Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 8 p. 60-67
  • ‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Gịnị Mere I Ji Na-akpagbu M?” (Ọrụ 9:1-5)
  • “Sọl, Nwanna M, Onyenwe Anyị . . . Zitere M” (Ọrụ 9:6-17)
  • “Ọ Malitere Kwusawa . . . na Jizọs Bụ Ọkpara Chineke” (Ọrụ 9:18-30)
  • ‘Ọtụtụ Ndị Kweere n’Onyenwe Anyị’ (Ọrụ 9:31-43)
  • Jizọs Họọrọ Sọl
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • N’ụzọ Damaskọs
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Sọl Ezute Ndị Enyi Ya Ochie Na Ndị Bụ́bu Ndị Iro Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 8 p. 60-67

ISI NKE 8

‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’

Sọl, onye obi tara mmiri na-akpagbu ọgbakọ, ghọrọ onye ozi na-anụ ọkụ n’obi

O Si n’Ọrụ Ndịozi 9:1-43

1, 2. Gịnị ka Sọl chọrọ ịga mee na Damaskọs?

E NWERE ụmụ nwoke ihu atọ ọchị nọ n’okporo ụzọ na-eme njem. Ọ fọrọ obere ka ha rute Damaskọs, bụ́ ebe ha chọrọ ịga rụọ arụrụala. Ha ga-aga n’ụlọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị ha kpọrọ asị, kee ha agbụ, menye ha ihere, kpụrụkwa ha gaa Jeruselem ka ụlọikpe Sanhedrin taa ha ahụhụ.

2 Aha onyeisi ha bụ Sọl. E nweela mgbe o so gbuo mmadụ.a N’oge na-adịbeghị anya, obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ nọ na-ekiri ndị ibe ya okpukpe ha na-agba ara ka ha ji nkume tụgbuo Stivin, ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 7:57–8:1) Mana, imesi ndị na-eso ụzọ Jizọs bi na Jeruselem ike ezurughị Sọl. Ọ malitekwara ịkpagbu Ndị Kraịst nọ n’obodo ndị ọzọ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ chọrọ ikpochapụ ndị okpukpe ahụ a na-akpọ “Ụzọ Onyenwe anyị.”—Ọrụ 9:1, 2; gụọ igbe bụ́ “Ikike Sọl Nwere na Damaskọs.”

3, 4. (a) Gịnị mere Sọl? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Na mberede, ìhè na-achachi anya nwuru gburugburu Sọl. Ndị ha na ya so hụrụ ìhè ahụ, o nyeghịkwa ha ọnụ okwu. Ìhè ahụ mere ka ìsì kpuo Sọl, ya adaa n’ala. Ọ naghịzi ahụ ụzọ. Ọ nụziri olu si n’eluigwe nke sịrị ya: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Ihe a juru Sọl anya, ya ajụọ, sị: “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?” Ọ ga-abụrịrị na ihe a zara Sọl enyeghị ya ọnụ okwu. Olu ahụ zara ya, sị: “Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu.”—Ọrụ 9:3-5; 22:9.

4 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe mbụ a Jizọs gwara Sọl? Olee uru anyị ga-erite ma anyị mụọ ihe ndị mere mgbe Sọl ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs? Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’ihe ọgbakọ Ndị Kraịst ji oge obi ruru ha ala mee mgbe Sọl chegharịrị?

IKIKE SỌL NWERE NA DAMASKỌS

Olee otú Sọl si nweta ikike ịga n’obodo ọzọ jide Ndị Kraịst? Ụlọikpe Sanhedrin na nnukwu onye nchụàjà nwere ikike ịgwa ndị Juu n’ebe ọ bụla ha bi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ ga-abụkwa na nnukwu onye nchụàjà nwere ikike ikwu ka e si ná mba ọzọ kpọrọ ndị omekome lọta Jeruselem ka e kpee ha ikpe. N’ihi ya, ndị okenye nọ n’ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs ga-eme ihe e kwuru n’akwụkwọ ozi nnukwu onye nchụàjà detaara ha.—Ọrụ 9:1, 2.

