-
“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
1-3. Olee ọhụụ Pita hụrụ, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe ọ pụtara?
OTU ụbọchị n’afọ 36 O.N.K., ka anwụ ọkọchị na-acha, Pita nọ n’elu ụlọ dị larịị na-ekpe ekpere. Ụlọ a dị nso n’osimiri dị n’obodo Jọpa, bụ́ ebe e nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Pita bụ ọbịa n’ụlọ ahụ kemgbe ụbọchị ole na ole. Ọnụnọ ọ nọ ebe a gositụrụ na ọ kpọghị ndị obodo ọzọ asị. Aha onye nwe ụlọ ahụ bụ Saịmọn. Aka ọrụ ya bụ isiji akpụkpọ anụ. Ọ bụghị onye Juu ọ bụla ga-ekwe anọ n’ụlọ ya.a Ma, Pita na-aga ịmụta ihe dị ezigbo mkpa na-egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu.
-
-
“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
a Ụfọdụ ndị Juu na-eleda onye na-esiji akpụkpọ anụ anya n’ihi na ọrụ ahụ na-eme ka ọ na-emetụ akpụkpọ anụ, ozu anụ, na ihe ndị na-asọ oyi o ji arụ ọrụ aka. A naghị ekwe ka ndị na-esiji akpụkpọ anụ bata n’ụlọ nsọ Chineke. Ebe ha na-anọ arụ ọrụ anaghị adị nso n’obodo. Ma é nweghị ihe ọzọ, ọ ga-adị kubit iri ise ma ọ bụ ihe karịrị amaụkwụ iri asaa ma e si n’obodo gawa ya. O nwere ike iso n’ihe mere ụlọ Saịmọn ji dịrị “n’akụkụ oké osimiri.”—Ọrụ 10:6.
-