị na-ekwusa ozi ọma “n’ụlọ n’ụlọ” otú ndịozi Jizọs mere

16. Olee otú ndịozi Jizọs si gosi na ha kpebisiri ike ịgba àmà nke ọma, oleekwa otú anyị si ekwusa ozi ọma ka ha?

16 Ndịozi Jizọs bidokwara izisa ozi ọma n’egbughị oge. Ha atụghị egwu ọ bụla. “N’ụbọchị ọ bụla, ma n’ụlọ nsọ ma n’ụlọ n’ụlọ,” ha nọ “na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma gbasara Jizọs, onye bụ́ Kraịst.”d (Ọrụ 5:42) Ndị a na-anụ ọkụ n’obi kpebisiri ike na ha ga na-agba àmà nke ọma. Ị̀ hụrụ na ha ji ozi ha na-ezisa gakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha otú Jizọs Kraịst gwara ha ka ha mee? (Mat. 10:7, 11-14) O doro anya na ọ bụ otú ahụ ka ha si mee ka ihe ha na-akụzi gbasaa ebe niile na Jeruselem. Taa, a ma Ndịàmà Jehova ama na ha na-ekwusa ozi ọma otú ndịozi Jizọs si kwusaa ya. Ọ bụrụ na anyị ana-aga n’ụlọ ọ bụla dị n’ókèala anyị, anyị na-egosi na anyị chọrọ ịgba àmà nke ọma ka onye ọ bụla nwee ike ịnụ ozi ọma. Jehova ọ̀ gọziela ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụlọ n’ụlọ? Ee, ọ gọziela ya. Ọtụtụ nde mmadụ anabatala ozi ọma Alaeze Chineke n’oge ikpeazụ a. Ọtụtụ n’ime ha nụrụ ozi ọma ahụ nke mbụ ya mgbe Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ ha.

IKWUSA OZI ỌMA “N’ỤLỌ N’ỤLỌ”

N’agbanyeghị na ụlọikpe Sanhedrin machiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ikwusa ozi ọma, “n’ụbọchị ọ bụla, ma n’ụlọ nsọ ma n’ụlọ n’ụlọ,” ha nọ na-ekwusa ozi ọma ma na-akụzi ihe. (Ọrụ 5:42) Olee ihe “n’ụlọ n’ụlọ” pụtara?

A sụgharịa okwu bụ́ katʼ oiʹkon otú e si dee ya n’asụsụ Grik mbụ, ọ pụtara “dị ka ụlọ si dị.” Ọtụtụ ndị nsụgharị kwuru na otú e kwesịrị isi ghọta okwu bụ́ ka·taʹ bụ “ná nkebi ná nkebi,” ya bụ, na e kebisịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ha na-ekwusa ozi ọma, ndị a banye n’otu ụlọ, ndị ọzọ abanye n’ụlọ ọzọ. Ebe ọzọ okwu bụ́ ka·taʹ pụtara otu ihe ahụ bụ na Luk 8:1, bụ́ ebe e kwuru na Jizọs kwusara ozi ọma “n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche.”

N’Ọrụ Ndịozi 20:20, e dere okwu bụ́ katʼ oiʹkous. N’amaokwu a, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, sị: “Ahapụghị m . . . izi unu ihe n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ.” Ụfọdụ ndị ekwuola na ihe Pọl na-ekwu ebe a bụ na ọ nọ n’ụlọ ndị okenye ahụ na-akụzi ihe. Mana, anyị ma na ọ bụghị eziokwu n’ihi ihe o kwuru n’amaokwu nke 21. Ọ sịrị: “Kama, eziri m ma ndị Juu ma ndị Grik ozi ọma nke ọma ka ha chegharịa, fewe Chineke ma nwee okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 20:21) Ndị Kraịst ibe ya echegharịala, nweekwa okwukwe na Jizọs. N’ihi ya, o doro anya na ikwusa ozi ọma na izi ihe n’ụlọ n’ụlọ pụtara ịgbara ndị na-abụghị Ndị Kraịst àmà.

A Họpụtara Ụmụ Nwoke Ruru Eru Ka Ha Na-ahụ Maka ‘Ọrụ Dị Mkpa’ (Ọrụ 6:1-6)

17-19. Olee nsogbu e nwere n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ nke nwere ike ịkpata nkewa, gịnịkwa ka ndịozi Jizọs mere iji dozie ya?

17 Ọ dị ezigbote nsogbu e nwere n’ọgbakọ ọhụrụ a nke chọrọ ikewa ndị nọ na ya. Olee nsogbu ọ bụ? Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs e mere baptizim si ebe ndị ọzọ bịa Jeruselem, ha chọkwara ịmụtakwu Okwu Chineke tupu ha alawa. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị bi na Jeruselem ji obi ha nye ego a ga-eji zụtara ndị ahụ ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. (Ọrụ 2:44-46; 4:34-37) Ma, a bịaziri nwee nsogbu e kwesịrị ịkpachapụrụ anya. “A naghị ekenye ụmụ nwaanyị isi mkpe ha [ya bụ, ụmụ nwaanyị isi mkpe ndị na-asụ Grik] ihe ndị a na-eke kwa ụbọchị.” (Ọrụ 6:1, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ma, a na-ekenye ụmụ nwaanyị isi mkpe na-asụ Hibru. Ọ ga-abụ na ihe bụ́ nsogbu bụ ịkpa ókè. Ịkpa ókè so n’ihe kacha akpata nkewa.

18 Ọ bụ ndịozi Jizọs bụ òtù na-achị isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ahụ. Ha nwekwara ọtụtụ ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ a na-amụba n’ike n’ike. N’ihi ya, ha ghọtara na ha “ekwesịghị ịhapụ okwu Chineke” ha “na-akụzi gaa kewe nri.” (Ọrụ 6:2) Iji dozie nsogbu ahụ e nwere n’ọgbakọ, ha gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha chọta ụmụ nwoke asaa “ndị mmụọ nsọ na-achị, ndị makwa ihe,” bụ́ ndị ndịozi Jizọs nwere ike ịhọpụta ka ha na-ahụ maka “ọrụ a dị mkpa.” (Ọrụ 6:3) O nwere ike ịbụ na ihe mere e ji chọọ ụmụ nwoke ruru eru bụ na ọrụ ha agaghị abụ naanị ike nri, kama ha ga na-ejide ego, na-azụta ihe, na-edekọkwa otú ihe niile si aga. Ụmụ nwoke niile a chọtara nwechara aha Grik. O nwere ike ịbụ na ihe a mere ka ọ dịrị ụmụ nwaanyị ndị ahụ e mejọrọ mfe ịtụkwasị ha obi. Mgbe ndịozi Jizọs kpechara ekpere ma leba anya n’ụdị ndị ụmụ nwoke asaa ahụ a chọtara bụ, ha họpụtara ha ka ha na-ahụ maka ‘ọrụ ahụ dị mkpa.’e

19 Ọrụ ike nri e nyere ụmụ nwoke asaa ahụ a họpụtara ọ̀ pụtara na ha agaghịzi eso na-ekwusa ozi ọma? Mbanụ! Stivin so n’ụmụ nwoke ahụ a họpụtara. O mechara gosi na ọ bụ nwoke obi kara nke ji obi ya niile ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 6:8-10) Filip sokwa n’ụmụ nwoke asaa ahụ, a kpọkwara ya “onye na-ezisa ozi ọma.” (Ọrụ 21:8) N’ihi ya, o doro anya na ụmụ nwoke asaa ahụ ka ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

20. Olee otú ndị Chineke taa si eme ihe ndịozi Jizọs mere?

20 Taa, Ndịàmà Jehova na-eme ihe ahụ ndịozi Jizọs mere. Ụmụ nwoke ndị a chọrọ ịhọpụta ka ha rụwa ọrụ n’ọgbakọ kwesịrị igosi na ha nwere amamihe Chineke, gosikwa na mmụọ nsọ ya na-edu ha. A na-esoro ntụziaka Òtù Na-achị Isi nyere ahọpụta ụmụ nwoke ndị ga-abụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Ndị a na-ahọpụta na-abụkwa ndị nwere àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru na mmadụ ga-enwe tupu a họpụta ya.f (1 Tim. 3:1-9, 12, 13) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ndị ahụ ruru eru. Ụmụ nwoke ndị a na-arụsi ọrụ ike na-ahụ maka ọtụtụ ‘ọrụ dị mkpa.’ Dị ka ihe atụ, ndị okenye nwere ike ime ndokwa ka e gbooro ndị agadi na-erubere Jehova isi mkpa ha. (Jems 1:27) Ụfọdụ ndị okenye so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ahazi mgbakọ, ma ọ bụ soro na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. Ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ na-agbasachaghị ịzụ atụrụ Chineke ma ọ bụ izi ihe. Ụmụ nwoke a niile a họpụtara ekwesịghị ikwe ka ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ nakwa ná nzukọ Jehova mee ka ha hapụ ọrụ Chineke nyere ha, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.​—1 Kọr. 9:16.