Ndị Rom nyekwara ndị Juu ikike ikpe ndị obodo ha ikpe. Ọ bụ ya mere ndị Juu ji nwee ikike ịpịa Pọl onyeozi “ọnụ ụtarị iri atọ na itoolu ugboro ise.” (2 Kọr. 11:24) Akwụkwọ Makabii nke Mbụ kwuru banyere akwụkwọ ozi onye nnọchiteanya Rom degaara Tọlemi nke Asatọ bụ́ eze Ijipt n’afọ 138 T.O.N.K. Akwụkwọ ozi ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na e nwere ndị arụrụala si n’obodo ha [dị na Judia] gbata n’obodo unu, kpụrụnụ ha kpụgara Saịmọn nnukwu onye nchụàjà ka ọ taa ha ahụhụ otú iwu ha kwuru.” (1 Makabii 15:21) N’afọ 47 T.O.N.K., Juliọs Siza kwadoro ikike e nyeburu nnukwu onye nchụàjà, kwuokwa na e nyekwara ya ikike idozi okwu ọ bụla ndị Juu nwere gbasara omenala ha.

“Gịnị Mere I Ji Na-akpagbu M?” (Ọrụ 9:1-5)

5, 6. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jizọs gwara Sọl?

5 Mgbe Jizọs kwụsịrị Sọl n’ụzọ Damaskọs, ọ jụghị ya: “Gịnị mere i ji na-akpagbu ndị na-eso ụzọ m?” Dị ka anyị kwuburu, ọ sịrị ya: “Gịnị mere i ji na-akpagbu m?” (Ọrụ 9:4) N’eziokwu, ọ na-adị Jizọs ka ọ̀ bụ ya ka a na-akpagbu ma a kpagbuwe ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 25:34-40, 45.

6 Ọ bụrụ na a na-emesi gị ike maka na i nwere okwukwe na Kraịst, obi sie gị ike na Jehova na Jizọs ma ihe na-eme gị. (Mat. 10:22, 28-31) E nwere ike Jehova agaghị ewepụ ọnwụnwa ahụ ugbu a. Cheta na Jizọs hụrụ mgbe Sọl nọ na-akwado ka e gbuo Stivin, hụkwa mgbe Sọl na-aga n’ụlọ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na Jeruselem na-akpụrụ ha. (Ọrụ 8:3) N’agbanyeghị na Jizọs hụrụ ihe niile ahụ, ọ kwụsịghị mkpagbu ahụ mgbe ahụ. Ma, Jehova si n’aka Kraịst nye Stivin na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ume ha ji rubere ya isi.

7. Gịnị ka ị ga na-eme ka i nwee ike idi mkpagbu?

7 I nwekwara ike idi mkpagbu a na-akpagbu gị ma i mee ihe ndị a: (1) Kpebisie ike na ị ga na-erubere Jehova isi, ihe ọ sọkwara ya mee. (2) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. (Fil. 4:6, 7) (3) Hapụrụ Jehova ọbọ. (Rom 12:17-21) (4) Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji na-atachi obi ruo mgbe ọ ga-ewepụ ọnwụnwa ahụ.—Fil. 4:12, 13.

“Sọl, Nwanna M, Onyenwe Anyị . . . Zitere M” (Ọrụ 9:6-17)

8, 9. Olee otú ọ ga-abụ na obi dị Ananayas maka ọrụ e nyere ya?

8 Mgbe Jizọs zachara Sọl ajụjụ ọ jụrụ ya nke bụ́, “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?,” Jizọs sịrị ya: “Bilie banye n’obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.” (Ọrụ 9:6) Ebe Sọl na-anaghịzi ahụ ụzọ, e du ya edu gaa n’ebe ọ ga-anọ na Damaskọs. Ọ nọ ebe ahụ buo ọnụ ma kpee ekpere ruo ụbọchị atọ. Ka ihe a na-eme, Jizọs gwara otu onye na-eso ụzọ ya nọ n’obodo ahụ banyere Sọl. Aha onye ahụ bụ Ananayas, ‘onye ndị Juu niile bi na Damaskọs na-ekwu okwu ọma banyere ya.’—Ọrụ 22:12.

9 Chegodị otú obi dị Ananayas. Ọ ga-abụ na obi akachaghị ya. Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye a kpọlitere n’ọnwụ, Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, na-agwa ya okwu ma họrọ ya ka ọ gaa rụọ ọrụ pụrụ iche. Ọ bụ nnukwu ùgwù ka a kwanyeere ya nye ya ọrụ ahụ. Mana, ọrụ ahụ adịghị mfe. Mgbe Jizọs gwara Ananayas ka ọ gaa gwa Sọl okwu, Ananayas sịrị: “Onyenwe anyị, anụla m ihe ọtụtụ ndị na-ekwu gbasara nwoke a. Ha na-ekwu gbasara ihe ọjọọ niile o mere ndị nsọ gị na Jeruselem. Ndị isi nchụàjà nyekwara ya ikike ka ọ kpụta ndị niile na-eso ụzọ gị.”—Ọrụ 9:13, 14.

10. Gịnị ka otú Jizọs si meso Ananayas ihe na-akụziri anyị gbasara Jizọs?

10 Jizọs abaraghị Ananayas mba maka na o kwuru ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Ma, Jizọs gwara ya hoo haa ihe ọ ga-eme. Jizọs kwanyekwaara ya ùgwù gwa ya ihe mere o ji chọọ ka ọ rụọ ọrụ ahụ pụrụ iche. Jizọs kwuru banyere Sọl, sị: “Ahọrọla m nwoke a ka ọ gbaara ndị mba ọzọ, ndị eze nakwa ndị Izrel àmà gbasara m. M ga-eme ka ọ mara ahụhụ niile ọ ga-ata n’ihi aha m.” (Ọrụ 9:15, 16) Ananayas rubeere Jizọs isi ozugbo. Ọ gara chọta Sọl onye na-akpagbu Ndị Kraịst ma sị ya: “Sọl, nwanna m, Onyenwe anyị Jizọs, onye pụtara n’ihu gị mgbe ị nọ n’ụzọ na-abịa, zitere m, ka i wee hụwa ụzọ ma jupụta na mmụọ nsọ.”—Ọrụ 9:17.

11, 12. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ a kọrọ banyere Jizọs, Ananayas, na Sọl?

11 E nwere ọtụtụ ihe anyị na-amụta n’akụkọ a a kọrọ banyere Jizọs, Ananayas, na Sọl. Dị ka ihe atụ, anyị mụtara na Jizọs na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma otú o kwere nkwa na ọ ga-eme. (Mat. 28:20) Ọ bụ eziokwu na Jizọs anaghị esi n’eluigwe agwa ndị mmadụ okwu taa, ọ na-esi n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye ọ họpụtara ilekọta ezinụlọ ya, na-eduzi ọrụ a. (Mat. 24:45-47) Òtù Na-achị Isi na-ezipụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ ka ha gaa chọta ndị chọrọ ịmatakwu banyere Kraịst. N’isi nke 7, anyị kwuru na e nweela ọtụtụ ndị dị otú ahụ kpere ekpere ka Chineke zi ha ụzọ, obere oge, Ndịàmà Jehova abịa n’ụlọ ha.—Ọrụ 9:11.

12 Ananayas rubere isi, gaa rụọ ọrụ ahụ e nyere ya, Chineke gọzikwara ya. Ị̀ na-erube isi n’iwu e nyere anyị ka anyị na-agba àmà nke ọma, ọ bụrụgodị na obi akachaghị gị? Ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, na-aga agwa ndị anyị na-amaghị okwu, na-eme ka obi wụba ụfọdụ n’ime anyị n’afọ. Ọ na-esiri ndị ọzọ ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’ahịa ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ha, n’okporo ámá, ma ọ bụkwanụ iji telefon ma ọ bụ akwụkwọ ozi ezi ha ozi ọma. Ananayas kwụsịrị ịtụ ụjọ. Ọ bụ ya mere o ji nwee ihe ùgwù ime ka mmụọ nsọ dakwasị Sọl.b Ananayas meliri ihe a maka na ọ tụkwasịrị Jizọs obi, werekwa Sọl ka onye ga-abụ nwanna ya. Anyị nwere ike ịkwụsị ịtụ ụjọ ma anyị mee ka Ananayas, tụkwasị Jizọs obi na ọ bụ ya na-eduzi ozi ọma anyị na-ezisa, na-enwekwara ndị mmadụ ọmịiko, ma weredị ndị ọtụtụ ndị kacha atụ ụjọ ka ndị nwere ike ịbụ ụmụnna anyị.—Mat. 9:36.

“Ọ Malitere Kwusawa . . . na Jizọs Bụ Ọkpara Chineke” (Ọrụ 9:18-30)

13, 14. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma e mebeghị gị baptizim, gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe Sọl mere?

13 Sọl mere ihe ọ mụtara ozugbo. Mgbe a gwọchara ya, e mere ya baptizim, ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Damaskọs amalite ịkpachi anya. Ma e nwere ihe ọzọ o mere. “N’egbughị oge, ọ malitere kwusawa n’ụlọ nzukọ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.”—Ọrụ 9:20.

14 Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma e mebeghị gị baptizim, ị̀ ga-eme ka Sọl, mee ihe ị mụtara n’egbughị oge? N’eziokwu, Sọl ji anya ya hụ ọrụ ebube Kraịst rụrụ. O dokwara anya na ihe a so mee ka o kpebie ime baptizim. Ma e nwere ndị ọzọ hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị Farisii hụrụ mgbe Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. E nwekwara ọtụtụ ndị Juu ma na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ n’ime ha enweghị mmasị iso Jizọs, ụfọdụ nọdị na-emegide ya. (Mak 3:1-6; Jọn 12:9, 10) Ma Sọl gbanwere obi ya. Gịnị mere Sọl ji gbanwee n’agbanyeghị na ndị ọzọ kpọrọ ekwo nkụ? Ọ bụ n’ihi na ọ tụrụ Chineke egwu karịa mmadụ. Obi dịkwa ya ezigbo ụtọ maka ebere Kraịst meere ya. (Fil. 3:8) Ọ bụrụ na i mee ka ya, ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie gị iso na-ekwusa ozi ọma na ịgbalịsi ike ka i ruo eruo ime baptizim.

15, 16. Gịnị ka Sọl mere n’ụlọ nzukọ ndị Juu, gịnịkwa ka ndị Juu nọ na Damaskọs mere?

15 Chegodị otú obi dị ndị mmadụ mgbe ha hụrụ ka Sọl malitere ikwusa banyere Jizọs n’ụlọ nzukọ ndị Juu. O juru ụfọdụ ndị anya, wụọ ụfọdụ ndị akpata oyi n’ahụ́, weekwa ụfọdụ ndị iwe. Ha jụrụ, sị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-emesi ndị na-eso ụzọ Jizọs ike na Jeruselem?” (Ọrụ 9:21) Mgbe Sọl na-akọwara ndị Juu ihe mere o ji kweta na Jizọs bụ Kraịst, ihe ọ kọwaara ha “doro nnọọ anya, ha enweghịkwa ike ịgbagha ihe o kwuru.” (Ọrụ 9:22) Ma, ọ bụrụgodị na a kọwara ihe nke ọma, ọ bụghị mmadụ niile na-ekweta ya. Ịkọwa ihe nke ọma enweghị ike ime ka ndị niile omenala ma ọ bụ mpako mere ka obi ha kpọchie gbanwee. Ma, Sọl adaghị mbà.

16 Mgbe afọ atọ gachara, ndị Juu nọ na Damaskọs ka nọ na-emegide Sọl. Ha mechara chọwa igbu ya. (Ọrụ 9:23; 2 Kọr. 11:32, 33; Gal. 1:13-18) Mgbe Sọl matara gbasara nkata ha na-akpa, o kwetara ka e si n’oghere dị ná mgbidi jiri nkata butuo ya, ya esizie n’obodo ahụ pụọ. Luk kpọrọ ndị nyeere Sọl aka ịgbapụ n’abalị ahụ “ndị ọ kụziiri ihe.” (Ọrụ 9:25) Ihe a Luk kpọrọ ha gosiri na e nwere ụfọdụ ndị nabatara ozi ọma Sọl kwusara na Damaskọs ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.

17. (a) Olee ihe dị iche iche ndị mmadụ na-eme ma a kụziere ha eziokwu dị na Baịbụl? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme? Maka gịnị?

17 Mgbe ị malitere ịgwa ndị ezinụlọ unu, ndị enyi gị, na ndị ọzọ ihe ọma ndị ị na-amụta na Baịbụl, i nwere ike ịna-atụ anya na ha niile ga-anabata eziokwu dị na Baịbụl maka na ha esighị ike nghọta. Ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị nabatara ya, ma ọtụtụ ndị emeghị otú ahụ. O nwedịrị ike ịbụ na ndị ezinụlọ unu mesoro gị omume ka ị̀ bụ onye iro ha. (Mat. 10:32-38) Ma, ọ bụrụ na ị na-amụtakwu otú ị ga na-esi enyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ, ọ bụrụkwa na ị na-akpa àgwà ka Onye Kraịst, ndị na-emegide gị nwedịrị ike imecha chegharịa.—Ọrụ 17:2; 1 Pita 2:12; 3:1, 2, 7.

18, 19. (a) Mgbe Banabas gbachiteere Sọl, gịnị mere? (b) Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Banabas na Sọl?

18 Mgbe Sọl bịara Jeruselem, obi esichaghị ndị na-eso ụzọ Jizọs ike na ọ bụzi onye na-eso ụzọ Jizọs otú o kwuru na ya bụ. Anyị ghọtakwara ihe kpatara ya. Ma mgbe Banabas gbachiteere Sọl, ndịozi Jizọs nabatara ya, ya na ha anọtụ. (Ọrụ 9:26-28) Sọl kpachapụrụ anya, ma ihere ozi ọma emeghị ya. (Rom 1:16) O ji obi ike kwusaa ozi ọma na Jeruselem, bụ́ ebe ọ nọ malite imesi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ike. O wutere ndị Juu nọ na Jeruselem na onye ha chere ga-enyere ha aka kpochapụ Ndị Kraịst bụzi onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, ha chọwara otú ha ga-esi egbu ya. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ụmụnna matara gbasara ihe a, ha kpọgara ya Sizaria ma ziga ya Tasọs.” (Ọrụ 9:30) Sọl mere ihe Jizọs si n’aka ọgbakọ Ndị Kraịst gwa ya. Ihe a baara ma Sọl ma ọgbakọ ahụ uru.

19 Ị̀ hụrụ na Banabas nyeere Sọl aka n’echeghị ka a gwa ya agwa? O doro anya na ihe a o meere ya mere ka ha abụọ, bụ́ ndị na-anụrụ ofufe Jehova ọkụ n’obi, bụrụ ezigbo enyi. Ị̀ na-eme ka Banabas, jiri obi gị niile na-akwado ndị ọhụrụ nọ n’ọgbakọ unu, soro ha na-aga ozi ọma, na-enyekwara ha aka ịna-emekwu nke ọma? Chineke ga-agọzi gị nke ukwuu ma ị na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na ị ka malitere ikwusa ozi ọma amalite, ị̀ na-ekwe ka e nyere gị aka otú Sọl mere? Ọ bụrụ na gị na ndị bụ́ aka ochie n’ikwusa ozi ọma ana-eso aga ozi ọma, ị ga-amụtakwu otú e si ezi ozi ọma, na-enwekwu ọṅụ, nwetakwa ndị gị na ha nwere ike ịbụ ezigbo enyi ná ndụ gị niile.

‘Ọtụtụ Ndị Kweere n’Onyenwe Anyị’ (Ọrụ 9:31-43)

20, 21. Olee otú ndị ohu Chineke si jiri oge ‘obi ruru ha ala’ mee ihe bara uru, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a?

20 Mgbe Sọl ghọrọ Onye Kraịst ma mechaa si na Jeruselem gbapụ, “obi malitere iru ọgbakọ niile dị na Judia na Galili na Sameria ala.” (Ọrụ 9:31) Olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ‘oge ahụ dị mma’ mee? (2 Tim. 4:2) Baịbụl kwuru na ‘okwukwe ha nọ na-esikwu ike.’ Ndịozi Jizọs na ụmụnna ndị ọzọ e nyere ọrụ mere ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs sie ike, ha nyekwaara ọgbakọ ahụ aka ka “ha na-atụ egwu Jehova, mmụọ nsọ ana-akasikwa ha obi.” Dị ka ihe atụ, Pita ji oge ahụ mee ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs bi n’obodo Lida na Sharọn sie ike. Mbọ ọ gbara mere ka ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ ‘kwere n’Onyenwe anyị.’ (Ọrụ 9:32-35) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ekweghị ka oké ọchịchọ megharịa ha anya, kama ha gbalịsiri ike na-enyere ibe ha aka ma na-ekwusa ozi ọma. Ihe a mere ka ọgbakọ ahụ “na-ehikwu nne.”

21 N’ihe dị ka afọ 1990, “obi malitere iru” Ndịàmà Jehova nọ n’ọtụtụ mba ala otú o ruru Ndị Kraịst oge mbụ. Ọchịchị ndị nọ na-emesi ndị Chineke ike ruo ọtụtụ iri afọ kwụsịrị ịchị na mberede. N’ihi ya, a kagburu ihe ụfọdụ a machiboro anyị iwu ime. Ná mba ụfọdụ, a kagbuchara ha kpamkpam. Ọtụtụ iri puku Ndịàmà Jehova ji ohere ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ihu ọha. Ọtụtụ ndị gekwara ntị.

22. Ọ bụrụ na a machighị ikwusa ozi ọma n’obodo unu, olee otú ị ga-esi jiri oge a na-eme ihe bara uru?

22 Ọ bụrụ na a machighị ikwusa ozi ọma n’obodo unu, ì ji oge a na-eme ihe bara uru? Ọ bụrụ na i bi n’obodo ebe ndị mmadụ nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha, Setan ga-achọ ime ka i jiri oge gị niile na-achụ akụnụba, kama ife Jehova. (Mat. 13:22) Ekwela ka o megharịa gị anya. Jiri oge ọ bụla obi ruru Ndị Kraịst ala n’obodo unu mee ihe bara uru. Were ya ka ohere i nwere iji gbaa àmà nke ọma na ime ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ sie ike. Cheta na ihe nwere ike ịgbanwe na mberede.

23, 24. (a) Olee ihe ndị anyị na-amụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Tabita? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

23 Chegodị banyere ihe mere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Tabita, ma ọ bụ Dọkas. O biri na Jọpa, bụ́ obodo dị nso na Lida. Nwanna nwaanyị ahụ hụrụ Jehova n’anya ji oge ya na ihe o nwere mee ihe bara uru. “Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-enyekwara ndị ogbenye aka.” Ma ọrịa bịara ya na mberede, ya anwụọ.c Ọnwụ ya mere ka ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Jọpa ruo uju nke ukwuu, karịchaa, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ndị o meere ihe ọma. Mgbe Pita rutere n’ụlọ ebe a nọ na-akwadebe ozu ya maka olili, ọ rụrụ ọrụ ebube ndịozi Jizọs Kraịst na-arụtụbeghị. Pita kpere ekpere ma mee ka Tabita si n’ọnwụ bilie. Chegodị otú obi si tọọ ụmụ nwaanyị ahụ na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ụtọ mgbe Pita kpọbatara ha n’ime ụlọ ahụ ma kpọnye ha Tabita. Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ merenụ mere ka obi sie ha ike maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ha. O doro anya na akụkọ ọrụ ebube a “gbasara na Jọpa niile, ọtụtụ ndị kwekwaara n’Onyenwe anyị.”—Ọrụ 9:36-42.

Ebe otu nwanna nwaanyị na-enye nwanna nwaanyị ọzọ merela agadi okooko osisi.

Olee otú ị ga-esi na-eme ka Tabita?

24 E nwere ihe abụọ dị mkpa anyị na-amụta n’akụkọ ọma a a kọrọ banyere Tabita. Nke mbụ bụ na anyị ejighị ndụ anyị n’aka. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị meere onwe anyị ezigbo aha n’ebe Chineke nọ ugbu a anyị dị ndụ. (Ekli. 7:1) Nke abụọ abụrụ na olileanya anyị nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ga-emezu. Jehova hụrụ ọtụtụ ihe ọma Tabita mere ma kwụọ ya ụgwọ. Ọ ga-echeta ọrụ anyị rụsiri ike ma kpọlite anyị n’ọnwụ ma ọ bụrụ na anyị anwụọ tupu Amagedọn. (Hib. 6:10) N’ihi ya, ma ànyị nọ “n’oge nsogbu” ugbu a ma ọ̀ bụ n’oge ‘obi ruru anyị ala,’ ka anyị nọgidesie ike na-agba àmà nke ọma banyere Kraịst.—2 Tim. 4:2.

SỌL, ONYE FARISII

“Nwa okorobịa a na-akpọ Sọl,” onye e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi mgbe a na-atụ Stivin nkume, bụ onye Tasọs. Tasọs bụ isi obodo ndị Rom aha ya bụ Silishia. Ọ dị n’ebe ndịda obodo Tọki n’oge anyị a. (Ọrụ 7:58) Ọtụtụ ndị Juu biri n’obodo ahụ. Sọl dere banyere onwe ya, sị: “E biri m úgwù n’ụbọchị nke asatọ. Abụ m onye Izrel. Esi m n’ebo Benjamin. Abụ m onye Hibru, onye ndị Hibru mụrụ. A bịa n’idebe iwu, abụ m onye Farisii.” Ihe a mere ka ọ bụrụ onye Juu a na-akwanyere ezigbo ùgwù.—Fil. 3:5.

Sọl, Onye Farisii.

Obodo Sọl bụ nnukwu obodo e ji azụmahịa mara, nke ndị bi na ya bara ọgaranya. E jikwa omenala ndị Grik mara obodo a. Ebe ọ bụ na Sọl toro na Tasọs, ọ ma asụsụ Grik. Ọ ga-abụ na ụlọ akwụkwọ praịmarị ọ gara bụ nke ndị Juu. Sọl mụtara ịkpa ákwà ụlọikwuu, bụ́ ọrụ ọtụtụ ndị na-arụ n’obodo ọ nọ too. O nwere ike ịbụ na Sọl mụrụ ọrụ ahụ n’aka nna ya mgbe ọ ka na-eto eto.—Ọrụ 18:2, 3.

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwukwara na Sọl bụ nwa amaala Rom malite mgbe a mụrụ ya. (Ọrụ 22:25-28) Ihe ọ pụtara bụ na nna Sọl ma ọ bụ nna nna ya nwetara ikike ịbụ nwa amaala Rom mgbe a na-amụbeghị ya. Anyị amaghị otú ezinụlọ Sọl si nweta ikike ịbụ ụmụ amaala Rom. N’agbanyeghị otú ha si nweta ya, ikike ahụ mere ka ha soro ná ndị ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ha. Ezinụlọ a mụrụ Sọl na akwụkwọ ọ gụrụ mere ka omenala ndị Rom, nke ndị Juu, na nke ndị Grik doo ya anya nke ọma.

Ọ ga-abụ mgbe Sọl na-agafebeghị afọ iri na atọ ka ọ gawara Jeruselem ịga gụkwuo akwụkwọ. Isi na Tasọs ruo Jeruselem dị narị kilomita asatọ na iri anọ (840). Ọ bụ Gameliel, onye a na-akwanyere ezigbo ùgwù, onye na-akụzikwa omenala ndị Farisii, kụziiri Sọl ihe na Jeruselem.—Ọrụ 22:3.

E nwere ike iji ụlọ akwụkwọ ahụ ọ gara tụnyere ịga mahadum n’oge anyị a. Ihe a na-akụziri ụmụ akwụkwọ na ya bụ Akwụkwọ Nsọ na iwu ndị Juu a na-edeghị ede, kụziekwara ha ka ha bute ha n’isi. Ọ bụrụ na nwa akwụkwọ Gameliel emee nke ọma, ọ ga-atụ anya inweta ezigbo ọrụ. O doro anya na Sọl bụ ụdị nwa akwụkwọ ahụ. O mechara dee, sị: “M nọkwa na-eme nke ọma n’okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ ndị ọgbọ m ná mba anyị, n’ihi na m na-anụrụ omenala nna nna m hà ọkụ n’obi nke ukwuu.” (Gal. 1:14) N’eziokwu, ọ bụ otú Sọl si na-anụrụ omenala ndị Juu ọkụ n’obi mere o ji jiri obi ọjọọ na-akpagbu ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ ka malitere amalite.

TABITA “NA-ARỤ ỌTỤTỤ ỌRỤ ỌMA”

Ebe Tabita na-enye onye rịọrọ ya arịrịọ onyinye.

Tabita nọrọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị n’obodo Jọpa. E nwere ọdụ ụgbọ mmiri n’obodo a. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ hụrụ Tabita n’anya maka na “ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-enyekwara ndị ogbenye aka.” (Ọrụ 9:36) O nwere aha abụọ otú ọtụtụ ndị Juu bi n’ebe ndị e nwere ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nwere. Otu bụ aha Hibru ma ọ bụ Arameik, nke ọzọ abụrụ aha Grik ma ọ bụ Latịn. Otú e si dee aha Grik ya bụ́ Dọkas n’asụsụ Arameik bụ “Tabita.” Aha abụọ ahụ pụtara “Nne Mgbada.”

Ọ ga-abụ na Tabita dara ọrịa ma nwụọ na mberede. A sara ya ahụ́ iji kwadebe ya maka olili, otú e si eme n’omenala ha. E busara ozu ya n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu. Ebe ahụ nwere ike ịbụ ụlọ ya. N’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, a na-elikarị mmadụ n’ụbọchị onye ahụ nwụrụ ma ọ bụ n’echi ya n’ihi otú ebe ndị ahụ si ekpo ọkụ. Ndị Kraịst nọ na Jọpa anụla na Pita onyeozi nọ n’obodo dị nso a na-akpọ Lida. A ka nwetụrụ oge buru ibu Pita ga-eji abịarute Jọpa tupu e lie Tabita ebe ọ bụ na isi Lida gaa Jọpa dị naanị kilomita iri na asatọ. Ọ ga-ewe onye ji ụkwụ ihe dị ka awa anọ. N’ihi ya, ọgbakọ ahụ dunyere ụmụ nwoke abụọ ka ha gaa gwa Pita ka ọ bịa n’egbughị oge. (Ọrụ 9:37, 38) Otu ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl kwuru, sị: “Ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu n’oge ochie na-edunyekarị ndị mmadụ ozi abụọ abụọ. Ihe so n’ihe mere ha ji eme ya bụ ka otu onye nwee ike ịgba akaebe ihe onye nke ọzọ kwuru.”

Gịnị mere mgbe Pita bịarutere? Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gwara anyị, sị: “Ha duuru ya gaa n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu. Ụmụ nwaanyị isi mkpe niile bịakwutekwara ya na-ebe ákwá, na-egosi ya ọtụtụ uwe mwụda na uwe ndị ọzọ Dọkas kwaara ha mgbe ọ dị ndụ.” (Ọrụ 9:39) Otu n’ime ihe mere ndị nọ n’ọgbakọ Tabita ji hụ ya n’anya bụ na ọ na-akwara ha ákwà. Ọ kwaara ha uwe a na-eyi n’ime nakwa nke a na-eyi n’elu. Baịbụl ekwughị ma Tabita ò ji ego ya zụọ ákwà ndị ahụ ọ kwaara ha ka hà wetaara ya ákwà, ya akwaara ha. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe mere e ji hụ ya n’anya bụ na ọ dị obiọma, “na-enyekwara ndị ogbenye aka.”

Ọ ga-abụrịrị na ihe Pita hụrụ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu metụrụ ya n’ahụ́. Richard Lenski, bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl, kwuru, sị: “Uju e ruru ebe a adịtụdịghị ka nke e ruru n’ụlọ Jaịrọs, bụ́ ebe ụmụ nwaanyị a kwụrụ ụgwọ ka ha bee ákwà nọ na-ebe ákwà, ndị na-egbu ọjà ana-egbukwa ọjà, a na-eme mkpọtụ ebe niile. Uju e ruru ebe a abụghị nke ihu abụọ.” (Mat. 9:23) O si ha n’obi. Ebe ọ bụ na e nwetụghị ebe Baịbụl kwuru ma Tabita ò nwere di ma ọ̀ bụ na o nweghị, ọtụtụ ndị kweere na ọ lụghị di.

Mgbe Jizọs nyere ndịozi ya ọrụ ha ga-arụ, o nyere ha ike ‘ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.’ (Mat. 10:8) Pita hụrụ mgbe Jizọs rụrụ ụdị ọrụ ebube ahụ, hụkwa mgbe ọ kpọlitere ada Jaịrọs n’ọnwụ. Ma tupu Pita akpọlite Tabita, e nwebeghị ebe Baịbụl kwuru na onyeozi Jizọs kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. (Mak 5:21-24, 35-43) Pita gwaziri ndị niile nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu ka ha pụọ, ya ekpesie ekpere ike. Tabita meghere anya ya ma bilie nọrọ ọdụ. Chegodị otú obi si tọọ Ndị Kraịst nọ na Jọpa ezigbo ụtọ mgbe Pita kpọnyere ndị nsọ na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ Tabita ná ndụ, bụ́ onye ha hụrụ n’anya.—Ọrụ 9:40-42.

a Gụọ igbe bụ́ “Sọl, Onye Farisii.”

b Ọ na-abụkarị naanị ndịozi Jizọs na-eme ka mmụọ nsọ dakwasị ndị mmadụ. Ma nke Sọl pụrụ iche. Ọ ga-abụ na Jizọs nyere Ananayas ikike ime ka mmụọ nsọ dakwasị Sọl. Mgbe Sọl ghọrọ Onye Kraịst, ya na ndịozi iri na abụọ Jizọs emekọghị ihe ruo ogologo oge. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eje ozi n’oge niile ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jizọs chọrọ ịhụ na Sọl nwetara ikike ọ ga-eji rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere ya.

c Gụọ igbe bụ́ “Tabita ‘Na-arụ Ọtụtụ Ọrụ Ọma.’”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya