-
Mụta Iche Nche N’aka Ndịozi JizọsỤlọ Nche—2012 | Jenụwarị 15
-
-
8, 9. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a kọrọ banyere njem Pọl mere?
8 Gịnị ka ihe a merenụ na-akụziri anyị? Cheta na ọ bụ naanị mgbe Pọl tinyewerela isi n’Eshia ka mmụọ Chineke sịrị ya abanyela. Naanị mgbe Pọl rutewerela Bitinia ka Jizọs gwakwara ya ihe ọ ga-eme. Ọ bụkwa mgbe Pọl rutecharala Troas ka Jizọs gwara ya banye na Masedonia. Ebe Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ ya, o nwere ike ime anyị ihe yiri nke ahụ. (Kọl. 1:18) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị nọ na-eche otú ị ga-esi ghọọ onye ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ otú ị ga-esi kwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ma, o nwere ike bụrụ naanị mgbe i bidocharala ime ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọ ọsụ ụzọ oge niile ka Jizọs ga-eji mmụọ nsọ duzie gị. Iji maa atụ: Ọkwọ ụgbọala nwere ike iduzi ụgbọala ya ka ọ gaa aka ekpe ma ọ bụ aka nri, ma, ọ bụ naanị ma ọ bụrụ na ụgbọala ahụ na-agba agba. Ọ bụkwa otú ahụ ka Jizọs nwere ike isi duzie anyị ịna-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma naanị ma ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike ime otú ahụ.
-
-
Mụta Iche Nche N’aka Ndịozi JizọsỤlọ Nche—2012 | Jenụwarị 15
-
-
HA MỤ ANYA KA HA WEE NA-EKPE EKPERE
-