“Okwu Chineke Nọ Na-agbasa” (Ọrụ 6:7)

21, 22. Olee ihe gosiri na Jehova gọziri ọgbakọ ọhụrụ ahụ?

21 Jehova nyeere ọgbakọ ọhụrụ ahụ aka imeri mkpagbu ndị iro ha nọ na-akpagbu ha nakwa nsogbu nke chọrọ ịkpatara ha nkewa. O doro anya na Jehova gọziri ọgbakọ a n’ihi na a gwara anyị, sị: “Okwu Chineke nọ na-agbasa, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọkwa na-ehikwu nne n’ike n’ike na Jeruselem. Ọtụtụ ndị nchụàjà ghọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 6:7) Ihe a bụ naanị otu n’ime akụkọ ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nke gosiri otú Jehova si na-agọzi ọgbakọ ahụ. (Ọrụ 9:31; 12:24; 16:5; 19:20; 28:31) Ọ̀ bụ na obi anaghị adị anyị ụtọ ma anyị nụ akụkọ na-egosi otú ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke si aga n’ihu n’ebe ndị ọzọ n’ụwa?

22 N’oge ndịozi Jizọs, ndị isi okpukpe iwe ji akwụsịghị ịkpagbu ndị Chineke. Mkpagbu ọzọ a ga-akpagbu ha eruwela ka mmiri. N’oge na-adịghị anya, ọ bụ Stivin ka ha ga-emekpọ ọnụ, dị ka anyị ga-ahụ n’Isi nke 6.

GAMELIEL BỤ ONYE RABAỊ A NA-AKWANYERE ÙGWÙ

Ihe e ji mara Gameliel e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi bụ Gameliel nke Okenye, nwa nwa Hilel, onye kụziiri ụfọdụ ndị Farisii ka ha ghara ịdị aka ike ka ndị Farisii ndị ọzọ. Gameliel bụ onyeisi ndị Sanhedrin. Ọ bụ onye Rabaị a na-akwanyere ezigbo ùgwù nke na ọ bụ ya bụ onye mbụ e turu aha bụ́ “Raban.” Akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishna sịrị: “Mgbe Raban Gameliel nke Okenye nwụrụ, ọ dịzi ka à ga-asị na Iwu ndị Juu so ya nwụọ, Iwu ahụ enweghịzi ùgwù.” E kwuru na e nwere ọtụtụ mkpebi o mere iji nyere ndị mmadụ aka. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica sịrị: “Otu ihe dị mkpa o kpebiri bụ iwu o nyere na nwaanyị di ya nwụrụ nwere ike ịlụgharị di ma ọ bụrụ na otu onye agbaa akaebe na di ya anwụọla.” A sịkwara na o tiri iwu ndị mere ka ụmụ nwoke arụrụala ghara imegbu ndị nwunye ha nakwa ka ụmụ ọjọọ ghara imegbu nne ha di ya na-anọghịzi. O kwukwara na e kwesịrị inye ndị Jentaịl dara ogbenye ikike ịtụtụ ihe e wefọrọ n’ubi otú ahụ e nyere ndị Juu dara ogbenye.

a Gụọ igbe bụ́ “Sanhedrin Bụ Ụlọikpe Ndị Juu Kacha Elu.”

b Ihe a bụ nke mbụ n’ime ihe dị ka ugboro iri abụọ e kwuru gbasara ndị mmụọ ozi n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. N’Ọrụ Ndịozi 1:10, a kpọrọ ha ‘ụmụ nwoke ndị yi uwe ọcha.’

c Gụọ igbe bụ́ “Gameliel Bụ Onye Rabaị A Na-akwanyere Ùgwù.”

d Gụọ igbe bụ́ “Ikwusa Ozi Ọma ‘n’Ụlọ n’Ụlọ.’”

e Ọ ga-abụ na ụmụ nwoke ahụ nwere àgwà e ji ama ndị ruru eru ịbụ ndị okenye n’agbakọ n’ihi na ‘ọrụ ahụ dị mkpa’ abụghị obere ọrụ. Ma, Akwụkwọ Nsọ ekwughị hoo haa mgbe a malitere ịhọpụta ndị okenye ma ọ bụ ndị nlekọta n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

f N’oge ndịozi Jizọs, e nyere ụmụ nwoke ụfọdụ ruru eru ikike ịhọpụta ndị okenye. (Ọrụ 14:23; 1 Tim. 5:22; Taị. 1:5) N’oge anyị a, ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị nlekọta sekit. Ọ bụzi ndị nlekọta sekit ka e nyere ọrụ ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya