-
“Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
7, 8. Gịnị ka iwu mmụọ ozi nyere ndịozi Jizọs mere ka ha mee, oleekwa ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
7 Mgbe ndịozi Jizọs nọ n’ụlọ mkpọrọ na-eche ka e kpee ha ikpe, o nwere ike ịbụ na ha na-eche na ndị iro ha ga-egbu ha n’ihi okwukwe ha. (Mat. 24:9) Ma n’abalị, ihe a na-atụghị anya ya mere. “Mmụọ ozi Jehova meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ.”b (Ọrụ 5:19) Mmụọ ozi ahụ gwara ha kpọmkwem ihe ha ga-eme. Ọ sịrị ha: “Gaanụ n’ụlọ nsọ, na-agwakwanụ ndị mmadụ” okwu. (Ọrụ 5:20) O doro anya na iwu a e nyere ndịozi Jizọs mere ka obi sie ha ike na ihe ha na-eme dị mma. O nwekwara ike ịbụ na ihe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara ha mere ka obi sie ha ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Okwukwe na obi ike ndịozi ahụ nwere mere ka ha ‘banye n’ụlọ nsọ mgbe chi bọrọ ma malite ịkụziri ndị mmadụ ihe.’—Ọrụ 5:21.
-
-
“Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
b Ihe a bụ nke mbụ n’ime ihe dị ka ugboro iri abụọ e kwuru gbasara ndị mmụọ ozi n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. N’Ọrụ Ndịozi 1:10, a kpọrọ ha ‘ụmụ nwoke ndị yi uwe ọcha.’
-